“Ọktoba 27- Nọvemba 2: ‘Otu Ụlọ nye Aha M’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Ọktoba 27–Nọvemba 2: “Otu Ụlọ nye Aha M”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124
Dị ka isi ike ka afọ isii ikpeazụ dịrịị nye Ndị nsọ, ihe niile malitere ịdịtụ mma na spring nke 1839: Ndị nsọ gbara ọsọ ndụ enwetewo ọmịiko n’etiti ndị nwe ala Quincy, Illinois. Ndị nche ekwerewo Josef Smith na ndị ndu ọzọ nke Nzukọ nsọ ịgbanarị ndọkpụ n’agha niime Missouri. Ma Nzukọ nsọ ka zụtaworo ala niime Illinois ebe Ndị nsọ nwere ike ịgbakọta ọzọ. Ee, ọ dị apịtị apịtị, ala anwụ nta juputara, mana ịtụnyere ya aka mgba niile Ndị nsọ zutewororịị, nke a yiri ihe dịtụ mma. Ya mere ha gbapụrụ mmiri apịtị ahụ ma tụọ atụmatụ maka obodo ukwu ọhụrụ, nke ha kpọrọ Nauvoo. Ọ pụtara “ọmarịcha” na Hibru, agbanyeghị ọ bụụrụ karịa ngosipụta nke okwukwe karịa nkọwa kpọmkwem, ma karịsịa nta n’oge mmalite. Ka ọ dị ugbu a, Onyenwe anyị naara agwa Onye Amụma Ya okwu n’uche nke ime ngwa ngwa. Ọ ka nwere eziokwu na emume nsọ ndị ọzọ iweghachite, ma Ọ chọrọ tempụl dị nsọ ebe Ọ “ga-ekpukwasị [Ndị Nsọ Ya] okpueze jiri nsọpụrụ, anwụghị anwụ, na ndụ ebighị ebi” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:55). N’ọtụtụ ụzọ, otu ụdị mmetụta nke okwukwe na ime ngwa ngwa ndị a bụ nke a na-ahụ n’ọrụ nke Onyenwe anyị taa
Lee Ndị Nsọ, 1:399–427; “Ịhazi Nzukọ nsọ na Nauvoo,” niime Mkpughe ndị dị N’ọnọdụ, 264–71.
Mụtakwuo ọzọ banyere ebe ndị agụgụala nke Nzukọ nsọ dị na Illinois.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:2–11
E nwere m ike ikpọku ndị ọzọ ịbakwute Kraịst.
Onyenwe anyị gwara Onye amụma Josef Smith ka ọ “maa ọkwa dị nsọ nke ozi ọma [Ya]” nye ndị eze niile nke ụwa” (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:2–11). Ọ bụrụ na ị natara ọrụ nke a ekenyere, kedụ ihe ọkwa gị ga-ekwu banyere Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya eweghachitere? Tụgharịa kwa uche otu i nwere ike i si kesaa aka ebe gị n’ụzọ ama ama na nke eke gị na ndị mmadụ gị na ha na-ekwu okwu kwa ụbọchị.
Lee kwa “Mweghachi nke Ozuzu nke Ozi ọma nke Jizọs Kraịst: Ịma Ọkwa Emume ncheta Narị Afọ Abụọ nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:12–21
E nwere m ike ịbụ onye na-eso ụzọ onye nnke Onyenwe anyị nwere ntụkwasị obi na ya.
Tulee ikesara ndị ọzọ, dị ka Onye Nzọpụta mere niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:12–21, njirimara dị ka nke Kraịst ndị ị na-ahụ niime ha. Kedụ otu O siworo kwuputa nye gị ịhụnaanya na ntụkwasị obi Ya?
Lee kwa Richard J. Maynes, “Inwete Ntụkwasị obi nke Onyenwe anyị na Ezi na ụlọ Gị,” Liahona, Nov. 2017, 75–77.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:22–24, 60–61
Onyenwe anyị chọrọ ka m kpọbata ma nabata ndị ọzọ.
Dị ka ị na-atụgharị uche na ntuziaka nke Onyenwe anyị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:22–24, 60–61, chee banyere otu i nwere ike i si mee ebe obibi gị na ngalaba ukwu gị ebe dị ka ihe Onyenwe anyị bu n’obi maka Nauvoo.
Lee kwa “Enyi nye Ndị Niile” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:25–45, 55
Anyị na-ewu tempụl niile nye Onyenwe anyị iji nata emume nsọ ndị dị nsọ.
Gịnị mere anyị ji enwe mmetụta na Onyenwe anyị na-enyekarị mgbe niile ndị Ya iwu iji wuo [tempụl niile] nye aha nsọ [Ya]?” Tulee ide ndepụta nke ebumnuuche ndị ị na-achọta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:25–45, 55. I nwere ike chọta ndị ọzọ niime abụ dị ka “Anyị Hụrụ Ụlọ Gị Naanya, O Chineke” (Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 247) ma ọ bụ vidiyo “Gịnị Bụ Tempụl?” (Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma). Kedụ otu ọrụ nke iwu ọtụtụ tempụl si bụrụ ihe iriba ama nke ịhụnaanya nke Onyenwe anyị nye gị?
Kemgbe ewuru Tempụl Nauvoo na 1840 gaaniihu, ihe karịrị tempụl 300 ka ewugoro ma ọ bụ amaworo ọkwa ha. Onyeisi Russell M. Nelson kuziri: “Anyị maara na oge anyị niime tempụl dị oke mkpa maka nzọpụta na mbuli elu nke anyị nakwa nke ndi ezi na ụlọ anyị. … Mwakpo niile nke onye iro nọ na-abawanye nke ukwuu, n’ike n’ike na ịdị iche iche. Mkpa ọ dị anyị ịnọ niime tempụl oge niile adịbeghị mgbe ọ dị ukwuu karịa” (“Ịbụrụ Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ nke Atụ,” Liahona, Nov. 2018, 114). Kedụ otu tempụl siworo nyere gị aka guzogide “mwakpo niile nke onye iro”? Kedụ ihe na-emetụta gị ime iji soro ndụmọdụ nke Onyeisi Nelson?
Lee kwa “Ihe Mere Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a si Arụ Tempụl niile,” temples.ChurchofJesusChrist.org.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:45–55
Onyenwe anyị na-agọzi ndị na-agba mbọ irube isi nye iwu nsọ Ya niile.
Ndị nsọ ka enyeworo iwu iwu tempụl na Ọgba Jackson, Missouri, mana “ndị iro ha gbochiri ha” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:51). Amaokwu nke 49-55 nwere niime ha ozi na-emesị obi ike maka ndị mmadụ ga-achọ irube isi nye iwu nsọ niile nke Chineke mana egbochie site ime otu ahụ niihi ezi na ụlọ ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ. Kedụ ndụmọdụ ị na-achọta niime amaokwu ndị a nke nwere ike inyere mmadụ aka n’ụdị ọnọdụ dị otu a?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:91–92
Onyenwe anyị pụrụ idu m site na ngọzi m nke onye petrak.
Mgbe na-adịghị anya nna nke Onye amụma, Joseph Smith, nke Nnukwu., nwụrụ, Onyenwe anyị kpọrọ Hyrum Smith n’ọkpụkpọ oku nke nna ya nwebuuru—Petrak nke Nzukọ nsọ. I nwere ike ịgụ banyere nke a nime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:91–92.
Kedụ otu i ga-esi akọwa ngọzi nke onye petrak nye onye na-anụtụbeghị ya mbụ? Gịnị ka i ga-ekwu iji gbaa mmadụ ume ịnata ya? Chọọ maka azịza niile nye ajụjụ ndị a niime ozi nke Okenye Randall K. Benneth “Ngọzị Gị niile nke Onye Petrak--Odudu sitere na Nna nke Eluigwe Na-akpate mmụọ” (Liahona, Me 2023, 42–43) ma ọ bụ Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ngọzị niile nke Onye Petrak” (Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma).
Ịdabere na ihe ị mụworo ma nwetawo, tulee otu i ga-esi edeju ahịrị okwu nke a: “Ngọzi nke Onye Petrak dị ka .” Gịnị mere Nna nke Eluigwe ji chọọ ụmụ Ya ịnata ngọzi nke onye petrak a?
Ọ bụrụ ma ị natabeghị ngọzi nke onye petrak, kedụ ihe i nwere ike ime iji nata ya? Ọ bụrụ na ị nataworịị ngọzị niile nke onye petrak, kedụ otu i nwere ike i si gosi Chineke na i jiri onyinye nke a kpọrọ ihe?
Lee kwa Kazuhiko Yamashita, “Oge I ji Anata Ngọzi nke Petrak,” Liahona, Me 2023, 88–90; Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 18.17, Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:15, 20
Jizọs Kraịst hụrụ ikwu eziokwu naanya.
-
Iji nyere ụmụ gị aka cheta ihe ha mụtara site na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:15, 20, i nwere ike inyere ha aka see ma chapụta ọtụtụ obi akwụkwọ. N’elu obi ahụ, i nwere ike nyere ha aka dee isi nkebiokwu ndị sitere na amaokwu ndị a. Egwu dị ka “Guzoro maka Ezi ihe” (Akwụkwọ abụ Ụmụntakịrị, 159) nwere ike inye aka kwusie ike okwu niile nke Onyenwe anyị.
-
Mgbe a gụkọtachara ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:15, 20, ikekwe i nwere ike inyere ụmụ gị aka chọpụta ihe ọ pụtara ibi ndụ eziokwu na peeji 31 nke Maka Ume Ndị Ntoroọbịa: Odudu Ime Nhọrọ niile. Gịnị ka Onyenwe anyị kwuru kpọmkwem banyere George Miller na amaokwu 20 “niihi ikwu eziokwu nke obi nke [George]”? I nwekwara ike ikesa ọmụmaatụ nke ụmụntakịrị na-egosi ikwu eziokwu site na nhụmiihe nke onwe gị ma ọ bụ site na magazin Friend. Kpọkuo ụmụ gị irọpụta otu ebumnobi igosi ikwu eziokwu izu ụka nke a ma gwa gị ụdị mmetụta ha nwetere mgbe ha mere ya.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:28–29, 39
Jizọs nyere ndị Ya iwu iwu tempụl niile.
-
Ụmụ gị nwere ike inwe ọṅụ ileanya na foto tempụl niile, gụnyekwara otu tempụl mgbe ochie na tempụl dị nso ebe ha bi (lee ChurchofJesusChrist.org/temples/list). I nwere ike iji foto ndị a na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:39 iji kọwaa na Jizọs Kraịst na-enyekarị ndị Ya iwu mgbe niile iwu tempụl niile—n’oge mgbe ochie na n’ụbọchị anyị taa (lee kwa peeji ihe omume nke izu ụka nke a).
-
Ọ bụrụ na unu bi nso na tempụl, tulee ịkpọga ụmụ gị ebe ahụ na ije ije nkwanye ugwu niime ọgba tempụl ahụ. Kpọkuo ha ịchọta mkpụrụ okwu ahụ “Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị—Ụlọ nke Onyenwe anyị” n’ezi tempụl ahụ. Gị na ụmụ gị kwuo okwu banyere ihe mkpụrụ okwu ndị a pụtara.
-
Tulee iji nchepụta ndị dị niime “Ime Baptizim na Ime Nnabata maka Ndị Nna nna ha” niime appendix A iji nyere ụmụ gị aka tụọ anya ụbọchị mgbe ha nwere ike ịbanye na tempụl (lee kwa “Tempụl ahụ na Atụmatụ nke Obi ụtọ” niime appendix B).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:91–92
Onyenwe anyị ga-agọzi m site na ngọzi nke onye petrak.
-
Dị ka unu na-agụkọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 124:91–92ọnụ, nyere ụmụ gị aka chọta ihe Onyenwe anyị kpọrọ Hyrum Smith ime. Kwuo okwu banyere ihe ngọzi nke onye petrak bụ: otu ngọzi pụrụ iche nke Onyenwe anyị ji na-akuziri anyị banyere onwe anyị na ihe Ọ na-achọ ka anyị ime ma bụrụ. Tulee iji nkeji nke “Ịnata Ngọzi nke Onye Petrak” niime appendix A iji nyere ụmụ gị aka kwadoo ịnata ngọzi nke onye petrak.