“Olu niile nke Mweghachite: Otù Enyemaka,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Otù Enyemaka,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Olu niile nke Mweghachite
Otù Enyemaka
Na 1842, mgbe ahazisiri Otù Enyemaka na Nauvoo, Illinois, Onye amụma Josef Smith kwuru, “Nzukọ nsọ abụghị nke zuru oke na nhazi tutu ruo mgbe a haziri ndịinyom otu a.” N’otu aka ahụ, ọmụmụ ihe nke Mweghachite Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị na ọkwa nchụaja Ya ezughị ezu tutu ruo ya agụnye ọmụmụ ihe nke Otù Enyemaka, nke ya onwe ya bụ “mweghachite nke usoro mgbe gboo” nke ndị nwanyị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst.
Eliza R. Snow rụrụ ọrụ dị mkpa na mweghachite ahụ. Ọ nọ anọ mgbe ebu ụzọ hazie Otù Enyemaka ma, dị ka ode akwụkwọ nke otù ahụ, dere ihe n’oge nzukọ ya niile. Ọ gbara aka ebe n’onwe ya na ahaziri Otù Enyemaka “dị ka n’usoro nke ọkwa nchụaja.” N’okpuru bụ okwu ya niile, e dere mgbe ọ naara eje ozi dị ka Onyeisi Otù Enyemaka Zuruọha nke abụọ, iji nyere ụmụnne ya nwanyị aka ghọta ọrụ dị nsọ nke enyere ụmụada ọgbụgba ndụ nke Chineke.
Ịmụtakwu banyere otu e si hazie Otù Enyemaka, lee Ụmụada niime Alaeze M: Agụgụala na Ọrụ nke Otù Enyemaka (2017), 1–25; Afọ Iri ise Mbụ nke Otù Enyemaka (2016), 3–175.
Eliza R. Snow
Agbanyeghị aha ahụ [Otù Enyemaka] nwere ike ịbụ nke ụbọchị ugbu a, nhazi ya bụ nke nsipụta mgbe gboo. A gwara anyị site n’aka [Josef Smith], na otu nhazi ahụ nọbuuru niime Nzukọ nsọ mgbe gboo, ntule ndị emere niime ụfọdụ akwụkwọ ozi erekọọdụrụ niime Agba Ọhụrụ, na-eji aha, ’agbọghọ a họọrọ’ [lee 2 Jọn 1:1; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:3].
Nke a bụ nhazi nke na-enweghị ike ịdị adị ma enweghị Ọkwa nchụaja, site n’eziokwu na ọ na-enwete ikikere ya na ike mmetụta ya site na nsipụta. Mgbe ewepụrụ Ọkwa nchụaja site n’elu ụwa, nhazi nke a nakwa mgbakwunye ndị ọzọ niile nke ezi usoro nke nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst n’elu ụwa, kpochapụrụ. …
“Ebe m nọ n’ihu na nhazi nke ‘Otù Enyemaka Ụmụnwanyị nke Nauvoo,’ … nakwa ebe m nweteworo nhụmiihe gbara ihu niime otù ahụ, elemanya e nwere m ike ikwu okwu ole ma ole nke ga-enyere ụmụada nke Zayọn aka na-ịganiihu na ọnọdụ nke a dị nnọọ oke mkpa, nke juputara na oke na ọrụ ọhụrụ na nke mụbara amụba. Ọ bụrụ ma onye ọbụla niime ụmụada na ndị nne nọ na Izrel na-enwe mmetụta mgbochi kacha peempe n’ogo ha ugbua, ugbu a ha ga-achọta ogo buru ibu maka ike na ikike niile maka ime ihe ọma bụ nke ha kachasị nwere niime ha ebe o buru ibu. …
“Ọ bụrụ na ajụjụ ahụ gbata n’obi, nke onye ọbụla, Kedụ ihe bụ ihe eji n’aka banyere Otù Enyemaka Ụmụnwanyị? Aga m azaghachi—ime ihe ọma—iwete n’ọchịchọ ike niile anyị nwere maka ime ihe ọma, na-abụghị naanị inyere ndị ogbenye aka mana na-ịzọpụta mkpụrụ obi niile. Mgbalị ejikọtara ọnụ ga-emejuputa ihe ga-akarị ihe e nwere ike imejuputa site n’ume nke ndị mmadụ kachasị dị ike. …
“Na-inyere ndị ogbenye aka, Otù Enyemaka Ụmụnwanyị nwere ọrụ ndị ọzọ ịrụ karịa naanị ibelata ọchịchọ anụ ahụ. Ịda ogbenye n’uche na ọrịa nke obi, nakwa achọ nlebara anya; ma ọtụtụ mgbe nkwupụta dị obi ọma—mkpụrụ okwu ndụmọdụ ole ma ole, ma ọ bụna nkwe n’aka dị jụụ ma dị ịhụnaanya ga-aka eme mma ma ka dị nnabata karịa akpa ọla edo. …
Mgbe Ndị nsọ gbakọtara site na mba ndị ọzọ, ndị ọbịa nye onye niile, ma nọrọ n’ọnọdụ inwe nduhie site n’aka ndị ahụ nọ na-eche iduhie, Otù [Enyemaka] kwesịkwara ịghara igbu oge na-ilekọta [ha], ma dubata ha niime otù nke ga-anụcha ma bulie ha elu, ma karịa ihe niile gbaa ha ume n’okwukwe nke Ozi ọma, ma site na ime otu a, nwere ike bụrụ ngwa ọrụ na-ịzọpụta ọtụtụ.
“Ọ ga-achọ ukwu akwụkwọ niime nke iji kọwaa ọrụ niile, ohere ọma niile na oke ma ọrụ niile na-abịa n’etiti nhụnuuche nke Otù ahụ. … Na-eme ya (n’okpuru ntuziaka nke bishọp gị), jiri nwayọọ, na-ịkpachara anya, n’ike, n’ịdị n’otu na site n’ekpere, ma Chineke ga-agọzi mgbalị gị niile jiri mmeri.”