“Nọvemba 3–9: ‘Olu nke Obi ụtọ maka Ndị Dị ndụ na Ndị Nwụrụ anwụ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 125–128,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 125–128,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Nọvemba 3–9: “Olu nke Obi ụtọ maka Ndị Dị ndụ na Ndị Nwụrụ anwụ”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 125–128
Na Ọgọst 1840, Jane Neyman na-eru uju gere Onye amụma ntị na olili nke enyi ya Seymour Brunson. Nwata nwoke nwa nke Jane Cyrus ka nwụkwara mgbe na-adịghị anya. Ịgbakwunye na-iru uju ya bụ eziokwu na Cyrus emebeghị baptizim, ma Jane nwere nchegbu ihe nke a ga-apụta nye mkpụrụ obi ya dị ebighị ebi. Josef echewokwa otu ụdị ihe ahụ gbasara nwanne ya nwoke ọ hụrụ naanya Alvin, onye nke nwụkwara tutu ime baptizim. Ya mere Onye amụma kpebiri ikesara onye niile nọ na akwam ozu ahụ ihe Onyenwe anyị kpugheere ya banyere ndị nwụrụ anwụ na-anataghị emume nsọ ozi ọma niile—na ihe anyị nwere ike ime iji nyere ha aka.
Ozizi nke baptizim maka ndị nwụrụ anwụ tọrọ Ndị nsọ ụtọ; echiche ha ozugbo tụgharịrị n’ebe ndị otù ezi na ụlọ ha nwụrụ anwụ ọnụ ọgụgụ Ugbu a e nwere olileanya maka ha! Josef soro keta oke na ọńụ ha, ma niime otu leta na-akuzi ozizi nke a, o jiri asụsụ ọńụ, nwere oke mmasị iji kọwaa ihe Onyenwe anyị kuziiri ya banyere nzọpụta nke ndị nwụrụ anwụ: “Kwe ka ugwu ukwu tie mkpu ọńụ, ma unu ndagwurugwu niile tisie mkpu ike; ma unu oke osimiri niile na ala akọrọ niile kwuonụ maka ịtụanya niile nke Eze unu dị Ebighị ebi!” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:23).
Lee Ndị Nsọ, 1:415–27; “Leta niile gbasara Baptizim maka Ndị Nwụrụ anwụ,” niime Mkpughe ndị dị N’ọnọdụ, 272–76.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 126
Onyenwe anyị chọrọ ka m lekọta ezi na ụlọ m.
Mgbe ọ na-alọta site na mishọn ọ gara na England—otu niime ọtụtụ mishọn o jere—Brigham Young natara ọkpụkpọ oku ọzọ dị mkpa sitere n’aka Onyenwe anyị. A gwara ya “ilekọta ezi na ụlọ [ya] n’ụzọ pụrụ iche” (amaokwu 3), ndị taworo ahụhụ mgbe ọ na-anọghị ya. Dị ka ị na-amụ nkeji nke a, tulee ihe mere mgbe ụfọdụ Onyenwe anyị ji na-achọ aja niime ije ozi anyị? Gịnị ka i nwere ike ime iji lekọta ezi na ụlọ gị?
Lee kwa “Lekọta Ezi na ụlọ Gị N’ụzọ Pụrụ iche,” niime Mkpughe ndị nọ N’ọnọdụ, 242–49.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 127:2–4
E nwere m ike ịdabere na Onyenwe anyị n’oge ndị ihe siri ike.
Ebubo ụgha niile na iyi egwu mnwuchi ọzọkwa amanyewo Josef Smith ịbanye na nzuzo na Ọgọst 1842. Ma ka ọ dị mkpụrụokwu ndị o degaara Ndị nsọ n’oge nke a (ugbu a Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 127) juputara na nchekube na ọńụ. Gịnị ka amaokwu nke 2–4 na-akuziri gị banyere Chineke? banyere izute ịkwa emo na mmegide? Kedụ nkebiokwu ndị sitere na amaokwu ndị a nwere ike inyere gị aka mgbe ị na-enwe mmetụta inwe mkpagbu? Tulee idekọ otu Onyenwe anyị si na-akwado gị niime “omimi mmiri” nke ndụ gị.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 127:5–8; 128:1–8
“Ihe ọbụla ọ bụ idekọrọ n’ụwa ka a ga-edekọ n’eluigwe.”
Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 127:5–8; 128:1–8, chọọ maka ihe ndị kpatara Onyenwe anyị ji nye Josef Smith ụdị ntuziaka a kpọrọ aha dị otu ahụ banyere ị na-edekọ baptizim niile maka ndị nwụrụ anwụ. Gịnị ka nke a na-akuziri gị banyere Onyenwe anyị na ọrụ Ya? Kedụ otu ịchere ntuziaka nke a nwere ike iji metụta ndekọihe niile nke ezi na ụlọ nke gị, dị ka jonaalụ nke onwe?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:5–25
Nzọpụta nke ndị nna nna m ha dị mkpa nye nzọpụta nke m.
O doro anya site n’ihe Chineke kpughere site n’aka Josef Smith ihe kpatara ndị nna nna anyị ha ndị a na-emeghị baptizim na ndụ nke a jiri chọọ anyị: anyị na-eme baptizim n’aha ha ka ha nwee ike họrọ ịnabata ma ọ bụ jụ emume nsọ nke a. Mana Onye amụma kuzikwara na nzọpụta nke ndị nna nna anyị ha “dị mkpa ma dị oke mkpa nye nzọpụta anyị.” Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:15-18, chee banyere ihe kpatara nke ahụ.
Amaokwu 5 na-akuzi na emume nsọ nke baptizim maka ndị nwụrụ anwụ ka “akwadoro tupu ntọala nke ụwa.” Gịnị ka eziokwu nke a na-akuziri gị banyere Chineke na atụmatụ Ya? Gịnị ka ozi nke Okenye Dale G. Renlund “Agụgụala Ezi na ụlọ na Ọrụ Tempụl: Nrachi na Ọgwụgwọ” na-agbakwunye na nghọta gị? (Liahona , Me 2018, 46–49).
Josef Smith jiri nkebiokwu dị ka “ike nrachi,” “ụzọ njikọ,” na “ịdị n’otu zuru oke” mgbe ọ na-akuzi banyere emume nsọ ọkwa nchụaja niile na baptizim maka ndị nwụrụ anwụ. Chọọ maka nkebiokwu ndị a na ndị yiri ha dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:5–25. I nwere ike iche maka ihe ndị i nwere ike iji gosipụta nkebiokwu ndị a, dị ka ụdọ igwe ma ọ bụ ụdọ? Kedụ ihe mere eji were ezigbo nkebiokwu ndị a iji kọwaa ozizi nke a?
Itule ajụjụ ndị sotere nwekwara ike inyere ọmụmụ ihe gị nke amaokwu ndị a aka:
-
N’echiche nke gị, gịnị mere baptizim maka ndị nwụrụ anwụ ga-eji abụ ihe ahụrụ dị ka “nke kachasị dị ebube site na isiokwu niile nke ozi ọma mgbe nile na-adigide nwere”? (amaokwu 17). Kedụ nhụmiihe ndị nyewooro gị aka nwee mmetụta n’ụzọ a?
-
N’uche dị ọlịa ka enwere ike i si abụ ụwa ọnụ ma ọ bụrụ ma enweghị “ụzọ njikọ … dị n’etiti ndị nna nna na ụmụ ha”? (amaokwu 18).
-
Gịnị na-amasị gị banyere okwu niile nke Josef Smit niime amaokwu 19–25? Kedụ otu amaokwu ndị a si emetụta ụzọ i si enwe mmetụta banyere Jizọs Kraịst? banyere ije ozi tempụl maka ndị nna nna gị ha? (lee kwa “Bịanụ, Ńụrịa,” Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 9).
Mgbe ị mụsịrị amaokwu ndị a, i nwere ike nwee mmetụta mkpate mmụọ ime ihe maka ndị nna nna gị ha. Nchepụta niile na FamilySearch.org nwere ike inye aka.
“Vidiyo niile Na-akpate mmụọ” dị na “Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ” nchịkọta nke Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma nwere ike inyere gị aka bara uru, akụkọ niile na-akpate mmụọ, na ozi niile sitere n’aka ndị ndu banyere agụgụala ezi na ụlọ.
Lee kwa Kevin R. Duncan, “Olu nke Obi ụtọ!,” Liahona, Me 2023, 95–97.
“Ndokwa Dị ebube ma Dị ịtụnaanya.”
Onyeisi Gordon B.Hincley kwuru:
“Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs n’aha ndị niile nọchitere nnukwu aja nnọchi anya. O doziri usoro ahụ n’okpuru nke Ọ bụziiri onye nnọchi anya maka ụmụ mmadụ niile. Usoro nke a n’okpuru nke otu mmadụ nwere ike mee ihe n’aha nke onye ọzọ ka ebugara niihu niime emume nsọ niile nke ụlọ nke Onyenwe anyị. Ebe a anyị na-eje ozi n’aha ndị ahụ nwụworo anwụ na-enweghị ọmụma ihe nke ozi ọma. Nke ha bụ nhọrọ nke ịnabata ma ọ bụ ịjụ emume nsọ nke emere. E debere ha n’ogo nhata ha na ndị ahụ na-eje ije n’elu ụwa. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-enye otu ụdị ohere dị ka ndị dị ndụ. Ọzọkwa, ụdị ndokwa dị ebube ma dị ịtụnaanya nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile mere site na mkpughe Ya nye Ndị Amụma Ya” (“Nnukwu Ihe niile Nke Chineke Kpugheworo,” Liahona, Me 2005, 82-83).
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 126:3
A pụrụ m inye aka lekọta ezi na ụlọ m.
-
I nyere ụmụ gị aka mụọ ijere ndị otù ezi na ụlọ ha ozi, tulee ikesa ozi banyere Brigham Young niime “Isi nke 50: Ndị nsọ niime Nauvoo” (niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 1844, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma) ma ọ bụ chịkọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 126 na mkpụrụokwu nke gị. I nwere ike kwusie ike nkebiokwu ahụ “ilekọta ezi na ụlọ gị n’ụzọ pụrụ iche” (amaokwu 3) ma kwuo okwu gị na ụmụ gị banyere ihe ọ pụtara ilekọta ezi na ụlọ anyị n’ụzọ pụrụ iche.
-
O nwere ike na-enye gị na ụmụ gị obi ụtọ ị na-ele foto niile nke ezi na ụlọ (ma ọ bụ see ọtụtụ foto) dị ka unu na-ekwu maka ụzọ ndị anyị nwere ike i si enye aka “lekọta” ndị otù ezi na ụlọ. Unu nwere ike gụọ otu egwu dị ka “Ebe obibi Pụrụ Ịbụ Eluigwe n’elụ Ụwa” (Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 298).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:5, 12
Ụmụ Chineke niile nwere mkpa ohere ime baptizim.
-
Kpọkuo ụmụ gị ịchọpụta site na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:1 isiokwu juru n’uche nke Josef Smith. Ha nwere ike chọgharịa na amaokwu 17 iji chọpụta isiokwu o weere ịbụ nke “kachasị dị ebube.” Kwe ka ha kesaa ihe ha chọtara ma kwuo maka ihe mere isiokwu nke a ji dị oke mmasị.
-
Na mgbakwunye inyere ụmụ gị aka kwadoo maka (ma bie ndụ) ọgbụgba ndụ baptizim nke ha, i nwere ike nyere ha aka mata otu esi enyere ndị mmadụ aka ndị na-emeghị ọgbụgba ndụ ndị a n’oge ndụ ha. Tulee ịgwa ụmụ gị banyere onye ị maara nwụrụ na-emeghị baptizim. Emesịa unu nwere ike gụkoọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:5 ọnụ ma kirie otu foto nke fọnt ebe a na-eme baptizim na tempụl (dị ka otu nke dị na ngwụcha ndepụta nke a). Gwa ụmụ gị otu o si emetụta gị banyere ime baptizim na tempụl n’aha ndị nwụrụ anwụ ka onye ọbụla nwete ohere ime ọgbụgba ndụ ha na Nna nke Eluigwe.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:18
Nna nke Eluigwe chọrọ ka m mụta ihe gbasara agụgụala ezi na ụlọ m.
-
O nwere ike ịbụ obi ụtọ nye gị na ụmụ gị ịrụ ụdọigwe akwụkwọ nke nwere aha nke ndị nne na nna, ndị nne nne na nna nna nke ukwu, nne nne na nna nna nke nnukwu dị ukwuu, ma na-aganiihu (lee ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a.) Emesịa unu nwere ike kesaara ibe unu ihe unu maara banyere ndị nna nna ndị a. Gụkọtanụ ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:18 iji chọpụta ihe ụzọ njikọ bụ nke na-eme agụgụala ezi na ụlọ anyị “zuo ezuo ma zuo oke.” Unu nwekwara ike lee vidiyo “Mgbam ume: Echere Na M Nwetere Ya site na Ya” (Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma).
-
Ihe omume ndị agbakwunyere iji nyere ụmụ gị aka sonye na agụgụala ezi na ụlọ ka enwere ike ịchọta niime “Tempụl na Atụmatụ nke Obi Ụtọ” niime appendix B ma ọ bụ na FamilySearch.org.