“Olu niile nke Mweghachite: Baptizim maka Ndị nna nna Anyị ha, ‘Ozizi Dị ebube,’” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Baptizim maka Ndị nna nna Anyị ha,‘Ozizi Dị ebube,’” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Olu niile nke Mweghachite
Baptizim maka Ndị nna nna Anyị ha, “Ozizi Dị ebube”
Phebe na Wilford Woodruff
Phebe Woodruff bi n’akụkụ Nauvoo mgbe Josef Smith malitere ikuzi ihe banyere ikwe omume nke ime baptizim maka ndị ahụ biiri ndụ mgbe gara aga. O dere banyere ya nye di ya, Wilford, onye na-eje ozi mgbasa ozi mishọn na England:
“Nwanne nwoke Josef … amụtawo site na mkpughe na ndị ahụ nọ niime nzukọ nsọ nwere ike ime baptizim maka nwanne ha nke ọbụla nwụrụ anwụ ma nweteghị ohere ọma ịnụ ozi ọma nke a, ọbụna maka ụmụ ha, ndị nne na nna, ụmụnne nwoke, ụmụnne nwanyị, ndị nne na nna nke ukwu, ndị deede, na ndị daada. … Ngwa ngwa ha mesịrị baptizim maka ndị enyi ha a na-atọhapụ ha site n’ụlọ mkpọrọ ma ha nwere ike inwere ha na mbilite n’ọnwụ ma kpọbata ha niime alaeze selestịal—ozizi nke a ka nzukọ nsọ na-anabata n’obi ụtọ ma ha na-aganiihu n’igwe n’igwe, ụfọdụ ka a na-aga ime baptizim ihe ruru ugboro 16 … n’otu ụbọchị.”1
Wilford Woodruff mesịrị kwuo maka ụkpụrụ nke a: “Oge ahụ m nụrụ maka ya, mkpụrụ obi m maliri elu n’ọńụ. … A gara m niihu ma mee baptizim maka ndị ụmụnne m niile nwụrụ anwụ ndị m nwere ike icheta maka. … O metụtara m ikwu haleluya mgbe mkpughe nke a pụtara ihè na-ekpughere anyị baptizim maka ndị nwụrụ anwụ. Ọ dịịrị m ka na anyị nwere ikike ịńụrị ọńụ niime ngọzi niile nke Eluigwe.”2
Vilate Kimball
Dị ka Nwanne nwanyị Woodruff, Vilate Kimball nụrụ banyere baptizim nnọchianya ebe di ya, Heber, pụrụ apụ ikwusa ozi ọma. O degaara ya ozi:
“Onyeisi Smith emeghewo isiokwu dị ọhụrụ na nke dị ebube … nke kpataworo nnọọ ịdị ndụ n’uju niime nzukọ nsọ. Ya bụ, ime baptizim maka ndị nwụrụ anwụ. Pọl kwuru okwu maka ya, niime Ndị Kọrịnt nke mbụ isi nke 15 amaokwu nke 29. Josef anatawo uju nkọwa ya karịa site na Mkpughe. … Ọ bụ ohere nke nzukọ nsọ nke a ime baptizim maka ụmụnna ha ndị nwụrụ anwụ tupu Ozi ọma nke a abịa; ọbụna ruo na Nna nna nna ukwu na Nne nne nne ukwu has. … Site na ime otu a, anyị na-eme dị ka ndị ọrụ nye ha; ma nye ha ohere ịpụta na mbilite n’ọnwụ nke mbụ. Ọ na-ekwu na a ga-ekwusara ha Ozi ọma … mana enweghị ihe ọbụla dị ka ime ndị mmụọ baptizim. … Kemgbe ekwusaworo usoro nke a ebe a, anọgidewo na-enye mmiri niile nsogbu esepụghị aka. N’oge ọgbakọ e nwere mgbe ụfọdụ ihe ruru Ndị Okenye asatọ ruo iri nọ niime osimiri n’otu oge na-eme baptizim. … A chọrọ m ime baptizim maka Nne m. E lere m anya ichere tutu gị alọghachị n’ebe obibi, mana oge ikpeazụ Josef kwuru okwu maka isiokwu ahụ, ọ nyere onye niile ndụmọdụ ịnọ na-arụ ọrụ, ma tọghapụ ndị enyi ha site na-agbụ ngwa ngwa dị ka o kwere omume. Ya mere echere m na m ga-aganiihu izu ụka nke a, ebe enwere ọtụtụ ndị agbata obi na-aganiihu. Ụfọdụ emewo baptizim ọtụtụ mgbe karịa. … Site otu a ị ga-ahụ na-enwere ohere maka onye niile. Ọ bụ na nke a abụghị ozizi dị ebube?”3
Phebe Chase
Ozugbo arụsịrị ebe a na-eme baptizim niime Tempụl Nauvoo, baptizim nnọchiteanya ka emere ebe ahụ kama ime ya n’osimiri. Phebe Chase, onye bi na Nauvoo, degaara nne ya akwụkwọ banyere tempụl, na-akọwa ebe a na-eme baptizim dị ka ebe “anyị nwere ike ime baptizim maka ndị anyị nwụrụ anwụ ma ghọzie ndị nzọpụta n’elu Ugwu Zayọn.” Ọ garaniihu ịkọwa na niime ebe a ana eme baptizim, “e mewo m baptizim maka ezi nna m na ndị ọzọ niile fọdụrụ na ndị enyi m nwụrụ anwụ. … Ugbu a a chọrọ m ịma ihe aha Nna gị na nke Nne gị bụ ka m wee nwee ike tọghapụ ha, nihi na ọ na-amasị m inyere Ndị nwụrụ anwụ aka. … Onyenwe anyị ekwuwo okwu ọzọ ma weghachite usoro mgbe gboo.”4
Sally Randall
Na-idegara ndị enyi ya na ezi na ụlọ ya akwụkwọ banyere baptizim maka ndị otù ezi na ụlọ ndị biirị ndụ oge gara aga, Sally Randall chetara ọnwụ nke nwa ya nwoke George:
“O lee ụdị oge mnwale nke ahụ bụ nye m ma o yiri otu ọ dị na m enweghị ike edinwu ya, mana … nna ya emeworo ya baptizim ma olee ụdị ihe ebube ọ bụ na anyị kwere ma nata ozi ọma n’uju dị ka ekwusara ya ugbua ma nwere ike ime baptizim maka ndị enyi anyị niile nwụrụ anwụ ma zọpụta ha ọbụla ruo otu anyị nwere ike ịmata ihe ọbụla gbasara ha.
“A chọrọ m ka ị deere m aha nke ndị niile ihe jikọtara anyị na ha bụ ndị nwụrụ anwụ ọbụla gbadaa ruo na ndị nna nna ukwu na ndị nne nne ukwu n’ụzọ ọbụla. Echekubere m ime ihe m nwere ike ime iji zọpụta ndị enyi m ma ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ ma ụfọdụ niime unu ga-abịa nyere m aka niihi na ọ bụ nnukwu ọrụ nye otu onye ime naanị ya. … A tụrụ m anya na i ga-eche na nke a bụ ozizi na-agbagwoju anya mana ị ga-ahụ na ọ bụ eziokwu.”5