Come, Follow Me
Nọvemba 10–16: “A Hụwo M Aja Gị niile nime Nrube isi”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 129–132


“Nọvemba 10–16: ‘A Hụwo M Aja Gị niile nime Nrube isi’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 129–132,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 129–132,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Josef Smith na-akuzi ihe

Nkọwa n’uju sitere n’aka Josef Smith nọ na Nauvoo, 1840, site n’aka Theodore Gorka

Nọvemba 10–16: “A Hụwo M Aja Gị niile nime Nrube isi”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 129–132

Site na Josef Smith, Onyenwe anyị wepụrụ ụfọdụ ihe dị omimi site na ebighị ebi. Ịdị ukwuu nke Chineke, ebube nke eluigwe, na ịdị nnukwu nke ebighị ebi nwere ike iyi ihe ruchara nke ama ama na nghọta nke ozi ọma eweghachitere, ọbụna nye uche nwere oke dị ka nke anyị. Mkpughe ndị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 129–32 bụ ezigbo ọmụmaatụ. Kedu ihe Chineke dị ka ya? O “nwere anụ ahụ … a na-emetụ aka dị ka nke mmadụ.” Kedu ihe eluigwe dị ka ya? “Otu ụdị ọha mmadụ ahụ nke dị adị n’etiti anyị ebe a ga-adịkwa n’etiti anyị ebe ahụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:22, 2). N’ezie, otu niime eziokwu kachasị enye ọṅụ banyere eluigwe bụ na o nwere ike ịgụnye mmekọrịta ezi na ụlọ ndị anyị hụrụ naanya, ma ọ bụrụ na-arachiri site n’ikike ziri ezi. Eziokwu ndị dị ka ndị a nwere ike ime eluigwe adị ka ihe na-adịghị anya—dị ebube ma otu ọ dị dị nso.

Mana emesịa, mgbe ụfọdụ Chineke nwere ike rịọ anyị ime ụmụ ihe ndị yiri ka ọ na-eme obi erughị ala na ndị na-adịghị nso. N’ebe ọtụtụ Ndị nsọ isimbụ nọ, alụmdi na nwunye karịrị otu bụ otu niime ụdị iwu nsọ ahụ. Ọ bụ mnwale nke okwukwe rara ezigbo ahụ nye Josef Smith, nwunye ya Emma, na ihe ruru onye niile natara ya. Iji nagidezie mnwale nke a, ha ga-achọ karịa nnọọ mmetụta ndị dị mma banyere ozi ọma ahụ eweghachitere; ha na-achọ okwukwe na Chineke nke miri emi nke ukwuu karịa nke ahụ. Iwu nsọ ahụ anọghịkwa n’iwu taa, mana ọmụmaatụ kwesịrị ntụkwasị obi nke ndị debere ya ka nọkwa. Ma ọmụmaatụ nke a na-akpate mmụọ anyị mgbe agwara anyị ịchụ “aja niile na nrube isi” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:50).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130–132

Chineke na-achọ ibuli ụmụ Ya elu.

E nwere ọtụtụ ihe ndị anyị amaghị banyere mbuli elu ma ọ bụ ndụ na ogo kachasị elu nke alaeze Selestịal—ụdị ndụ nke Chineke na-ebi. Ọtụtụ niime ya nwere ike gafee ike anyị ugbu a ịghọta. Mana Chineke ekpughewo nchepụta ole ma ole dị oke ọnụ ahịa, ma ọtụtụ niime ha ka a na-achọta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130–32. I nwere ike gụọ jiri ajụjụ ndị dị ka ndị a niime uche: Kedụ ihe m na-amụta banyere Chineke? Kedụ ihe m na-amụta banyere ndụ mgbe ndụ anụ ahụ gasịrị? Kedụ otu ozi nke a banyere ndụ ebighị ebi si agọzi ndụ m ugbua?

Lee kwa “Obi Anyị Ńụrịrị Ịnụ Ka O Kwuru Okwu,” dị niime Mkpughe ndị nọ N’ọnọdụ, 277-80.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:20–21; 132:5

Chineke na-agọzi ndị na-erube isi nye iwu Ya niile.

Kedụ otu i ga-esi ekwu, na mkpụrụokwu nke onwe gị, ihe Onyenwe anyị na-akuzi niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:20–21 na 132:5? Tụgharịa uche otu esiworo gosịpụta ụkpụrụ nke a na ndụ gị.

Mgbe ụfọdụ, ọbụna mgbe anyị na-erube isi nye Chineke, ngọzi niile anyị na-atụanya ya anaghị abịa ozugbo. Kedụ otu i na-esi ejikwa okwukwe na olileanya gị mgbe nke a na-eme? Chọọ nghọta ndị dị niime ozi nke Okenye D. Todd Christofferson “Mmekọrịta Anyị na Chineke” (Liahona, Mee 2022, 78–80).

Lee kwa 1 Nifaị 17:35; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 82:10.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:13–21

akara ngosi semịnarị
Nna nke Eluigwe mere ka o kwe omume maka ezi na ụlọ niile ịdị ebighị ebi.

Site n’Onye amụma Josef Smith, Onyenwe anyị weghachitere eziokwu na mmekọrịta alụmdi na nwunye na ezi na ụlọ nwere ike dị ebighị ebi. Dị ka i na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:13–21, chọọ nkebiokwu niile nke na-enyere gị aka ghọta ndịiche dị n’etiti ihe “ga-anọgide” ruo mgbe ebighị ebi na nke na-agaghị. Kedụ ihe i chere ọ pụtara maka mmekọrịta alụmdi na nwunye ịbụ “site n’aka [Onyenwe anyị]”? (amaokwu 14).

N’ozi ya “N’otito nke Ndị Ahụ Na-azọpụta,” Onyeisi Dieter F. Uchtdorf kwuru ndịiche dị n’etiti mmekọrịta alụmdi na nwunye dị ebighị ebi na ụmụ ihe ndị “a na-atụfu atụfu” (Liahona, Me 2016, 77–78). Gịnị ka ndịiche nke a na-akuziri gị banyere otu esi enye ọzụzụ—ma ọ bụ kwadoo maka—mmekọrịta alụmdi na nwunye? Chee banyere mmekọrịta niile nke ezi na ụlọ—ugbu a na n’ọdịniihu—dị ka ị na-agụ ozi nke okenye Uchtdorf. Kedụ ihe ị na-achọta ebe ahụ na-enye gị olileanya niime Kraịst maka mmekọrịta niile nke ezi na ụlọ gị?

Onyeisi Henry B. Eyring kesara ndụmọdụ nke a ọ natara mgbe o nwere nchegbu banyere ọnọdụ ezi na ụlọ ya: “Gịnwa naanị bie ndụ ntozu oke alaeze Selestịal, ma nhazi niile nke ezi na ụlọ ga-adị ịtụnaanya karịa otu i nwere ike iche” (niime “Ebe obibi Ebe Mmụọ nke Onyenwe anyị Na-ebi,” Liahona, Me 2019, 25). Kedụ otu ndụmọdụ nke a si enyere gị ma ọ bụ onye ị ma aka?

Lee kwa “Ezi na ụlọ niile Pụrụ Ịnọkọta ọnụ ruo Ebighị ebi,” Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 300; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Alụmdi na nwunye,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.

nwoke na nwanyị nọ na mpụta tempụl

Alụmdi na nwunye ka enwere ike ịrachi ruo ebighị ebi niime ụlọ nke Onyenwe anyị.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:1–2, 29–40

Alụmdi na nwunye bara ụbara ka Chineke nabatara naanị mgbe Ọ kwadoro ya.

Ọtụtụ mmadụ ndị na-agụ Agba Ochie na-atule banyere Abraham, Jekọb, Moses, na ndị ọzọ lụrụ ọtụtụ ndị nwunye. Ụmụ odibo nke Onyenwe anyị ndị a ha na-akwa iko? Chineke ọ kwadoro alụmdi na nwunye ha? Josef Smith nwere otu ụdị ajụjụ ndị a. Chọọ maka azịza ndị Chineke nyere niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:1–2, 29–40.

Alụmdi na nwunye n’etiti otu nwoke na otu nwanyị bụ ihe atụ alụmdi na nwunye nke Chineke (lee isi nkeji nye Ịma ọkwa nke Ulọ ọrụ 1; Jekọb 2:27, 30). Kosiladị, enweworịị oge ndị mgbe Chineke nyere ụmụ Ya iwu ịlụ ụbara alụmdi na nwunye.

Afọ ndị isimbụ nke Nzukọ nsọ eweghachitere bụụrụ otu niime oge ngụpụ ndị ahụ. Ọ bụrụ na ị na-achọ ịmụtakwu banyere ụbara alụmdi na nwunye n’etiti Ndị nsọ isimbụ, lee “Mercy Thompson na Mkpughe maka Alụmdi na nwunye” (niime Mkpughe niile Dị n’ọnọdụ, 281–93); Ndị nsọ, 1:290–92, 432–35, 482–92, 502–4; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ụbara Alụmdi na nwunye niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma; “Gịnị mere O Jiri Dị Mkpa maka Josef Smith na Ndị ọzọ Ịlụ Karịa Otu nwunye?” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org

10:7

Why was it necessary for Joseph Smith and others to practice polygamy?

A question from the Worldwide Devotional: A Face to Face Event with Elder Cook on September 9, 2018

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 03

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:2, 18–19; 132:13, 19

Nna nke Eluigwe chọrọ ka m lekwasị anya n’ihe ndị dị ebighị ebi.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:20–21; 132: 5, 21–23

Chineke na-agọzi m dị ka m na-erube isi nye iwu Ya niile.

  • Ikekwe otu ntụnyere dị mfe nwere ike kuziere ụmụ gị banyere irube isi nye iwu nsọ niile nke Chineke. N’ịmaatụ, i nwere ike rịọ ha inye gị ntuziaka niile iji jee ije otu ebe, dị ka ịga ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ụlọ Nzukọ nsọ. Gịnị na-eme mgbe anyị esoroghị ntuziaka niile? Emesịa unu nwere ike gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:21 ma tụlee ntuziaka ndị a nye iwu nsọ niile nke Chineke nyeworo anyị.

  • Unu nwekwara ike gụkọta ọnụ otu egwu banyere nrube isi, ụdị dị ka “Debe Iwu nsọ niile” (Akwụkwọ abụ Ụmụntakịrị, 146-47), ma chọọ maka mkpụrụ okwu ndị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:20–21 na 132:5 nke yiri ndị ahụ dị niime egwu ahụ. Kedụ otu Chineke si agọzi anyị mgbe anyị na-agba mbọ idebe iwu nsọ Ya niile?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:22

Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist nwere anụ ahụ na-apụghị ịnwụ anwụ.

  • Mgbe unu gụkọtasịrị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:22 ọnụ, gị na ụmụ gị nwere ike kirie otu foto nke Jizọs Kraịst ma tụọ aka na anya Ya, ọnụ Ya, na akụkụ ahụ Ya ndị ọzọ. Ụmụ gị nwere ike tụọ aka na otu ụdị akụkụ ahụ ndị ahụ nke ahụ nke onwe ha. Gwa ha ihe mere o ji dị mkpa nye gị ịmata na ahụ anyị yiri dị ka nke Nna nke Eluigwe na nke Jizọs.

nwanyị na nwata nwanyị nọ na mpụta tempụl

Niihi emume nsọ niile nke ụlọ nke Onyenwe anyị, ezi na ụlọ nwere ike ịdị ebighị ebi.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:19

Nna nke Eluigwe mere ya ekwe omume maka ezi na ụlọ niile ịnọkọta ọnụ ruo ebighị ebi.

  • Nyere ụmụ gị aka chọta ọmụmaatụ nke ihe niile na-adịghị anọgide ruo ebighị ebi—nri na-emebi emebi, okooko osisi nke na-akpọnwụ akpọnwụ, na ndị ọzọ. Mgbe ahụ lekọtanụ anya na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:19 ọnụ ma chọta isi nkebiokwu niile dị ka “ọgbụgba ndụ dị ebighị ebi,” “arachiri,” “site ebighị ebi niile,” na “si n’ebighị ebi ruo n’ebighị ebi.” (Lee kwa “Isi nke 55: Mkpughe banyere Alụmdi na nwunye,” niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 198, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.) I nwekwara ike lee foto niile nke ezi na ụlọ gị ma gbaa ama na Onyenwe anyị emewo ya ekwe omume, site n’emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile nke tempụl, maka ezi na ụlọ niile ịnọ ruo ebighị ebi.

0:42

Chapter 55: A Revelation about Marriage: July 1843

Nwee mmetụta uche nye ọnọdụ niile nke ezi na ụlọ. ‘Ụmụntakịrị taa na-ahụta onwe ha niime nhazi ọtụtụ ezi na ụlọ dị iche na nke gbagwojuru anya. … [Anyị] kwesịrị irute [ndị ahụ] na-adị ka naanị ha nọ, dị ka ahapụrụ ha, ma ọ bụ nọ ofe mgbidi” (Neil L. Andersen, “Onye Ọbụla nke Nabatara Ha, Nabatara M,” Liahona, Me 2016, 49, 52).

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.

ọnụ ụlọ nrachi

Ọnụ ụlọ nrachi dị niime Tempụl Paris France

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị