Come, Follow Me
Nọvemba 17–23: “Kwadoonụ maka Ọbịbịa Nke Nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133–134


“Nọvemba 17–23: ‘Kwadoonụ maka Ọbịbịa Nke Nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133–134,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133–134,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

otite agba nke ụmụagbọghọ iri na-amaghị nwoke

Ụmụagbọghọ Iri Na-amaghị nwoke, site n’aka Jorge Cocco

Nọvemba 17–23: “Kwadoonụ maka Ọbịbịa Nke Nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133–134

Na 1833, igwe ndị iwe wakpọrọ ma bibie ụlọ ọrụ mbipụta nke Nzukọ nsọ. Niime ọrụ ndị ekwesịrị ibipụta n’oge ahụ bụ Akwụkwọ nke Iwu nsọ niile—mbọ mbụ nke Nzukọ nsọ idekọta mkpughe niile nke Chineke nke ụbọchị ikpeazụ a niime otu ukwu akwụkwọ. Igwe ndị iwe ahụ kposasịrị peeji ndị a na-amachibeghị, ma agbanyeghị Ndị nsọ nwere obi ike chekwara ụfọdụ niime ha, naanị kọpi Akwụkwọ nke Iwu nsọ niile dị ole ma ole na-ezughị ezu ka a maara lanarịrị.

Ihe anyị maara ugbu a dị ka nkeji 133 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile ka ebu n’obi ịbụ appendix nye Akwụkwọ nke Iwu nsọ niile, dị ka akara mkpu na ngwụcha mkpughe niile nke Onyenwe anyị ebipụtara. Ọ na-adọ aka na ntị maka ụbọchị nke ikpe na-abịa abịa ma kpọgharịa oku dị na mkpughe oge ugbu a: Gbafuo site n’ihe niile nke ụwa, dị ka ejiri Babịlọn gosị. Wuo Zayọn. Kwadoo maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ. Ma gbasaa ozi nke a “nye mba niile, na ala ụmụnna niile, na ire niile, na mmadụ niile” (amaokwu 37). Atụmatụ nsinambụ nke Akwụkwọ nke Iwu nsọ niile ka a na-emejuputaghị, mana mkpughe nke a bụ ihe ncheta na ihe akaebe na ọrụ nke Onyenwe anyị ga-aganiihu, “niihi na ọ ga-eme ogwe aka nsọ ya apụta ihè … , ma nsọtụ niile nke ụwa ga-ahụ nzọpụta nke Chineke ha” (amaokwu 3).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:4-14

Jizọs Kraịst na-akpọ m ịjụ Babịlọn ma bịa na Zayọn.

Mmegide ime mmụọ nke Zayọn bụ Babịlọn—obodo ukwu mgbe ochie nke gburugburu akwụkwọ nsọ niile gosipụtara ajọọ omume na agbụ nke ime mmụọ. Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:4–14, tụgharịa uche otu Onye Nzọpụta si na-akpọ gị “ịpụ … site na Babịlọn” (amaokwu 5) ma “gaa … niihu ruo … Zayọn” (amaokwu 9). Kedụ otu i si na-aza oku Ya? Kedụ ihe ọzọ ị mụtara banyere Zayọn site n’ozi Okenye D. Todd Christofferson “Bịanụ na Zayọn”? (Liahona,, Nov. 2008, 37–40).

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:1–19, 37–39

akara ngosi semịnarị
E nwere m ike ịkwado ugbu a maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta.

Ma nkeji 1, okwu mmalite nke Onyenwe anyị nye Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, ma nkeji 133, appendix nsinambụ nye Akwụkwọ nke Iwu nsọ niile, malitere jiri otu ụdị arịrịọ ahụ sitere n’aka Onyenwe anyị: “Ńaanụ nti, O unu ndị nke nzukọ nsọ m” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:1; 133:1). Ikekwe i nwere ike ịmụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:1–19, 37–39 ma depụta ozi niile Onyenwe anyị na-akpọku gị “ịńa ntị” nye (gee ntị ma rube isi) dị ka ị na-akwado maka Ọbịbịa Ya nke Ugboro Abụọ. Ọ kachasị, i nwere ike depụta ihe niile Ọ na-achọ gị ime iji (1) kwadoo onwe gị na (2) inye aka akwado ụwa maka nlọghachi Ya. Kedụ ihe ị na-amụ site na ndepụta ndị a?

Onyeisi Russell M. Nelson kesara eziokwu ndị dị mkpa banyere ihe ụwa ga-adị ka ya mgbe Onye Nzọpụta lọghachiri—na otu esi akwado. Chọọ maka eziokwu ndị a niime ozi ya “Ọdịniihu nke Nzukọ nsọ: Ịkwado Ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta” (Liahona, Apr. 2020, 6–11). Kedụ ihe na-akpate gị ime—ma ọ bụ ị nọ na-eme—iji kwadoo ụwa maka nlọghachi nke Onye Nzọpụta”? (“Isiokwu Kworum Ọkwa nchụaja nke Erọn,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma).

Lee kwa Matiu 25:1–13; Russell M. Nelson, “Nabata Ọdịniihu na Okwukwe,” Liahona, Nov. 2020, 73–76; “Bịanụ, Unu Ụmụ nke Onyenwe anyị,” Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 58; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:19–56

Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst ga-enye nnukwu ọńụ maka ndị ezi omume.

Dị ka ị na-agụ nkọwa nke nlọghachi nke Onye Nzọpụta niime amaokwu niile nke 19-56, gịnị ka ị na-achọta nke ị na-atụ anya ya? Kedụ mkpụrụ okwu ma ọ bụ nkebiokwu ndị na-akọwa ịhụnaanya nke Onyenwe anyị maka ndị Ya? Tulee idekọta nhụmiihe niile nke onwe gị jiri obi ọma dị ịhụnaanya nke Onyenwe [gị], na ihe niile nke o nyefeworo n’aka [gị] dị ka otu ịdị mma ya siri dị” (amaokwu 52).

Jizọs na-egosi otu nwanyị obi ọma

Nkọwa n’uju sitere n’aka Ọgwọ ọrịa, site n’aka Kelsy na Jesse Lightweave

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 134

“Gọọmentị niile ka ehiwere site n’aka Chineke maka uru nke mmadụ.”

Mmekọrịta Ndị nsọ isimbụ na gọọmentị gbagwojuru anya. Mgbe e jiiri ike kwapụ Ndị nsọ site na Ọgba Jackson, Missouri, niime 1833, ha rịọrọ maka enyemaka site n’aka gọọmentị obodo na nke mba ma ọdịghị nke ha natara. Otu oge ahụ kwa, ụfọdụ ndị mmadụ na-esoghị na Nzukọ nsọ tapịara nkuzi niile banyere Zayọn ịpụta na Ndị nsọ jụrụ ikikere nke gọọmentị nke elu ụwa. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 134 ka e dere, n’otu akụkụ, iji doo anya ọnọdụ nke Nzukọ nsọ banyere gọọmentị. Gịnị ka nkeji nke a na-atụpụta banyere otu Ndị nsọ nke Onyenwe anyị kwesịrị iche maka gọọmentị?

Dị ka ị na-amụ nkeji 134, tulee ịchọgharị ụkpụrụ niile nke gọọmentị na oke na ọrụ nke ndị ama ala. Kedụ otu nchepụta ndị a siworo wetere Ndị nsọ isimbụ enyem aka? Kedụ otu esi etinye ha n’ọrụ n’ebe i bi?

Lee kwa Edide niile nke Okwukwe 1:11–12; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Mnwere onwe Okpukperechi,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 03

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:4–5, 14

Onyenwe anyị chọrọ ka m pụọ site na ajọọ ihe dị niime ụwa.

  • Gị na ụmụ gị nwere ike depụta ụfọdụ ebe na ọnọdụ ndị nke Onyenwe anyị chọrọ anyị ịpụ apụ site na ya. Emesịa i nwere ike tụnyere ebe ndị ahụ na ọnọdụ niile ahụ ruo na nkọwa nke “Babel, Babịlọn” niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ (Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma). Ha nweziri ike gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:4–5, 14. Gịnị ka ọ pụtara “ịpụ … site na Babịlọn”? (amaokwu 5). I nwekwara ike depụta ebe na ọnọdụ ndị yiri ya nke Onyenwe anyị na-akpọku anyị ịbịa ma tụnyere ndepụta ahụ na nkọwa nke “Zayọn” niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:19–21, 25

Jizọs Kraịst ga-abịa ọzọ.

  • Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ ime ka a ga-asị ihe ọ dị ka ya ịkwado maka ihe, dị ka ịsọ mpi egwuregwu, onye ọbịa dị mkpa, ma ọ bụ ụbọchị ezumiike akacha nwee mmasị. Gịnị mere nkwado jiri dị mkpa? I nweziri ike gụkọta ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:17–17, 21 ma kpọkuo ụmụ gị ịchọpụta ihe Onyenwe anyị na-akpọku anyị ikwado maka ya. I nwere ike gosi ha foto sitere na ndepụta nke izu ụka nke a ma jụọ ụmụ gị ihe ha maara banyere Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst. Kedụ ihe ọzọ anyị na-amụta site na amaokwu nke 19-25, 46-52? Kedụ ihe anyị nwere ike ime iji kwadoo maka ihe omume nke a?

  • I nwere ike zotuo foto dị iche iche ma ọ bụ ụmụ ihe ndị na-ejije ihe ndị anyị nwere ike ime iji kwadoo maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst (dị ka ịgụ akwụkwọ nsọ, ikesa ozi ọma, ma ọ bụ ije ozi nye ezi na ụlọ anyị niile). Kwe ka ụmụ gị chọta foto niile ma ọ bụ ụmụ ihe ma kwuo banyere otu ime ihe ndị a ga-esi enyere anyị aka dị njikere izute Onye Nzọpụta mgbe Ọ ga-alọghachi.

  • I nwekwara ike gụkọta ọnụ otu egwu banyere Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, dị ka “Mgbe Ọ Ga-abịa Ọzọ” (Akwụkwọ abụ Ụmụntakịrị, 82–83). Kesaara ibe unu ịhụnaanya ị nwere maka Onye Nzọpụta na mmetụta gị banyere nlọghachi Ya.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:52–53

Jizọs Kraịst dị ịhụnaanya ma dị obi ebere.

  • Gị na ụmụ gị nwere ike lee anya na foto ndị nke na-egosi na Jizọs dị ịhụnaanya ma nwee obi ebere. (N’ịmaatụ, lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, ọnụ ọgụgụ 42, 47.) Kedụ ihe ọzọ Jizọs meworo iji gosi ịhụnaanya na obi ọma Ya? Gụkọtanu ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:52, ma nyere ụmụ gị aka chee maka ụzọ ndị ha nwere ike i si “kpọpụta obi ọma dị ịhụnaanya nke Onyenwe ha” n’ebe ndị ọzọ ọnụ ọgụgụ

    Christ Healing the Sick at Bethesda
Jizọs na otu nwata

Nkọwa sitere na N’Ihè Ya, site n’aka Greg Olsen

Kuzie ozizi doro anya ma dị mfe. Onyenwe anyị na-akuzi ozi ọma Ya na “ido anya na ịdị mfe” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 133:57). Gịnị ka mkpụrụ okwu ndị a na-atụpụtara gị banyere ikuzi ozi ọma nye ezi na ụlọ ma ọ bụ klas gị?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 134:1–2

Onyenwe anyị chọrọ ka m rube isi na iwu.

  • Ụmụ gị nwere ike depụta usoro iwu niile ma ọ bụ iwu niile ha na-erube isi na ha. Kedụ ihe ndụ ga-adị ka ya ọbụrụ ma enweghị onye rubere isi na iwu ndị a? Emesịa i nwere ike gụkọọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 134:1–2 ọnụ gị na ha, na-enyere ha aka ghọta mkpụrụ okwu nke ọbụla ma ọ bụ nkebiokwu ndị ha nwere ike aghọtaghị. Gịnị mere Onyenwe anyị jiri chọọ ka anyị rube isi nye iwu ahụ? (lee kwa Edide niile nke Okwukwe 1:12).

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.

Jizọs yiiri otu uwe mwụda uhie uhie

Kraịst yi Uwe mwụda Uhie, site n’aka Minerva Teichert.

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị