Nkeji 100
Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma na Sidney Rigdon, na Perrysburg, New York, 12 Oktoba 1833 (History of the Church, 1:416, 419–421). Ụmụnne ndị nwoke abụọ ahụ, ebe ha nọworo ọtụtụ ụbọchị ha hapụrụ ezi na ụlọ ha nile, nwere mmetụta maka ha.
1–4, Joseph na Sidney ga-ekwusa ozi-ọma ahụ maka nzọpụta nke mkpụrụ-obi nile; 5–8, A ga-enye ha n’awa ahụ ihe ha ga-ekwu; 9–12, Sidney ga-abụ onye-nkwupụta ma Joseph ga-abụ onye mkpughe ma dị-ike n’ọgbụgba-ama; 13–17, Onye-nwe ga-ekụlite ndị mmadụ dị-ọcha n’obi, ma ndị na-erubere ya isi ka a ga-azọpụta.
1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu, ndị enyi m Sidney na Joseph, ezi na ụlọ unu dị mma; ha nọ n’ime aka m abụọ, ma a ga m emere ha otu osi masị m; n’ihi n’ime m ka ike nile dị.
2 Ya mere, soro m, ma nụrụ ndụmọdụ nke m ga-enye unu.
3 Lee, ma hụrụ, e nwere m igwe mmadụ n’ebe a, na mpaghara nile gbara ebe a gburu-gburu; ma a ga-emeghe ọnụ-ụzọ a ga-eji arụsị-ọrụ ike na mpaghara nile gbara gburu-gburu n’ala ọwụwa anyanwụ nke a.
4 Ya mere, mụ, Onye-nwe, e mewo ka ị bia n’ebe a; n’ihi na otu a ka m chere dị mkpa n’ime m maka nzọpụta nke mkpụrụ-obi nile.
5 Ya mere, n’ezie a sị m unu, welite nụ olu unu nile elu nye ndị mmadụ ebe a; kwụpụta nụ echiche nile nke m ga-etinye n’ime obi unu nile, ma unu a gaghị enwe mgbagwọ-ju-anya n’iru ndị mmadụ;
6 N’ihi na a ga-enye ya unu n’awa ahụ, e, n’oge ahụ, ihe unu ga-ekwu.
7 Mana otu iwu-nsọ ka m na-enye unu, na unu ga-ekwupụta ihe ọbụla unu na-ekwupụta n’aha m, n’obi nke ihe dị-mkpa, na mụọ nke ịdị nwayọ, n’ihe nile.
8 Ma e kwe m unu nkwa nke a, na ọ bụrụraa na unu na-eme nke a Mụọ Nsọ ahụ ga-apụta ìhè n’ịgba-aka-ebe nye ihe nile ọbụla nke unu ga-ekwu.
9 Ma ọ dị m mkpa na gị, nwa odibo m Sidney, bụrụ onye nkwupụta okwu nye ndia; e, n’ezie, a ga m echi gị echiche baa n’okpụkpọ-oku nke a, ọbụna ị bụrụ Onye-nkwupụta okwu nye nwa ọdịbọ m Joseph.
10 Ma a ga m enye ya ike ịdị-ukwuu n’ọgbụgba-ama.
11 Ma a ga m enye gị ike ịdị-ukwuu n’ịkọwadaruo-ala akwụkwọ-nsọ nile, ka ị wee bụrụ onye nkwupụta nye ya, ma ọ ga-abụ onye-mkpughe nye gị ka ị wee mata ezi-okwu nke ihe nile gbasara ihe nile nke ala-eze m n’ụwa.
12 Ya mere, gaa-n’iru na njem unu ma ka obi unu nile n̄ụrịa; n’ihi na lee, ma hụrụ, a nọnyere m unu ọbụna ruo n’ọgwụgwụ.
13 Ma ugbua a na m enye unu otu okwu gbasara Zaịọn. Zaịọn ga-enwe mgbapụta, n’agbanyeghì na a ga-ata ya ahụhụ nwoge nta.
14 Ụmụnna unu nwoke, ndị odibo m Orson Hyde na John Gould, nọ n’aka m abụọ; ma ọbụrụraa na ha na-edebe iwu-nsọ m nile ha ga-abụ ndị a zọpụtara.
15 Ya mere, ka a kasie unu obi; n’ihi na ihe nile ga arụkọ-ọrụ ọnụ maka ọdị mma nke ha ndị na-eje-ije n’ụzọ ziri-ezi, ma ruo na nsacha nke nzukọ-nsọ.
16 N’ihi na a ga m ekụlite nye onwe m ndị mmadụ ndị dị ọcha n’obi, ndị ga-efe m n’ezi-omume;
17 Ma ha nile ndị na-akpọku aha nke Onye-nwe, ma na-edebe iwu-nsọ ya nile, ga-enwe nzọpụta. Ọbụna otu a. Amen.