Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Luk 21


NAJS, Luk 21:24–26 (tụlee ihe dị iche na Luk 21:24–26)

(Jisus kọwara ihe iriba-ama nile nke ọbịbịa ya.)

24 Ugbua ihe ndịa ka ọ gwara ha, gbasara mbibi nke Jerusalem. Na mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, na-asị, Nna ukwu, gwa anyị gbasara ọbịbịa gị?

25 Ma ọ zara ha, sị kwa, N’ime ọgbọ ahụ nke a ga-emezu oge nile nke ndị Jentaịlụ, ihe iriba-ama nile ga-adị n’ime anyanwụ, na n’ime ọnwa, na n’ime kpakpando nile; na n’elu ụwa nnukwu nsogbu nke mba nile jiri mgbagwọju anya, dịka oke osimiri na oke ụzụ nke nfegharị mmiri. Ụwa ka a ga-esogbu kwa, na mmiri nile nke nnukwu ebe miri-emi.

26 Obi nile nke ndị mmadụ ga-ada mba n’ihi egwu, na n’ihi ile anya maka ihe nile ahụ nke na-abịa n’elu ụwa. N’ihi na ike nile nke elu-igwe ga eme mkpọtụ.

NAJS, Luk 21:32 (tụlee ihe dị iche na Luk 21:32)

(A ga-emezu ihe nile mgbe e mezuru oge nile nke ndị Jentaịlụ.)

32 N’ezie asị m unu, ọgbọ nke a, ọgbọ ahụ mgbe a ga-emezu oge nile nke ndị Jentailụ, a gaghị agafe ruo mgbe a ga-emezu ihe nile.

Bipụta