Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Luk 12


NAJS, Luk 12:9–12 (tụlee ihe dị iche na Luk 12:9–10)

(Ikwuhie Chineke megide Mụọ Nsọ ka na-agaghị agbaghara.)

9 Kama onye ahụ nke na-agọnarị m n’iru ndị mmadụ, ka a ga-agọnarị n’iru ndị mụọ-ozi nke Chineke.

10 Ugbụ a ndị na-eso ụzọ ya matara na o kwuru nke a, n’ihi na ha ekwuwo ihe ọjọọ megide ya n’iru ndị mmadụ ahụ; n’ihi na ha tụrụ egwu ikwupụta ya n’iru ndị mmadụ.

11 Ma ha tụgharịrị uche n’etiti onwe ha, na-asị, Ọ matara obi anyị nile, ọ na-ekwu kwa okwu ruo na amamikpe anyị, a gaghị agbaghara kwa anyị. Kama ọ zara ha, sịkwa ha,

12 Onye ọbụla ga-ekwu okwu megide Ọkpara nke Mmadụ, ma chegharịa, a ga-agbaghara ya, kama nye onye ahụ nke na-ekwuhie Chineke megide Mụọ Nsọ, a gaghị agbaghara ya.

NAJS, Luk 12:41–57 (tụlee ihe dị iche na Luk 12:38–48)

(Anyị garịrị adị na njikere oge nile maka ọbịbịa nke Onye-nwe.)

41 N’ihi, lee, ọ na-abịa na nche nke mbụ nke abalị, ọ ga-abịa kwa na nche nke abụọ, ọzọ kwa ọ ga-abịa na nche nke atọ.

42 N’ezie asị m unu, ọ bịaworị, dịka e dere banyere ya; ọzọ kwa mgbe ọ ga-abịa na nche nke abụọ, ma-ọbụ na nche nke atọ, ngọzi na-adịrị ndị odibo ahụ mgbe ọ ga-abịa, ọ ga-ahụ ka ha na-eme otu a;

43 N’ihi na Onye-nwe nke ndị odibo ahụ ga-eke onwe ya ihe okike, mee kwa ha ka ha nọdụ ọdụ na nri, ọ ga-abịa kwa jee kwara ha ozi.

44 Na ugbụ a, n’ezie a na m agwa unu ihe ndị a, ka unu nwee ike mara nke a, na ọbịbịa nke Onye-nwe dịka onye-ori n’ime abalị.

45 Na ọ dị ka otu nwoke nke bu nna nwe ụlọ, onye, ọbụrụ na o cheghị arịa ya nile nche, onye-ori abịa n’oge awa ahụ ọ na-amaghị, buru kwa arịa ya nile, kesasị kwaa ha n’etiti ndị otu ya nile.

46 Ha wee sị kwa n’etiti onwe ha, ọbụrụ na nna nwe ụlọ matararị oge awa onye-ori ga-abịa, ọ gaara eche nche, ọ gaaraghị ekwe ka e tiwaa baa n’ụlọ ya na arịa ya nile efuo.

47 Na o wee sị ha, N’ezie asị m unu, ya mere unu nọrọ kwa na njikere; n’ihi n’oge awa mgbe unu na-echeghị ka Ọkpara nke Mmadụ na-abịa.

48 Mgbe ahụ Pịta wee sị ya, Onye-nwe, ọbụ anyị ka ị na-agwa akụkọ ilu nke a, ma-ọbụ nye mmadụ nile?

49 Onye-nwe wee sị kwa, Ana m agwa ndị ahụ bụ ndị Onye-nwe ga-eme ndị-ọchịchị nke ezi na ụlọ ya, inye ụmụ ya òkè nri ha n’oge ya.

50 Ha wee sị kwa, Mgbe ahụ onye bụ onye odibo ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi na nke nwere amamihe?

51 Ma Onye-nwe wee sị ha, Ọ bụ onye odibo ahụ onye na-eche nche, inye òkè nri ya n’oge ya.

52 Ngọzi na-adịrị onye odibo ahụ mgbe Onye-nwe ya ga-abịa, ọ ga-ahụ ya, ka ọ na-eme otu a.

53 N’ezi-okwu a sị m unu, na ọ ga-eme ya onye-ọchịchị nke ihe nile o nwere.

54 Kama ajọọ onye odibo bụ onye ahụ nke na-agaghị achọta ya ka ọ na-eche nche. Na ọbụrụ na-achọtaghị onye odibo ahụ ka ọ na-eche nche, ọ ga-asị n’obi ya, Onye-nwe m na-anọ ọdụ dị anya ịbịa, ọ ga-amalite kwa iti ndị ndịkom na-eje ozi, na ndịnyom na-eje ozi ihe, na iri ihe oriri, na ịn̄ụ ihe ọn̄ụn̄ụ, na in̄ụbiga mmanya oke.

55 Onye-nwe nke onye odibo ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-eleghị anya ya, na n’oge awa mgbe ọ na-amaghị, ọ ga-egbutu kwa ya, họpụtakwara ya oke ya n’etiti ndị na-ekweghị ekwe.

56 Na onye odibo ahụ nke maara ihe Onye-nwe ya chọrọ, ọ kwadobeghị kwa maka ọbịbịa nke Onye-nwe ya, o meghị kwa dịka ọchịchọ ya dị, a ga-eti ya ọtụtụ ụtarị.

57 Kama onye ahụ nke na-amataghị ihe Onye-nwe ya chọrọ, na mee kwa ihe nile kwesịrị ụtarị, a ga-eti ya ụtarị ole na ole. N’ihi na onye ọbụla e nyere ihe ukwu, n’aka ya ka a ga-achọ ihe ukwu; Onye ahụ nke Onye-nwe nyekwara ihe ukwu idobe, n’aka ya ka ndị mmadụ ga-ajụ nke ka.

Bipụta