NAJS, 2 Ndị Tesalonaịka 2:2–3, 7–9 (tụlee ihe dị iche na 2 Ndị Tesalonaịka 2:2–9)
(Pọl buru amụma ngọnarị okwukwe tutu nlọghachi nke Onye-nwe.)
2 Ka a ghara ime ka unu maa jijiji n’ime uche, ma-ọbụ e site na leta sogbue unu, ewezuga ma unu natara ya site n’aka anyị; ọbụghị site na mụọ, ma-ọbụgh: site n’okwu, gbasara otu ụbọchị ahụ nke Kraịst siri dị nso.
3 Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu site n’ụzọ ọbụla; n’ihi na ndapụ ahụ ga-ebu ụzọ bịa, na ka e kpughee onye ahụ na-emebi iwu, nwa ndịkom nke ịla-n’iyi;
7 N’ihi na ihe omimi nke oke-ajọọ-omume a rụwori ọrụ, ọbụ kwa ya na-arụsi ọrụ ike ugbua, Kraịst kweere ya ka o rụọ ọrụ, ruo na e mezuru oge ahụ ngbe a ga-ewepụ ya site n’ụzọ.
8 Na mgbe ahụ ka a ga-ekpughe otu ajọọ onye ahụ, onye nke Onye-nwe ga-erechapụ jiri mụọ nke ọnụ ya, ga-ebibi kwa jiri mmuke ìhè nke ọbịbịa ya.
9 E, Onye-nwe, ọbụna Jisus, onye ọbịbịa ya na-agaghị adị ruo mgbe ndapụ ahụ gasịrị, site na-ịrụ ọrụ nke Setan jiri ike nile, na ihe iriba-ama nile, na oke ihe iju-anya nile nke ụgha.