Ntụgharị-asụsụ Joseph Smith Ime ka a mataNdịa na-eso bụ mpaghara nile a họọrọ ahọ nke Ntụgharị-asụsụ Joseph Smith mere site na Ntụgharị-asụsụ Eze James nke Bible (NAJS). Onye-nwe kwalitere mụọ Onye-amụma Joseph Smith iweghachi ezi-okwu nile nye ihe nile e dere na Bible na-aghọwo ihe furu efu ma-ọbụ a gbanwere ke mgbe e dere okwu izizi nile na ha. Ezi-okwu nile ndị a e weghachiri mere ka ozizi doo anya mezitụkwa nghọta nke akwụkwọ-nsọ. Ihe ọgụgụ nile a họọrọ maka Nduzi ahụ ga-enye aka imezitụ nghọta gị banyere akwụkwọ-nsọ nile na-eleghị anya na asụsụ nke a na-atụgharị ha. NAJS, Jenesis NAJS, Jenesis 9(A ga-ejide mmadụ inye nkọwasi n’ihi igbu mmadụ na kwa n’ihi ịla ndụ anụmanụ n’iyi.) NAJS, Jenesis 14(Nnukwu nkwusa ozi-ọma nke Melkizedek ka a kpọtụrụ ọnụ; ike nile na ngọzi nile nke Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek ka a kọwara nke ọma.) NAJS, Jenesis 15(Abraham hụrụ n’ime ọ́hụ̀ Ọkpara nke Chineke mata kwa maka mbilite n’ọnwụ.) NAJS, Jenesis 17(Chineke hiwere ọgbụgba-ndụ nke ibi-úgwù ya na Abraham. Emume-nsọ nke baptism na ịgbaru-afọ nke ụmụ-ntakịrị ji abụ ndị nwere nkọwasị ka e kpughere nye Abraham.) NAJS, Jenesis 19(Lọt guzogidere ajọọ omume nke Sodọm.) NAJS, Jenesis 48(Mkpụrụ Josef ga-abụ ndị ndu n’ime mkpokọta nke Israel n’ụbọchị ndị ikpeazụ.) NAJS, Jenesis 50(Moses, Eron, na Joseph Smith ka a kpọrọ aha ha nile na ibu-amụma nke a nke Josef n’Ijipt. Ọzọ kwa Josef buru amụma na Akwụkwọ nke Mọmọn ga-abụ onye nsiso nye akụkọ ndekọta nke Juda.) NAJS, Ọpụpụ NAJS, Ọpụpụ 4(Ọbụghị Onye-nwe kpatara imesi-obi-ike nke Fero. Hụ kwa NAJS, Ọpụpụ 7:3, 13; 9:12; 10:1, 20, 27; 11:10; 14:4, 8, 17; ntụnye nke ọbụla, mgbe a tụgharịrị-asụsụ ya nke ọma, na-egosi na Fero mesịrị obi ya ike na onwe ya.) NAJS, Ọpụpụ 18(Jetro bụ onye isi nchụ-aja.) NAJS, Ọpụpụ 22(Ndị ọgbụ-mmadụ agaghị adị ndụ.) NAJS, Ọpụpụ 33(Ọ dịghị mmadụ ọbụla juputara na mmehie pụrụ ịhụ iru Chineke ma dị ndụ.) NAJS, Ọpụpụ 34(Ndozi mbadamba nkume nke abụọ e nyere Moses nwere iwu dịtụ obere karịa ndozi nke mbụ.) NAJS, Deuteronọmi NAJS, Deuteronọmi 10(N’elu ndozi mbadamba nke mbụ Chineke kpughere ọgbụgba-ndụ nke mgbe nile na-adịgide nke okwa onye nchụ-aja dị-nsọ.) NAJS, 1 Samuel NAJS, 1 Samuel 16(Mụọ ọjọọ ahụ nke bịa kwasịrị Sọl esiteghị n’Onye-nwe.) NAJS, 2 Samuel NAJS, 2 Samuel 12(Chineke ewepụghị ajọọ mmehie Devid.) NAJS, 2 Ihe-emere n’Ubọchị Ndi-eze NAJS, 2 Ihe-emere n’Ubọchị Ndi-eze 18(Onye-nwe adịghị etinye mụọ nke okwu-ụgha n’ime ọnụ ndị amụma.) NAJS, Abụ Ọma NAJS, Abụ Ọma 14(Onye bụrụ-abụọma wee nurịa ọn̄ụ maka ụbọchị nke mweghachi.) NAJS, Abụ Ọma 24(Abụọma a na-eme mmemme ọbịbịa Kraịst nke ugboro abụọ) NAJS, Abụ Ọma 109(Anyị ga-ekpe ekpere maka ndị-iro anyị.) NAJS, Aịsaịa NAJS, Aịsaịa 42(Onye-nwe ga-eziga nwa odibo ya nye ndị ahụ kpuru ìsì.) NAJS, Jeremaia NAJS, Jeremaia 26(Onye-nwe adịghị echegharị; ndị mmadụ na-echegharị.) NAJS, Emọs NAJS, Emọs 7(Onye-nwe adịghị echegharị; ndị mmadụ na-echegharị.) NAJS, Matiu NAJS, Matiu 3(Oge okorọbịa na nwanta Jisus ka a kọwara nke ọma.) NAJS, Matiu 4(Mụọ ahụ duuru Jisus, ọbughị Setan duuru ya.) NAJS, Matiu 6(Onye-nwe anaghị eduba anyị n’ime ọnwụnwa.) NAJS, Matiu 7(E kpela-ikpe na-ezighị ezi.) NAJS, Matiu 9(Jisus jụrụ baptism nke ndị Farisi; ọ bụ ya nyere iwu nke Moses.) NAJS, Matiu 16(Mpụtara nkeji okwu ahụ “ibulite obe nke Jisus” bụ ịgọnarị ndụ na-eyighị Chineke.) NAJS, Matiu 17(Elaịas abụọ ga-abịa—otu maka ikwadobe ụzọ na otu maka iweghachi.) NAJS, Matiu 18(Ụmụ-ntakịrị enweghị mkpa nke nchegharị.) NAJS, Matiu 19(A ga-azọpụta ụmụntakịrị.) NAJS, Matiu 21(Mmadụ garịrị echegharị tutu ya enwee ike ikwere na Kraịst.) NAJS, Matiu 23(Onye ahụ nke no n’elu-igwe bụ onye okike anyị.) NAJS, Matiu 26(Jisus hiwere oriri-nsọ.) NAJS, Matiu 27(Ọnwụ Judas ka a kọwara nke ọma.) NAJS, Mak NAJS, Mak 9(Jọn O Me Baptism no n’elu Ugwu nke Mnwogharị.) NAJS, Mak 12(Chineke abụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, n’ihi na ọ na-ekulite ndị nwụrụ anwụ site n’ili ha nile.) NAJS, Mak 14(Jisus hiwere oriri-nsọ.) NAJS, Mak 16(Ndị mụọ-ozi abụọ kelere ụmụ-ndịnyom ahụ ekele n’ili nke Onye-nzọpụta.) NAJS, Luk NAJS, Luk 1(Zakaraịas, nna Jọn O Me Baptism, na-arụ ọrụ nile nke ọkwa nchụ-aja.) NAJS, Luk 2(Dibịa nile n’ime temple ahụ na-an̄a Jisus ntị na-ajụkwa ya ajụjụ nile.) NAJS, Luk 3(Kraịst ga-abịa imezu amụma, wepụ mmehie nile, weta nzọpụta, na ịbụrụ ìhè, ọ ga-abịa kwa n’ụbọchị nke ike na ozuzu oge a kara aka.) NAJS, Luk 11(Uju nke akwụkwọ-nsọ nile bụ ọtụghe-ụzọ nke ọmụma ihe.) NAJS, Luk 12(Ikwuhie Chineke megide Mụọ Nsọ ka na-agaghị agbaghara.) NAJS, Luk 16(Jisus nyere ọnọdụ-okwu maka akụkọ-ilu nke onye ogaranya na Lazarọs.) NAJS, Luk 17(Ala-eze nke Chineke abịaworị.) NAJS, Luk 18(Ịtụkwasị obi n’ụba akụ na e gbochi mmadụ site n’íbata na ala-eze Chineke.) NAJS, Luk 21(Jisus kọwara ihe iriba-ama nile nke ọbịbịa ya.) NAJS, Luk 23(Jisus rịọrọ mgbaghara maka ndị agha nke ndị Rom ndị kpọgidere ya n’obe.) NAJS, Jọn NAJS, Jọn 1(Ozi-ọma nke Jisus Kraịst ka e kwusara site na mmalite. Otu Elaịas (Jọn O Me Baptism) ga-edozi ụzọ maka Kraịst, na Elaịas ọzọ (Kraịst) ga-eweghachi ihe nile.) NAJS, Jọn 4(Jisus mere ndị mmadụ baptism.) NAJS, Jọn 13(Jisus sachara ụkwụ nke Ndị-ozi.) NAJS, Jọn 14(Ọkpara-eze nke ọchịchịrị, ma-ọbụ Setan, bụ nke n’uwa nke a.) NAJS, Ọlụ Ndị-ozi NAJS, Ọlụ Ndị-ozi 9(Ndị ha na Pọl nọ na mgbanwe ya hụrụ ìhè ahụ, kama ha anụghị olu-okwu ahụ ma-ọbụ hụ Onye-nwe.) NAJS, Ndị Rom NAJS, Ndị Rom 4(Ma okwukwe na ọrụ nile, site n’amara, dị mkpa maka nzọpụta.) NAJS, Ndị Rom 7(Kraịst nwere ike ịgbanwe mkpụrụ-obi ndị mmadụ.) NAJS, Ndị Rom 8(Ndị nile na-agbaso ụzọ nile nke anụ arụ apụghị ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.) NAJS, 1 Ndị Kọrịnt NAJS, 1 Ndị Kọrịnt 7(Pọl zara ajụjụ nile banyere alụlụ dị na nwunye n’etiti ndị a kpọrọ na izisa ozi-ọma.) NAJS, 1 Ndị Kọrịnt 15(Enwere ogo nke ebube atọ na mbilite n’ọnwụ.) NAJS, 2 Ndị Kọrịnt NAJS, 2 Ndị Kọrịnt 5(Pọl nyere Ndị-nsọ ndụmọdụ ka ha ghara ibi ndụ dịka n’ụdị nke anụ arụ.) NAJS, Ndị Galesia NAJS, Ndị Galesia 3(Kraịst bụ onye-ogbugbo nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ. Iwu Moses [ọgbụgba-ndụ ochie] na ozi-ọma nke mgbe nile na-adigide [ọgbụgba-ndụ ọhụrụ] ka a tụlere ihe dị iche na ha.) NAJS, Ndị Efesọs NAJS, Ndị Efesọs 4(Iwe na-ezighị ezi bụ mmehie.) NAJS, 1 Ndị Tesalonaịka NAJS, 1 Ndị Tesalonaịka 4(Ndị ezi-omume ahụ dị ndụ n’ọbịbịa nke Onye-nwe a gaghị enwe uru dị mma karịa ndị ezi-omume nwụrụ anwụ.) NAJS, 2 Ndị Tesalonaịka NAJS, 2 Ndị Tesalonaịka 2(Pọl buru amụma ngọnarị okwukwe tutu nlọghachi nke Onye-nwe.) NAJS, 1 Timoti NAJS, 1 Timoti 2(Kraịst bụ Ọkpara ahụ a Mụrụ Nanị Ya na Onye-ogbugbo.) NAJS, 1 Timoti 6(Ndị ahụ nke nwere ìhè nke anwụgh-anwụ na-ebi n’ime ha pụrụ ịhụ Jisus anya.) NAJS, Ndị Hibru NAJS, Ndị Hibru 1(Ndị mụọ-ozi bụ ndị mụọ nkwusa ozi-ọma.) NAJS, Ndị Hibru 4(Ọrụ nile nke Chineke ka a kwadobere site na ntọ-ala nke ụwa.) NAJS, Ndị Hibru 5(Otu ndedata dị na akwụkwọ e ji depụta ihe na NAJS na-ekwu na ama-okwu nke 7 na 8 na-atụnyere Melkizedek ọbụghị kwa Kraịst. Ma-ọbụghị nke a, ihe nile dị n’ime NAEJ na NAJS bu otu ihe.) NAJS, Ndị Hibru 6(Ụkpụrụ nile nke Kraịst na eduga na ntozu-oke.) NAJS, Ndị Hibru 7(Ọkwa nchụ-aja dị nsọ dị n’usoro nke Ọkpara Chineke dị na-enweghị nna ma-ọbụ nne o nweghị kwa ọbụghị mmalite ma-ọbụghị ọgwụgwụ nke ụbọchị nile.) NAJS, Ndị Hibru 11(Okwukwe bụ nnwapụta nke ihe a na-ele anya ya.) NAJS, Jemes NAJS, Jemes 1(Mkpagbu, ọbụghị ọnwụnwa, na-enye aka ido anyị nsọ.) NAJS, Jemes 2(Ndị òtù ekwesighị ile otu onye anya na-ọdị elu karịa onye ọzọ.) NAJS, 1 Pita NAJS, 1 Pita 3(Ụfọdụ n’ime ndị mụọ nọ n’ụlọ mkpọrọ bụworị ndị ajọọ-omume n’ubochị nile nke Noa.) NAJS, 1 Pita 4(Ozi-ọma ahụ ka e kwusaara ndị ahụ nwụrụ anwụ.) NAJS, 1 Jọn NAJS, 1 Jọn 2(Kraịst ga-abụ onye nkwuchita ọnụ anyị n’ebe Nna nọ ma ọbụrụ na anyị echegharịa.) NAJS, 1 Jọn 3(Onye ọbụla a mụrụ site na Chineke a dịghị aga-n’iru n’ime mmehie.) NAJS, 1 Jọn 4(Nanị ndị mmadụ ahụ kwere na Chineke pụrụ ịhụ ya anya.) NAJS, Mkpughe NAJS, Mkpughe 1(Jọn natara mkpughe site n’aka Jisus Kraịst nyefee kwa ya ndị ndu nke nzukọ asaa dị n’Esia.) NAJS, Mkpughe 2(Ndị ajọọ mmadụ ka a ga-atụba n’ime ala mụọ.) NAJS, Mkpughe 5(Ndị odibo iri na abụọ nke Chineke ka e zigara n’ụwa dum.) NAJS, Mkpughe 12(Nwanyị ahụ [Nzukọ-nsọ], nwa ahụ [ala-eze Chineke], okporo ígwè ahụ [okwu nke Chineke], nkịta-ọhịa ahụ [Setan], na Maikael ka a kọwara. Agha ahụ di n’elu-igwe ka a gara n’iru na-alụ n’elu ụwa.) NAJS, Mkpughe 19(Chineke na-eji okwu nke Kraịst na-emekpa mba nile arụ.)