Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Luk 3


NAJS, Luk 3:4–11 (tụlee ihe dị iche na Luk 3:4–6)

(Kraịst ga-abịa imezu amụma, wepụ mmehie nile, weta nzọpụta, na ịbụrụ ìhè, ọ ga-abịa kwa n’ụbọchị nke ike na ozuzu oge a kara aka.)

4 Dịka e deworo ya n’akwụkwọ onye-amụma Esaias; ndịa bụ kwa okwu ahụ nile, na-asị, Olu-okwu nke otu onye na-eti mkpu n’ime ọzara, Dozie nụ ụzọ nke Onye-nwe, mee kwa nụ ka okporo ụzọ ya dị wara wara.

5 N’ihi na lee, ma hụrụ, ọ ga-abịa, dịka e deworo ya n’akwụkwọ nke ndị amụma, iwepụ mmehie nile nke ụwa, na-iweta nzọpụta nye mba nile na-ekweghị ekwe, ikpokọta n’otu ndị ahụ nile furu efu, ndị sitere na ogige atụrụ nke Israel;

6 E, ọbụna ndị a chusasịrị na ndị akpagburu; na kwa idozi ụzọ ahụ na ime ka ikwusa ozi-ọma nye ndị Jentailụ kwe omume.

7 Na ịbụ ìhè nye ndị nile na-anọdụ n’ọchịchịrị, ruo ebe nile uwa sọtụrụ; iweta na mmezu mbilite n’ọnwụ site na ndị nwụrụ anwụ, na i rigoro n’elu, ibiri n’aka nri nke Nna ahụ,

8 Ruo n’ozuzu oge a kara aka, ma iwu na igba-ama ahụ ka a ga-arachi, na ọtụghe-uzọ nile nke ala-eze ka a ga-enyelite kwa Nna ahụ ọzọ;

9 Ilekọta ikpe ziri ezi nye mmadụ dum; ịrịdata n’ikpe n’elu mmadụ dum, na ime ka ndị dị ndụ na-eyighị chi kwere site n’omume ndụ na-eyighị chi ha nile, nke ha meworo; ihe a nile gaje ime n’ụbọchị ahụ mgbe ọ ga-abịa;

10 N’ihi na ọbụ ụbọchị nke ike; e, a ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla, ugwụ ukwu ọbụla na ugwụ nta ka a ga-eme ka ha dị ala; ebe dị mgbagọ ka a ga-eme ka ha dị wara wara, na ụzọ nile na-adịghị larịị ka a ga-eme ka ha dị larịị;

11 Na anụ arụ nile ga-ahụ nzọpụta nke Chineke.

Bipụta