Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, 1 Ndị Kọrịnt 7


NAJS, 1 Ndị Kọrịnt 7:1–2, 5, 26, 29–33 (tụlee ihe dị iche na 1 Ndị Kọrịnt 7:1–2, 5, 26, 29–33)

(Pọl zara ajụjụ nile banyere alụlụ dị na nwunye n’etiti ndị a kpọrọ na izisa ozi-ọma.)

1 Ugbua banyere ihe nile nke unu detara akwụkwọ nye m, na-asị ọ dị mma ka nwoke ghara imetụ nwanyị aka.

2 Na-agbanyeghị, a na m asị, iji zee ịkwa-iko dị n’etiti ndị na-alughị alụlụ, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, ka nwanyị ọbụla nwee kwa dị nke aka ya.

5 Unu a hapụla otu onye site n’ebe ibe ya no, ewezuga ma-ọbụ na nkwekọrịta maka otu oge; ka unu nwee ike nye onwe unu n’ibu-ọnụ na ekpere, bịakata kwa ọnụ ọzọ, ka Setan ghara ịnwa unu ọnwụnwa n’ihi unu apụghị ijide onwe unu aka.

26 Ya mere a na m eche na nke a dị mma n’ihi mkpa dị ugbua, maka mmadụ inọgide otu ọdị ka o nwee ike ime ezi ihe karịa.

29 Kama ana m agwa unu okwu ndị a kpọworo oku nye ije-ozị ahụ. N’ihi nke a ka m na-ekwu, ụmụnna, oge ahụ nke fodụrụ dị mkpụ mkpụ, na a ga-ezipụ unu n’ije-ozị ahụ. Ọbụna ndị nke nwere ndị nwunye, ga-adị dịka a ga-asị na ha enweghị ma ọli; n’ihi na-akpọwo unu, họrọ kwa unu ịrụ ọrụ nke Onye-nwe.

30 Na ọ ga-adịrị ndị na-akwa akwa, ka a ga-asị na ha akwaghị; na ndị na-anụrị ọn̄ụ, ka a ga-asị na ha an̄ụrịghị, na ndị na-azụ ahịa, ka a ga-asị na ha enweghị ihe;

31 Na ndi na-eji ụwa mee ihe, ka a ga-asị na ha ejighi ya mee ihe; n’ihi na ọdịdị nke ụwa nke a na-agabiga agabiga.

32 Kama ana m achọ, ụmụnna, ka unu na-ebulite ọkpụpkọ oku unu elu. Achọrọ m ka unu bụrụ ndị na-adịghị echegbu onwe unu. N’ihi na onye na-alụghị nwunye na-echegbu onwe ya maka ihe nile bụ nke Onye-nwe, otu ọ ga-eme ihe ga-atọ Onye-nwe ụtọ; Ya mere ọ na-emeri.

33 Kama onye ahụ nke lụrụ nwunye, na-echegbu onwe ya maka ihe nile nke bụ nke ụwa, otu ọ ga-eme ihe na-atọ nwunye ya ụtọ; ya mere e nwere ihe dị iche, n’ihi na a na-egbochi ya na ije ozi.

Bipụta