Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Ndị Galesia 3


NAJS, Ndị Galesia 3:19–20 (tụlee ihe dị iche na Ndị Galesia 3:19–20)

(Kraịst bụ onye-ogbugbo nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ. Iwu Moses [ọgbụgba-ndụ ochie] na ozi-ọma nke mgbe nile na-adigide [ọgbụgba-ndụ ọhụrụ] ka a tụlere ihe dị iche na ha.)

19 Ya mere mgbe ahụ, a tụkwasịrị iwu ahụ n’ihi njehie nile, ruo mgbe mkpụrụ ahụ ga-abịa bụ onye e kwere nkwa n’iwu ahụ e nyere Moses, onye e chiri echichi site n’aka nke ndị mụọ-ozi ịbụ onye ogbugbo nke ọgbụgba-ndụ nke mbụ a, (iwu ahụ.)

20 Ugbua onye-ogbugbo a abụghị onye-ogbugbo nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ, kama otu onye-ogbugbo nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ dị, nke bụ Kraịst, dịka e dere ya n’iwu ahụ gbasara nkwa nile ahụ e kwere Abraham na mkpụrụ ya. Ugbua Kraịst bu onye ogbugbo nke ndụ; n’ihi na nke a bụ nkwa ahụ nke Chineke kwere Abraham.

Bipụta