Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Aịsaịa 42


NAJS, Aịsaịa 42:19–23 (tụlee ihe dị iche na Aịsaịa 42:19–22)

(Onye-nwe ga-eziga nwa odibo ya nye ndị ahụ kpuru ìsì.)

19 N’ihi na aga m ezitara gị nke bụ onye kpuru-isi nwa odibo m; e, onye-ozi ga-emeghe anya nile nke ndị kpuru isi, ime kwa ka ntị nile nke ndị ntị chiri ghere oghe;

20 A ga-eme kwa ka ha zuo-oke na-agbanyeghị ikpu-ìsì ha, ma ọbụrụ na ha ga-an̄a onye ozi ahụ bụ nwa odibo nke Onye-nwe ntị.

21 Unu bụ ndị mmadụ, na-ahụ ọtụtụ ihe, kama unu adịghị achọpụta, unu na-emeghe ntị unu nile ịnụrụ, kama unu adịghị anụ ihe.

22 Ndị mmadụ dị otua adịghị atọ Onye-nwe ụtọ, kama n’ihi ezi-omume ya ọ ga-eme ka iwu ahụ dị ukwuu mee kwa ka o nwee nsọpụrụ.

23 Unu bụ ndị a pụnarịworo ihe ha na ndị a lụtaworo ihe ha n’agha; ndị iro unu ha nile e siworo unu ọnya n’ime olulu nile, ha ezobewo kwa unu n’ụlọ mkpọrọ nile; ha ewerewo unu ka anụ ibe ya ji mere nri, ọ dịghị kwa onye nnapụta; dịka ihe alụtaworo n’agha, ọ dịghị kwa onye na-asị, Weghachi.

Bipụta