Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Mak 16


NAJS, Mak 16:3–6 (Tulee Mak 16:4-7; mgbanwe nile yiri onwe ha k’emere n’ime Matiu 28:2–8; tụlee ihe dị iche na Luk 24:2–4)

(Ndị mụọ-ozi abụọ kelere ụmụ-ndịnyom ahụ ekele n’ili nke Onye-nzọpụta.)

3 Kama mgbe ha lere anya, ha wee hụ na a kpọrepụrụ nkume ahụ, (n’ihi na o buru ibu nke ukwuu,) na ndị mụọ-ozi abụọ na-anọdụ n’elu ya, ndi yikwasịrị ogologo uwe mwụda ọcha nile; ma ụjọ tụrụ ha.

4 Kama ndị mụọ-ozi ahụ sịrị ha, unu atụla ụjọ; unu na-achọ Jisus onye Nazaret, onye akpọgideworo n’obe, o biliwo; ọ nọghị n’ebe a; lee ebe ha nyibere ya;

5 Lawa kwa nụ, gwa ndị na-eso ụzọ ya na Pịta, na o buruwo unu ụzọ gaa Galili; n’ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dịka ọ gwara unu.

6 Na ha, na-ibanye n’ime ili, hụrụ ebe ahụ ha nyibere Jisus.

Bipụta