Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Mak 9


NAJS, Mak 9:3 (tụlee ihe dị iche na Mak 9:4)

(Jọn O Me Baptism no n’elu Ugwu nke Mnwogharị.)

3 Na ebe ahụ Elaịas tinyere Moses wee pụtakwute ha, ma-ọbụ n’okwu ọzọ, Jọn O Me Baptism na Moses; Ha na Jisus na-ekwurịta kwa okwu.

NAJS, Mak 9:40–48 (tụlee ihe dị iche na Mak 9:43–48)

(Ibepu aka ma-ọbụ ụkwụ na-emehie ka a tụlere ihe dị iche ya na ibelata òtù nile nke nwere ike iduhie mmadụ ụzọ.)

40 Ya mere, ọbụrụ na aka gị esogbuo gị, bepụ ya; ma-ọbụ ọbụrụ na nwanne gị nwoke esogbuo gị o kwupụtaghị kwa ọ hapụghị kwa ime ya, ya ka a ga-ebepụ. Ọ dị mma inwe nkwarụ baa na ndụ, karịa inwe aka abụọ, baa n’ime ala mụọ.

41 N’ihi na ọ dị mma maka gị iba na ndụ na-enweghị nwanne gị nwoke, karịa gị na nwanne gị nwoke na a ga-atụba unu n’ala mụọ, n’ime ọkụ ahụ na-adịghị anyụ anyụ, ebe ikpuru ha na-adịghi anwụ, ọkụ ahụ kwa adịghị anyụ anyụ.

42 Ọzọ kwa, ọbụrụ na ụkwụ gị esogbuo gị, bepụ ya, n’ihi na ya nke bụ ihe nlere anya gị, nke ị na-eji eje ije, ọbụrụ na ọ ghọọ onye njehie, a ga-ebepụ ya.

43 Ọ dị mma maka gị ịba na ndụ na-enweghị ụkwụ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụba gị n’ala mụọ; nime ọkụ ahụ na-adịghị anyụ anyụ.

44 Ya mere, ka mmadụ ọbụla na-eguzoro ma-ọbụ na-ada, n’onwe ya ọ bụghị kwa maka onye ọzọ; ma-ọbụ na-atụkwasịghi onye ọzọ obi.

45 Jụọ nụ Nna m, a ga-emekwara unu ya n’obere oge mgbe ahụ ihe ọbụla unu ga-ariọ, m’ọbụrụ na unu ga-arịọ n’okwukwe, kwere na unu ga-anata.

46 Ọ bụrụ kwa n’anya gị nke na-ahụrụ gị ụzọ, ya onye nke a họpụtara iche gị nche igosi gị ìhè, a ghọọ onye njehie ma sogbuo gị, ghụpụ ya.

47 Ọ dị mma maka gị ịba n’ala-eze Chineke, na-enwe otu anya, karịa inwe anya abụọ atụba gị n’ime ọkụ ala-mụọ.

48 N’ihi na ọ dị mma na a ga-azọpụta gị onwe gị, karịa ịtụba gị tinyere nwanne gị nwoke n’ime ala-mụọ, ebe ikpuru ha na-adịghị anwụ anwụ, na ebe ọkụ ahụ na-adịghị anyụ anyụ.

Bipụta