Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Jọn 4


NAJS, Jọn 4:1–4 (tụlee ihe dị iche na Jọn 4:1–2)

(Jisus mere ndị mmadụ baptism.)

1 Ya mere mgbe ndị Farisi nụwororị na Jisus nwetara na mere ndị na-eso ụzọ baptism karịa Jọn,

2 Ha chosiri ike karịa n’ụzọ ọbụla ka ha nwee ike gbuo ya; n’ihi na ọtụtụ mmadụ nabatara Jọn dịka onye-amụma, kama ha ekwenyeghị na Jisus.

3 Ugbua Onye-nwe maara nke a, na-agbanyeghị na ya onwe ya e meghị ọtụtụ baptism dịka ndị na-eso ụzọ ya;

4 N’ihi na o kwere ha ime baptism n’ihi ịma-atụ nke otu ha si-egosi afọ-ọma otu onye na ibe ya.

NAJS, Jọn 4:26 (tụlee ihe dị iche na Jọn 4:24)

(Chineke ekwewo ndị kwere ekwe n’ezie nkwa nke Mụọ ya.)

26 N’ihi nye ndị dị otu a ka Chineke kwere nkwa Mụọ ya. Na ndị na-efe ya ofufe, garịrị efe ya ofufe n’ime mụọ na n’ime ezi-okwu.

Bipụta