Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Ndị Rom 7


NAJS, Ndị Rom 7:5–27 (tụlee ihe dị iche na Ndị Rom 7:5–25)

(Kraịst nwere ike ịgbanwe mkpụrụ-obi ndị mmadụ.)

5 N’ihi na mgbe anyị nọọrọ na anụ arụ, oke mmetụta nile nke mmehie ndị na-adịghị na nkwe kọrịta nke iwu, rụrụ ọrụ n’akụkụ arụ anyị nile ịmịta mkpụrụ nye ọnwụ.

6 Kama ugbua a napụtawo anyị site n’iwu ahụ ebe e jideworo anyị n’ime ya, ebe anyị nwụrụ anwụ nye iwu ahụ, ka anyị wee fee ofufe n’ime ịdị ọhụrụ nke mụọ, ọ bụghị kwa na-idị ochie nke mkpụrụ okwu e dere ede.

7 Gịnị ka anyị ga-ekwu mgbe ahụ? Iwu ahụ ọ bụ mmehie? Chineke ekwela. Ee, a mawoghị m rị mmehie, ma ọ bụghị site n’iwu ahụ; n’ihi na-amawoghị m rị agụọ ime ihe ọjọọ, ewezuga na iwu kwuru, Gị enwela anya-ukwu.

8 Kama mmehie, ebe o weere ohere site na iwu-nsọ ahụ, rụpụtara n’ime m ụdị agụụ dị iche iche. N’ihi na mmehie bụ ihe nwụrụ anwụ ma iwu adịghị ya.

9 N’ihi n’otu mgbe adịịrị m ndụ na-ejehieghị n’iwu, kama mgbe iwu-nsọ nke Kraịst bịara, mmehie wee dị ndụ ọzọ, mụ onwe m wee nwụọ kwa.

10 Na mgbe m na-ekwenyeghị n’iwu-nsọ ahụ nke Kraịst nke bịara, nke e chiri echichi nye ndụ, achọtara m na ọ mawo m ikpe nye ọnwụ.

11 N’ihi mmehie ebe o weere ohere, gọnarịrị iwu-nsọ ahụ, wee ghogbue kwa m, site kwa na ya e gbuo m.

12 Na-agbanyeghị, achọpụtara m n’iwu ahụ dị nsọ, na iwu-nsọ ahụ dị nsọ na zie ezi dị kwa mma.

13 Mgbe ahụ e mere nke ahụ bu ezi ihe ọnwụ n’ebe m nọ? Chineke ekwela. Kama mmehie, ka o wee pụta ihe na-ọbụ mmehie site na nke ahụ bụ ezi ihe na-arụta ọnwụ n’ime m; ka mmehie, site na iwu-nsọ, nwee ike ghọọ mmehie nke ukwu hie nne.

14 N’ihi na anyị matara na iwu-nsọ ahụ bụ nke mụọ, kama mgbe m nọ n’okpuru iwu, a ka m nọ kwa na anụ arụ, e rekwara n’okpuru mmehie.

15 Kama ugbua abụ m nke mụọ; n’ihi na nke ahụ e nyere m n’iwu ka m mee, ya ka m na-eme, nke ahụ kwa e nyere m n’iwu ka m ghara ikwere ya ka m na-aghara ikwere.

16 N’ihi na ihe m maara na o zighị-ezi, agaghị m eme ya, n’ihi na nke ahụ bụ mmehie, ka m na-akpọ asị.

17 Ma ọ bụrụ na mụ emeghị nke ahụ bụ nke m na-agaghị ekwere, a na m ekwenyere iwu, na o ziri-ezi, a maghị kwa m ikpe.

18 Ugbua, ọbụghị kwa mu onwe m ọzọ na-emehie, kama a na m achọ imegide mmehie ahụ nke bi n’ime m.

19 N’ihi na amatara m na ezi-ihe ebighi n’ime m, nke bụ n’ime anụ arụ m; n’ihi ike m ji eme ihe m chọrọ dị n’ime m, kama ime nke ahụ bụ ezi-ihe a chọtaghị m ike, nanị n’ime Kraịst.

20 N’ihi na ezi-ihe ahụ nke m gaaworị ime mgbe m no n’okpuru iwu, a chọtaghị m na o ziri ezi, ya mere e meghị m ya.

21 Kama ihe ọjọọ nke m na-ekwesịghị ime n’okpuru iwu, achọtara m na o ziri ezi, nke ahụ, ka m mere.

22 Ugbua ọbụrụ na m emee nke ahụ, site na enyem-aka nke Kraịst, a gaghị m eme ya n’okpuru iwu ahụ, anọghi m n’okpuru iwu; ọbụrụ kwa na m achọghị ọzọ ìmejọ ihe, kama ana m achọ imeri mmehie nke na-ebi n’ime m.

23 Ahụrụ m mgbe ahụ na okpuru iwu, na mgbe m choro ime ezi-ihe ihe-ọjọọ nọ n’ebe m nọ; n’ihi na iwu nke Chineke di m mma dika mmadụ ime m siri dị.

24 Na ugbua ana m ahụ iwu ọzọ, ọbụna iwu-nsọ nke Kraịst, e debawokwa ya n’ime uche m.

25 Kama akụkụ arụ m nile na-ebu agha megide iwu nke uche m na-ewetakwa m na ndọkpụ na-agha nye iwu nke mmehie nke bu akụkụ arụ m nile.

26 Ọbụrụ kwa na m emerighị mmehie ahụ nke no n’ime m, kama jiri anụ arụ fee iwu nke mmehie ofufe; O ogbenye-ọnụ-ntụ ka m bụ! Onye ga-anapụta m site n’arụ nke ọnwụ a?

27 A na m ekele Chineke site na Jisus Kraịst Onye-nwe anyị, mgbe ahụ, na ọtụa mụ onwe m ji uche m na-efe iwu nke Chineke ofufe.

Bipụta