Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Ndị Hibru 7


NAJS, Ndị Hibru 7:3 (tụlee ihe dị iche na Ndị Hibru 7:3)

(Ọkwa nchụ-aja dị nsọ dị n’usoro nke Ọkpara Chineke dị na-enweghị nna ma-ọbụ nne o nweghị kwa ọbụghị mmalite ma-ọbụghị ọgwụgwụ nke ụbọchị nile.)

3 N’ihi na Melkizedek nke a ka e chiri echichi onye nchụ-aja na-igbaso usoro nke Ọkpara nke Chineke, nke bụ usoro dị na-enweghị nna, na-enweghị nne, na-enweghị akụkọ usoro ọmụmụ, na-enweghị ọbụghị mmalite nke ụbọchị nile, ma-ọbụghị ọgwụgwụ nke ndụ. Na ndị nile ahụ e-chiri echichi nye ọkwa nchụ-aja nke a ka e mere ka ha yie Ọkpara nke Chineke, na-anọgide dịka onye nchụ-aja mgbe nile.

NAJS, Ndị Hibru 7:25–26 (tụlee ihe dị iche na Ndị Hibru 7:26–27)

(Ọrụ Kraịst dịka onye-ogbugbo ka a kọwara.)

25 N’ihi na onye isi nchụ-aja dị otu a kwesịrị anyị, onye dị nsọ, na-enweghị obi ọjọọ, na-emerụghị emerụ, onye ekewapụworo iche site na ndị mmehie, onye e mekwara onye ọchịchị nye elu-igwe nile;

26 Ọ bụghị kwa dịka ndị isi nchụ-aja ndị chụlitere aja kwa ụbọchị, nke mbụ maka mmehie ha nile, mgbe ahụ kwa n’ihi mmehie nile nke ndị mmadụ; n’ihi na ọdịghị ya mkpa ịchụ aja maka mmehie nile nke ya, n’ihi na ọ maghị mmehie ọbụla, kama n’ihi mmehie nile nke ndị mmadụ. Nke a kwa ka o mere otu oge, mgbe ọ chụlitere onwe ya.

Bipụta