Come, Follow Me
Disemba 30–Jenụwarị 5: “Mweghachite Ahụ Ekwere na nkwa Na-aga Niihu”: Mweghachite nke Uju nke Ozi ọma nke Jizọs Kraịst


“Desemba 30–Jenụwarị 5: ‘Mweghachite Ekwere nkwa Na-aga Niihu’: Mweghachite n’Uju nke Ozi ọma nke Jizọs Kraịst,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Mweghachite n’Uju nke Ozi ọma nke Jizọs Kraịst,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

anyanwụ na-awa n’eluigwe

Desemba 30–Jenụwarị 5: “Mweghachite Ahụ Ekwere nkwa Na-aga Niihu”

Mweghachite n’Uju nke Ozi ọma nke Jizọs Kraịst

Kedu otu unu si na-eme ncheta nke ugboro 200 nke otu mmemme nke gbanwere ụwa? Nke ahụ bụ ajụjụ Otu Ndịisi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na abụọ tụgharịrị uche na ya dị ka Epril 2020 bịaruru, na-agba afọ 200 kemgbe Ọhụ nke Mbụ nke Josef Smith. “Anyị naara eche ma e kwesịrị ịkpụ ihe ọkpụkpụ,” Onyeisi Russell M. Nelson chetara. “Mana dị ka anyị tulere agụgụala pụrụ iche na mmetụta ozuru ụwa nke Ọhụ nke Mbụ ahụ, anyị nwere afọ ojuju imepụta ihe ọkpụkpụ na-abụghị nke granaịt ma ọ bụ okwute mama nke mkpụrụokwu … , nke na-agaghị akanye n’elu ‘mbadamba nkume’ mana kama nke aga edenye niime “mbadamba nwere uru” nke obi anyị [2 Ndị Kọrịnt 3:3]” (“Nụrụnụ Ya,” Liahona, Me 2020, 90).

Mkpụrụokwu ncheta ndị ha kepụtara ka akpọrọ “Mweghachite n’Uju nke Ozi ọma nke Jizọs Kraịst: Ịma Ọkwa Emume ncheta Narị Afọ Abụọ nye Ụwa.” Ọ bụ ebe ncheta na-abụghị naanị maka Ọhụ nke Mbụ mana nyekwa ihe niile Jizọs Kraịst meworo—ma nọkwa na-eme—kemgbe ahụ. Mweghachite nke ozi ọma Ya malitere mgbe otu onye chigharịrị n’ebe Chineke nọ ma nụrụ Ya. Ọ na-aganiihu otu ụzọ ahụkwa: otu obi, otu nhụmiihe dị nsọ otu mgbe—gụnyekọta nke gị.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’ebe obibi na na Nzukọ nsọ

“Chineke hụrụ ụmụ Ya naanya na mba niile nke ụwa.”

N’uche nke gị, gịnị ga-eme ọkwa a mara banyere Mweghachite si malite jiri ahịrịokwu banyere ịhụnaanya nke Chineke? Dị ka ị na-amụ ọkwa a mara, leba anya na ngosipụta niile banyere ịhụnaanya nke Chineke maka “ụmụ Ya na mba niile nke ụwa.” Kedụ otu Mweghachite nke ozi ọma si nyere gị aka nwete mmetụta ịhụnaanya Ya?

Leekwa Gerrit W. Gong, “Mba Niile, Ala Ụmụnna niile, na Ire niile,” Liahona, Nov. 2020, 38-41.

Mweghachite malitere jiri otu azịza nye otu ajụjụ.

E nwere ike kwuo na Onye Nzọpụta malitere Mweghachite nke ozi ọma Ya site n’ịza otu ajụjụ. Olee ozi i chere ịma ọkwa Mweghachite nwere maka otu onye nwere ọtụtụ ajụjụ banyere Chineke, ozi ọma ahụ, ma ọ bụ “nzọpụta nke mkpụrụ obi ya”? I nwekwara ike mụọ Josef Smith—Agụgụala 1:5-20 iji hụ ihe i nwere ike ịmụta site n’aka Josef Smit banyere ịchọta azịza nye ajụjụ niile nke ozi ọma.

Leekwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ịchọta Azịza niile,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

agba etere nke Josef Smit na-eleli anya elu niime ọdọ ọtụtụ osisi

Uju sitere na Ọchịchọ niile nke Obi M, site n’aka Walter Rane

akara ngosi semịnarị
Jizọs Kraịst eweghachitewo Nzukọ nsọ Ya.

Kedu ihe ị ma banyere “Nzukọ nsọ Agba Ọhụrụ nke Kraịst,” nke Onye Nzọpụta weghachitere site n’aka Josef Smit? Tulee ịmụ akwụkwọ nsọ ndị a na idepụta ụfọdụ njirimara nke Nzukọ nsọ Ya:

Ọzọ, ị nwere ike iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’elu tụnyere ndị dị n’okpuru, nke na-akọwa otu Jizọs Kraịst si weghachite njirimara niile nke Nzukọ nsọ Ya site n’aka Josef Smith:

Gịnị kpatara i jiri nwee obi ekele maka Mweghachite nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst?

Okenye Jeffrey R. Holland na nwunye ya nwere otu mgbe ha nwara ịtụgharị uche otu ha gaara esi ebi ndụ tupu eweghachite Nzukọ nsọ. “Gini bụ ihe anyị chere na anyị nweburu?” ha jụrụ onwe ha. Gụọ banyere nhụmiihe ha niime “Ihé nke Olileanya Zuru oke” (Liahona, Me 2020, 81-82). Kedu otu Mweghachite siworo nye aka mejupụta olileanya nke ime mmụọ gị?

Leekwa Isiokwu na Ajụjụ niile, “Ngọnarị okwukwe na Mweghachite nke Ozi ọma ahụ,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

“Mweghachite e kwere na nkwa na-aganiihu.”

I chewo nnọọ echiche banyere onwe gị dị ka onye so na Mweghachite nke ozi ọma? Tulee mkpụrụokwu ndị a sitere n’aka Onyeisi Dieter F. Uchtdorf: “Mgbe ụfọdụ anyị na-eche ihe banyere Mweghachite nke ozi ọma dị ka ihe zuru oke, nọzi anyị na-azụ. … Na nsịrịdị, Mweghachite ahụ bụ usoro na-aganiihu; anyị bi niime ya ugbua” (“Ị Na-ehi Ụra site n’okpuru Mweghachite?,” Liahona, Me 2014, 59).

Dị ka ị na-akwado ịmụ otu esi weghachite ozi ọma n’oge ndị nke 1800, ị nwere ike ịmalite site n’itule otu esi weghachite ya niime ndụ gị. Gụọ Ọkwa Mweghachite buru ajụjụ ndị dị ka ndị a n’uche: Olee otu m si bịa mara na nke a bụ eziokwu? Olee otu m ga-esi esoro eme ihe niime Mweghachite ahụ taa?

“Eluigwe niile ghere oghe.”

Gịnị ka nkebiokwu ahụ “eluigwe niile ghere oghe” pụtara nye gị? Kedu ihe akaebe ị na-ahụ—niime Ọkwa Mweghachite ahụ, niime Nzukọ nsọ taa, niime akwụkwọ nsọ, na niime ndụ gị—na eluigwe niile n’ezie ghere oghe?

I nwekwara ike gụnyekọta “Chi Abọọla” (Abụ niile, no. 1) dị ka akụkụ ihe ọmụmụ gị. Kedụ ihe ị na-achọta niime abụ nke a na-agbakwunye na nghọta gị banyere nkebiokwu ahụ “eluigwe niile ghere oghe”?

Leekwa Quentin L. Cook, “Ngọzi nke Mkpughe Na-aganiihu nye Ndị Amụma na Mkpughe Nke onwe iji Duo Ndụ Anyị,” Liahona, Me 2020, 96-100.

Mụkọọ ihe ọnụ. Onyeisi Nelson kpọkuru anyị ịmụ [Ọkwa Mweghachite ahụ] n’onwe na anyị na ndị otu ezi na ụlọ [anyị] na ndị enyi” (“Nụrụ Ya,” 92). Tulee otu i nwere ike isi gụnyekọta ndị ọzọ niime ihe ọmụmụ gị.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji nke ụmụntakịrị 01

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe

“Anyị na-ama ọkwa n’ụzọ doro anya.”

  • Dị ka ị na-agụ akụkụ niile nke Ọkwa Mweghachite gị na ụmụ gị (ma ọ bụ lekiri vidiyo nke Onyeisi Nelson na-agụ ya agụ), nyere ha aka chọta ahịrịokwu ndị na-amalite jiri nkebiokwu ndị dị ka “anyị na-ama ọkwa,” “anyị na-ekwuputa,” ma ọ bụ “anyị na-agba ama.” Kedụ eziokwu ndị nke ndị amụma na ndị ozi anyị na-ama ọkwa ha? Elemanya gị na ụmụ gị nwere ike ikesa ama nke onwe unu banyere ụfọdụ niime eziokwu ndị a kwa.

    6:0

    The Restoration of the Fulness of the Gospel of Jesus Christ

    President Russell M. Nelson, with the First Presidency and Quorum of the Twelve Apostles, makes a bicentennial proclamation on The Restoration of the Fulness of the Gospel of Jesus Christ.

“Josef Smith … nwere ọtụtụ ajụjụ.”

  • O nwere ike dị mmasị nye ụmụ unu inyocha ụfọdụ ajụjụ ndị Josef Smith nweburu nke dubara na Mweghachite nke ozi ọma nke Onye Nzọpụta. Nyere ha aka chọta ụfọdụ ọmụmaatụ niime Josef Smith—Agụgụala 1:10, 29, 68. Olee otu esi gọzie anyị taa niihi na Chineke zara ajụjụ niile nke Josef Smith.

  • I nwekwara ike nye ụmụ gị ohere ikwu banyere ajụjụ ndị ha nwere. Kedụ ihe anyị na-amụta site n’aka Josef Smith banyere otu esi achọta azịza niile? (Lee Josef Smit—Agụgụala 1:8–17; lee kwa amaokwu 3 na 4 nke “Onye a bụ Ọkpara M Hụrụ naanya,” Akwụkwọ Abụ Ụmụ ntakịrị, 76).

“Ndị ozi nke eluigwe bịara ikuziri Josef ihe.”

  • Olee ndị bụụrụ “ndị ozi nke eluigwe [ndị] bịara ikuziri Josef ihe”? Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ ilele foto ha niime Akwụkwọ Nka Ozi ọma (lee ọnụ. 91, 93, 94, 95). Olee otu onye ọbụla niime ndị ozi ndị a si nye aka “hiwegharịa Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst”? Akwụkwọ nsọ tụrụ arọ niime ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a pụrụ inyere ụmụ gị aka zaa ajụjụ nke a.

The Prophet Joseph Smith sitting on his bed in the Smith farm house. Joseph has a patchwork quilt over his knees. He is looking up at the angel Moroni who has appeared before him. Moroni is depicted wearing a white robe. The painting depicts the event wherein the angel Moroni appeared to the Prophet Joseph Smith three times in the Prophet's bedroom during the night of September 21, 1823 to inform him of the existence and location of the gold plates, and to instruct him as to his responsibility concerning the plates.

Jizọs Kraịst eweghachitewo Nzukọ nsọ Ya.

  • Olee otu i ga-esi enyere ụmụ gị aka ghọta ihe ọ pụtara iweghachite Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta? Ikekwe ha enwee ike wuo ụlọ elu dị mfe jiri ọtụtụ okwute ma ọ bụ ọtụtụ iko ma “weghachite,” ma ọ bụ wugharịa, ya. Ma ọ bụ, ọ bụrụ na enwewo mgbe ụmụ gị dochiri otu ihe niihi na o furu efu ma ọ bụ mebiri emebi, i nwere ike tụnyere nhụmiihe ahụ na Onye Nzọpụta iweghachite Nzukọ nsọ Ya. Nyere ha aka chọta ọkpọrụkpụ ihe ndị akpọrọ aha niime Ọkwa Mweghachite nke Onye Nzọpụta weghachitere.

nna na ụmụ ji okwute na-egwu egwu

“Eluigwe niile ghere oghe.”

  • Ịgosipụta ihe nkebiokwu ahụ “eluigwe niile ghere oghe” pụtara, ikekwe ị nwere ike kesara ụmụ gị otu ozi, na mbụ n’ebe ime ụlọ emechiri emechi ma emesịa site na ọnụ ụzọ ghere oghe. Kwe ka ha n’otu n’otu na-ekesakwa ozi. Kedụ ozi ndị Jizọs Kraịst nwere maka anyị? Kedụ nhụmiihe ndị nyewooro anyị aka mara na eluigwe niile ghere oghe nye anyị?

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke Friend magazin.