“Nọvemba 24–30: ‘Ọ “Rachiwo Ozi Ya na Ọrụ Ya jiri Ọbara Nke Onwe Ya’” : Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135–136,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135–136,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Nọvemba 24–30: Ọ “Rachiwo Ozi Ya na Ọrụ Ya jiri Ọbara Nke Onwe Ya”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135–136
Ehihie Jun 27, 1844, hụtara Josef na Hyrum Smith n’ụlọ mkpọrọ ọzọ kwa, ndị so ha abụrụ Jọn Taylor na William Richards. Ha kwenyere na aka ha dị ọcha maka mpụ ọbụla, mana ha nyefere na nwude, na-atụanya idebe Ndị Nsọ nọ na Nauvoo na nchekwa. Nke a abụghị oge mbụ ndị iro nke Nzukọ nsọ tinyeworo Onye amụma Josef niime ụlọ mkpọrọ, mana oge nke a ọ dịịrị ka ọ ma na ya agaghị alọta na ndụ. Ya na ndị enyi ya gbalịrị ịkasi ibe ha obi site n’ịgụ ihe ọgụgụ sitere na Akwụkwọ nke Mọmọn na ịbụ abụ. Emesịa a nụrụ ụda egbe, ma na nkeji ole ma ole ndụ anụ ahụ nke Josef Smith na nwanne ya nwoke Hyrum abịaworịị na njedebe.
Ma ka ọ dị ọ bụghị njedebe nke ọrụ ahụ sinachi ha nabataworo. Ma ọ bụghị njedebe nke Mweghachite nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst. E nwere ọrụ ndị ọzọ a ga-arụ na mkpughe ndị ọzọ nke ga-edu Nzukọ nsọ gaaniihu. Njedebe ndụ nke Onye amụma abụghị njedebe nke ọrụ Chineke.
Lee Ndị Nsọ, 1:521–52.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135; 136:37–39
Josef na Hyrum Smith jiri ọbara ha rachie ama ha.
Chee maka mmetụta ịnaara ịnwe ma ọ bụrụ na ibiworịị na Nauvoo mgbe egburu Josef na Hyrum Smith (lee Ndị nsọ, 1:554–55). Kedụ otu ị gaara esi aghọta ihe nke a dị oke egwu? Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135, ebiputara ọnwa atọ gara aga, dịịrị ka o nyere aka. Dị ka ị na-achọgharị na nkeji nke a, tulee ihe gaara ewetere gị nghọta na mmasịgharị obi ike. Kedụ ihe ị ga-agwa onye jụrụ, “Gịnị mere Chineke ji kwe ka egbuo Onye amụma Ya?” (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 136:37–39).
I nwekwara ike chọgharịa nkeji 135 maka mkpụrụokwu ma ọ bụ nkebiokwu ndị na-akpate mmụọ gị ikwesị ntụkwasị obi na Kraịst ruo ọgwụgwụ, dị ka Josef na Hyrum mere.
Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 5:21–22; “Icheta Ogbugbu n’ihi okwukwe ahụ,” niime Mkpughe ndị nọ N’ọnọdụ, 299–306; Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Josef Smith (2011), 522–23, 529–40; “Ama maka Akwụkwọ nke Mọmọn” (vidiyo), Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135:3
Josef Smit bụ onye amụma na onye aka ebe nke Jizọs Kraịst.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135:3 na-akpọ aha ụfọdụ niime ihe ndị Josef Smith mezuru “n’obere oghere nke afọ iri abụọ.” Kedụ otu ihe ndị a si metụta gị na mmekọrịta gị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst? Tulee otu i ga-esi emeju ahịrịokwu dị ka nke a: Niihi ihe Onyenwe anyị mere site n’aka Josef Smith, mụ onwe M … I nwekwara ike dekọọ ma kesaa ama gị nke Onye amụma Josef Smith na ndị ọzọ.
Ụzọ ọzọ iji mụọ banyere ozi nke Josef Smith bụ ịgbalị ide ihe banyere nkenke ọkwa ọnwụ ma ọ bụ ozi ekele maka ya. Kedụ ihe ị ga-ekwu iji wulite okwukwe niime Kraịst na n’ozi ọma Ya eweghachitere? I nwere ike chọọ ịgụnye ihe omume ndị dị mkpa ma ọ bụ ihe ndị emezuru ahụtara niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135 ma ọ bụ ndị ahụ akpọtụrụ niime akụrụngwa niile dị n’okpuru.
Jizọs Kraịst kpughere ọtụtụ eziokwu banyere Onwe Ya na Aja mgbaghara mmehie Ya site n’aka Josef Smith. Tulee ịtụgharị uche nhụmiihe i nweteworo mgbe ị na-amụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile n’afọ nke a. Kedụ eziokwu ndị pụtaworo ihè nye gị? I nwere ike chọọ ikesara ezi na ụlọ gị, klas ma ọ bụ ndị otu kworum, ma ọ bụ ndị ọzọ ihe ndị a dị ka ị na-amụ ihe izu ụka nke a. Kedụ otu eziokwu ndị a si enyere gị aka ghọta ma bịarute Onye Nzọpụta nso?
Lee kwa “Josef Smith: Onye amụma nke Mweghachite” (vidiyo), Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma; Tad R. Callister, “Josef Smith—Onye amụma nke Mweghachite,” Liahona, Nov. 2009, 35–37; “Ịja mma dịrị Nwoke ahụ,” Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 27; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Josef Smith,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.
Egwu Metụtara
Ịbụ abụ ndị a sotere ma ọ bụ ilele vidiyo niile nwere ike kpọkuo Mmụọ Nsọ ma ọ bụ kpatee mmụọ mkparịta ụka banyere ọrụ nke Onye amụma Josef Smith na aja niile nke Ndị nsọ ndị garaniihu mgbe ọ ọnwụ ya gasịrị.
“Nwoke Ogbenye Onye njem nke na-Eru uju” (Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 29). Mgbe ọ nọ n’Ụlọ Mkpọrọ Kateeji, Jọn Taylor bụrụ abụ nke a.
“Ịja mma dịrị Nwoke ahụ” (Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 27; lee kwa viidiyo). Edereede nke abụ nke a ka e dere dị ka ozi ekele nye Josef Smith.
“Bịanụ, Bịanụ, Unu Ndị nsọ” (Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 30; lee kwa vidiyo).
“Okwukwe nime Nzọụkwụ Niile” (lee vidiyo).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 136
E nwere m ike nyee aka mezuo uche nke Onyenwe anyị dị ka M na-esoro ndụmọdụ Ya.
Mgbe Josef Smith nwụsịrị, Ndị nsọ ka achụpụrụ site na Nauvoo. Ugbu a ha zutere njem dị maịlụ 1,300 (2,100 km) site na alaịkpa siri ike. Brigham Young, Onyeisi Kworum Ndị Ozi Iri na Abụọ, nwere nchegbu banyere otu Ndị nsọ ga-esi anya ndụ n’ije ahụ. N’ebe ha ga-anọ nwa oge akpọrọ Winter Quarters, ọ rịọrọ maka odudu. Azịza nke Onyenwe anyị ka edekọrọ niime nkeji 136. “Site na-inyere Ndị nsọ aka cheta na agwa ha na njem ahụ dịkwa mkpa dị ka ebe ha na-aga, mkpughe ahụ nyere aka gbanwee mkwagharị ijewe mpaghara ọdịda anyanwụ site na ọnọdụ ọjọọ dị mkpa banye na nhụmiihe ime mmụọ dị mkpa a kọrọ” (“Nke a Ga-abụ Ọgbụgba ndụ Anyị,” niime Mkpughe ndị nọ N’ọnọdụ, 308).
Buru nke a n’uche dị ka ị na amụ nkeji 136. Kedụ ndụmọdụ ị na-ahụta nke nwere ike inye aka tụgharịa mnwale siri ike dị niime ndụ gị “banye na nhụmiihe ime mmụọ … dị mkpa”? I nwere ike tụgharịa uche otu ndụmọdụ nke a nwere ike i si nyere gị aka mejupụta uche nke Onyenwe anyị niime ndụ nke onwe gị, dị ka o nyeere Ndị nsọ isimbụ aka na njem ha.
Lee kwa “Nke a Ga-abụ Ọgbụgba ndụ Anyị,” niime Mkpughe ndị nọ N’ọnọdụ, 307–14; “Bịanụ, Bịanụ, Unu Ndị nsọ,” Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 30; Isiokwu Agụgụala Nzukọ nsọ, “Nsochi nke Odudu Nzukọ nsọ,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135:1–2, 4–5
Josef na Hyrum Smith nyere ndụ ha maka Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya.
-
Chịkọta okwu maka ụmụ gị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135:1 ma ọ bụ kesaa “Isi nke 57: Egbuola Onye amụma” (niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 201–5, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma). Nke a nwere ike bụrụ ohere ọma nye gị na ụmụ gị ikesa mmetụta gị niile banyere aja Josef na Hyrum chụrụ maka Onye nzọpụta na ozi ọma Ya.
-
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135:4–5 na-ekwu na Hyrum Smith gụrụ akụkụ ihe edere sitere na Akwụkwọ nke Mọmọn tupu ya agawa n’Ụlọ Mkpọrọ Kateeji Gị na ụmụ gị nwere ike gụkọta edereede nke a ọnụ (lee Ita 12:36–38). Kedụ otu amaokwu ndị a gaara esi akasi Hyrum obi? I nwekwara ike kesaa akwụkwọ nsọ ndị ga-ewetere gị nkasi obi mgbe ị na-echegbu ma ọ bụ nwee mwute.
-
Gị na ụmụ gị nwere ike lee anya na foto niile nke ndị amụma (lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nọs. 7, 14, 67) ma kwuo okwu banyere ụfọdụ ụmụ ihe Chineke na-arịọ ndị amụma ime. Kedụ ihe ndị amụma ndị a jiri chụọ aja maka Onye nzọpụta?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135:3
Josef Smit bụ onye amụma na onye aka ebe nke Jizọs Kraịst.
-
Iji nyere nwa gị aka cheta ma nye ekele otu Onyenwe anyị siworo gọzie anyị site n’ozi nke Josef Smith, i nwere ike gosipụta ụmụ ihe ga-anọchite anya ihe ndị Josef mere, dị ka Akwụkwọ nke Mọmọn, Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, ma ọ bụ otu foto nke tempụl (lee kwa ihu akwụkwọ ihe omume n’izu ụka nke a). Emesịa ụmụ gị nwere ike lee anya niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 135:3 maka ụfọdụ ihe ndị Josef Smith mere iji nyere anyị aka bịarute Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst nso. Kpọkuo ụmụ gị ikesa ihe mere ha ji enwe obi ekele maka ihe ndị a.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 136
Onyenwe anyị pụrụ ịgọzi m mgbe m na-agba mbọ.
-
Tulee idebe otu foto nke Tempụl Nauvoo n’otu akụkụ ọnụ ụlọ ma na-ekewapụta ebe mgbaba dị mfe n’akụkụ nke ọzọ. Kpọkuo ụmụ gị ịgbakọta nso na foto ahụ, ma gwa ha banyere Ndị nsọ ndị ga-ahapụ Nauvoo mgbe Josef Smith nwụsịrị (lee isi nke 58, 60, na 62 niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 206–8, 211–16, 222–24, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma). Kwusie okwukwe Ndị nsọ ndị a nwere niime Jizọs Kraịst ike, ma kpọkuo ụmụ gị ije ije ruo n’ebe mgbaba ahụ iji nọchite njem gaa na Winter Quarters. Ha nwere ike gụọ otu egwu dị ka “Ị Bụ Onye Ọsụ ụzọ” (Akwụkwọ abụ Ụmụntakịrị, 218-19) dị ka ha na-eje ije.
-
Kọwaa na niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 136, Onyenwe anyị nyere ndụmọdụ iji nyere Ndị Nsọ aka na njem ha ruo Ndagwurugwu Salt Lake. Nyere ụmụ gị aka chọta ihe niime mkpughe nke a nke nwere ike inye ha mgbam ume maka njem nke a (lee amaokwu nke 4, 10-11, 18-30). Kedụ otu ndụmọdụ nke a nwere ike i si nyere anyị aka na mnwale ndị anyị na-ezute taa?