Ọgbakọ Zuru ọha
Ọbịbịa nke Akwụkwọ nke Mọmọn
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Ọbịbịa nke Akwụkwọ nke Mọmọn

Eziokwu nsipụta na ndị akaebe pụrụ iche nke Akwụkwọ nke Mọmọn gbara ama sị na ọbịbịa nke Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ihe dị ebube na-ezia.

Otu mgbe ya na ndị okenye Nzukọ nsọ na-ezukọta, Onye amụma Josef Smit kwupụtara: “Wepụ Akwụkwọ nke Mọmọn, na mkpughe niile, ebee ka okpukperechi anyị nọzi? E nweghị nke anyị nwere.”1 Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, site na Ọhụ Nke Mbụ, ọbịbịa nke Akwụkwọ nke Mọmọn n’ụzọ dị ebube bụ ihe omume nke abụọ dị oke mkpa nke kpughere Mweghachi nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-agba nke a. Akwụkwọ nke Mọmọn na-agba ama ịhụnaanya nke Chineke nwere n’ebe ụmụ Ya nọ, nakwa aja mgbaghara mmehie dị nsọ na-achọghị ọdịmma nke onwe nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, na ozi Ya na-enweghị atụ n’etiti ndị Nifaị obere oge O Bilitechara n’ọnwụ.2 Ọ gbakwara ama na ndị ụlọ nke Izrel fọdụrụnụ ga-abụ otu site n’ọrụ nke ụbọchị ikpeazụ Ya nakwa na chụpụghị ha oge niile ebighị ebi.3

Ka anyị na-amụ ihe banyere ọbịbịa nke akwụkwọ nke a dị nsọ n’ụbọchị ikpeazụ ndị a, anyị na-amata na ihe niile banyere ya dị ebube—site n’Onye amụma Josef ịnata epekele ọla edo niile ahụ si n’aka onye mmụọ ozi dị nsọ ruo na ntụgharị asụsụ ya “site na onyinye na ike nke Chineke,”4 nchekwa ya, na mbipụta ya site n’aka nke Onyenwe anyị.

Mbipụta Akwụkwọ nke Mọmọn bidororịị ọtụtụ oge tupu Josef Smit a nata epekele ọla edo niile ahụ site n’aka mmụọ ozi Moronaị. Ndị amụma nke oge gara aga bukwara amụma gbasara ọbịbịa nke akwụkwọ nsọ nke a n’oge ndụ anyị.5 Aịzaya kwuru okwu banyere akwụkwọ a rachiri arachi, na mgbe ọ ga-apụta ndị mmadụ ga na-ese okwu banyere okwu Chineke. Ọnọdụ nke a ga-ebute ọnọdụ nke Chineke ga-enwe ike rụọ “ọrụ ebube Ya dị ịtụnaanya,” ime ka “amamiihe nke ndị ha maara ihe [laa] n’iyi, ma nghọta nke ndị ha na-akpachapụ anya [bụrụ] ihe e zoro ezo” ebe ndị dị nwayọọ n’obi ka “ọńụ ha ga-abawanye n’ime Onyenwe anyị, ma ndị bụ ogbenye n’etiti ụmụ mmadụ ga-ańụrị ọńụ n’ime Onye Nsọ nke Izrel.”6 Ezikiel kwukwara okwu banyere mkpịsị nke Juda (Baịbụl) na mkpịsị nke Ifrem (Akwụkwọ nke Mọmọn) nke e wekọtara ọnụ ị bụ otu. Ma Ezikiel (n’ime Agba Ochie) ma Lihaị (n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn) gosipụtara na ha “ga-agakọta ọnụ” ime ka ozizi ụgha jupụta na mgbagwoju anya, hiwe udo, ma weta anyị na-ọmụmaihe nke ọgbụgba ndụ niile.7

Na mgbede nke Septemba 21, 1823, afọ atọ na mkpirisi ka e nwetachara Ọhụ Nke Mbụ, mmụọ ozi Moronaị gara ugboro atọ leta Josef, onye amụma ikpeazụ nke ndị Nifaị nọ na Emerịka mgbe ochie, n’ihi ekpere o jiri obi ya niile kpee. N’oge nleta ha were abalị niile, Moronaị gwara Josef na Chineke nwere ọrụ dị ebube ọ ga-arụ—ntụgharị asụsụ na mbipụtara ndị ụwa okwu ndị si na mkpalite nke mmụọ nke ndị amụma mgbe ochie nọ na kọntinent Emerịka.8 Ụbọchị na-esote, Josef gara ebe ahụ, nke na-adịghị anya site na-ebe obibi ya, ebe Moronaị liri epekele ndị ahụ n’oge ngwụcha ndụ ya, narị afọ ndị gara aga. Josef hụkwara Moronaị ọzọ ebe ahụ, onye nke gwara ya ka ọ kwadoo onwe ya maka ị nata epekele niile ahụ n’ọdịniihu.

N’ime afọ anọ na-esote ya, na Septemba 22 kwa afọ ọbụla, Josef natara nkuzi a gbakwunyere site n’aka Moronaị banyere ọmụmaihe gbasara otu a ga-esi a chịkọta alaeze nke Onyenwe anyị n’ụbọchị ikpeazụ a. Nkwado nke Josef gụnyekwara nleta si n’aka ndị mmụọ ozi nke Chineke, siri otu ahụ na-ekpughe ịdị ukwuu na ịdị ebube nke ihe omume ndị ga-eme na-agba oge nke a.9

Ọlụlụ ọ lụrụ Emma Hale na 1827 bụrịị mpaghara nke nkwado ahụ. Ọ rụrụ ọrụ dị mkpa na-inyere Onye amụma aka n’oge ndụ ya niile nakwa n’ozi ya. N’eziokwu, na Septemba 1827, Emma dugara Josef n’elu ugwu ahụ ebe e zoro epekele niile ahụ, o cheere ya mgbe mmụọ ozi Moronaị nyefere rekọọdụ ahụ n’aka Josef. E kwere Josef nkwa na a ga-echekwa epekele ndị ahụ ma ọ bụrụ na o tinye ike ya niile n’ọrụ i chekwa ha tupu eweghachi ha n’aka Moronaị.10

Ezi ndị mụ na ha so n’ozi, ọtụtụ ihe ndị a na-achọpụta ugbu a sitere n’oge mgbe ichie mere mgbe ndị na-egwupụta ihe ọkpụ n’ala nọ n’ọrụ ọbụladị na mberede n’oge a na-akpọpu ala maka ọrụ a na-arụ arụ. Kaosiladị, mmụọ ozi nyere Josef ntụzi aka ebe epekele ndị ahụ nọ. Ọ nweghị ihe ọzọ ọ bụ karịa ọrụ ebube.

Usoro nke ntụgharị asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn bụkwarịị ọrụ ebube. Rekọọdụ mgbe ochie nke a dị nsọ a bụghị “ihe a tụgharịrị asụsụ ya” n’ụzọ omenaala nke ndị ọkammụta si a tụgharị ihe ndị ichie dere site n’ịmụ asụsụ ndị ichie. Anyị kwesịrị ilebakarị usoro ahụ anya dị ka “mkpughe” site na enyemaka ngwa ọrụ a na-ahụ anya nke Onyenwe anyị wepụtara karịa “ntụgharị asụsụ” nke onye nwere mmụta banyere asụsụ dị iche iche mere. Josef Smit kwupụtara na site n’ike nke Chineke na ọ “tụgharịrị asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn site [n’akara na-anọchi okwu, dị ka n’oge gboo n’obodo Ijipti], nke mmụta ya funarịrị ụwa, nke ihe dị ịtụnaanya meere [ya onwe ya] naanị nọ, nwa okoroọbịa na-enweghị mmụta, i buso amamiihe nke ndị ụwa na amaghị ihe mụbawanyere kemgbe narị afọ iri na asatọ agha, site na mkpughe ọhụrụ.”11 Enyemaka nke Onyenwe anyị na ntụgharị asụsụ nke epekele ndị ahụ—ma ọbụ mkpughe, naka nke ọzọ— pụtakwara ihe mgbe a na-atụle obere oge ahụ dị ebube o were Josef Smit iji tụgharịa asụsụ ha.12

Ndị odee nke Josef gbara ama banyere ike nke Chineke nke pụtara ihe mgbe a nọ n’ọrụ ntụgharị asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn. Oliver Cowdery kwuru otu mgbe sị na: “Ndị a bụ ụbọchị ndị na-enweghị nchefu—ị nọrọala n’okpuru ụda olu-okwu a kpọpụtara site na mkpalite mmụọ nke eluigwe, kpọteworo afọ ojuju nke kachasị nke obi nke a! Kwa ụbọchị, a gara m n’ihu, na-enweghị mgbochi ọbụla, idetu ihe si n’ọnụ ya, dị ka ọ tụgharịrị asụsụ … ‘Akwụkwọ nke Mọmọn.’”13

Agụgụ nsipụta niile kpughere na site n’oge Josef nwetere epekele ndị ahụ na 1827, e mere ọtụtụ nnwale isi n’aka ya zoro ha. Ọ hụtara na “a gbara oke mbọ iji nata [ya] [epekele ndị ahụ]” ma “nkata niile e nwere ike ị kpa ka e tinyere n’ọrụ maka ebumnuuche ahụ.”14 Ka emesịrị a manyere Josef na Emma ị hapụ Manchester, New York, gawa na Harmony, Pennsylvania, iji nweta ebe nchekwa i bido ọrụ ntụgharị asụsụ, ebe dị anya na-ebe igwe ndị ọgbaaghara nakwa ndi chọrọ izu epekele ndị ahụ na-anọghị nso.15 Dị ka otu otu ọkọ akụkọ siri hụ: “Otu ahụ ka mpaghara nke mbụ tara akpụ nke nchekwa epekele nke Josef siri bịa na ngwụcha. … Mana ọkọ a kọghị rekọọdụ ahụ, ma na mgbalị ya i chekwa ha Josef na-enweghị obi abụọ a mụtawo ọtụtụ ihe gbasara ụzọ niile nke Chineke na mmadụ nke ga-enyere ya aka nke ọma n’oge ọdịniihu.”16

Mgbe ọ na-atụgharị asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn, Josef mụtara na Onyenwe anyị ga-ahọrọ ndị akaebe ga-ahụ epekele niile ahụ.17 Nke a bụ akụkụ ihe nke Onyenwe anyị n’Onwe Ya hiwere mgbe Ọ sịrị, “Site n’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọbụ atọ ka a ga-ehiwe okwu niile.”18 Oliver Cowdery, David Whitmer, na Martin Harris bụụrụ ndị so na ndị mbụ so Josef n’ihiwe ọrụ nke Chineke dị ebube nọ ọgbọ nke a, ma bụrụkwa ndị akaebe mbụ a kpọrọ oku ị gba ama pụrụ iche banyere Akwụkwọ nke Mọmọn nye ụwa. Ha gbara ama na onye mmụọ ozi, nke si n’iru nke Onyenwe anyị bịa, gosịrị ha rekọọdụ ndị mgbe ochie ahụ na ha hụkwara ihe ndị ebiri nime epekele ahụ niile. Ha gbakwara aka ebe na ha nụrụ olu Chineke si n’eluigwe na-ekwupụta na-atụgharịrị asụsụ rekọọdụ mgbe ochie ahụ site n’onyinye na ike nke Chineke. Enyere ha iwu ka ha gbaa aka ebe banyere ya nye elu ụwa niile.19

Nụzọ dị ebube Onye-nwe kpọrọ ndị aka ebe asatọ ọzọ, ịhụ epekele ọla-edo ahụ niile n’onwe ha na ka ha bụrụ ndị aka-ebe pụrụ iche banyere ezi-okwu na ịdị nsọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn nye ụwa. Ha gbara ama na ha hụrụ ma jiri nwayọọ nyochaa epekele niile ahụ na mkpụrụ edemede niile e binyere ya. Ọbụladị n’etiti nsogbu, mmegbu, na ụdịrị ihe isi ike niile, obụladị ụfọdụ n’ime ha a kwụsịghị ike n’okwukwe ha n’ikpeazụ, ndị ama iri na otu ndị a ahọọrọ ịgba ama banyere Akwụkwọ nke Mọmọn e nweghị mgbe ha gọnarịrị ama na ha ahụwo epekele ndị ahụ. Ọ bụzighị naanị Josef Smit mara ihe banyere nleta nke Moronaị na epekele ọla edo niile ahụ.

Lucy Mack Smit deturu na nwa ya nwoke lọtara n’ebe obibi jupụta na ańụrị mgbe e gosịchara ndị akaebe ahụ epekele ahụ niile. Josef kọwaara nne na nna ya sị, “ọ dị m ka e bupụrụ m ibu arụ nke dịịrị ka ọ na-anyịgbu m, ọ na-enye obi m ańụrị, na ọ gaghị a bụzikwa naanị m so n’elu ụwa a.”20

Josef Smit zutekwara oke mmegide na mbipụta Akwụkwọ nke Mọmọn mgbe ntụgharị asụsụ ya bịara na ngwụcha. O nwere ike mee ka onye mbipụta akwụkwọ a kpọrọ Egbert B. Grandin bi na Palmyra, New York, kwere i bipụta ya naanị ma na Martin Haris, jiri nnukwu okwukwe na ịchụ aja, gbaa ubi ya ibe dị ka ihe akaebe maka ụgwọ mbipụta ihe ahụ. Site n’otu akụkụ mmegide garaniihu ka ebipụtasịrị Akwụkwọ nke Mọmọn, Martin Harris n’okwukwe rere ubi ya ruru ntụ ala 151 (0.6 km2) iji kwụpụchaa ụgwọ mbipụta ahụ. Site na mkpughe e nyere Josef Smit, Onyenwe anyị gwara Martin Harris ka ọ hapụ inwe anya ukwu n’akụ o nwere ma kwụọ ụgwọ eji bipụta akwụkwọ ahụ nke “bu eziokwu na okwu nke Chineke n’ime ya.”21 Na Maachị 1830, e bipụtara kọpị Akwụkwọ nke Mọmọn mbụ dị 5,000, ma taa, e bipụtala kọpị karịrị nde180 n’ihe karịrị asụsụ otu narị.

Eziokwu nsipụta na ndị akaebe pụrụ iche nke Akwụkwọ nke Mọmọn gbara ama sị na ọbịbịa nke Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ihe dị ebube na-ezia. Na-agbanyeghị, ike nke akwụkwọ nke a adabeereghị naanị na agụgụala mara oke mma kama n’ozi ya siri ike na-enweghị atụ nke na-agbanweela ndụ ndị mmadụ na-apụghị ịgụta ọnụ tinyere ndụ nke m!

Agụrụ m Akwụkwọ nke Mọmọn niile oge mbụ mgbe m bụ nwata akwụkwọ semịnarị. Dị ka ndị nkuzi m tụpụtara, e bidoro m gụwa ya site na ihu akwụkwọ ndubata ya. Nkwa ahụ dị n’ihu akwụkwọ ndị nke mbụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn ka na-ehi ụda n’ime mmụọ m: “Tụlee n’ime obi [unu] … , ma … jụọ Chineke [na-okwukwe] … n’aha nke Kraịst ma akwụkwọ ahụ ọ bụ eziokwu. Ndị niile ga-eso ụzọ a … ga-enweta ọgbụgba-ama nke eziokwu na ịdị nsọ ya site n’ike nke Mụọ Nsọ.”22

Site na-ibu nkwa ahụ n’obi, na ị chọsiike ịmatakarị ihe gbasara eziokwu ya, nakwa mmụọ nke ekpere, a mụrụ m Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ, obere obere, dị ka m mezuru ọmụmụ ihe semịnarị ndị e nyere m kwa izu ụka. Echetara m, dị ka ọ bụ echi gara aga, ka mmetụta ọnụnụ ọkụ jiri nwayọ n’ekoli na mmụọ m, na-ejupụta obi m, amụbawanye nghọta m, na-enyewanye ańụrị, dị ka Alma siri kọwaa n’oge ọ na-ekwusara ndị ya okwu nke Chineke.23 Mmetụta ahụ mechara ghọọ mmata ihe nke gbara mgbọrọgwụ n’ime obi m wee ghọọ ntọala nke ọgbụgba ama m banyere ihe ndị ahụ dị mkpa mere na nkuzi niile a hụrụ n’ime akwụkwọ nke a dị nsọ.

Site n’ihe ndị a na nhụmiihe nke onwe ndị ọzọ ego na-apụghị ịzụta, Akwụkwọ nke Mọmọn na-ezia ghọrọ isi nkume dị n’etiti nke kwdoro okwukwe m n’ime Jizọs Kraist na ama m banyere ozizi nke ozi ọma Ya. Ọ bịara ghọọ otu n’ime ngidi na-agbara m ama aja mgbaghara mmehie dị nsọ nke Kraịst. Ọ bịara ghọọ ihe mkpuchi oge ndụ m niile megide mbọ nke onye iro ime ka okwukwe m daa mba ma tinye ekweghị ekwe na-echiche m, ma nye mgbamume ị kwụsi ike kwupụta ọgbụgba ama m banyere Onye Nzọpụta nye ụwa.

Ezi ndị enyi m, ama m banyere Akwụkwọ nke Mọmọn bịara site na-ahịrị ruo na-ahịrị24 dị ka ihe ọrụ ebube nye mkpụrụ obi m. Ruo ụbọchị taa, ọgbụgba ama ahụ garaniihu na-eto ka m nọgidere na-achọ, n’obi ziri ezi, ịghọtazi okwu Chineke nke ọma dị ka e dere n’ime akwụkwọ nke akwụkwọ nsọ nke a na-enweghị atụ.

Unu niile bụ ndị na-anụ olu m taa, a na m akpọku unu ị bịa soro bụrụ otu ndị so na ọbịbịa nke Akwụkwọ nke Mọmọn n’ụzọ dị ebube n’ime ndụ unu. A na m ekwe unu nkwa na ka unu na-eji ekpere ma nọgide na-etufeghị oge na-amụ okwu dị na ya, unu nwere ike soro keta oke nkwa ya niile na ọkpụrụkpụ ngọzi niile n’ime ndụ unu. A na ekwughachikwa ọzọ na nkwa ahụ na-ehi ụda nihu akwụkwọ ya niile: na ọ bụrụ na unu “a jụọ Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, nʼaha nke Kraịst, ma ihe ndị a niile ha abụghị ezi-okwu; ma ọbụrụ na unu ga-eji ezigbo obi, jiri ezigbo ebum-nʼobi, na-enwe okwukwe nʼime Kraịst,” Nʼobi ebere Ọ “ga-egosipụta ezi-okwu dị na ya nye unu, site nʼike nke Mụọ Nsọ.”25 A na m enye unu mmasi obi ike na Ọ ga-enye unu azịza na onwe unu, dị ka O mewooro m na ọtụtụ ndị ozọ na gburugburu ụwa. Nhụmiihe unu ga-adị ebube ma dịkwara unu nsọ dị ka nhụmiihe nke Josef Smit dịịrị ya, dị kakwa ọ dịịrị ndị akaebe nke mbụ na ndị ọzọ na-achọwo ị nata akaebe banyere inwe ugwu na ikwesị ntụkwasị obi nke akwụkwọ nke a dị nsọ.

A na m agba ama m na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ okwu nke Chineke na-ezia. A na m agba ama na rekọọdụ nke a dị nsọ “wepụtara ozizi niile nke ozi ọma, depụta atụmatụ nke nzọpụta, gwa ndị mmadụ ihe ha ahaghị ime iji nweta udo na ndụ nke a na nzọpụta nke ebighị ebi na ndụ nke na-abịa.”26 A na m agba aka ebe na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ngwa ọrụ nke Chineke iji weta na mmezu mkpokọta nke Izrel nụbchị anyị taa na inyere ndị mmadụ aka ị bịa mata Ọkpara Ya, Jizọs Kraist. A na m agba aka ebe na Chineke dị ndụ na Ọ hụrụ anyị naanya na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, bụ Onye Nzọpụta nke ụwa, isi nkume dị n’etiti nke okpukperechi anyị. A na m ekwu ihe ndị a niile n’aha nsọ nke Onye Mgbapụta anyị, Nna anyị ukwu, Onyenwe anyị, ọbụla Jizọs Kraịst, amen.