Mmezu nke Amụma
Amụma nile nke bịaworo na mmezu site na Mweghachite nke oziọma Jizọs Kraịst n’uju ya dị ọtụtụ.
Ezi Ụmụnne m ndi Nwoke na ndi Nwanyị, ọ bụrụụm ịhe nkwanye ugwu ikwu okwu na ọgbakọ zuru-ọha nke-a pụrụiche n’echeta Ọhụ Mbụ nke Josef Smit hụrụ Chineke Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, n’ime ebe a ga-akpọ Odo-Osisi dị Nsọ. Ọhụ ahụ bụ mbido dị ebube nke Mweghachite nke ọziọma ma ịhe ọzọ nile ndị emehere, site na Akwụkwọ nke Mọmọn ruo na nlaghachi nke ikike na ọtụghe-ụzọ nke ọkwa nchụaja, nhazi nke ezi Nzukọ-nsọ nke Onyenwe anyị, tempụl nile nke Chineke, ma ndị amụma ma ndị ozi ndị n’edu ọrụ nke ụbọchị ikpeazu a.
Site na atụmatụ si n’igwe, ndị amụma Chineke nke mgbe ochie, mgbe Mụọ Nsọ kpaliri ha, n’ebu amụma maka Mweghachite ma ịhe n’abịa n’ụbọchị nke anyị, ọgbọ ikpeazu na uju nke oge nile. Ọ bụ ọrụ nke ahụ “kpaliri mkpụrụ obi nile” nke ndị ọhụ-ụzọ nke isi mbụ ahụ.1 Bido n’ọgbọ nke oge gara-aga, ha kwuru maka echi, ha rọrọ nrọ, ha hụrụ ọhụụ ma buo amụma maka ọdịnịhu nke alaeze Chineke n’ụwa, ịhe Aisaia kpọrọ “ọrụ dị ịtụ-n’anya na ihe iju anya.”2
Amụma nile nke bịaworo na mmezu site na Mweghachite nke oziọma Jizọs Kraịst n’uju ya, ọbụna Nzukọ-nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a dị ọtụtụ. Taa, kosiladị, A ga m ekwu obere gbasara ole n’ole ndị nke masịrị m. Ịhe ndịa ka akụziri m site n’aka ndị nkụzi ọma m nke Praịmarị ma n’ikpere nke nne m onye mụọ ozi.
Daniel, ọnye mechiri ọdụm ndị ahụ ọnụ site n’okwukwe ya na Jizọs Kraịst ma site n’enyemaka ndị mụọ ozi nlekọta nke Chineke, bụ ọnye hụrụ ụbọchị anyị na ọhụ. Mgbe ọ n’akọwara Eze Nebukadịneza nke Baybylon nrọ, Daniel bụrụ amụma na Nzụkọ-nsọ nke Onyenwe anyị g’ebili n’ụbọchị nile nke ikpeazụ dịka okwute ntakịrị “awapụtara n’elu ugwu n’ejighi aka.”3 “Ejighi aka,” pụtara enyeamaka nke eluigwe, Nzụkọ-nsọ nke Onyenwe anyị ga-abawanye n’ike ruo mgbe ọ jupụtara ụwa nile “ma agaghi ebibi ya mọlị … [kama ị] gụzoro ruo ebighi ebi.”4
Ọ bụ ịhe akaebe dị ukwuu na okwu nile nke Daniel n’abịa na mmezu dịka ndị otú Nzukọ-nsọ, site nsọtụ ụwa nile, n’ekiri ma n’ege ọgbakọ nke-a ntị taa.
Onye ozi Pọl kwụsịrị ike n’okwukwe, kọwara “oge nile nke mweghachite ịhe nile … kemgbe ụwa ahụ bidoro.”5 Ọnye ozi Pọl dere na nime uju nke oge nile, Chineke ga “akpọkọta … nime otu ịhe, ịhe nile nime Kraịst,”6 “Jizọs Kraịst n’onwe ya bụ isi nkume ahụ.”7 Amụma ndị ahụ metụtara m n’obi otu siri ike mgbe m sonyere n’ime ofufe ido-nsọ nke Tempụl nke Rome Italy. Ndị amụma na ndị ozi nile nọ ebe ahụ n’agba ama Jizọs Kraịst, Ọnye Mgbapụta nke ụwa, dịka otu Pita na Pọl si mee. Nzụkọ-nsọ nke-a bụ ezi ọmụmatụ n’egosi nkwụghachi ahụ, ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, ma ndị otú anyị bụ ndị akaebe maka amụma eluigwe ndị ahụ eburu oge gara aga.
Josef nke Ijipt buru amụma na n’ụbọchị ikpeazụ nile: “ọnye ọhụ-ụzọ ka Onyenwe Chineke m ga-ekulite elu, onye ga-abụ onye-ọhụ-ụzọ nke a họpụtara ahọpụta nye mkpụrụ nke ukwu m nile.”8 “N’ihi na ọ ga-arụ ọrụ [Onyenwe anyị].”9 Josef Smit, ọnye amụma nke Mweghachite ahụ bụ ọnye ọhụ-ụzọ ahụ.
Jọn Onye Mkpughe ahụ buru amụma maka otu mụọozi nke Onye ahụ Kachasi-ike, ma kpọkọta ọnụ ururu ịhe nke Mweghachite ahụ site n’ji okwu ndịa: “Ma ahụrụ m mụọ ozi ọzọ ka ọ n’efe n’ime eluigwe, ma oji oziọma ebighi-ebi ahụ a g’ekwusara ndị mmadụ nile bi n’ụwa, ma mba nile, ma asụsụ nile, ma ire nile, ma ndị mmadụ.”10 Moronaị bụ mụọ ozi ahụ. Ọ hụrụ ụbọchị anyị dịka esi dee ya n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Ugboro ole n’ole ọ bịara, ọ kwadoro Josef Smit maka ije ozi ya, tinyekwa ntụgharị nke Akwụkwọ nke Mọmọn: Ịgba ama Ọzọ nke Jizọs Kraịst.
Ndị amụma ndị ọzọ kwukwara maka ụbọchị anyị. Malakaị kwuru maka otu Elaija g’esi atụgharị “obi nke ndị nna nye ndị bụ ụmụ, na obi nke ndị bụ ụmụ nye ndị nna ha.”11 Elaịja abịawo, ma nihi nke ahụ, taa, anyị nwere tempụl ruru 168 na nsọtụ ụwa nile. Tempụl ọbụla baara ndị otú tozuru oké uru ndị n’agba ndụ dị nsọ ma na anata emume-nsọ nile agọziri n’aha nke ha ma n’aha ndị nna-nna ha nwụwororịị. Ọrụ ahụ edoro nsọ dịka Malakaị kọwara bụ “ịhe dị n’etiti atụmatụ nke Onye Okike maka akaraka ebighi ebi nke ụmụ Ya nile.”12
Anyị bi n’oge ahụ eburu na amụma; anyị bụ ndị enyere ikike ịnabata Ọbịbịa nke Abụọ nke Jizọs Kraịst; anyị kwesịrị ịkpọkọta ụmụ nile nke Chineke, ndị ahụ g’anu ma bakọọ eziokwu nile, ọgbụgba ndụ nile na nkwa nile nke oziọma ebighi ebi ahụ. Onyeisi Nelson kpọrọ ya “aka-mgba ahụ kachasị, mkpa ahụ kachasi, na ọrụ ahụ kachasi n’ụwa taa”13 A nam agba akaebe m maka nke ahụ.
Dịka ọrụ m natara n’aka Onyeisi Russell M. Nelson, n’ọnwa Febụarị nke afọ a, edoro m Tempụl nke Durban South Africa nsọ. Ọ bụ ụbọchị nke m g’echeta ruo ndụ m nile. Mụ na ndị otú nọ, ndị bịakwutere oziọma dịka Jeremaịa buru n’amụma ọtụtụ oge gara aga—“otu si nime nnukwu obodo, ma abụọ si nime otu ezinụlọ.”14 Ozizi nke Jizọs Kraịst mere k’anyị nile dịrị n’otu—gburugburu ụwa nile—dịka ụmụ nwoke na nwanyị nke Chimeke, dịka ụmụnne ndị nwoke na nwanyị nime oziọma ahụ. N’agbanyeghi otu anyị yiri m’ọbụ jikee, anyị bụ otu mmadụ nwere otu Nna nke Igwe, onye atụmatụ ya kemgbe mbido bụbụrụ ma bụrụkwa ugbua maka njikọta ezinụlọ Ya site n’ịmee ma ị dobe ọgbụgbandụ nile edoro nsọ nke tempụl.
Ọnye amụma Josef Smit buru amụma nye ndị ọtu ọgbakọ ntakịrị nke ndị ji ọkwa nchụ-aja n’ebe ụlọakwụkwọ dị na Kirtland Ohio, n’afọ 1834 “Ọ bụ nanị ntakịrị Ọkwa nchụ-aja achị n’aka ka unu n’ahụ ebea n’abalị a, mana Nzukọ-nsọ a g’ejupụta North na South Amerika—ọ g’ejupụta ụwa.”15
N’afọ ndị nsonso gara-aga, A gawo m njem gburugburu ụwa izuta ndị otú nke Nzukọ-nsọ nke-a. Ụmụnnem nwoke nke Kworum nke Ndi-Ozi Iri-na-abụọ enwewokwa ụdị ije ozi a. N’agbanyeghi nke-a, onye ga emezunwu atụmatụ njem nke ezi onye amụma anyị, Onyeisi Nelson, onye njem ya dịka Onyeisi nke Nzukọ-nsọ ahụ buworo ya jee zuta ndị nsọ bi nime mba 32 nakwa mpaghara obodo dị nime U.S.16 maka ị gba akaebe nke Jizọs Kraịst ahụ dị ndụ.
E cheterem mgbe m natara ozi mgbasa oziọma m dịka nwa okorobịa. A chọbụụrụ m ije ozi na Germany, dịka nnam, nwanne m nwoke na ọgom-nwanne nwoke. Enwenwu m ike iche ka ndị ọzọ lọta ebe-obibi, a gbara m ọsọ jee n’ebe ndobe ozi ma mepe akwụkwọ-ozi ahụ. A gụtara m na akpọwọm okú ije ozi na Eastern states Mission nke isi ụlọ-ọrụ ya dị na Obodo-ukwu New York. Nke-a wuterem, nihi nke-a, a baram nime ma mehee akwụkwọ-nsọ maka nkasi obi. E bidoro m gụwa nime Ozizi na Ọgbụgbandụ nile: “Lee, ma hụrụ, e nwere m igwe mmadụ n’ebe a, na mpaghara nile gbara ebe a gburu-gburu; ma a ga-emeghe ọnụ-ụzọ a ga-eji arụsị-ọrụ ike na mpaghara nile gbara gburu-gburu n’ala ọwụwa anyanwụ nke a.”17 Amụma ahụ, nke enyere Onye amụma Josef Smit n’afọ 1833, bụụrụ Mkpughe nyere m. A mataram n’oge ahụ, na akpọworom n’ebe mgbasa ozi nke Onyenwe anyị chọrọ kam jee ozi na ya. A kụziri m maka Mweghachite ahụ nakwa otu o si bido, bido mgbe Nna anyị bi N’igwe kwuuru Josef Smit ma kwuo, “Ọnye a bụ Ọkpara M nke Hụrụ n’anya. Nụrụ nu olu Ya!”18
Nke kacha dịịrị Nzukọ-nsọ nile a mkpa bụ amụma Aisaia buru afọ karịrị 700 tupu amụọ Jizọs Kraịst: “Ma mgbe ọ g’eru n’ụbọchị nile nke ikpeazu ahụ, na ugwu ụlọ nke Onyenwe anyị ka a g’ehiwe n’elu nke ugwu nile, … ma mba nile g’asọba nime ya.”19
N’uche m taa, A nam ahụ nde kwuru nde ndị otú anyị ma ndị enyi ndị n’ekiri usoro niile ndịa site na onyonyo, intanet, m’ọbụ ụzọ ọzọ. Anyị nodụrụ ọdụ dịka anyị nile ọ “nọ n’elu ugwu nile.”20 Ọ bụ Brigham Young kwuru okwu amụma ndịa “Ebe a bụ ebe ahụ ziri ezi.”21 Ndị nsọ ahụ, ụfọdụ ha bụ ndị nna-nna m, rụrụ ọrụ iji hiwe Zion n’ebe Rock Mountain a “site n’uche na ọñụ onye ahụ n’achị mba nile nke ụwa.”22
E guzoro m taa n’ebe a edoro nsọ nke dọtaworo nde kwuru nde ndị ọbịa. Na 2002, Obodo-ukwu Salt Lake bụ ebe emere Egwuruegwu Olumpik nke Winter. Otú Abụ Tabanakụl gụrụ egwu na mmepe mmemme ahụ, ma Nzụkọ-nsọ nke-a gosiri ọtụtụ concert ma mee ọtụtụ emume maka ndị ọbịa si ọtụtụ mba bịa. A ga m echeta mgbe nile ị hụụ tempụl n’azụ akụkọ ndị agbasara n’ụwa nile mgbe ahụ.
Kemgbe afọ ndị ahụ gara-aga, ndịiisi United States, ndị eze, ndị ikpe, ndị ọchịchị, ndị ambasadọ, na ndị ọrụ mba ọzọ abịawo Obodo-ukwu Salt Lake ma zuta ndị isi anyị. Ọnyeisi Nelson kpọrọ ndị ịsi Otu Ndi N’ahụ maka Mmelite ndị Isi Ojii ọbịa, ndịa bụ otu nọ nime United State n’ahụ na mmadụ nwere otu ugwu ma n’agaghị enwe mmegbu nihi agbụrụ. Echetaram i guzo ụbụ n’ụbụ n’akụkụ ndị enyi na ndị isi ndị ahụ dịka Onyeisi Nelson sonyere ha n’ịkpọ okú ka enwe “mbawanye mkpaso ezi agwa na ezi nkwekọrịta n’etiti agbụrụ nke ụwa.”23
Ọtụtụ ndị ọzọ abịawo na Ogige Tempụl ma zutakọrịta na kansịl ha na ndị isi Nzukọ-nsọ. N’ọmụmatụ, afọ nke-a gara-aga, ka m kwuo obere, anyị nabatara ndị Ọgbakọ Civil Society nke 68 nke United Nation, nke ahụ bụ ọgbakọ zuru-ụwa, ma bụrụ nke mbụ emere n’ezi Obodo-ukwu New York. Anyị ezutawo otu Kọmitii Okpukpere-chi nke Vietnam, ma ndị ambasadọ nke Kuba, nke Philippine, Argentina, Romania, Sudan, Qatar, na Saudi Arabia. Anyị anabatawokwa ode akwụkwọ-ukwu nke Otú Mba-uwa Ndi Alakụba.
Ịhe m n’akọwa bụ mmezu amụma Aịsaịa buru na n’ụbọchị ikpeazu nile, mba nile g’asọba nime “ugwu ụlọ nke Onyenwe anyị.”24 Tempụl ukwu nke Salt Lake gụzoro n’etiti ịdị ebube ahụ.
Ọ bụghị mma obodo mara n’akpọta ndị mmadụ, n’agbanyeghi na obodo anyị dị ebube; ọ bụ ịhe dị nime okpukperechi anyị dị ọcha, nke n’apụta ihé na mmụọ, ọganihu, ịdịmma ma obi sara mbara nke Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi-ikpeazu a na ndị otú ya; ịhụnanya anyị dịka Chineke si ahụ n’anya, ma ntinye uchu nime ịhe nrọpụta dị elu, nke Josef Smit kpọrọ “ọrụ nke Kraist.”25
Anyị amaghị mgbe Onye Nzọpụta ga-alaghachi, mana nke-a k’anyị mara. Anyị kwesịrị ịkwado n’obi ma n’uche, tozuo oke ị nabata Ya, ma nweta nkwanye-ugwu isonye nime ịhe nile eburu n’amụma ọtụtụ oge gara-aga.
A nam agba ama na Onyeisi Russell M. Nelson bụ onye amụma nke Onyenwe anyị n’ụwa, ma n’akụkụ ya bụ Ndị Ozi Chineke kpọrọ, ndị a na-akwado dịka ndị amụma, ndị ọhụ ụzọ na ndị mkpughe. Ọzọkwa, ezi ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị, mweghachite ahụ kana a ga nihu.
A ga m emechi site n’amụma nke Josef Smit buru, okwu ndị m n’agba ama na ha bụ eziokwu: “Enweghi aka rụrụ arụ g’akwụsị ọrụ nke-a agala n’ihu; mkpagbu g’abịa n’ike, igwé mmadụ g’etikọta aka ọnụ, ndị agha g’agbakọ, ebubo-ụgha g’achọ imebi aha, mana eziokwu ahụ nke Chineke g’eje n’ihu atụghị ụjọọ, jidesie ezi ukpuru ya aka, ma nọrọ n’onwe ya, ruo mgbe ọ rikpụru ala-ukwu nile, zute mpaghara nile, zachaa obodo nile, daa na ntị nile, ruo mgbe ebumnuche nile nke Chineke mezuworo, ma Nnukwu Jehova ahụ ekwuo na ọrụ ahụ emezuwo.”26 Otu a ka m n’agba ama na amụma nile nke Josef Smit ka a n’emezu.
A na m ekwe nkwa na dịka unu n’esoro ndụmọdụ nsọ nke ezi onye amụma anyị, Onyeisi Russell M. Nelson, ndị ndụmọdụ ya, nke Ndị Ozi, na nke Ndi Ndụ Nzụkọ-nsọ ndị ọzọ, ma dịka ị n’egere ntị nye ndị amụma mgbe ochie ndị buru amụma maka ụbọchị anyị, ị g’ejupụta na mụọ na ọrụ nke Mweghachi ruo ime obi na mkpụrụ-obi gị. A nam ekwe nkwa na ị g’ahụ aka Chineke nime ndụ unu, nụta mkpali Ya ma nwete mmetụta nke ịhụnanya Ya. N’aha nke Jizọs Kraịst, jiri obi ekele maka Mweghachite nke oziọma Ya na Nzukọ-nsọ Ya, nke n’egosi ịhụnanya Ya n’enweghi atụ, amen.