Ọgbakọ Zuru ọha
Otu Ọkwa nchụaja si Agọzi Ndị-ntoroọbịa
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Otu Ọkwa nchụaja si Agọzi Ndị-ntoroọbịa

Enyere anyị ohere ọma ịkuzi dịka ndị mụọ-ozi, ikwusa oziọma n’elu cọntinent nile nke ụwa, ma nyere mkpụrụ-obi nile aka ịbịakwute Kraịst.

Ụmụnne nwoke na nwanyị, E nwere m ezi obi-ekele ịgwa unu okwu na mgbede a pụrụ-iche gbasara onyinye dị-nsọ nke ọkwa nchụaja na ikike dị-egwu o nwere ịgọzi ndị ntorobịa nime ọgbọ nke a. A na m ekpe-ekpere ka Mụọ nyere m aka n’ikuzi eziokwu agbanyeghị ezughị-oke m nile.

Otu Ndị-isi Mbụ echeterela ndị nile ji ọkwa nchụaja nke Erọn na “unu bi nime ụbọchị nke nwere ohere-ọma na aka-mgba nile dị ukwuu—ụbọchị nke eweghachiworo ọkwa nchụaja. Unu nwere ikike iji emume-nsọ nile nke Ọkwa nchụaja Erọn rụọ-ọrụ. Dịka unu ji ekpere na itozu-oke na arụ ọrụ ahụ, unu ga-agọzi nke-ọma ndụ nile nke ndị gbara unu gburu-gburu.”1 Dịka ndị ikom-nta nke Nzukọ-nsọ, a na echetakwara anyị na anyị bụ “[ụmụ ndị nwoke] nke Chineke hụrụ n’anya, ma O nwere ọrụ [anyị] ga arụ”2 ma anyị na-enye aka nime ọrụ Ya “iweta na mmezu anwụgh-anwụ na ndụ ebighị-ebi nke mmadụ” (Moses 1:39).

Ọkwa nchụaja bụ ikike iji emume-nsọ na ọgbụgba-ndụ nile nke oziọma Onye-nzọpụta rụọ ọrụ nye ndị nile tozuru-oke ịnata ha. Site na emume-nsọ nile nke ọkwa nchụaja na ọgbụgba-ndụ nile dị nsọ ka ngọzi nile nke aja mgbaghara mmehie Onye-nzọpụta na-abịa na uju nke na enyere anyị aka inweta akaraka si na chi.

Josef Smit bụ onye-ikom nta onye Chineke kpọrọ iweghachita oziọma nke Jizọs Kraịst na, nihi nke ahụ, enyere ọkwa nchụ-aja, nke ojiri gọzie mmadụ nile. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 135 kwupụtara ọtụtụ ngọzi nile nke Josef nyerela ndị ntorobịa nke ọgbọ nke a. Anyị gụrụ: “Josef Smit … emewo karịa, ma-ọbụghị Jisus nanị, n’ihi nzọputa nke mmadụ n’ime ụwa nke a, karịa madụ ọbụla ọzọ nke biworo n’ime ya. … O wepụtawo Akwụkwọ nke Mọmọn … ; o zipụwo na uju oziọma mgbe nile na-adịgịde … gaa n’akụkụ anọ nile nke ụwa; o wetawo mkpughe nile ahụ na iwu nsọ nile ndị mejuworo akwụkwọ [nke] Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile … ; ọ kpọkọtawo ọtụtụ puku nile nke Ndị-nsọ Ụbọchị-ikpeazụ a, … ma hapụ ịdị ukwuu na aha nke na-agaghị egbu egbu” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 135:3).

Ịrụ ọrụ dị ka Josef rụrụ, anyị ga etozurịrị iji ọkwa nchụaja nke Onyenwe anyị rụọ ọrụ. Ka a na-atụgharị-asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn, Josef na Oliver Cowdery chọrọ ime baptism, kama ha enweghị ikike zuru-oke. Ụbọchị May 15, 1829, Jọn Omee Baptizm bịakwutere ha ka ha na-ekpe ekpere, ma nye ha ọtụghe-ụzọ nile na ikike nke ọkwa nchụaja nke Erọn, kwuo, “N’elu unu ndị odibo ibe m, site n’aha nke Mesaịa, ka m na-enyefe Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn, nke ji ọtụghe-ụzọ nile nke nkwusa ozi-ọma nke ndị mụọ-ozi na nke ozi-ọma nke nchegharị, na nke ime-baptism site na-imikpu n’ime mmiri maka nsachapụ nke mmehie nile”(Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile13:1)

Enyere anyị ohere ọma ịkuzi dịka ndị mụọ-ozi, ikwusa oziọma n’elu cọntinent nile nke ụwa, ma nyere mkpụrụ-obi nile aka ịbịakwute Kraịst. Ọrụ nke a dobere anyị na ime otu ọrụ nke Jọn Omee Baptizm, Moronaị, Josef Smit, Onye-isi Nelson, na ndị odibo ọzọ nile nke Onye-nwe-anyị.

Ọrụ anyị na ọkwa nchụaja Ya na ewekọta ndị ahụ chọrọ isoro ma bie ndụ nkuzi nile nke Onyenwe anyị nke ọma, nke m mara siri-ike dịka anyị na-ahụ aka-mgba nile nke ntorobia. Kama ịdị na otu anyị na ndị odibo nile nke Onyenwe anyị imezu ọrụ Ya ga-enyere anyị aka imeri ọnwụnwa na nduhie nile nke onye-iro. Inwere ike bụrụ ihé nye ndị nile na amatachaghị onwe ha. Ihé si gi na-ahụ ga-achasike nke ga-eme onye ọbụla nọ gị nso ga-enweta ngozị. O nwere ike sie ike mgbe ụfọdụ ịmata ọnọdụ nke mụọ ndị-nsiso anyị, kama enwere m obi-ekele ịmata na a bụ m onye-otu nke kworum ọkwa nchụaja nwere okwukwe nke m nwere ike ịrụ ọrụ ịbiaru Kraịst nso.

Nime anyị na ndị enyi na ezinaụlọ anyị, Mụọ Nsọ ahụ bụ otu nime ndị-nsiso anyị kachasị mkpa. Kama ịnweta Ya mbge ọbụla, anyị ga edobe onwe anyị n’ime ọnọdụ na ebe nile Ọ ga achọ ịnọ. Nke a nwere ike bido na ebe-obibi anyị nile dịka anyị na-eme ha ebe dị nsọ site na isoro na ịmụ akwụkwọ-nsọ na ekpere ụbọchị ọbụla dịka ezinaụlọ na, nke ka mkpa, dịka anyị na-amụ akwụkwọ-nsọ nile ma kpee ekpere na onwe anyị.

Foto, oyiyi
Enzo na nwanne ya nwanyị
Foto, oyiyi
Enzo na ezinaụlọ ya

Nime afọ nke a,enyere m ohere ọma dị umeala inyere nwanne m nwanyị nta Oceane, aka, ịga nihu na-ụzọ ọgbụgba-ndụ site na ịnabata ime baptism ma mezuo otu nime ihe aga emerịrị ibanye ala-eze selestial. Ọ hapụrụ ime baptism otu ọnwa, tupu echie m onye nchụaja, inye m ohere imee emume nso ahụ, ka ụmụnne-nwanyị anyị ndị-ọzọ nwekwara ohere ịrụ ọrụ na okpuru ọrụ ọkwa nchụaja na nọrọ dịka ndị aka-ebe. Dịka anyị guzoro na akụkụ nile nke fọnt chee onwe anyị ihu ma jikere ịbanye na miri, A hụrụ m mkpalite mmetụta ya, dịka nkem. Ma enwere m mmetụta ịdị-na-otu, ka m hụrụ na mkpebi ya dị nma. Ohere ọma nke a iji ọkwa nchụaja rụọ ọrụ mere ka m kpachapụ anya na ibi-ndụ oziọma m. Inwe ike kwado, A gara m temple ụbọchị ọbụla na izu-ụka ahụ, ebe nne m, nne-nne m, na nwanne m nwanyị kwadoro m ime baptism maka ndị nwụrụ-anwụ.

Nhụmihe nke a kuziri m ọtụtụ ihe gbasara ọkwa nchụaja na otu m nwere ike iji ya rụọ ọrụ na itozu-oke. A ma m na ndị nile nwere ọkwa nchụaja nwere ike nwee ụdị mmetụta ndị ahụ m nwere ma ọbụrụ na anyị soro ihe ịmatụ nke Nifaị ị “ga ma mee.” (lee 1 Nephi 3:7). Anyị agaghị anọrọ na nkiti ma chọ ka Onyenwe anyị were anyị rụọ ọrụ ebube Ya. Anyị ekwesịghị iche ka ndị chọrọ enyem aka anyị chọta anyị; ọ bụ oke na ọrụ anyị dịka ndị ji ọkwa nchụaja ịbụ ihe ịmatụ ma kwụrụ dịka ndị aka-ebe nke Chineke. Ọbụrụ na anyị na-eme mkpebi nile na-emebi ọganihu ebigh-ebi anyị, anyị ga agbanwerịrị ugbua. Setan ga-anwa ike ya idobe anyị na ọnọdụ nke ịchọ obi-ụtọ nile abaghị uru. Kama a mara m na ọbụrụ na anyị gbaa mbọ, chọọ ndị ga-akwado anyị, ma chegharịa ụbọchị ọbụla, ngọzi nile ga-apụta ga-adị egwu ma ndụ anyị nile ga-agbanwe ruo mgbe nile dịka anyị nọgidere ịga n’ihu na ụzọ ọgbụgba-ndụ.

A ma m na nke a bụ ezigbo Nzukọ-nsọ nke Kraịst, onye bụ Onye-nzọpụta anyị ma were ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja nye ndị-ozi Ya, ndị na-eji ya edu anyị, nke ka nke nime ụbọchị nile nke aka-mgba, ma kwado ụwa maka niọghachite Ya.

A ma m na Josef Smit bụ onye-amụma nke Mweghachi ma na Onyeisi Nelson bụ onye-amụma anyị dị ndụ taa. A na m akpọku anyị nile ịmụ ndụ nile nke ndị ji ọkwa nchụaja dị ukwuu ma gbalia imezi onwe anyị ụbọchị nile ka anyị nwere ike ịdị na nkwado ịhu Onye-mere anyị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Otu Ndị-isi Mbụ, nime Imezu ọrụ M nye Chineke (booklet, 2010), 5.

  2. Isi-okwu kworum Ọkwa nchụaja nke Erọn, nime General Handbook: Ịrụ-ọrụ nime Nzukọ-nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ,, 10.1.2, ChurchofJesusChrist.org.

Bipụta