Tulee Ịdị mma na Ịdị Ukwuu nke Chineke
A na m akpọku gị icheta kwa ụbọchị ịdị ukwuu nke Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst na ihe ndị Ha mewooro gị.
Site na mgbe niile, ọbụna ma kacha nke n’oge ndị siri ike, ndị amụma a gbawo anyị ume icheta ịdị ukwuu nke Chineke na itule ihe O mewooro anyị dị ka na onwe anyị, dị ka ndị ezi na ụlọ, na dị ka ndị dị iche iche.1 Ntụzi aka nke a ka a na ahụta ebe niile n’ime akwụkwọ nsọ kama ọ bụ ihe pụtara ihé nke ọma n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Ihu akwụkwọ ya na-akọwa na otu n’ime nzube nke Akwụkwọ nke Mọmọn bụ “igosi ndị ụlọ nke Izrel fọdụrụnụ ihe ukwuu niile nke Onyenwe anyị meworo ndị nna ha.”2 Mmechi Akwụkwọ nke Mọmọn tinyekọtara arịrịọ nke Mọmọn: “Lee, a ga m agba unu ume ka mgbe unu ga-agụ ihe ndị a … na unu ga-echeta otu Onye-nwe siri nwe obi ebere nʼebe ụmụ nke mmadụ nọ, … ma tụgharịa ya nʼuche nʼime obi unu nile.3
Arịrịọ na-enweghị mgbanwe ndị sitere n’aka ndị amụma maka ịtụgharị uche na ịma mma nke Chineke pụtara ìhè.4 Nna anyị nke Bi N’eluigwe chọrọ ka anyị cheta ịma mma Ya na nke Ọkpara Ya Ọ Hụrụ n’anya, a bụghị maka afọ ojuju ha kama maka mmetụ ụdị ncheta ahụ nwere n’ebe anyị nọ. Site n’itule obi oma Ha, echiche na nghọta anyị ga-abawanye. Site n’ịtụgharị uche na ọmịiko Ha, anyị adịrịzi umeala karịa, jupụta n’ekpere, ma kwudosie ike.
Otu nhumihe n’enweghị nchefu m nwetere n’aka otu onye rịaburu ọrịa gosiri otu obi ekele maka mmepụ aka na ọmịiko nwere ike iji gbanwee anyị. N’afọ 1987, abịara m mata Thomas Nielson, otu nwoke ama nkeọma onye nwere mkpa inwete mkpụrụ obi ọzọ. Ọ gbara afọ 63 ma o bi n’ime Logan, Utah, n’ime United States. Na-ijecha ozi ndi agha n’oge Agha nke Ụwa II, ọ lụrụ Donna Wilkes n’ime Tempụl Logan Utah. Ọ bịara bụrụzie onye gbasiri ike n’akpụ briiki na- eme nke ọma. N’afọ ndị sochirinụ ọ bịara nwee mmasị ịrụkọta ọrụ ya na nwanwa ya mbụ, Jonathan, mgbe ụlọakwụkwọ mechiri. Ha abụọ wulitere njikọ pụrụiche, n’otu ụzọ n’ihi na Tom hụtara ọtụtụ ihe banyere onwe ya n’ime Jonathan.
Tom hụtara iche mkpụrụobi sitere n’aka onye ọzọ dịka ihe siri ike. Ọ bụghị nwoke nwere ndidi n’onwe ya. Ọ nwewo ike ihiwe ma nweta ebumnobi ya site n’ịrụsi ọrụ ike na ime mkpebi siri ike. Site na nrịanrịa nke obi nkuchi, ndu ya na-ejighị aka, Tom mgbe ụfọdụ n’ajụ m ihe m n’eme ka emee usoro ihe ahụ ọsọ ọsọ. N’egwuregwu, ọ tụpụtara ụzọ ndị m nwere ike gaa nke ga-eme mkpụrụobi onye ọzọ abịara ya oge n’adịghị anya.
Otu ụbọchị obiụtọ ma jupụtara n’ụjọ, e nwetara otu mkpụrụobi nke onye ọzọ dabara adaba maka Tom. Otu ọ ha na ụdị ọbara ya dabara adaba, ma onye nwe mkpụrụobi ahụ dị nta, nanị afọ 16 ka ọ gbara. Mkpụrụobi ahụ bụ nke Jonathan, nwanwa Tom ọ hụrụ n’anya. N’isi ụtụtụ ụbọchi ahụ, Jonathan merụrụ nnukwu ahụ mgbe ụgbọ onyoko kụrụ ụgbọ ala ọ na-anya.
Mgbe m gara leta Tom na Donna na ụlọ ọgwụ, ha enweteghị onwe ha. Ọ rara nnukwu ahụ iche banyere ihe ha n’agabiga, ịmata na ndụ nke Tom nwere ike gbatịa site n’itinye mkpụrụobi nke nwanwa ya. Na mbụ, ha ekweghị anara mkpụrụobi enyere ha si n’aka nne na nna Jonathan, nwa ha nwanyị na ọgọ ha nwoke na-eru uju. Tom na Donna maara, n’agbanyeghị, na Jonathan anwụọla nụbụrụ isi, ma bịa ghọta na ekpere ha maka mkpụrụobi onye ọzọ maka Tom e buteghị ihe mberede nke Jonathan. Mba, mkpụrụobi Jonathan bụụrụ onyinye nke nwere ike ịgọzi Tom n’oge mkpa ya. Ha bịara mata na ihe dị mma nwere ike si n’ime ihe ike nke a pụta ma ha kpebiri ịganiihu.
Usoro mbugharị ahụ gara nke ọma. Emesịa, Tom bụụrụ nwoke dị iche. Mgbanwe ahụ karịrị ahụike melitere ma ọbụna obi ekele. Ọ gwara m na ya chere maka Jonathan ụtụtụ niile, na nwa ya nwanyị na ọgọ ya nwoke, n’onyinye o nweteworo na ihe onyinye ahụ buworo. Ọbụnadị ihu ọchị ejiri mara ya na mkpebi ya pụtara ihé nke ọma, a hụtara m na Tom dịịrị umeala karịa, nwe ezi uche, ma nwe obi ọma.
Tom biri afọ 13 agbakwunyere kemgbe emesịrị mbugharị ahụ, afọ ndị ọ garaghị enwete na nkịtị. Ịma ọkwa olili ya depụtara na afọ ndịa kwere ya imetụ ndụ nke ndị ezi na ụlọ ya na ndị ọzọ na mmepụ aka na ịhụnanya. Ọ bụ onye enyemaka nkeonwe na onye eji ama atụ olileanya na mkpebi.
Dị ka Tom, onye ọbụla n’ime anyị anatawo onyinye ndị nke anyị enweghị ike enye onwe anyị, onyinye ndị nke sitere na Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ n’anya, tinyekọta mgbapụta site na aja mgba ghara mmehie nke Jizọs Kraịst.5 Anyị anatawo ndụ n’ime ụwa nke a; anyị ga-anata ndụ anụ ahụ ma emesịa, nakwa nzọpụta na mbuli elu dị ebigh ebi—ma ọbụrụ na anyị họrọ ya—nanị n’ihi Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst.
Oge niile anyị tinyere n’ọrụ, rite site na ya, ma ọbụ ọbụna chee maka onyinye ndịa niile, anyị kwesịrị itule aja ahụ, mmepụ aka, na ọmịiko nke ndị n’enye enye. Nkwanye ugwu maka ndị n’enye n’eme nnukwu ihe karịa nanị inye anyị obi ekele. Itule uche na onyinye Ha niile nwere ike ma kwesịrị ịgbanwe anyị.
Otu mgbanwe amaara ama bụụrụ nke Alma Nta. Dịka Alma naara “agagharị n’ibu agha megide Chineke,”6 onye mmụọ ozi pụtakwutere ya. Jiri “olu nke egbe eluigwe,”7 onye mmụọ ozi ahụ jụrụ Alma ajụjụ maka imegbu ndị Nzukọ nsọ na “idupụ obi ndị mmadụ.”8 Mmụọ ozi ahụ gbakwunyere ndụmọdụ nkea: “Gaa, ma cheta ike nke ndị nna gị …; ma cheta ihe ukwuu niile Chineke mewooro ha.”9 N’ime mgbam ume niile dị ire, nke ahụ bụụrụ ihe mmụọ ozi kwusiri ike maka ya.
Alma chegharịrị ma chetakwa. O mesịrị gwa nwa ya nwoke Helaman mgbam ume ahụ. Alma nyere ndụmọdụ, “Ọ dị m ka asị na ị ga-eme dịka m meworo, n’icheta ndọkpụ n’agha nke ndị nna anyị ha; n’ihi na ha nọọrọ n’ịbụ-oru, ma ọdịghị onye nwere ike ịnapụta ha ma ọbụghị Chineke nke Abraham, Aịsak, na Jekọb; ma n’ezie ọ napụtara ha na mkpagbu ha niile.”10 Alma kwuru n’obi umeala, “A na m etinye ntụkwasị obi m na ya.”11 Alma ghọtara na site n’ịcheta nnapụta site na ibu oru na nkwado n’oge “mnwale na nsogbu niile ụdị ọbụla,” anyị na-abịa mata Chineke na eziokwu nke nkwa Ya niile.12
Mmadụ ole ma ole n’ime anyị nwere nhụmihe dị egwu dịka nke Alma, n’agbanyeghị mgbanwe anyị nwekwara ike dị omimi. Onye Nzọpụta rịọrọ mgbe gboo:
“Mkpụrụobi ọhụrụ kwa ka m ga-enye gị ma mụọ ọhụrụ ka m ga-etinye n’ime gị: ma aga m ewepụ mkpụrụobi kpọrọ akpọ … , ma a ga m enye gị mkpụrụobi dị ndụ.
Ma a ga m etinye mụọ n’ime unu. …
“… Ma unu ga-abụ ndị m, ma a ga M abụ Chineke unu.”13
Onye Nzọpụta bilitere n’ọnwụ gwara Ndị Nifaị otu mgbanwe a si ebido. Ọ chọpụtara otu njirimara pụtara ihé n’ime atụmatụ Nna nke Eluigwe mgbe O kwuru:
“Ma Nna m zitara m ka e wee bulie m n’elu obe; ma mgbe e buliworo m n’elu obe, ka m wee dọtara mmadụ niile onwe m. …
“Ma n’ihi nke a ka e buliteworo m elu; ya mere, dịka ike nke Nna siri dị aga m adọtara onwe m mmadụ niile.”14
Gịnị ka ọ ga ewe gị ịbịakwuru Onye Nzọpụta? Tulee nranye nke Jizọs Kraịst nye uche nke Nna Ya, mmeri Ya megide ọnwụ, iwekwasị n’Onwe Ya njọ na njehie gị niile, Ya ịnata ike site na Nna Ya ikwuchitere gị, na mgbapụta Ya kacha elu maka gị?15 Ọ bụ na ihe ndị a niile erughị ịdọkpute gị na Ya? Ha bụ maka mụ. Jizọs Kraịst “jiri aka mepere emepe guzoro, nwee olileanya ma dịrị njikere ịgwọ ọrịa, ịgbaghara njọ, ịsacha, ịgba ume, ime ka adị ụcha, ma doo [mụ na gị] nsọ.”16
Eziokwu ndịa niile kwesịrị inye anyị mkpụrụobi ọhụrụ ma kpalite anyị ị họrọ i soro Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst. N’agbanyeghị ọbụna mkpụrụobi ọhụrụ “nwere ike ịkpafu, … nweekwa ike ịhapụ Chineke ahụ [anyị] hụrụ n’anya.”17 Ịmerị agwa nkea, anyị kwesịrị ịtụgharị uche ụbọchị niile na onyinye niile anyị nataworo na n’ihe ndị ha gosipụtara. Eze Benjamin nyere ndụmọdụ, “Ọ ga-adị m mma na unu ga-echeta, ma oge niile na-echeta, ịdị ukwuu nke Chineke … na ịdị mma ya na ogologo-ntachi-obi o nwere n’ebe unu nọ.”18 Ọ bụrụ anyị emee otu a, anyị etozuo maka ngọzi niile pụrụ iche nke eluigwe.
Itule uche n’ịdị mma na ebere nke Chineke n’enyere anyị aka dịkarịchaa na njikere ịnabata ihe nke mụọ. N’otu aka ahụ, ịdị nkọ nke ime mụọ bara ụba n’enye anyị ohere ị mata eziokwu nke ihe niile site n’ike nke Mụọ Nsọ.19 Nke a gụnyere ọgbụgba ama nke eziokwu jupụtara na Akwụkwọ nke Mọmọn; ịmata na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke onwe anyị; na ịnabata na ozi ọma Ya ka eweghachiteworo n’ụbọchị ikpeazụ a.20
Mgbe anyị chetara ịdị ukwuu nke Nna anyị nke Eluigwe na Jizọs Kraịst na ihe ndị Ha mewooro anyị, anyị agaghị eleda Ha anya, dị ka otu Tom eledaghị mkpụrụobi nke Jonathan anya. N’ụzọ jupụtara n’ọńụ na nkwanye ugwu, Tom chetara n’ụbọchị ọbụla ihe ike ahụ nke weteere ya ndụ ogologo. N’obi ụtọ ịmata na enwere ike ịzọpụta anyị ma bulie anyị elu, anyị kwesịrị icheta na nzọpụta na mbuli elu bịara n’oke ọnụ ahịa.21 Anyị nwere ike na nsọpụrụ jupụta n’ọńụ dị ka anyị na amata na ewezuga Jizọs Kraịst, anyị lara n’iyi, mana n’ime Ya, anyị nwere ike nata onyinye ahụ kachasị ukwuu Nna nke Eluigwe nwere ike inye.22 N’ezie, nsọpụrụ nke a n’ekwe ka anyị ńụrịa ọńụ na nkwa “nke ndụ ebigh ebi n’ime ụwa nke a” ma n’ikpeazụ nata “ndụ ebigh ebi … ọbụna ebube anwụghị anwụ” n’ime ụwa nke n’abịa.23
Mgbe anyị tulere ịdị mma nke Nna anyị nke Eluigwe na Jizọs Kraịst, ntụkwasị obi anyị n’ime Ha na-abawanye. Ekpere anyị na-agbanwe n’ihi na anyị maara na Chineke bụ Nna anyị ma anyị bụ ụmụ Ya. Anyị anaghị achọ ịgbanwe uche Ya kama ime ka uche anyị na nke Ya makọọ ma nwetara onwe anyị ngọzi niile nke Ọ chọrọ inye, dabeere na-ọnọdụ na anyị ga-arịọ maka ha.24 Anyị na-achọsi ike ịdị umeala karịa, dị ụcha enweghị ntụpọ, nọgidesie ike, dịrịka Kraịst.25 Mgbanwe ndịa mere anyị etozuo oke maka ngọzi niile agbakwunyere si n’eluigwe.
Site n’ikwere na ihe niile dị mma si naka Jizọs Kraịst, anyị ga-agwa ndị ọzọ ihe banyere okwukwe anyị n’ụzọ kacha mma.26 Anyị ga-enwe mgbam ume mgbe ọrụ na ọnọdụ dị ka ọ karịrị anyị dakwasịrị anyị.27 Anyị ga akwalite mkpebi anyị idebe ọgbụgba ndụ ndị anyị meworo i soro Onye Nzọpụta ahụ.28 Anyị ga-ejupụta n’ịhụnanya nke Chineke, na-achọ inyere ndị ahụ nọ na mkpa aka ghara ikpe ha ikpe, hụ ụmụ anyị n’anya ma zụọ ha n’ụzọ eziomume, nweta nsachapụ nke njọ anyị niile, ma ńụrịa ọńụ mgbe niile.29 Ndịa bụ mkpụrụ pụrụiche nke icheta ịdị mma na ebere nke Chineke.
N’aka nke ọzọ Onye Nzọpụta dọrọ aka na ntị, “Enweghị ihe mmadụ ji emehie Chineke, ma ọbụ, onweghị onye ọ na-akpalite iwe-ọkụ ya megide, m’ọbụghị ndị ahụ ndị na-anaghị ekwupụta aka ọrụ ya n’ihe niile.”30 Echeghị m na a kparịrị Chineke mgbe anyị chefuru Ya. Kama, echere m na o wutere ya nke ukwuu. Ọ maara na anyị a napụwo onwe anyị ohere ịbịakwute Ya nso site n’icheta Ya na ịdị mma Ya. Mgbe ahụ Ọ gaghị abịaru anyị nso ma nye anyị ngọzi niile pụrụiche O kwere anyị na nkwa.31
A na m akpọku gị icheta kwa ụbọchị ịdị ukwuu nke Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst na ihe ndị Ha mewooro gị. Kwe ka ntule gị maka ịdị mma Ha jidesie mkpụrụobi gị nọ na mwagharị ike na-ebe Ha nọ.32 Tulee ọmịiko Ha, ma ị ga-enwete ngọzi agbakwunyere amamihe nke ime mụọ gị ma dịrịzie mma karịa dị ka Kraịst. Itule mmetụta ọmịiko Ha ga-enyere gị aka “ịnọgide n’okwukwe ruo ọgwụgwụ,” tutu “a nabata gị n’eluigwe” i “binyere Chineke n’ọnọdụ ańụrị n’enweghị ọgwụgwụ.”33
Nna anyị nke Eluigwe, ikwu banyere Ọkpara Ya Ọ Hụrụ n’anya, kwuru, “Nụrụ olu Ya!”34 Dị ka ị na-eme ihe n’okwu ahụ ma geere Ya ntị, cheta, n’ọńụ na nkwanye ugwu, na Onye Nzọpụta nwere mmasị iweghachite ihe ndị ị nweghị ike iweghachite; Ọ nwere mmasị ịgwọ ọnya ndị i nweghị ike ịgwọ; Ọ nwere mmasị imezi ihe nke mebiworo n’enweghị mmeta;35 Ọ na-akwụ ụgwọ maka mmegide ọbụla dakwasịrị gị;36 ma Ọ nwere mmasị imetazi kpamkpam mkpụrụobi niile tiwara etiwa.37
Dịka m tụgharịworo uche na onyinye niile sitere naka Nna anyị nke Eluigwe na Jizọs Kraịst bịa, abịawo m mata maka ịhụnanya n’enweghị ọgwụgwụ na ọmịiko Ha n’enweghị atụ Ha nwere na-ebe ụmụ Nna nke Eluigwe niile nọ.38 Amamihe nkea agbanwewo m, ma ọ ga-agbanwekwa gị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen