Ntọala Dị Mma megide Oge nke Na-abịa
N’ime afọ ndị na-abịa abịa, ka anyị kwe mmelite ndị emere na Tempụl Salt Lake ịkpali ma kwalite anyị.
Agụgụala nke Tempụl Salt Lake
Ka anyị laghachị azụ n’ehihie ekpom ọkụ nke Julaị 24, 1847, ihe dị ka elekere 2:00 ehihie. N’isote njem ụbọchị 111 siri ike nke gụnyere ndị otu Nzukọ nsọ dị 148 ndị gụnyere otu mbụ gawara ọdịda anyanwụ, Brigham Young, Onyeisi Kworum Ndi Ozi Iri na abụọ mgbe ahụ, dara ọrịa n’adịghị ike site na ahụ ọkụ nke elu ugwu, banyere Salt Lake Valley.
Abalị abụọ gachara, ka ọ na-agbake site na nrịa nrịa ya, Brigham Young duuru ọtụtụ ndị otu Kworum Ndi Ozi Iri na abụọ na ndị ọzọ gaa njem ngagharị. William Clayton dere, “Ihe ruru kwọta atọ nke otu maịlụ na ugwu nke kampụ ahụ, anyị bịaruru na-ọmarịcha ala sara asa, dị larịị ma gbada na ọdịda anyanwụ.”1
Mgbe ya na ndị otu ahụ naara elezi ebe ahụ anya, Brigham Young n’otu ntabi anya kwụsịrị ma rụnye mkpara ya n’ime ala, n’ekwupụta, “N’ebe a ka Tempụl nke Chineke anyị ga-eguzo.” Otu n’ime ndị soro ya bụụrụ Okenye Wilford Woodruff, onye kwuru na okwu a “sitere n’ime ya pụta dị ka amụma eluigwe,” ma ọ rụnyere alaka osisi n’ime ala ahụ iji hụọ mma ebe ahụ Onyeisi Young rụnyere mkpara ya. Atụala iri anọ (16 ha) ka a họpụtara maka tempụl ahụ, ma ekpebiri na obodo ahụ kwesịrị ka a hazie ya “nke ọma na sụkwịa chuwere ihu n’Ugwu & Ndịda, ọwụwa anyanwụ & ọdịda anyanwụ” ebe tempụl ga-anọ n’etiti .2
Na ọgbakọ zuru ọha nke Eprel 1851, ndị otu Nzukọ nsọ tụliri aka n’otu obi ịkwado ka arụọ tempụl “na aha nke Onyenwe anyị.”3 Afọ abụọ gasịrị, na Febrụwarị 14, 1853, ala ahụ ka edoro nsọ n’aka Heber C. Kimball na mmemme ọha nke puku kwuru puku Ndị nsọ bịara, ma e gwuru ala maka ntọala nke Tempụl Salt Lake ahụ. Ọnwa ole ma ole gasịrị, na Epril 6, nkume njikọ ukwu niile nke tempụl ahụ ka e doro ma doo nsọ na nnukwu mmemme nke gụnyere kọlọ gad na ndị egwu na ịga ije n’usoro ndị ndu Nzukọ nsọ duru site na tabanakụl ochie ruo na ebe a na-arụ tempụl, ebe e kwuru okwu ma kpee ekpere n’isi okwute anọ ọbụla ahụ.4
Na mmemme mmepe ala ahụ, Onyeisi Young chetara na ya ahụworịị ọhụ mgbe ọ zọrọ ụkwụ n’ala ahụ na mbụ dị ka ha n’ele anya n’ala ndagwurugwu ahụ, n’ekwu, “A maara m [mgbe ahụ], dị ka nnọọ otu m sịrị mara ugbua, na ebe a bụ ala nke a ga-arụ tempụl na ya—ọ nọọrọ n’ihu m.”5
Afọ iri gasịrị, Brigham Young buru amụma ndị a soterenụ na ọgbakọ zuru ọha na Ọktoba 1863: “A chọrọ m ịhụ na-arụrụ tempụl [ahụ] n’ọnọdụ nke ọ ga-anọgide ruo milenum. Nke a abụghị nanị tempụl anyị ga-arụ; a ga-enwe narị kwuru narị ha a ga-arụ ma doo nsọ nye Onyenwe anyị. A ga-ama tempụl nke a dị ka tempụl mbụ a rụrụ n’elu ugwu site n’aka Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a. … A chọrọ m ka tempụl ahụ … i guzoro dị ka ihe ncheta dị ike nke okwukwe, ntachịobi na nrụsi ọrụ ike nke ndị nsọ nke Chineke n’elu ugwu.”6
Na inyocha nke agụgụala nke a, dị nkenke, a nọ m n’echiche nke ịhụ ọhụ nke Brigham Young—na mbụ, ọ na-ahụta na, n’ụzọ dị ire na, site otu eji arụ ụlọ mgbe ahụ na-ebe ahụ, Tempụl Salt Lake ka a ga-arụ n’ụzọ nke ga-anọgide ruo oge milenum niile ma, nke abụọ, ya ibu amụma maka uto nke tempụl dị n’ihu na gburugburu ụwa, ọbụna ịgụ ha ruo narị kwuru narị.
Nrụgharị Tempụl Salt Lake
Dị ka Brigham Young, onye amụma anyị taa n’elegide Tempụl Salt Lake ahụ na ndị ọzọ anya n’oke mkpachapụ anya. N’afọ niile, Otu Ndịisi Mbụ enyewo Otu Bishọp Nduzi, site n’oge ruo n’oge, ndụmọdụ ka ha hụ na ntọala nke tempụl Salt Lake ahụ siri ezigbo ike. Mgbe m jere ozi n’Otu Bishọp Nduzi, n’arịrịọ nke Otu Ndịisi Mbụ, anyị mere nnyocha ihe niile dị n’ụlọ nke Tempụl Salt Lake ahụ, tinyekọta ntule nke nrụgharị e mere na nso nso a ịrụli ala ya elu na usoro eji ewu ihe niile.
Ebe a bụ akụkụ ndị ejiri emegharị ya nke Otu Ndịisi Mbụ wetere n’oge ahụ: “Na nhazi na owuwu nke Tempụl Salt Lake, ndị ọrụ injinia, ndị ọrụ aka, ngwa ọrụ, ihe ndị eji eme ụlọ, na ihe ndị ọzọ nọ mgbe ahụ ka ejiri rụọ ya. Kemgbe e doro ya nsọ na 1893, tempụl ahụ eguzorowo chịm ma bụrụ ngosi nke okwukwe [na] olileanya na dịka ihé nye ndị dị iche iche. Ezi nlekọta ka enyeworo iji rụọ ọrụ, doo ọcha, ma lekwa tempụl ahụ n’ọnọdụ dị mma. Granaịtị dị n’ezi na joists na osisi nkwado ala ime ụlọ ahụ nọ na ọnọdụ dị mma. Mmụta ndị e mere na nso nso a gosiri na ebe ahụ Brigham Young họọrọ maka tempụl nwere ezigbo aja ma ala ya siri ike nke ọma.”7
Nnyocha ahụ kpebiri na mmezi na mmelite dị mkpa ka ekwesịrị iji megharịa ma melite tempụl ahụ, tinyekwara ihu ụlọ na elu ụlọ, ngwa ụlọ ndị mere ochie, na ebe baptizm. Otuosiladị, ntule maka mmelite pụtara ihé nke ọma nke bidoro site na ntọala nke tempụl gbaliri elu ka a kwadoro.
Ntọala Tempụl Ahụ
Dị ka unu nwere ike i cheta Onyeisi Brigham Young n’onwe ya sooro na-eme ihe ebe ọ dị ukwuu na ntọala nsinambụ nke tempụl ahụ, nke jideworo tempụl ahụ nke ọma kemgbe arụchara ya na afọ 127 gara aga. Mmelite pụtara ihé ọhụrụ a tụpụtara maka tempụl ahụ ka a ga-eji base isolation technology eme, nke a na-echeghị nnọọ n’oge owuwu ya. Nke a ka a maara bụ nke dị ugbua, ọrụ injinịa kacha mma maka nchekwa ala ọmajijiji.
Teknụzụ nke a, e mepụtara ọhụrụ, bidoro na ntọala nke tempụl, n’ewete ezi nchekwa banyere mmebi sitere na ala ọmajijiji. N’eziokwu, ọ na-enyere tempụl aka iguzosike kwụrụ chịm, ọbụna dị ka elu ụwa na agbata ndị nọ n’akụkụ ya n’agabiga ala ọmajijiji na-emekarị.
Nrụgharị tempụl ahụ nke a ga-etinye ụdị teknụzụ a ka Otu Ndịisi Mbụ mara ọkwa ya afọ gara aga. Na ntụzi aka nke Otu Bishọp Nduzi, ebidoro nrụgharị ọnwa ole ma ole gara aga, na Jenụwarị 2020. A chọpụtara na aga emecha ya ihe ruru afọ anọ.
Ime ka Ntọala Nke Onwe Gị Kwusie Ike
Dị ka m na-atụle afọ anọ na-abịa maka ọdịdị nke tempụl Salt Lake a mara mma, pụrụ iche, dị elu, ma dị ịtụnanya, a na m ahụta ya karịa dịka oge nke mmegharị kama oge nke mmechi! N’ụdị dị otu a, anyị nwere ike jụọ onwe anyị, “Kedụ otu nrụgharị nke a dị ukwuu nke Tempụl Salt Lake si akpalite anyị inwe mmegharị, nrụgharị, mmụgharị, ntughari, ma ọbụ mweghachi-ime mmụọ nke onwe anyị?”
Itinye anya n’ime nwere ike chọpụta na anyị onwe anyịkwa na ndị ezi na ụlọ anyị nwere ike irite oke site na anyị ime ụfọdụ nlekọta anya na ọrụ mmetazi, ọbụna mmelite pụtara ihé! Anyị nwere ike ibido ụdị usoro a site n’ịjụ:
“Kedụ ihe ntọala m yiri ka ya?”
“Gịnị mejupụtara nkume etiti ahụ juru eju, kwụrụ chịm, sie ike nke bụ akụkụ nke ntọala m, n’elu ebe ama m dabere?”
“Gịnị bụ mmewere kentọala nke akparama agwa ime mmụọ m na mmetụta uche nke ga-ekwe mụ na ezi na ụlọ m iguzosi ike adaghị mba, ọbụna imeri ala ọmajijiji na nnukwu ọgbaghara pụtara ihé ga-emerịrị n’ime ndụ anyị?”
Ihe ndịa na-eme, yiri ala ọmajijiji na-ara ahụ ịchọpụta ma ọ na-abịa n’ike n’ike n’ụzọ dị iche iche—jupụtara na ajụjụ ma ọbụ obi abụọ, n’ezute mkpagbu ma ọbụ nsogbu, na-emezi mmejọ nke onwe niile gị na ndị ndu Nzukọ nsọ, ndị otu, ozizi, ma ọbụ atụmatụ. Nchekwa kachasị mma megidere ihe ndịa dabeere na ntọala nke ime mmụọ anyị.
Kedụ ihe nkume etiti ime mmụọ nke ndụ onwe anyị na ezi na ụlọ anyị ga-abụ? Ha nwere ike bụrụ ibi ndụ dị mfe nghọta, ma dịrị oke mkpa nke ụkpụrụ nke ozi ọma—ekpere ezi na ụlọ; ọmụmụ akwụkwọ nsọ; tinyekọta Akwụkwọ nke Mọmọn; ọgịga tempụl; na mmụta ozi ọma site na Bịanụ, Soro M na nnọkọ mgbede nke ezi na ụlọ. Ihe ndị ọzọ g’enye aka gbaa ntọala ime mụọ unu ume nwere ike gụnye Ndepụta nke Okwukwe, ịma ọkwa ezi na ụlọ ahụ, na “Kraịst Ahụ Dị Ndụ.”
Nye mụ onwe m, ụkpụrụ niile a gụnyere n’ime ajụjụ ndị ekwuru dịka otu ụzọ esi anata rekọmend tempụl dịka ndabere siri ike maka ntọala ime mmụọ—kacha nke ajụjụ anọ nke mbụ. A na m ahụta ha dị ka nkume etiti ime mmụọ.
Anyị, n’ezia, maara ajụjụ ndịa nke ọma, dị ka Onyeisi Russell M. Nelson gụpụtaara anyị ha n’otu n’otu n’ọgbakọ zuru-ọha nke gara aga.
-
I nwere okwukwe n’ime na ọgbụgba-ama nke Chineke, Nna nke Ebigh ebi; Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst; na Mụọ Nsọ?
-
I nwere ọgbụgba-ama nke Aja-mgbaghara-mmehie nke Jizọs Kraịst na maka ọrụ Ya dịka Onye-nzọpụta na Onye-mgbapụta gị?
-
I nwere ọgbụgba-ama nke Mweghachite oziọma nke Jizọs Kraịst?
-
Ị na-akwado Onyeisi Nzukọ-nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a dị ka onye amụma, onye ọhụụ ụzọ, na onye mkpughe na dị ka onye naanị ya nwere ikikere n’elu ụwa iji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja eme ihe?8
I nwere ike ịhụta otu i si atụle ajụjụ ndị a dị ka mmewere bara uru n’ime ntọala nke onwe gị inyere gị aka wuo ma wusie ya ike? Pọl kuziiri Ndị Efesọs ihe maka nzukọ nsọ nke e “wukwasịkwara unu n’elu ntọala ndị ozi na ndị amụma, ebe Jizọs Kraịst n’onwe ya bụ nkume isi nkuku e ji tọọ ntọala, n’ịdị n’otu nke ya na ya, ụlọ ahụ dum, ebe ọ bụ nke e jikọrọ akụkụ ya niile ọnụ, n’eto eto ka ọ ghọọrọ tempụl nsọ nye Onyenwe anyị.”9
Otu n’ime ọńụ kachasị nke ndụ m bụ ịmatazi na inwete nkwalite site n’aka ndị otu nke Nzukọ nsọ gburugburu ụwa ndị bụ ọmụmatụ dị ndụ nke okwukwe n’ime Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya. Ha nwere ntọala nke onwe siri ike nke n’enyere ha aka jiri nghọta kwusiri ike, nagide ihe ndị na-eme siri ike n’agbanyeghị obi mgbu na ụfụ.
Igosi nke a n’ọnọdụ nke onwe karịa, na nso nso a e kwuru m okwu na olili nke otu nwunye na nne mara mma, gbasiri ike dị nta (bụkwa enyi nke ezi na ụlọ anyị). Ọ bụụrụ otu scrappy Division 1 soccer player mgbe o zutere ma lụọ di ya nwa akwụkwọ dọkịnta eze. E jiri nwa nwanyị mara mma, nwere akaraka dị egwu wee gọzie ha. Ọ gbara mgba ike site n’ụdị kansa dị iche iche n’ime afọ isii tara akpụ. N’agbanyeghị nsogbu ndị nọgidere nke ime ahụ na n’elu ahụ nke ọ gabigara, ọ tụkwasịrị obi na Nna ya nke Eluigwe nwere ịhụnanya ma mgbe ụfọdụ ka ndị enyi soshal media ya n’ekwu ihe e ji mara ya: “Chineke nọ n’ime ihe niile.”
N’otu n’ime ihe ndị o dere na soshal media ya nke otu onye juworo ya, “Kedụ ka i si aganiihu inwe okwukwe n’etiti ihe mgbawa obi niile gbara gị gburugburu?” O jiri okwu ndịa zaghachị n’ekwusi ike: “N’ihi okwukwe bụ ihe na-edu m n’oge ihe isi ike ndị a. Inwe okwukwe abụghị na enweghị ihe ọjọọ ga-eme. Inwe okwukwe n’enyere m aka i kwere na a ga-enwe ihé ọzọ. Ma na ihé ahụ ga-amụke nke ọma karịa n’ihi na a gabigawo m ihe ike. Ihe ike ole ọbụla m gabigaworo n’afọ niile ndịa gara aga, e nwetewo m ihé karịa. E nwetewo m ọrụ ebube. Ọ dịwo m ka ndị mmụọ ozi nọnyeere m. A matawo m na Nna m nke Eluigwe n’ebugharị m. Enweghị nke ọbụla nke m gaara enwete ma ọ bụrụ na ndụ dị mfe. Ọdịniihu nke ndụ a nwere ike a maghị ya, mana ọbụghị okwukwe m. Ọ bụrụ na m họrọ enweghị okwukwe mgbe ahụ a họrọwo m ị ga n’ọchịchịrị. N’ihi ewezuga okwukwe, ọchịchịrị bụ nanị ihe fọrọ.”10
Ama nke okwukwe ya n’ime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’adịghị ada mba—n’okwu ya na n’ime agwa ya—bụụrụ ihe nkwalite mmụọ nye ndị ọzọ. Ọbụna na ahụ ya esighị ike, ọ kwalitere ndị ọzọ ka ha sie ike karịa.
A na m eche maka ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị otu Nzukọ nsọ, ndị gbasiri ike dị ka nwanne nwanyị a, ndị na-eme ihe n’okwukwe ụbọchị ọbụla, n’agbalịsike ị bụ ezi ndị na-eso ụzọ nke Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst na-adaghị mba. Ha na-amụ maka Kraịst. Ha na-ekwu maka Kraịst. Ha na-agbalị ime ihe dị ka Ya. Ma ọbụrụgodi na ụbọchị niile nke ndụ ha nọsiri ike ma ọbụ esighị ike, ntọala ha siri ike ma ọ dịghị ada mba.
Ndịa bụ mmụọ kwudosiri ike ndị ghọtara nkọwa dara ụda nke egwu “How firm a foundation, ye Saints of the Lord” na “ndị gbabara n’ime Onye Nzọpụta maka ebe mgbaba.”11 Obi jupụtara m n’ekele ịnọ n’etiti ndị kwadoworo ntọala ime mmụọ tozuru oke nke aha nke Ndị Nsọ na ndị siri ike ma dịrị njikere ịnagide ọtụtụ nnukwu ọgbaghara nke ndụ.
Echeghị m na anyị nwere ike kwukarịa mkpa nke ụdị ntọala a siri ike dị n’ime ndụ nke onwe anyị. Ọbụna na nwata, ụmụ anyị ndị Praịmarị ka a kụziiri dị ka ha na-agụ maka eziokwu nke a:
Nwoke amamihe ahụ rụrụ ụlọ ya n’elu nkume ahụ,
Ma mmiri ozuzo ahụ bịara n’ada n’ala. …
Mmiri ozuzo ahụ gbadara ala, ma ide mmirigbaliri elu,
Ma ụlọ ahụ dị n’elu nkumeguzosịrị ike.12
Akwụkwọ nsọ kwupụtaziri ozizi ntọala nkea. Onye Nzọpụta kuziiri ndị dị iche iche bi na Emerịka ihe:
“Ma ọbụrụ na unu ga-eme ihe ndị a oge niile ngọzi na-adịrị unu, n’ihi na e wukwasịrị unu n’elu nkume m.
“Mana onye ọbụla n’etiti unu ga-eme karịa ma-ọbụ welata aka karịa ndị a ewukwasịghị ha n’elu nkume m, kama ewukwasịrị ha n’elu ntọala aja; ma mgbe mmiri ozuzo ga-agbadata, ma ide-mmiri abịa, ma ifufe efee, ma fekwasị ha, ha ga-ada.”13
Ọ bụ ezigbo olileanya nke ndi ndu Nzukọ-nsọ na nrụgharị a pụtara ihé na Tempụl Salt Lake ga-enye aka imejupụta ọchịchọ nke Brigham Young ịhụta “tempụl ahụ arụrụ n’ọnọdụ nke ga-anọgide ruo milenum.” N’ime afọ ndị na-abịa abịa, ka anyị kwe mmelite ndịa emere na Tempụl Salt Lake ịkpali ma kwalite anyị, dịka otu onye na dịka ndị ezi na ụlọ, ka anyị kwa wee—n’ịma atụ—ka a “ga-arụpụta n’ọnọdụ nke ga-anọgide ruo milenum.”
Anyị ga-eme otu a dị ka anyị n’emejupụta iwu nke Onye ozi Pọl nyere i “[debere] na nchekwa maka [onwe anyị] ntọala dị mma megide oge nke na-abịa, ka [anyị] wee nwee ike nwete ndụ ebighị ebi.”14 Ọ bụ ekpere m dị ike na ntọala ime mmụọ anyị ga-abụ eziokwu ma kwudosie ike, na ọgbụgba ama anyị nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na nke ọrụ Ya dịka Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta ga-abụrụ anyị isi nkume njikọ, nke onye m n’agba ama n’aha Ya, ọbụna Jizọs Kraịst, amen.