Ọgbakọ Zuru ọha
“Ka Ewulite Ụlọ Nke a na Aha M”
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


“Ka Ewulite Ụlọ Nke a na Aha M”

(Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 124:40)

Ọgbagba ndụ anatara na emume nsọ emere n’ime tempụl dịcha oke mkpa nye nsacha nke mkpụrụobi anyị na maka mbuli elu kacha elu nke ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị nke Chineke.

N’ime Ọhịa oké osisi ahụ Dị nsọ afọ 200 gara aga, Josef Smit dị nta hụrụ ma kwusara Chineke, Nna nke Ebighị ebi, na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst okwu. Site n’aka Ha, Josef mụtara ihe banyere ezi ọdịdị nke Chukwu nakwa mkpughe na-aga n’ihu dị ka ọhụụ kachasịrị elu kpọbatara “ọgbọ nke uju nke oge” ụbọchị-ikpeazụ a.”1

Mgbe ihe ruru afọ atọ gachara, n’aziza nye ekpere siri ike na mgbede nke Septemba 21, 1823, ime-ụlọ nke Josef n’ehi ụra jupụtara n’ihé tutu ruo mgbe ọ dịịrị “ihé karịa ihé nke ehihie.”2 Oyiyi mmadụ pụtara n’akụkụ akwa ya, kpọọ nwata nwoke ahụ aha ya, ma kwuo na “ọ bụ onye ozi e zitere site n’ihu nke Chineke … Ma na aha ya bụụrụ Moroni.”3 Ọ gwara Josef okwu banyere ọbịbịa nke Akwụkwọ nke Mọmọn.

Ma mgbe ahụ Moronaị agwụpụta akwụkwọ nke Malakaị n’ime Agba Ochie, nke nwere ọdịiche obere n’asụsụ nke edere n’ime Ụdị nke Eze Jemis.

Lee, a ga m ekpughe nye unu Ọkwa Nchụ-aja ahụ, site n’aka nke Elaịja onye-amụma, tutu ọbịbịa nke nnukwu ụbọchị ahụ dị egwu nke Onye-nwe.

“Ma ọ ga-akụnye n’ime obi ndị bụ ụmụ nkwa nile e kwere ndị nna ha, ma obi ndị bụ ụmụ ga-atụgharịkwute ndị bụ nna ha. Asị ma-ọbụghị otu ahụ, ụwa nile ka a ga-ala n’iyi kpam kpam n’ọbịbịa ya.”4

N’ụzọ dị mkpa, okwu Moronaị gwara Josef Smit banyere ọrụ Elijah bidoro ọrụ tempụl na ọrụ agụgụala ezi na ụlọ n’ụbọchị ikpeazụ ndịa ma bụụrụ isi ihe na mweghachite “ihe niile, nke Chineke kwupụtaworo site n’ọnụ nke ndị amụma Ya niile dị nsọ kemgbe ụwa bidoro.”5

A na m ekpe ekpere maka enyem aka nke Mụọ Nsọ dị ka anyị na-amụkọta ihe ọnụ banyere ọgbụgba ndụ niile, emume nsọ niile, na ngọzi niile nke dịịrị anyị n’ime tempụl niile nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi nsọ Ụbọchi-ikpeazu a.

Mbịaghachị nke Elijah

A na m ebido site n’ịjụ ajụjụ dị mkpa: gịnị mere mbịaghachite nke Elijah ji dịrị mkpa?

Anyị na-amụta ihe site na mkpughe nke ụbọchị ikpeazụ a na Elijah jiiri ike nrachị nke Ọkwa Nchụaja Melchizedek”6 ma “ọ bụụrụ onye amụma ikpeazụ ime nke a tupu oge nke Jizọs Kraịst.”7

Onye Amụma Josef Smit kọwara: “Mụọ ahụ, ike ahụ, na ọkpụkpọ oku nke Elijah bụ, na unu ga-enwe ike ijide ọtụghe nke … Uju nke Ọkwa Nchụaja Melkizedek … ; na ị … nata … emume nsọ niile bụ nke alaeze nke Chineke, ọbụna n’ịtụgharị mkpụrụobi nke ndị bụ nna nye ụmụ ha, na mkpụrụobi nke ụmụ nye ndị bụ nna, ọbụna ndị ahụ ndị nọ n’eluigwe.”8

Ikikere nrachị nke a dị nsọ dị mkpa ka ọ bụrụ na “ihe ọbụla nke ị ga-arachị n’elu ụwa ka a ga arachị n’eluigwe: ma ihe ọbụla nke ị ga-atọghapụ n’elu ụwa ka a ga atọghapụ n’eluigwe.”9

Josef gara n’ihu kọwaa nke ọma: “Kedụ otu Chineke g’esi wee bịa napụta ọgbọ nke a? Ọ ga-ezita Elijah Onye Amụma. … Elijah ga-ekpughe ọgbụgba ndụ niile iji rachie mkpụrụobi nke ndị nna nye ụmụ ha, na ụmụ ha nye ndị nna.”10

Elijah na Mosis pụtara n’elu Ugwu nke Mnwogharị ma nyefee ikikere nke a n’isi Pita, Jemis, na Jọn.11 Elijah pụtakwutekwara ya na Mosis na Elias na Eprel 3, 1836, n’ime Tempụl Kirtland ma nyekwa otu ụdịrị ọtụghe nke ọkwa nchụaja ahụ n’isi Josef Smit na Oliver Cowdery.12

Mweghachite nke ikikere nrachị site n’aka Elijah n’afọ 1836 dịịrị mkpa ịkwado ụwa maka Ọbịbịa Nke Abụọ nke Onye Nzọpụta ma bido mmasị n’ọrụ agụgụ ezi na ụlọ mụbara nke ukwuu gburugburu ụwa.

Ịgbanwe, Ịtụgharị, na Ịsacha Mkpụrụobi niile

Mkpụrụokwu ahụ mkpụrụobi ka edere ihe karịrị 1,000 ugboro n’ime akwụkwọ nsọ niile. Okwu nke a dị mfe ma dịrị mkpa mgbe ụfọdụ n’egosi mmetụta dị n’ime mmadụ. Mkpụrụobi anyị—nchịkọta nke ọchịchọ anyị, mmetụ ịhụnanya, ebumnuche, ebumnobi, na agwa—n’akọwa onye anyị bụ ma kpebie ihe anyị ga-aghọ . Ma njirimara ọrụ nke Onyenwe anyị bụ ịgbanwe, ịtụgharị, na ịsacha mkpụrụobi site na ọgbụgba ndụ ozi ọma na emume nsọ nke ọkwa-nchụaja.

Anyị anaghị ewu ma ọbụ a banye tempụl nsọ nanị inwete nhụmihe ncheta nke onwe ma ọbụ nke ezi na ụlọ. Kama, ọgbagba ndụ anatara na emume nsọ emere n’ime tempụl dịcha oke mkpa nye nsacha nke mkpụrụobi anyị na maka mbuli elu kacha elu nke ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị nke Chineke.

Itinye n’ime mkpụrụobi ụmụ ya nkwa niile emere nye ndị nna ha—ọbụna Ebreham, Aịzik, na Jekọbb—ịtụgharị mkpụrụobi nke ụmụ nye nke nna ha, ime nchọcha agụgụala ezi na ụlọ, na ime emume nsọ nnọchị anya nke tempụl bụ ọrụ ndị na-agọzi ndị mmadụ ma n’ọnwụ ma na ndụ. Dị ka anyị bịara dịrịzie uchu n’ọrụ nke a dị nsọ, anyị n’enye nrube isi n’iwu nsọ niile inwe ịhụnanya ma jeere Chineke na ndị agbata obi anyị ozi.13 Ma ụdị ije ozi a na-achọghị uru n’enyere anyị aka ị “Nụrụ Ya!”14 ma bịakwute Onye Nzọpụta.15

Ọgbụgba ndụ kachasị ịdị nsọ na emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja ka a na-anata nanị n’ime tempụl—ụlọ nke Onyenwe anyị. Ihe niile nke amụtara na ihe niile nke emere n’ime tempụl n’ekwusị ike gbasara ịdị nsọ nke Jizọs Kraịst na ọrụ Ya n’ime atụmatụ ukwu nke ańụrị nke Nna nke Eluigwe.

N’esi N’ime Obi Apụta Ihé

Onyeisi Ezra Taft Benson kọwara otu usoro dị mkpa Onye Mgbapụta n’eji n’iwete “na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke mmadụ.”16 O kwuru: “Ọrụ Onyenwe anyị n’esi n’ime obi apụta ihé. Ndị ụwa na-adabere n’ihe ahụrụ anya karịa ihe dị n’ime. Ụwa ga-akpọpụta ndị mmadụ pụọ na apịtị. Kraịst n’ewepụ apịtị site na ndị mmadụ, ma emesịa ha ewepụ onwe ha pụọ na apịtị. Ụwa ga-emezi ndị mmadụ site n’ịgbanwe agbata ha. Kraịst na-agbanwe ndị mmadụ, ndị ga-emesị gbanwee agbata ha. Ụwa ga-ahazi agwa mmadụ, mana Kraịst nwere ike gbanwe ọdịdị mmadụ.”17

Ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ ọkwa nchụaja bụ isi n’usoro n’aganihu nke mmụgharị na mgbanwe ime mụọ; ha bụ ụzọ nke anyị na Onyenwe anyị na-esi arụkọta ọrụ si n’ime obi pụta ihe. Ọgbụgba ndụ niile nke edebere n’okwukwe, echetere mgbe niile, ma dee ya jiri Mụọ nke Chineke dị ndụ … n’elu mkpụrụobi anyị”18 n’ewete nzube na mmesi obi ike nke ngọzi niile n’ụwa a na mgbe ebighị ebi. Emume nsọ ndị anatara na ntozu oke na nke echetere mgbe niile na-emepe ụzọ nke eluigwe ebe ike nke ndụ iyi Chineke nwere ike si bata n’ime ndụ anyị.

Anyị anaghị abịa na tempụl izo ezo ma ọbụ ịgbanarị njọ niile nke ụwa a. Kama, anyị na-abịa na tempụl imeri ụwa nke njọ. Dịka anyị na-akpọbata nime ndụ anyị ike nke ndụ iyi Chineke”19 site n’ịnata emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja na ime na idebe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ, ejiri ike karịrị anyị gọzie anyị20 imeri ọnwụnwa na aka mgba niile nke ndụ anụ ahụ na ime na ịdịrịzi mma.

Okwu a na-ekwu maka Ụlọ Nke a Ga- Agbasa

Tempụl nke mbụ nke ọgbọ nke a ka a rụrụ n’ime Kirtland, Ohio, ma nyefee n’ọrụ Chukwu na Machị 27, 1836.

N’otu mkpughe enyere Onye Amụma Josef Smit otu izu ụka emesịrị ido nsọ, Onyenwe anyị kwuru:

“Ka obi ndị nke m nile n̄ụrịa ọn̄ụ, ndị, jiri ume ha, wuo ụlọ nke a n’aha m. …

“E obi nke puku kwuru puku na iri puku kwuru iri pụku ga-an̄ụrị oke ọn̄ụ n’ihi ngọzi nile nke a ga-awụpụta, na onyinye dị-nsọ nke e jirila doo ụmụ odibọ m nsọ n’ụlọ nke a.

“Ma okwu a na-ekwu maka ụlọ nke a ga-agbasa ruo ala ndị-ọzọ; na nke a bụ mmalite nke ngọzi nke a ga-awụkwasị nisi ndị nke m.”21

Biko hụba ama nkebi okwu ndịa, obi nke puku kwuru puku na iri puku kwuru iri puku ga-an̄ụrị oke ọn̄ụ, ma okwu a na-ekwu maka ụlọ nke a ga-agbasa ruo ala ndị ọzọ. Ndị a bụụrụ nkwupụta dara ụda n’Eprel 1836, mgbe Nzukọ nsọ nwere nanị ọnụ ọgụgụ ndị otu ole ma ole na otu tempụl.

Taa n’afọ 2020, anyị nwere tempụl dị 168 n’arụ ọrụ. Tempụl iri anọ na itolu agbakwunyere ka a na-arụ arụ ma ọbụ a mara ọkwa maka ya. Ụlọ niile nke Onyenwe anyị ka a na arụ “n’agwaetiti niile nke oke osimiri ”22 na n’ime mba na ebe niile atuleworo n’oge gara aga n’aka ọtụtụ ndị n’enweghị ike enwete tempụl.

Mmemme onyinye dị nsọ ka a na asụ na-asụsụ dị 88 ugbu a ma ga-adị n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ agbakwunyere dị ka a na-arụ tempụl iji gọzie ụmụ nke Chineke ndị ọzọ. N’afọ 15 n’abịa n’ihu, ọnụ ọgụgụ asụsụ nke a ga-asụ emume nsọ tempụl nwere ike mụbaa ugboro abụọ.

N’afọ a anyị ga-eme ntọala ma ebido ịrụ tempụl dị 18. N’ụzọ nke ọzọ, o were afọ 150 ịrụ tempụl 18 nke mbụ, site na mbido nke Nzukọ nsọ n’afọ 1830 ruo ido nsọ nke Tempụl Tokyo Japan site n’aka Onyeisi Spencer W. Kimball n’afọ 1980.

Tempụl isii

Tulee imelite ọrụ nke tempụl ọkụ ọkụ nke emeworo nanị n’oge ndụ nke Onyeisi Russell M. Nelson. Mgbe a mụrụ Onyeisi Nelson na Septemba 9, 1924, Nzukọ nsọ nwere tempụl isii na-arụ ọrụ .

Tempụl 26

Mgbe echiri ya Onye Ozi na Eprel 7, 1984, mgbe afọ 60 gasịrị, tempụl 26 naara arụ ọrụ, mmụba nke tempụl 20 n’ime afọ 60.

Tempụl 159

Mgbe a kwadoro Onyeisi Nelson dịka Onyeisi Nzụkọ nsọ, tempụl dị 159 naara arụ ọrụ, mmụba tempụl 133 n’ime afọ 34 n’oge mgbe o jere ozi dịka onye otu nke Kworum Ndị Ozi Iri na abụọ.

Tempụl ndị na-arụ ọrụ na ndị amara ọkwa ya

Kemgbe ọ bụziiri Onyeisi Nzukọ nsọ na Jenụwarị 14, 2018, Onyeisi Nelson amawo ọkwa tempụl 35 ọhụrụ.

Pesentị Iri itolu na isii nke tempụl nọ ugbua ka edoworo nsọ n’oge ndụ nke Onyeisi Nelson; pesentị 84 ka edoworo nsọ kemgbe e chiri ya Onye Ozi.

Tinye Uche Mgbe Niile na ihe Ndị Ahụ Kachasị Mkpa

Dị ka ndị otu Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị eweghachitere, anyị n’eguzoro n’ịtụnanya maka otu ọrụ Ya si na-aga ọkụ ọkụ na ụbọchị ikpeazụ a. Ma ọtụtụ tempụl ndị ọzọ na-abịa.

Brigham Young buru amụma, “N’Imetazi ọrụ nke a ọ dị mkpa na ga-enwe ọ bụghị nanị otu tempụl kama puku kwuru puku ha, ma puku kwuru puku na iri puku kwuru iri puku nke ndị nwoke na ndị nwanyị ga-abanye n’ime tempụl ndịa ahụ ma rụọ ọrụ maka ndị mmadụ ndị biworo ndụ ọtụtụ afọ gara aga dịka Onyenwe anyị ga ekpughe.”23

Kwere nghọta, ịma ọkwa nke tempụl ọhụrụ nke ọbụla bụ ụzọ nnukwu ọńụ na ihe eji enye Onyenwe anyị ekele. Kosiladị, ihe kachasị mkpa nye anyị kwesịrị ị bụ nọgbụgba ndụ na emume nsọ niile nwere ike gbanwe mkpụrụobi anyị ma mikwuo nraranye anyị nye Onye Nzọpụta ma ọbụghị nnọọ ebe ma ọbụ mma nke ụlọ ahụ.

Ọrụ kachasị ibe ya dakwasịrị anyị dị ka ndị otu Nzukọ nsọ nke OnyeNwe anyị eweghachitere bụ (1) ị “Nụrụ Olu Ya!”24 ma kwe ka obi anyị gbanwee site n’ọgbụgba ndụ na emume nsọ niile, na (2) imejupụta n’ọńụ ọrụ si na chi enyere inye ngọzị tempụl nye ezi na ụlọ nke mmadụ niile ma n’ọnwụ ma na ndụ. Site na ntụzi aka na enyem aka Onyenwe anyị, n’ezie anyị ga emejupụta ọrụ ndịa dị nsọ.

Mwulite Elu nke Zayọn

Onye-amụma Joseph Smith mara ọkwa:

“Iwulite Zayọn bụ ọrụ nke masịworo ndị mmadụ nke Chineke n’oge niile; ọ bụ isiokwu nke ndị amụma, ndị nchụaja na ndị eze jiworo mmasị dị iche mee ihe; ha ejiwo ọchịchọ jupụtara n’ọńụ lee anya ruo n’ụbọchị nke anyị bi na ya; ma nke ejiri ọchịchọ si n’eluigwe jupụtara n’ọńụ kpalie ha agụwọ ma dee ma buo amụma maka ụbọchị anyị a; kama ha nwụrụ n’ahụghị ya; … ọ dịịrị anyị ịhụta ya, soro n’ihe a na-eme ma nyee aka bulie ebube nke Ụbọchị-ikpeazụ a.”25

“Ọkwa nchụaja eluigwe ga ejikọta ya na nke elu ụwa, iwete ebumnuche ndị ahụ; … ọrụ ahụ Chineke na ndị mụọ ozi jiworo obi ụtọ n’ọgbọ niile gara aga tụgharịa uche na ya; nke kpaliri mụọ nke ndị petrak na ndị amụma mgbe ochie; ọrụ akara aka iwete mbibi nke ike niile nke ọchịchịrị, nrụgharị nke elu ụwa, ebube nke Chineke, na nzọpụta nke ezi na ụlọ mmadụ.”

A ji m obi nwayọ agba ama na Nna na Ọkpara pụtakwutere Josef Smit, ma Elijah weghachitere ikikere nrachị. Ọgbụgba ndụ na emume nsọ niile nke tempụl dị nsọ nwere ike gbaa anyị ume ma sachaa mkpụrụobi anyị dị ka anyị na a “Nụrụ olu Ya!”27 ma nata ike nke ndu iyi Chineke n’ime ndụ anyị . A na m agba akaebe na ọrụ nke ụbọchị ikpeazụ a ga-ebibi ike nke ọchịchịrị ma webata nzọpụta nke ezi na ụlọ nke mmadụ. E ji m obi ụtọ agba-ama eziokwu ndị a n’aha dị nsọ nke Onye-nwe-anyị Jizọs Kraịst, amen.