Isi 11
Usoro ego nke ndị Nifaị ka a kọwara—Amiulek wee nwe ndọrọ-ndọrọ ya na Ziezrọm—Kraịst agaghị azọpụta ndị mmadụ n’ime mmehie ha nile—Nanị ndị ahụ ketara ala-eze nke elu-igwe bụ ndị azọpụtara—Mmadụ nile ga-ebili n’ime anwụ-anwụ—ọdịghị ọnwụ dị ma Mbilite n’Ọnwụ gasịa. Ihe dịka n’afọ 82 tutu amụọ Kraịst.
1 Ugbua ọ bụ n’ime iwu nke Mosaịa na nwoke ọbụla nke bụ onye-ikpe nke iwu ahụ, ma-ọbụ ndị ahọpụtara ịbụ ndị-ikpe, ga-anata ụgwọ ọrụ nile dịka oge nke ha jere ozi ikpe ndị a kpọtara n’iru ha ka e kpee ha ikpe.
2 Ugbua ọbụrụ na otu nwoke ji nke ọzọ ụgwọ, ma ọ chọghị ịkwụ ihe ahụ nke o ji n’ụgwọ, e kpesara mkpesa maka ya nye onye-ikpe ahụ; ma onye-ikpe ahụ mere ihe e kpebiri n’ikike ya, ma ziga ndị-ọrụ ka a kpọta nwoke ahụ n’iru ya, ma ọ ga-ekpe nwoke ahụ dịka iwu ahụ nke e wetara megide ya siri dị, ma otu a nwoke ahụ ka a kwagidere ịkwụ ihe ahụ o ji n’ụgwọ, ma-ọbụ anapụsịa ya ihe nile, ma-ọbụ a chụpụ ya site n’etiti ndị ahụ dịka onye-ori ma-ọbụ onye mpụnarị.
3 Ma onye-ikpe ahụ ga-anata n’ụgwọ ọrụ ya dịka oge ya siri dị—otu sinaịn nke ọla edo n’otu ụbọchị, ma-ọbụ otu sinọm nke ọla-ọcha, nke ya na otu sinaịn nke ọla-edo ha n’otu, ma nke a bụ dịka iwu ahụ nke e nyere siri dị.
4 Ugbua ndị a bụ aha nile nke mpekele ọla-edo ha dị iche iche, na nke ọla-ọcha ha, dịka uru ha siri dị. Ma aha nile ahụ ka ndị Nifaị nyere ha, n’ihi na ha agbakọghị n’ụdị nke ndị Juu ndị nọ na Jerusalem; ọbụghị ma ha na-atụ n’ụdị nke ndị Juu, mana ha gbanwere mgbakọ ha na ihe ọtụtụ ihe ha, dịka echiche nile na ọnọdụ nile nke ndị ahụ, n’ọgbọ nile siri dị, wee ruo ọchịchị nke ndị-ikpe nile, ha ebe ọbụ na eze Mosaịa hiweworo ha.
5 Ugbua mgbakọ ahụ dị otu a—otu sinaịn nke ọla-edo, otu siọn nke ọla-edo, otu shọm nke ọla-edo, na otu limna nke ọla-edo.
6 Otu sinọm nke ọla-ọcha, otu amnọ nke ọla-ọcha, otu ezrọm nke ọla-ọcha, na otu ọntaị nke ọla-ọcha.
7 Otu sinọm nke ọla-ọcha na otu sịnaịn nke ọla-edo ha n’otu, ma nke ọbụla bụ maka otu ntụtụ balị, na kwa maka otu ntụtụ nke ụdị mkpụrụ-akụkụ ubi dị iche iche.
8 Ugbua otu siọn nke ọla edo pụtara ugboro abụọ ihe nke otu sinaịn pụtara.
9 Ma otu shọm nke ọla-edo bụ ugboro abụọ nke uru otu siọn.
10 Ma otu lịmna nke ọla-edo bụ ihe ha nile pụtara.
11 Ma otu amnọ nke ọla ọcha buru ibu dịka sinọm abụọ.
12 Ma otu ezrọm nke ọla-ọcha buru ibu dịka sinọm anọ.
13 Ma otu ọntaị buru ibu dịka ha nile.
14 Ugbua nke a bụ uru nke ọn̄ụ-ọgụgụ ndị ka ntakịrị na mgbakọ ha—
15 Otu shịblọn bụ ọkara nke otu sinọm; ya mere, otu shịblọn bụ maka ọkara otu ntụtụ nke balị.
16 Ma otu shịblọm bụ otu ọkara nke otu shịblọn.
17 Ma otu lia bụ otu ọkara nke otu shịblọm.
18 Ugbua nke a bụ ọn̄ụ-ọgụgụ ha, dịka mgbakọ ha siri dị.
19 Ugbua otu antịọn nke ọla-edo ha ka shịblọn atọ.
20 Ugbua, ọ bụ maka nanị ebum-n’obi inweta uru, n’ihi na ha natara ụgwọ ọrụ ha nile dịka ọrụ enyere ha siri dị, ya mere, ha kpalitere ndị ahụ n’ọgba-aghara nile, na ụdị inye nsogbu nile na ajọọ-omume, ka ha wee nwewanye ọrụ ọzọ, ka ha wee nweta ego dịka ikpe nile nke e wetara n’iru ha siri dị; ya mere ha kpalitere ndị ahụ megide Alma na Amiulek.
21 Ma Ziezrọm a malitere ịjụ Amiulek ajụjụ, na-asị: Ị ga-aza ajụjụ ole na ole nke m ga-ajụ unu? Ugbua Ziezrọm bụ ọkachamara n’aghụghọ nile nke ekwensu, ka o wee bibie ihe ahụ nke dị mma; ya mere, ọ sịrị Amiulek: Ị ga-aza ajụjụ nile nke m ga-atọgbọrọ gị?
22 Ma Amiulek sịrị ya: E, ọbụrụ na ọ bụ dịka Mụọ nke Onye-nwe, nke dị n’ime m siri dị; n’ihi na agaghị m ekwu ihe ọbụla megidere Mụọ nke Onye-nwe. Ma Ziezrọm sịrị ya: Lee, n’ebe a bụ ọntaị isii nke ọla ọcha, ma ndị a nile ka m ga-enye gị ma ọbụrụ na Ị ga-agọnarị ọnụnọ nke Onye-kacha-elu.
23 Ugbua Amiulek sịrị: O gị nwa nke ala-mụọ, gịnị mere i jiri n’anwa m ọnwụnwa? Ị mataghị na ndị-ezi-omume adịghị arara onwe ha nye ụdị ọnwụnwa ndị a?
24 Ị kwere na ọdịghị Chineke dị? Asị m gị, E-e, Ị matara na e nwere otu Chineke, ma na Ị hụrụ ego ahụ n’anya karịa ya.
25 Ma ugbua I kwuwo okwu ụgha n’iru Chineke nye m. Ị sịrị m—Lee ọntaị isii ndị a, ndị pụtara oke uru, a ga m enye gị—mgbe Ị tinyeworo ya n’obi gị idota ha site n’ebe m nọ; ma-ọbụ nanị ọchịchọ gị na m ga-agọnarị Chineke nke ezi-okwu ahụ dị ndụ, ka I wee nwe ihe ga-eme ka ibibie m. Ma ugbua lee, maka nnukwu ihe ọjọọ nke a ị ga- enwe ụgwọ ọrụ gị.
26 Ma Ziezrọm sịrị ya: Ị sịrị na e nwere otu Chineke nke ezi-okwu ahụ dị ndụ?
27 Ma Amiulek sịrị: E, e nwere otu Chineke nke ezi-okwu ahụ dị ndụ.
28 Ugbua Ziezrọm sịrị: Enwere karịa otu Chineke?
29 Ma ọ zara, E-e.
30 Ugbua Ziezrọm sịrị ya ọzọ: Olee otu I siri mata ihe ndị a nile?
31 Ma ọ sịrị: Otu mụọ-ozi emewo ka m mata ha.
32 Ma Ziezrọm sịrị ọzọ: Onye ka ọ bụ nke ga-abịa? Ọ bụ Ọkpara nke Chineke?
33 Ma o sịrị ya, E.
34 Ma Ziezrọm sịrị ọzọ: Ọ ga-azọpụta ndị ya n’ime mmehie ha nile? Ma Amiulek zara ma sị ya: Asị m gị ọ gaghị eme ya, n’ihi na ọ gaghị-ekwe mee na ọ ga-agọnarị okwu ya.
35 Ugbua Ziezrọm sịrị ndị ahụ: Hụ na unu chetara ihe ndị a; n’ihi na ọ sịrị na e nwere nanị otu Chineke; ma na ọ na-asị na Ọkpara nke Chineke ga-abịa, mana ọ gaghị azọpụta ndị ya—dịka o nwere ikike inye Chineke iwu.
36 Ugbua Amiulek sịrị ya ọzọ: Lee Ị kwuwo okwu ụgha, n’ihi na Ị sịrị na m kwuru okwu dịka m nwere ikike inye Chineke iwu n’ihi na asịrị m na ọ gaghị azọpụta ndị ya n’ime mmehie ha nile.
37 Ma asị m gị ọzọ na o nweghị ike ịzọpụta ha n’ime mmehie ha nile; n’ihi na enweghị m ike ịgọnarị okwu ya, ma ọ sịwo na ọdịghị ihe na-adịghị ọcha ga-enwe ike iketa ala-eze nke elu-igwe; ya mere, olee otu a ga-esi zọpụta unu ma ọbụghị na unu ketara ala-eze nke elu-igwe? Ya mere, agaghị azọpụta unu n’ime mmehie unu nile.
38 Ugbua Ziezrọm sịrị ya ọzọ: Ọbụ Ọkpara Chineke ahụ bụ Nna nke Mgbe-ebighi-ebi ahụ?
39 Ma Amiulek sịrị ya: E, ọ bụ ya bụ Nna nke Ebighi-ebi nke elu-igwe ahụ na nke ụwa, na ihe nile nke dị n’ime ha; ọ bụ ya bụ mmalite ahụ na ọgwụgwụ ahụ, onye mbụ na onye ikpe-azụ;
40 Ma ọ ga-abịa n’ime ụwa ịgbapụta ndị ya; ma ọ ga-ebukwasị onwe ya njehie nile nke ndị kwere n’aha ya; ma ndị a bụ ndị ahụ ga-enwe ndụ-ebighi-ebi, ma nzọpụta anaghị abịara onye ọbụla ọzọ.
41 Ya mere, ndị ajọọ-omume na-anọgide dịka aga-asị na ọdịbeghị mgbapụta ọbụla e mere, ma ọbụghị ịtọpụ n’agbụ nile nke ọnwụ; n’ihi na lee, ụbọchị na-abịa mgbe mmadụ nile ga-ebili site n’ọnwụ ma guzoro n’iru Chineke, ma e kpee ha ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị.
42 Ugbua, e nwere otu ọnwụ nke a na-akpọ ọnwụ nke arụ; na ọnwụ nke Kraịst ga- atọpụ agbụ nile nke ọnwụ nke arụ a, ma na ka e wee kulite mmadụ nile site n’ọnwụ nke anụ arụ a.
43 Mụọ ahụ na arụ ahụ a ga-ejikọta ha ọzọ n’ụdị ya zuru oke; ma ụkwụ na aka ma njikọ-ahụ ka a ga-eweghachi n’ụdị ya mbụ, ọbụna otu anyị dị ugbua n’oge a; ma a ga- akpọta anyị iguzoro n’iru Chineke, na-amata ọbụna dịka anyị matara ugbua, ma nwe ncheta doro anya maka ikpe-ọmụma anyị nile.
44 Ugbua, mweghachi a ga-abịara onye ọbụla, ma okenye ma nwata, ma oru ma ndị nwere onwe ha, ma nwoke ma nwanyị, ma ndị ajọọ-omume ma ndị ezi-omume; ma ọbụna ọ gaghị adị ihe ha ka otu ntụtụ isi ha nile ga-efu, mana ihe nile ka a ga-eweghachi n’ụdị zuru oke, dịka ọ dị ugbua, ma-ọbụ na arụ, ma a ga-akpọta ha ma mee ka ha zaa ajụjụ n’iru oche-ikpe nke Kraịst Ọkpara ahụ, na Chineke Nna ahụ, na Mụọ Nsọ ahụ, nke bụ otu Chineke ebighi-ebi, ka e kpee ha ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị, ma ha dị mma ma-ọbụ ma ha dị njọ.
45 Ugbua, lee, agwawo m gị okwu gbasara ọnwụ nke arụ na-anwụ anwụ, na kwa gbasara mbilite n’ọnwụ nke arụ na-anwụ anwụ. Asị m gị na arụ na-anwụ anwụ ka a ga ekulite n’arụ na-anaghị anwụ anwụ, nke ahụ bụ site n’ọnwụ, ọbụna site n’ọnwụ nke mbụ baa na ndụ, ka ha ghara ịnwụ anwụ ọzọ; mụọ ha nile na-ejikọta ha na arụ ha nile, ọdịghị mgbe a ga-ekewa ha ọzọ; otu a ha nile aghọọ nke mụọ na anaghị anwụ-anwụ, ka ha ghara ịhụ ire ure ọzọ.
46 Ugbua, mgbe Amiulek kwusịrị okwu ndị a nile ndị ahụ malitere ọzọ inwe ịtụ n’anya, na kwa Ziezrọm malitere ịma jijiji. Ma otu a ka okwu nile nke Amiulek siri gwuchaa, ma-ọbụ nke a bụ ihe nile nke m deworo.