Nkeji 66
Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith, Onye-amụma na Orange, Ohio, 25 Oktoba 1831 (History of the Church, 1:219–221). Nke a bụ ụbọchị nke mbụ nke ọgbakọ dị mkpa. N’okwu mmalite nke mkpughe a Onye-amụma dere, “N’arịrịọ nke William E. McLellin, a jụrụ m Onye-nwe, ma nata nke a na-eso” (History of the Church, 1:220).
1–4, Ọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide ahụ bụ uju nke ozi-ọma; 5–8, Ndị okenye ga-ekwusa ozi-ọma, gbaa ama, ma tụgharịa-uche ha na ndị mmadụ; 9–13, Ije-ozị nkwusa ozi-ọma nke ịkwesị ntụkwasị obi ga-eme ka e nweta ihe-nketa nke ndụ ebighi-ebi.
1 Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru nye nwa odibo m William E. McLellin—Ngozi dịịrị gị, ọbụrụraa na ị tụgharịwo site n’ajọọ-omume gị nile, ma nabatawo ezi-okwu m nile, ka Onye-nwe Onye-mgbapụta gị kwuru, Onye-nzọpụta nke ụwa, ọbụna nke ka ha ra bụ ndị kwere n’aha m.
2 N’ezie a sị m gị, ngozi dịịrị gị maka ịnabata ọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide m, ọbụna uju nke ozi-ọma m, e zipụrụ nye ụmụ nke mmadụ, ka ha nwee ndụ ma bụrụ ndị ga-eketa oke site n’ebube nke a ga-ekpughe n’ụbọchị ndị ikpeazụ, dịka e deworo ya site n’aka ndị-amụma na ndị-ozi n’ụbọchị ndị ochie.
3 N’ezie a sị m gị, nwa odibo m William, na ị dị ọcha, ma ọbụghị n’ihe nile; chegharịa, ya mere, n’ihi ihe ndị ahụ n’adịghị mma n’iru m, ka Onye-nwe kwuru, n’ihi na Onye-nwe ga-egosi ha nye gị.
4 Ma ugbua, n’ezie, mụ, Onye-nwe ga-egosi ha nye gị ihe m chọrọ gbasara gị; ma-ọbụ ihe bụ uche m gbasara gị.
5 Lee, n’ezie a sị m gị, na ọ bụ uche m ka ị gaa kwusaa ozi-ọma m site n’ala rute n’ala, ma site na nnukwu obodo rute na nnukwu obodo, e, na mpaghara ndị ahụ nile gbara gburu-gburu ebe a n’ekwusabeghi ya.
6 Anọla, ọtụtụ ụbọchị n’ebe a; a ga-kwala n’ala nke Zaịọn ugbụ a; mana ọbụrụraa na i nwere ike izipu, zipu; ma ọbụghị otu a, echekwala maka ihe-onwunwe gị.
7 Gaa n’ala ndị ọwụwa anyanwụ nile, gbaa ama n’ebe nile, nye mmadụ nile ma n’ime ụlọ-nzukọ ha nile na-atụgharị uche gị na ndị mmadụ.
8 Ka nwa odibo m Samuel H. Smith jee gị na ya, ma ahapụ kwala ya, ma nye ya ndụmọdụ gị nile; ma onye ahụ nke kwesịrị ntukwasị obi ka a ga-eme ka o sie ike n’ebe nile; ma mụ, Onye-nwe, ga-esoro unu jee.
9 Bịkwasị ndị ọrịa aka ma arụ ha ga-adị kwa ike ọzọ. Alọghachila ruo mgbe mụ, Onye-nwe ga-ezigara gị. Nwee ndidi n’ime nsogbu. Rịọ, ma ị ga-anata, kụọ aka, ma a ga-emeghere gị ya.
10 Enwela mmasị n’ibu arụ. Hapụ ajọọ-omume nile. Akwala iko—ọnwụnwa nke na-enye gị nsogbu.
11 Dota okwu ndị a nile, n’ihi na ha bụ ezi-okwu ma kwesị ntụkwasị-obi; ma ị garịrị ebulite ọkpụkpọ gị, ma nuba ọtụtụ mmadụ baa na Zaịọn jiri ukwe nile nke ọn̄ụ mgbe nile na-adigide n’elu isi ha.
12 Gaa n’iru n’ihe ndịa nile ọbụna ruo ọgwụgwụ, ma ị ga-enwe okpu-eze nke ndụ ebighi-ebi n’aka nri nke Nna m, Onye nke jupụtara n’amara ma n’ezi-okwu.
13 N’ezie, otu a ka Onye-nwe gị Chineke gị, Onye-mgbapụta gị kwuru, ọbụna Jisus Kraịst. Amen.