Ọgbakọ Zuru ọha
Ogidi na Ụzarị niile
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


11:17

Ogidi na Ụzarị niile

Anyị nwekwara ike inwe ogidi nke ìhè nke onwe anyị—otu ụzarị ọkụ n’otu oge.

Ozi m bụ maka ndị ahụ na-echegbu banyere igba ama niile ha nihi na ha enwebeghi nhụmihe nke ime mmụọ nke dị ukwuu. A na m ekpe ekpere na A ga m ewetere unu ụfọdụ udo na mmesi obi ike.

Mweghachite nke ozi ọma Jizọs Kraịst malitere site na mgbawa nke ìhè na eziokwu! Otu nwata nwoke bi na mgbago New York, nwere aha dị mfe nke Josef Smit, banyere nime ọdọ osisi ị kpe ekpere. Ọ nwere nchegbu maka mkpụrụ obi ya na ọnọdụ ya nihu Chineke. Ọ chọrọ mgbaghara nke njọ ya nile. Ma ọ gbagwojuru ya anya banyere nzukọ nsọ nke ọ ga-esonye. Ọ chọrọ ido anya na udo—ọ chọrọ ìhè na mmụta.

Dị ka Josef sekpuru ala ị kpee ekpere na “nyelite ọchịchọ nile nke obi [ya] n’aka Chineke,” otu ọchịchịrị dị nnukwu ekpuchie ya. Ihe dị ọjọọ, na-emegide, ma dị ezi irè gbara mbọ ịkwụsị ya—ikechi ire ya ka ọ ghara ikwu okwu. Ike niile nke ọchịchịrị mụbara n’ike nke mere Josef echee na ọ ga-anwụ. Mana ọ “ji[ri] ike [ya] nile na-akpọku Chineke ka ọ napụta [ya] site n’ike nke onye iro nke a nke jideworo [ya].” Ma mgbe ahụ, “n’oge ahụ kpọm kwem mgbe [o] jikeworo imikpu n’ime obi nkoropụ na hapụ onwe [ya] nye mbibi,” mgbe ọ maghị ma ọ nwekwara ike ịnọgide ọzọ, otu ihè dị ebube ejupụta n’ọdọ osisi ahụ, wee chụsasịa ọchịchịrị ahụ na onye iro nke mkpụrụ obi ya.

Otu “ogidi nke ihè” nke chakara anyanwụ ejiri wayọ gbada n’isi ya. Otu onye pụtara, ma emesịa onye ọzọ. Ndị “mmụke ha na ebube ha karịrị nkọwa nile.” Nke mbụ, Nna anyị nke Eluigwe, na-akpọ ya aha, “na-arụ nke ọzọ aka—[Josef!] Onye a bụ Ọkpara M Hụrụ naanya. Nụrụ Okwu Ya!

Ma jiri mgbawa nke ihè na eziokwu ahụ dị ukwuu, Mweghachite ahụ amalitewo. Eziokwu niile nke mkpughe na ngọzi dị nsọ ndị ga-asọ ka ide miri ga-esochi: akwụkwọ nsọ ọhụrụ, ọtụghe niile nke ọkwa nchụ aja eweghachitere, ndị ozi na ndị amụma, emume nsọ na ọgbụgba ndụ, na mweghachi nke ezi Nzukọ nsọ ​​dị ndụ nke Onyenwe anyị, nke ga-ejupụta ụwa otu ụbọchị n’ìhè na ịgba aka ebe nke Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya eweghachitere.

Ihe niile ndịa ma karịa, malitere nihi ekpere obi nkoropụ nke otu nwata nwoke ya na otu ogidi nke ihè.

Anyịnwa nwekwara mkpa niile dị obi nkoropụ nke onwe anyị. Anyịnwa chọkwara mnwere onwe site na mgbagwoju anya nke ime mmụọ na ọchịchịrị nke ụwa. Anyịnwa kwesịkwara ị mata maka nke onwe anyị. Ọ bụ ya kpatara Onyeisi Russell M. Nelson jiri kpọkuo anyị “irukpunye [onwe anyị] nime ihè nke Mweghachite dị ebube.”

Otu nime nnukwu eziokwu nke Mweghachite bụ na eluigwe ghe oghe—na anyịnwa nwekwara ike ị nata ihè na mmụta site n’elu. A na m agba ama na nke a bụ ezịokwu.

Mana anyị kwesịrịrị ịkpachara anya maka ọnya nke ime mmụọ. Mgbe ụfọdụ ndị otù Nzukọ nsọ na-enwe nkụda mmụọ ma kpafuo nihi ha enwebeghi nhụmihe nke ime mmụọ dị ukwuu—nihi ha enwebeghi nhụmihe nke ogidi nke ihè nke onwe ha. Onyeisi Spencer W. Kimball dọrọ aka na ntị na site ịdị “Na-atụ anya ihe dị egwu mgbe niile, ọtụtụ agaghị anata kpamkpam nzikọrịta ozi a na-ekpughe mgbe niile.”

Onyeisi Josef F. Smith n’otu aka ahụ chetara na “Onyenwe anyị gbochiri m ịnwete ọrụ ebube niile [mgbe m bụ nwata], ma gosi m ezi okwu ahụ, ahịrị n’elu ahịrị, ozizi n’elu ozizi, ntakịrị n’ebe a na ntakịrị ebe ahụ.”

Nke a bụ usoro ama ama nke Onyenwe anyị, ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị. Kama izitere anyị ogidi nke ihè, Onyenwe anyị na-ezitere anyị ụzara nke ihè, ma emesịa ọzọ, ma ọzọkwa.

Ụzara niile nke ihè ahụ ka a ka na-aganiihu na-awụkwasị n’isi anyị. Akwụkwọ nsọ na-akụzi na Jizọs Kraịst bụ “ihè na … ndụ nke ụwa,” na “Mmụọ Ya ahụ na-enye ìhè nye mmadụ ọbụla [ma nwanyị] nke na-abịa n’ime ụwa,” na ihè Ya “[na-e]mejupụta mbara ukwu nile nke ohere “nke na-enye ihe nile ndụ.” Ihè nke Kraịst n’ezie nọ gburugburu anyị.

Ọ bụrụ nanyị anatawo onyinye nke Mmụọ Nsọ ma na-agba mbọ itinye okwukwe n’ọrụ, chegharịa, ma kwanyere ọgbụgba ndụ anyị ugwu, mgbe ahụ anyị etozuo oke ịnata ụzara ndị a dị nsọ mgbe niile. Nime okwu Okenye Devid A. Bednar kwuru ama ama, “anyị ‘bi niime mkpughe.’”

Ma, onye ọ bụla n’ime anyị dị iche. Enweghi mmadụ abụọ na-enwete nhụmihe nke ihè na eziokwu Chineke n’otu ụzọ yiri onwe ha. Were ụfọdụ oge chee maka otu ijiri nwete nhụmihe nke ihè na Mmụọ nke Onyenwe anyị.

Enwere ike ịnwetawo nhụmihe nke mgbawa nke ihè na ịgba ama ndịa dị ka “udo [ekwuru] nye obi gị gbasara [otu] okwu” nke na-enye gị nchekasị.

Ma ọ bụ dị ka otu echiche—olu dị jụụ na ntakịrị—nke batara “n’ime uche gị ma n’ime obi gị” ma gwa gị ka i mee ihe ọma, dị ka inyere mmadụ aka.

Ikekwe ị nọwo na klas n’ebe Nzukọ nsọ—ma ọ bụ na kamp ndị ntorobịa—wee nwee ọchịchọ dị ike iso Jizọs Kraịst na ịnọgide na nkwesị ntụkwasị obi. Ma eleghị anya, ị guzoworo na-ekesaa akaebe nke ị nwere olile anya na ọ bụ eziokwu ma emesịa nwee mmetụta na ọ bụ n’ezie.

Ma ọ bụ ikekwe ị nọwo na-ekpe ekpere ma nwee mmesi obi ike na-enye ọṅụ na Chineke hụrụ gị n’anya.

O nwere ike ịbụ na ị nụwo ka mmadụ na-agba ama banyere Jizọs Kraịst ma o metụrụ gị n’obi ma juputa gị na olile anya.

Ikekwe ị nọ na-agụ n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn ma otu amaokwu ekwuoro mkpụrụ obi gị okwu, dịka a ga-asị na Chineke debere ya ebe ahụ naanị maka gị—ma mgbe ahụ ga-abịa mata na Ọ mere.

O nwere ike ị nwetewo mmetụta ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ndị ọzọ nọ dị ka ị na-ejere ha ozi.

Ma ọ bụ ikekwe ọ na-arara gị ahụ inwe mmetụta nke Mmụọ Nsọ na oge ahụ n’ihi ịda mbà n’obi ma ọ bụ nchegbu kama ịnwere onyinye pụrụ iche na okwukwe iji leghachi anya n’azụ wee mata “obi ebere nke Onyenwe anyị” ndị gara aga.

Ihe m na-ekwu bụ na enwere ọtụtụ ụzọ eji anata ụzara niile si n’igwe nke ịgba ama. Ndịa bụ naanị ole ma ole, n’ezie. Ha nwere ike ha agaghị adị ka ihe ebube, mana ha niile sonyere otu akụkụ nke ịgba ama anyị.

Ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị, A hụbeghi m ogidi nke ihè, mana, dị ka gị, enwetewom ọtụtụ ụzara si na chi. Kemgbe afọ ndị gara aga, agbawo m mbọ ijiri nhụmihe ndịa kpọrọ ihe. A hụtawo m na dị ka m na-eme, a na m amata ma na-echeta ọbụna ọtụtụ nime ha. Ndị a bụ ụfọdụ ọmụmaatụ nke sitere nime ndụ m. Enwere ike ha agaghị adị oke mmasị nye ndị ọzọ, ma ha bara uru nye m.

Echetara m na a bụ m nwa okorobịa na-ejikwaghị onwe ya n’otu baptizim. Dị ka ọgbakọ ahụ na-amalite, enwetere m mmetụta Mmụọ ka ọ gwara m ka m nọdụ ala ma dị nsọpụrụ. A nọdụrụ m ọdụ ma nọrọ jụụ ruo ogologo oge nke ọgbakọ ahụ.

Tupu ozi mgbasa ozi ọma m, a tụrụ m ụjọ na ịgba ama m esichaghị ike. Enwebeghi onye ezi na ụlọ m jerela mishọn mbụ, ma amaghịm ma enwere m ike imenwu ya. Echetera m dị ka m na-amụ ọmụmụ na jiri obi m kpe ekpere iji nata aka ebe siri ike nke Jizọs Kraịst. Emesịa n’otu ụbọchị, dị ka m rịọrịọ Nna nke Eluigwe, enwetere m otu mmetụta dị ike nke ihè na nke ịhụnaanya. Ma a matara m. A matara m nnọọ.

Echetere m ka akpọlitere m n’ụra otu abalị ọtụtụ afọ mgbe nke a gasịrị nihi mmetụta nke “amamihe na-enweghi ntụpọ” dị ka ọ na-agwa m na a ga-akpọ m ije ozi nime kworum nke ndị okenye. Mgbe izu ụka abụọ gafere, akpọrọ m.

Echetere m na otu ọgbakọ zuru ọha ebe otu onye otù nke Kworum nke Ndị-ozi Iri na Abụọ ahụrụ naanya kwuru okwu niile nke ịgba ama nke m gwaworo otu enyi na enwere m olile anya na m ga-anụ.

Echetere m na mụ na ọtụtụ narị ụmụnne ndị nwoke sekpuru n’ala ma kpee ekpere maka otu ezigbo enyi tọgbọrọ n’ala n’efu jiri igwe ikuku na-eku ume n’otu obere ụlọ ọgwụ dị anya mgbe obi ya kwụsịrị. Ka anyị jikọtara obi anyị niile ịrịọ maka ndụ ya, o tetara wee dọpụta igwe ikuku site na akpịrị nke onwe ya. Ọ na-eje ozi taa dị ka onyeisi stek.

Ma echetara m mgbe m tetara jiri mmetụta nke ime mmụọ dị ike mgbe m nwesịrị nrọ doro anya nke otu ezigbo enyi na onye ndụmọdụ nke nwụrụ n’oge na-erughi eru, wee hapụ nnukwu oghere na ndụ m. Ọ nọ na-amụmụ ọnụ ọchị ma nwee ọṅụ. A matara m na ọ dị mma

Ndị a bụ ụfọdụ ụzara nke m. Ị nwetawo ahụmịhe nke onwe gị—ịgba ama nke gị nke juputara na mgbawa ihè. Dịka anyị na-amata, cheta ma na-achịkọta ụzarị ndị a “ọnụ na otu,” ihe dị ebube ma dị ike na-amalite ime. “Ihè na-arapara n’ìhè—eziokwu na-amakụ eziokwu.” Eziokwu na ike nke otu ụzarị nke ịgba ama na-akwado ma jikọta ya na nke ọzọ, ma emesịa ọzọ, na nke ọzọ. Ahịrị n’elu ahịrị, ozizi n’elu ozizi, ụzara ebe a ma ụzara ebe ahụ—otu obere oge ime mmụọ dị oké ọnụ ahịa n’otu oge—n’ebe ahụ enwere nhụmihe ime mmụọ jupụtara n’ìhè na-etolite n’ime anyị. Eleghị anya ọ dịghị otu ụzara di ike zuru oke ma ọbụ na-egbuke egbuke zuru oke iji bụrụ ihe akaebe zuru oke n’onwe ya, mana ejikọta ha ọnụ ha nwere ike ịghọ ìhè nke ọchịchịrị nke obi abụọ na-enweghị ike imeri.

“O mgbe ahụ, nke a ọ bụghị ihe dị irè?” Alma jụrụ. “Asị m unu, E, n’ihi na ọ bụ ìhè”

“Nke ahụ bụ nke Chineke bụ ìhè” Onyenwe anyị na-akụziri anyị “ma onye natara ìhè, ma nọgide n’ime Chineke, ga-anata ìhè karịa; ma ìhè ahụ ga na-amuke karịa ma na-amuke karịa tutu ruo ụbọchị ahụ zuru oke.”

Nke a pụtara, ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, na ka oge na-aga na site na “nnukwu mgbalị,”anyị onwe anyị nwekwara ike inwe ogidi nke ìhè nke onwe anyị—otu ụzarị ọkụ n’otu oge. Ma n’etiti ogidi ahụ, anyị onwe anyị ga-ahụkwa Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya na-akpọ anyị n’aha, na-atụ anyị aka n’ebe Onye Nzọpụta anyị bụ Jizọs Kraịst nọ, na-akpọku anyị ka anyị “Nụrụ Ya!”

A na m agba ama maka Jizọs Kraịst, na Ọ bụ ìhè na ndụ nke ụwa dum—na nke ụwa nke onwe gị na nke onwe m.

A na m agba ama na Ọ bụ ezi na Ọkpara nke ezi Chineke dị ndụ, ma na Ọ guzoro n’isi nke Nzukọ nsọ ​​nke a bụ ezi okwu ma dị ndụ, nke na anata odudu na ntuziaka site n’aka ndị amụma na ndị ozi Ya dị eziokwu na dị ndụ.

Ka anyị mata ma nata ìhè Ya nke dị ebube ma họrọ Ya karịa ọchịchịrị nke ụwa—mgbe niile na mgbe ebighị ebi. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Lee Josef Smith—Agụgụala 1:10–13.

  2. Lee Josef Smith—Agụgụala 1:14–16.

  3. Lee Joseph Smith, Journal, Nov. 9–11, 1835, 24, josephsmithpapers.org.

  4. Joseph Smith—Agụgụala 1:17.

  5. Lee Joseph Smith—Agụgụala 1:20. Mgbe Joseph Smith laghachiri n’ebe obibi mgbe Ọhụụ nke Mbụ gasịrị, nne ya jụrụ ma ọ dị mma. Ọ zaghachịrị sị, “A dị m mma nke ọma. … Amụtawo m maka onwe m na okpukpechi Presbyterian abụghị ezi-okwu.” (nkwugharịsike ga-agbakwụnyere).

  6. Russell M. Nelson, “Okwu Mmechi,” Liahona, Nov. 2019, 122.

  7. Spencer W. Kimball, nime Ripọọtụ nke Ọgbakọ, Ọgbakọ Mpaghara nke Munich Germany, 1973, 77; enọmiri niime Graham W. Doxey, “Olu Ahụ Dị Juu Ntakịrị,” Ensign, Nov. 1991, 25.

  8. Nkuzi nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Joseph F. Smith (1998), 201: “Mgbe m dị ka nwata nwoke, malitere ije ozi nlekota, ugboro ugboro ka m ga-apụ jee rịọ Onyenwe anyị ka o gosi m otu ihe ebube, ka m wee nwe ike nata otu ịgba ama. Mana Onyenwe anyị enyeghi m ihe ebube ndịa, mana gosi m eziokwu, ahịrị n’elu ahịrị, ozizi n’elu ozizi, ntakịrị ebe a ma ntakịrị ebe ahụ, tutu ọ mee ka m mata eziokwu ahụ bido n’elu isi m ruo na ọbụ ụkwụ m, ma ruo mgbe obi abụọ na ujo pụsiworo kpam kpam nime m. O ziteghi mmụọ ozi site na eluigwe iji mee nke a, ma ọbụkwanụ ma ọ okwuru okwu jiri opi ike nke onyeisi ndị mmụọ ozi. Site na ntaka niile nke olu dị jụụ ma dị ntakịrị nke Mmụọ nke Chineke dị ndụ, o nyere m ọgbụgba ama nke m nwere. Ma site n’ụkpụrụ nke a na ike ọ ga-enye ụmụ mmadụ niile ọmụma ihe nke eziokwu ahụ nke ga-anọnyere ha, ma ọ ga-eme ka ha mara nke bụ eziokwu ahụ, dị ka Chineke maara ya, na ime uche nke Nna dị ka Kraịst na-eme ya.”

  9. Mosaịa 16:9.

  10. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:46; lee kwa Jọn 1:9.

  11. Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 88:12–13.

  12. David A. Bednar, Mmụọ nke Mkpughe (2021), 7.

  13. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:23.

  14. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 8:2; lee kwa Hilaman 5:30.

  15. Lee Mosaia 5:2; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:12.

  16. Lee 2 Nefi 4:21; Hilaman 5:44.

  17. Onyenwe anyị achọpụtawo ikike nke ikwere n’ịgba ama nke ndị ọzọ dị ka onyinye nke mmụọ (see Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:13–14).

  18. Mkpughe nke oge a na-akụzi na okwu niile nke akwụkwọ nsọ ka “e nyere ha site na Mmụọ m nye unu, … ma m’ọbụghị site n’ike m unu agaraghị enwe ha; ya mere unu nwere-ike ịgba-ama na unu anụwo olu m, ma mata okwu m nile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:35–36).

  19. Lee Mosaịa 2:17; Moronaị 7:45-48.

  20. 1 Nefi 1:20. Okenye Gerrit W. Gong ekwuwo maka “iji anya na-ele anya ma na-aṅụrị ọṅụ n’ọtụtụ obi ebere nke Onyenwe anyị niime ndụ anyị” (“Ozi nlekọta,” Liahona, Mee 2023, 18) na otu “aka Onyenwe anyị niime ndụ anyị dị na-edokarị anya n’ile anya” (“Na-echeta Ya Mgbe niile,” Liahona, Me 2016, 108). Onyinye nke iji obi ekele mata na ịnakwere aka nke Onyenwe anyị nime ndụ anyị, ọ bụrụgodị na anyị amataghị ya ma ọ bụ nwee mmetụta ya n’oge ahụ, dị ike. Akwụkwọ nsọ na-ekwukarị maka ike ime mmụọ nke icheta (lee Hilaman 5:9–12; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77, 79), nke nwere ike ịbụ ihe mbute ụzọ nye mkpughe (lee Moronaị 10:3–4).

  21. Joseph Smith kuziri, “Mmadụ nwere ike irite uru site na-ịhụta mkpatu mbụ nke mmụọ nke mkpughe; dị ka ọmụmaatụ, mgbe ị na-enwete mmetụta amamihe nke na-enweghi ntụpọ na-abanye n’ime gị, ọ nwere ike inye gị echiche ọma na mberede, nke mere na site na-ịhụ ya, ị nwere ike ịhụ na ọ mezuru n’otu ụbọchị ma ọ bụ n’otu n’oge na-eteghị anya; (ya bụ) ihe ndị ahụ nke Mmụọ nke Chineke wetara n’uche unu, ga-emezu; ma otu a site na-ịmụta Mmụọ nke Chineke na ịghọta ya, ị ga-etolite ruo na ụkpụrụ nke mkpughe, ruo mgbe ị ga-ezu oke n’ime Kraịst Jizọs” (Nkuzi niile nke Ndịisi nke Nzukọ: Joseph Smith [2011], 132).

  22. Ndi Efesọs 1:10.

  23. Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 88:40: “N’ihi na akọn’uche na-arapara n’akọn’uche; amamihe na-anabata amamihe; ezi-okwu na-amakụ ezi-okwu; ezi-omume na-ahụ ezi-omume n’anya; ìhè na-arapara n’ìhè.”

  24. Alma 32:35. Alma kwusiri ike na nhụmihe ndị a jupụtara n’ìhè, n’agbanyeghị na ọ na-adịkarị ntakịrị, dị adị n’echiche ọ bụla. Eziokwu ha na-adịwanye ike karị ma ọ bụrụ na ejikọtara ha ọnụ iji mepụta otu dị ike.

  25. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 50:24.

  26. Alma 32:41.