Ọgbakọ Zuru ọha
Ọ Bụ Amamiihe niime Onyenwe anyị Na Anyị Ga-Enwe Akwụkwọ nke Mọmọn
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


11:13

Ọ Bụ Amamiihe niime Onyenwe anyị Na Anyị Ga-Enwe Akwụkwọ nke Mọmọn

Ọ bụ ekpere m na ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn afọ nke a ga-abụ ihe ọńụ na ngọzi nye onye ọbụla niime anyị.

Ezi ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, anyị juputara n’obi ekele maka mgbalị unu n’ịgụ akwụkwọ nsọ jiri Bịanụ, Soro M. Unu emeela maka ihe niile unu na-eme. Njikọ gị na Chineke kwa ụbọchị na okwu Ya nwere nsonazụ ndị miri emi. “Unu na-atọ ntọala nke nnukwu ọrụ. Ma site n’ihe nta niile ka oke ihe si apụta.”

Ị na-agụ nkuzi niile nke Onye Nzọpụta dị niime akwụkwọ nsọ na-enyere anyị aka gbanwee ebe obibi anyị ịghọ ebe nsọ niile nke okwukwe na ebe niile nke ọmụmụ ozi ọma. Ọ na-akpọku Mmụọ niime ebe obibi anyị. Mmụọ Nsọ na-emeju mkpụrụ obi anyị jiri ọńụ ma tọghata anyị ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst ogologo ndụ.

Niime afọ ikpeazụ ndị a, mgbe anyị na-agụ akwụkwọ niile nke akwụkwọ nsọ, anyị ahụtawo panorama nke nkuzi niile nke Chineke nye ụmụ Ya n’ọgbọ ozi ọma nke kacha mkpa.

N’ọgbọ nke ọbụla, anyị ahụwo nsoro a maara ama. Chineke na-eweghachite ma ọ bụ na-ekpughe ozi ọma nke Jizọs Kraịst site n’aka ndị amụma Ya. Ndị mmadụ na-eso ndị amụma ma a na-enwe ngọzị nke ukwuu. Kosiladị, ka oge na-aga, ụfọdụ ndị na-akwụsị ịńa ntị n’okwu niile nke ndị amụma ma na-ewepụ onwe ha site n’ebe Onyenwe anyị na ozi ọma Ya nọ. Nke a bụ ihe anyị kpọrọ ngọnarị okwukwe. Ozi ọma ka ebuzọ kpugheere Adam, mana ụfọdụ niime ụmụ Adam na Iv pụrụ site n’ebe Onyenwe anyị nọ na ngọnarị okwukwe. Anyị na-ahụ nsoro nke mweghachite na ngọnarị okwukwe emegharịrị niime ọgbọ niile nke Inọk, Noa, Ebreham, Mosis, na ndị ọzọ.

Ugbu a taa, anyị bi n’ọgbọ nke uju nke oge niile. Nke a bụ naanị ọgbọ nke na-agaghị ebi na ngọnarị okwukwe. Ọ bụ ọgbọ nke a ga-akpọbata Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst na ọchịchị puku afọ Ya.

Ya mere, kedụ ihe dị iche banyere ọgbọ nke a? Kedụ ihe Onyenwe anyị nwetewooro anyị taa, kacha nke maka oge anyị, nke ga-enyere anyị aka bịaruo Onye Nzọpụta nso ma ghara ịhapụ Ya ma ọlị?

Otu azịza nke na-abịa n’uche m bụ akwụkwọ nsọ—ma karịsịa Akwụkwọ nke Mọmọn: Ama Ọzọ nke Jizọs Kraịst.

Ebe Chineke ekwewo nkwa na agaghị enwe ngọnarị okwukwe zuruọha ọzọ, anyị kwesịrị ibunuche ma kpachapụ anya izere ngọnarị okwukwe nke onwe ọbụla—na-echeta, dị ka Onyeisi Russell M. Nelson kuziworo, “Anyị n’otu n’otu ka ọ dịịrị maka uto ime mmụọ nke onwe anyị.” Ị na-amụ Akwụkwọ nke Mọmọn, dị ka anyị na-eme afọ nke a, na-akpọta anyị nso mgbe niile n’ebe Onye Nzọpụta nọ—ma na-enyere anyị aka ịnọ Ya nso.

Anyị na-akpọ ya “ọmụmụ ihe,” ma nke ahụ dị mma niihi na ọ na-egosi mgbalị. Mana ọ dịghị mkpa na anyị ga-amụ eziokwu ọhụrụ. Mgbe ụfọdụ ị na-agụ Akwụkwọ nke Mọmọn bụ nnọọ banyere inwe mmetụta njikọ nye Chineke taa—na-azụ mkpụrụ obi, nwee mgbam ume ime mmụọ tutu ịpụ izute ụwa, ma ọ bụ inwete ọgwụgwọ mgbe ụbọchị siri ike gasịrị site niime ụwa.

Anyị na-amụ akwụkwọ nsọ ka Mmụọ Nsọ, nnukwu onye nkuzi, nwee ike mikpuo ntọghata anyị nye Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ma nyere anyị aka ghọọ dị ka Ha karịa.

Jiri echiche ndị a nuche, anyị nwere ike tulee, “Kedụ ihe Mmụọ Nsọ kuziwooro anyị n’izu ụka nke a n’oge ọmụmụ Akwụkwọ nke Mọmọn anyị?” na “Kedụ otu nke a si na-akpọta anyị nso nye Onye Nzọpụta?”

Ndị a bụ ajụjụ ndị dị mma maka ọmụmụ akwụkwọ nsọ n’ebe obibi. Ha bụkwa ezigbo ajụjụ ndị dị ezigbo mma iji malite klas Sọnde na nzukọ nsọ. Anyị na-emelite nkuzi anyị na nzukọ nsọ na Sọnde site n’imelite ọmụmụ ihe anyị n’ebe obibi niime izu ụka. Site otu a, na klas anyị niile nke Sọnde, “ya onye na-ekwusa na ya onye na-anata, na-aghọta onwe ha, ma ha abụọ ka a na-ebuli mmụọ ha elu ma ha na-an̄ụrịkọta on̄ụ.”

Ebe a bụ amaokwu ole ma ole Mmụọ tinyere n’uche m sitere na ihe ọmụmụ Akwụkwọ nke Mọmọn izu ụka nke a:

  • Nifaị tuziiri Jekọb aka “ichekwa epekele ndị a ma nyefee ha n’aka na n’aka … site na ndudugandu ruo na ndudugandu. Ma ọ bụrụ na-enwere nkwusa ozi ọma nke dị nsọ, ma ọ bụ mkpughe … , ma ọ bụ ibu amụma,” Jekọb ga-akanye … ha n’elu epekele ndị a … niihi ndị [ha].”

  • Jekọb mesịrị gbaa ama, “Anyị na-achọgharị [akwụkwọ nsọ], … ma ebe inwe aka ebe ndị a niile anyị enwetewo olile anya, ma okwukwe anyị abụrụzie akwaa akwụrụ.”

Ugbu a, amaokwu ndị a mere ka m cheta ihe Nifaị kwuwororịị oge gara aga banyere epekele bras niile:

“Ma anyị enwetawo ndekọihe niile … wee chọgharịa ha, chọpụta na ha dịịrị … oke ọnụ ahịa nye anyị, nke mere na anyị nwere ike ichekwa iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị nye ụmụ anyị.

“Ya mere, o bụ amamiihe niime Onyenwe anyị na anyị ga-eburu ha, dị ka anyị na-aga njem niime alaịkpa, chee ihu n’ala e kwere na nkwa.”

Ugbu a, ọ bụrụ na ọ bụ amamiihe nye Lihaị na ezi na ụlọ ya inwe akwụkwọ nsọ, ọ bụkwa nnọọ amamiihe nye anyị taa. Oke ọnụ ahịa na ike ime mmụọ nke akwụkwọ nsọ na-aganiihu anyụghị anyụ niime ndụ anyị.

Enwetụbeghị ndị mmadụ niime agụgụala nwere Akwụkwọ nke Mọmọn na akwụkwọ nsọ ndị ọzọ nke anyị na-enwe ańụrị ya taa. Ee, Lehi na ezi na ụlọ ya ka agọziri iburu epekele bras niile, mana ha enweghị kọpị maka ụlọikwuu ọbụla! Kọpị Akwụkwọ nke Mọmọn kachasị mkpa bụ kọpị nke onwe anyị. Ọ bụ kọpị nke anyị na-agụ.

Niime ọhụ osisi nke ndụ ahụ nke Lehi, Lehi kuziiri anyị mkpa nhụmiihe nke onwe dị jiri ịhụnaanya nke Chineke. Mgbe o risịrị mkpụrụ osisi ahụ, Lehi hụrụ nwunye ya, Seraya, na ụmụ ya ndị nwoke Nifaị na Sam ebe dịtụ anya ntakịrị.

“Ha guzooro dị ka ha amaghị ebe ha ga-aga.

“… a kpọkuru m ha bịakwute m,” ka Lehi kwuru, “ma agwakwara m ha jiri oke olu ka ha bịakwute m, ma rachaa mkpụrụ osisi ahụ, nke dị mmasị karịa mkpụrụ osisi ndị ọzọ.

“Ma … ha bịakwutere m ma rachaa mkpụrụ ahụ.”

Ọmụmaatụ ịzụ nwa na mkpachapụanya nke Lehi na-amasị m. Seraya, Nifaị, na Sam naara ebi ndụ ezi omume, dị mma. Mana Onyenwe anyị nwere ihe ka mma, ihe dị ụtọ karịa maka ha. Ha amaghị ebe ha ga-achọta ya, mana Lehi maara. Ya mere ọ kpọrọ ha “jiri oke olu” ịbịa n’osisi nke ndụ ma rachaa mkpụrụ ahụ n’onwe ha. Ntuziaka ya doro anya. Enweghị ike enwe nghọtaghie.

Abụ m ihe mpụtara yiri otu ụdị ịzụ nwa na mkpachapụanya. Mgbe m bụ nwata nwoke, ikekwe afọ 11 ma ọ bụ 12, nne m jụrụ m ajụjụ, “Mak, ị maara n’onwe gị, site n’aka Mmụọ Nsọ, na ozi ọma a bụ eziokwu?”

Ajụjụ ya tụrụ m anya. Agbalịwo m mgbe niile ị bụ “ezigbo nwata nwoke,” ma echere m na nke ahụ ezuwo. Mana nne m, dị ka Lehi, maara na enwere ihe ndị ọzọ dị mkpa. E kwesịrị m ime ihe ma mara n’onwe m.

Azaghachiri m na-enwetabeghị nhụmiihe ahụ Ma ọ dịghị ka ọ tụrụ ya na anya ma ọlị site n’azịza m.

Mgbe ahụ o kwuru otu ihe m na-echefubeghị ma ọlị. E chetere m mkpụrụ okwu ya ruo taa: “Nna nke Eluigwe chọrọ gị ịmata n’onwe gị. Mana ị haghị ime mgbalị. I kwesịrị ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn ma kpee ekpere ịmata site n’aka Mmụọ Nsọ. Nna nke Eluigwe ga-aza ekpere gị niile.”

N’ezie, agụbeghị m Akwụkwọ nke Mọmọn na mbụ. Echeghị m na m etoruwo ime nke ahụ. Mana nne m maara karịa.

Ajụjụ ya kpalitere niime m ọchịchọ ịmata n’onwe m.

Ya mere, abalị ọbụla, niime ọnụ ụlọ nke mụ na ụmụnne m ndị nwoke abụọ nwere, agbanyere m ọkụ dị n’elu akwa m ma gụọ otu isi niime Akwụkwọ nke Mọmọn. Emesịa, dị ka m gbanyụrụ ọkụ, a rịpụtara m site na akwa m gbuo ikpere m ma kpee ekpere. E kpere m ekpere n’eziokwu karịa ma jiri ọchịchọ dị ukwuu karịa mgbe mbụ. A rịọrọ m Nna nke Eluigwe si biko kwe ka m mata eziokwu dị na Akwụkwọ nke Mọmọn.

Site mgbe m malitere ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn, ọ metụrụ m na Nna nke Eluigwe maara maka mgbalị m niile. Ma o metụrụ m na m dị mkpa nye Ya. Dị ka m gụrụ ma kpee ekpere, mmetụta ndị dị mma, na-enye udo dakwasịrị m. Site n’isi ruo n’isi, ihe nke okwukwe naara eto eto niime mkpụrụ obi m. Mgbe na-adịghị anya, a matara m na mmetụta ndị a bụụrụ nkwenye nke eziokwu sitere n’aka Mmụọ Nsọ. A bịara m mata n’onwe m na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ eziokwu ma na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta nke ụwa. Ụdị obi ekele m nwere maka ọkpụkpọ oku nke nne m mmụọ kpalitere.

Nhụmiihe nke a ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn dị ka nwata nwoke malitere usoro nke ọmụmụ akwụkwọ nsọ na-aganiihu ịgọzi m ruo taa. A ka m na-agụ Akwụkwọ nke Mọmọn ma gbuo ikpere n’ekpere. Ma Mmụọ Nsọ na-ekwenye eziokwu ya mgbe niile na mgbe niile.

Nifaị kwuru ya nke ọma. Ọ bụ amamiihe niime Onyenwe anyị na anyị ga-eburu akwụkwọ nsọ gburugburu ndụ anyị. Akwụkwọ nke Mọmọn bụ “isi nkume” na-eme ọgbọ nke a adị iche site na ọgbọ ndị niile gara aga. Dị ka anyị na-amụ Akwụkwọ nke Mọmọn ma soro onye amụma dị ndụ, agaghị enwe ngọnarị okwukwe nke onwe niime ndụ anyị.

Ọkpụkpọ oku ịbịa n’osisi nke ndụ site n’ijidesi ike n’okwu Chineke abụghị naanị ọkpụkpọ oku sitere n’aka Lehi nye ezi na ụlọ ya, ma ọ bụghị nnọọ naanị ọkpụkpọ oku sitere n’aka nne m nye m ịgụ ma kpee ekpere banyere Akwụkwọ nke Mọmọn. Ọ bụkwa ọkpụkpọ oku sitere n’aka onye amụma anyị, Onyeisi Russell M. Nelson, nye onye ọbụla niime anyị.

“Ana m ekwe nkwa,” ka o kwuru, “na dị ka ị n’eji ekpere amụ Akwụkwọ nke Mọmọn ụbọchị niile, ị ga-eme mkpebi ndị ka mma karịa—ụbọchị niile. Ana m ekwe nkwa na dị ka ị na atụgharị uche ihe ị mụrụ, ọnụ mpio niile nke eluigwe ga-emeghe, ma ị ga-anata azịza nye ajụjụ niile nke onwe gị na ntuziaka maka ndụ nke gị.”

Ọ bụ ekpere m na ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn afọ nke a ga-abụ ihe ọńụ na ngọzi nye onye ọbụla niime anyị ma ga-akpọta anyị nso nso ruo na Onye Nzọpụta.

Nna nke Eluigwe dị ndụ. Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị. Akwụkwọ nke Mọmọn nwere niime ya okwu Ya niile ma na-ewete ịhụnaanya Ya. Onyeisi Russell M. Nelson bụ onye amụma dị ndụ nke Onyenwe anyị n’ụwa taa. Ama m na ihe ndị a bụ eziokwu niihi nkwenye aka ebe nke Mmụọ Nsọ, aka ebe nke m natara na mbụ mgbe m na-agụ Akwụkwọ nke Mọmọn dị ka nwata nwoke. Site na aha Jizọs Kraịst, amen

Hụba ama

  1. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:33

  2. “Kurikulum ewekọtara ọnụ hiwere isi n’ebe obibi, Nzukọ nsọ kwadoro nwere ike mmetụta ịtọhapụ ike nke ezi na ụlọ niile, dị ka ezi na ụlọ ọbụla ji akọ na uche na mkpachapụ anya eso eme ihe iji gbanwee ebe obibi ha ịghọ ebe nsọ nke okwukwe. Ana m ekwe nkwa na dị ka unu na-arụsi ọrụ ike iji rụgharịa ebe obibi unu ịghọ ebe ọmụmụ ozi ọma hiwere isi, oge na-aga ụbọchị Ezumiike unu ga-abụ n’ezie ihe mmasị. Ụmụ unu ga-enwe obi ụtọ ịmụ ma bie ndụ nkuzi niile nke Onye Nzọpụta, ma ike mmetụta nke onye iro niime ndụ gị na n’ebe obibi gị ga-ebelata. Mgbanwe niile niime ezi na ụlọ unu ga-adị egwu ma kwe nkwado” (Russell M. Nelson, “Ịghọ Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a Eji ama atụ,” Liahona, Nov. 2018, 113).

  3. “N’ezie, n’ezie, a sị m gị, aga m ekenye gị Mmụọ m, nke ga-agba ama nye echiche gị, nke ga-emeju mkpụrụ obi gị n’ọńụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:13).

  4. “Ọgbọ niile bụ oge nke Onyenwe anyị nwere ọbụladị otu nwa odibo enyere ikike nụwa onye nwere ọkwa nchụaja dị nsọ na ọtụghe niile, na onye nwere ike dị nsọ inyefe ozi ọma ruo ndị niile bi nụwa” (Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ọgbọ niile,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma).

  5. Lee Mosis 5:12–16.

  6. Onye amụma Daniel hụrụ ụbọchị anyị, ọgbọ anyị, mgbe ọ kọwara nrọ Nebukadịneza. Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a bụ nkume ahụ dị niime nrọ ahụ, akubiri site nugwu ukwu na-enweghị aka, na-ewegharị aganiihu imeju ụwa dum (lee Daniel 2:34–35, 44–45; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 65:2).

  7. Chineke Nna na Jizọs Kraịst kpọrọ Onye amụma Josef Smith ịbụ onye amụma nke ọgbọ nke a. Ike niile sinachi nke ọgbọ ndị gara aga ka aga eweghachite site na ya. Ọgbọ a nke uju oge agaghị ebelata n’oge ma ọ bụ n’ebe n’ebe. Ọ gaghị ebi na ngọnarị okwukwe, ma ọ ga-emeju ụwa” (Russell M. Nelson, “Mkpokọta nke Israel Gbasasịrị agasasị,” Liahona, Nov. 2006, 79–80).

  8. Russell M. Nelson, “Okwu Mmehie,” Liahona, Nov. 2018, 8.

  9. Lee “Ntọghata Bụ Ebumnuche Anyị,” Bianụ Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ: Akwụkwọ nke Mọmọn 2024, v.

  10. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:22; lee kwa amaokwu 17-21.

  11. Jekọb 1:3–4

  12. Jekọb 4:6.

  13. 1 Nifaị 5:21–22.

  14. A mara ọkwa ya na nso nso a na nde 200 kọpị nke Akwụkwọ nke Mọmọn ka ekesasịworo niime ọgbọ nke a. Nke ahụ bụ ihe dị ịrịba ama. Akwụkwọ nke Mọmọn ugbu a ka atụgharịworo asụsụ ya n’asụsụ dị 113, ebe enwere asụsụ 17 ọhụrụ dị na usoro. Ụdị ngọzi ọ bụ inwe Akwụkwọ nke Mọmọn ebipụtara ebipụta, nke ekwe ntị, nke nụrụ, nke nlekiri, na ọdịdị ndị ọzọ. (Lee Ryan Jensen, “Church Distributes 200 Millionth Copy of the Book of Mormon,” Church News, Dec. 29, 2023, thechurchnews.com.)

  15. 1 Nifaị 8:14–16; nkwusi ike agbakwunyere.

  16. “Mmetụta nke ime mmụọ nke kachasị ibe ya sie ike niime ndụ nke otu nwata bụ ọmụmaatụ ezi omume nke ndị nne na nna ma ndị nne na nna nke ukwu dị ịhụnaanya ndị jiri okwukwe n’edobe ọgbụgba ndụ nke ha dị nsọ. Ndị nne na nna mara ihe na-akụziri ụmụ ha okwukwe nime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, nke ga-abụ na ha onwe ha kwa “wee mata ebe ha ga-esi wee lee anya maka mgbaghara nke mmehie ha’ [2 Nifaị 25:26]. Akpọghi ọgbụgba ndụ ihe na akwụghị chim n’idebe ya n’eduba na ị nọ nkịtị nke ime mmụọ. Mmerụ ime mmụọ na-akakarịchasị ukwuu n’ụmụ anyị na ụmụ ụmụ anyị” (Kevin W. Pearson, “Ị Ka Dị Njikere?,” Liahona, Nov. 2022, 69).

  17. Lee Ozizi na Ọgbụgbandụ nile 6:22–24.

  18. Onye amụma Josef Smith kwuru sị: “A gwara m ụmụnne ndị nwoke ahụ na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ akwụkwọ a kachasịrị dezie edezi n’ụwa, bụrụ kwa isi oke nkume nke okpukpere chi anyị, na mmadụ ga-aka sabịa Chineke nso site na ịnọgide n’usoro iwu ya, karịa site n’akwụkwọ ọbụla ọzọ” (niime Ndubata nke Akwụkwọ nke Mọmọn).

  19. Russell M. Nelson, “Akwụkwọ nke Mọmọn: Gịnị Ka Ndụ Gị Ga-adị Ka Ya Ma ewezuga Ya?,” Liahona, Nov. 2017, 62–63.