Ọgbakọ Zuru ọha
Ihe niile Maka Ọdịmma Anyị
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


14:14

Ihe niile Maka Ọdịmma Anyị

N’oge ndụ na ebighị ebi, ebumnuche nke Okike na ọdịdị nke Chineke n’onwe Ya bụ iwete ihe niile ọnụ maka ọdịmma anyị.

Taa bụ Eprel 6, ncheta oge Jizọs Kraịst weghachiri Nzukọ nsọ Ya nke ụbọchị ikpeazu—na akụkụ nke oge Ista mgbe anyị jị ọṅụ na-agba ama nke ndụ zuru oke, aja mgbaghara mmehie, na Mbilite n’ọnwụ dị ebube nke Jizọs Kraịst.

Otu akụkọ ndị China malitere dị ka otu nwa nwoke nke otu nwoke chọtara ọtu ọmalicha ịnyịnya.

“Nke a dị mma,” ka ndị agbataobi kwuru.

“Ka anyị lewe,” ka nwoke ahụ kwuru.

Emesịa nwa nwoke ahụ adaa site na ịnyịnya ahụ ma merụọ ahụ nke na-adịgide adịgide.

“Nke a dịghị mma,” ka ndị agbataobi kwuru.

“Ka anyị lewe,” ka nwoke ahụ kwuru.

Ndị agha na-achọ ndị a ga-anabata na otù ha abịa ma ghara ịkpọrọ nwa ahụ merụrụ ahụ.

“Nke a dị mma,” ka ndị agbataobi kwuru.

“Ka anyị lewe,” ka nwoke ahụ kwuru.

Ụwa nke a na-agbanwe agbanwe na-adị nnọọ ka oké ifufe ọ na-efegharị ya, nke a na-ejighị n’aka, mgbe ụfọdụ ihe ndabara ọma, na—ọtụtụ mgbe—adịghị mma. Agbanyeghi, nime ụwa nke mkpagbu a, “anyị mara na ihe niile na arụkọ ọrụ iwetara ndị hụrụ Chineke n’anya ezi ihe.” N’ezie, dị ka anyị na-eme ihe ziri ezi ma cheta ọgbụgba ndụ anyị niile, “ihe niile ga-arụkọ ọrụ ọnụ maka ọdịmma nke unu.”

Ihe niile maka ọdịmma anyị.

Nkwa nke a dị mma ikwu okwu ya! Mmesi obi ike na-akasi obi sitere n’aka Chineke N’onwe Ya! N’ụzọ nke ọrụ ebube, ebumnuche nke Okike na odidi nke Chineke bụ ị mata mmalite na ọgwụgwụ, iweta na mmezu ihe niile maka ọdịmma anyị, ma nyere anyị aka doo anyị nsọ ma dịrị nsọ site na amara na aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.

Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst nwere ike ịzọpụta ma gbapụta anyị site na mmehie. Mana Jizọs Kraịst ghọtazuru nime obi ya mgbu anyị ọbụla, mkpagbu, nrịa nrịa, iri uju, na nkewa. N’oge ndu na mgbe ebighị ebi, mmeri Ya megide ọnwụ na ọkụ mmụọ nwere ike mee ihe niile ezie ezi. Ọ na-enye aka agwọ ndị obi tiwara etiwa na ndị akọtọrọ, mee udo n’etiti ndị iwe na ndị nwere nkewa, kasie obi nye ndị nọ naanị ha na ndị agụpụrụ agụpụ, gbaa ume nye ndị mgbagwoju anya na ndị na-ezughi oke, ma wete ọrụ ebube ndị kwere omume naanị nihi Chineke.

Anyị na-agụ haleluya na tie hosana! Jiri ike ebighị ebi na ịdịmma na-enweghi ọgwụgwụ, niime atụmatụ obi ụtọ nke Chineke, ihe niile nwere ike ịrụkọ ọrụ ọnụ maka ọdịmma nke anyị. Anyị nwere ike zute ndụ jiri obisike ma na-ejighị ụjọ.

A hapụ anyị n’onwe anyị, enwere ike anyị agaghị ama ịdị mma nke onwe anyị. Mgbe “m họọrọ onwe m” A na m ahọrọkwa ezughị ezu nke m, adịghị ike m na ezughị oke m niile. Mgbe emesịrị, a chọọ ị mee ihe kacha mma, anyị kwesịrịrị ịdị mma. Ebe enweghi onye dị mma ma ọ bụghị ma Chineke, anyị na-achọ ntozu oke nime Jizọs Kraịst. Anyị na-abụrụzi onwe anyị n’ogo kachasị zie ezie, ma dị mma naanị dị ka anyị na-eyipụ mmadụ nke anụ ahụ ma dịrị ka nwata niihu Chineke.

Jiri ntụkwasị obi na okwukwe anyị niime Chineke, mnwale niile na mkpagbu niile ka a pụrụ ido nsọ maka ọdịmma anyị. Josef, eresịrị ị bụ ohuu na Ijipt, mesiri zọpụta ndị ezi na ụlọ ya na ndị ya. Mkpochi akpochiri Onye amụma Josef Smith na Mkpọrọ Libati kuziiri ya na “ihe ndịa ga-enye gị nhụmiihe, ma ga-abụ maka ọdịmma gị.” Ibiwo n’okwukwe, mnwale niile na aja niile anyị ahọrọghị ma ọlị pụrụ gọzie anyị na ndị ọzọ n’ụzọ ndị anyị na-echeghị.

Anyị na-amụba okwukwe na ntụkwasị obi nime Onyenwe anyị na ihe niile nwere ike rụkọta ọrụ ọnụ maka ọdịmma anyị dị ka anyị na-erite nhụnuche ebighị ebi; ghọta na mnwale anyị niile nwere ike bụrụ “kama maka ntakịrị oge”; mata na mkpagbu ka a pụrụ ido nsọ ka ha bụrụ maka uru anyị; nakwere mberede niile, ọnwụ erughị eru, ọrịa na-egbu egbu na nje bụcha akụkụ nke ndụ anụ ahụ; ma tụkwasị obi na Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnaanya anaghị enye mnwale iji taa anyị ahụhụ ma ọ bụ ikpe ikpe. Ọ gaghị ewere okwute nye onye rịọrọ maka achịcha ma ọ bụ agwọ nye onye rịọrọ azu.

Mgbe mnwale bịara, mgbe ụfọdụ ihe anyị kachasị chọọ bụ mmadụ ị gere anyị ntị ma nọnyere anyị. N’oge ahụ, azịza ndị ahụ ana enyekarị anaghi enye aka, na-agbanyeghị ebumnuche ha bụ iji kasie obi. Mgbe ụfọdụ anyị na-achọ onye ga-esoro anyị ruo uju, ma soro anyị bee akwa; onye ga-ekwe ka anyị gosiputa mgbu anyị, mgbakasị ahụ, mgbe ụfọdụ ọbụna iwe; ma onye ga-esoro anyị nakwere na enwere ihe ndị anyị amaghị.

Mgbe anyị tụkwasịrị Chineke na ịhụnaanya Ya obi, ọbụna obi mgbawa anyị nke kachasị, nwere ike na njedebe, rụkọta ọrụ ọnụ maka ịdị mma anyị.

A na m echeta ụbọchị m natara ozi maka nnukwu mberede ụgbọala nke metụtara ndị m hụrụ naanya. N’oge dị otu a, nime nhujuanya na okwukwe, anyị ga-ekwu naanị otu Job kwuru, “Onyenwe anyị nyere, ma Onyenwe anyị eweworo, ngọzi dịrị aha nke Onyenwe anyị.”

Gburugburu Nzukọ nsọ zuru ụwa, ihe ruru 3,500 stek na distrit tinyere ngalaba ukwu na ngalaba nta ruru 30,000 na arọpụta ebe mgbaba na nchekwa. Mana n’etiti stek na ngalaba ukwu anyị niile, ọtụtụ ndị ezi na ụlọ na ndị mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ezute ima aka ndị siri ike, ọbụna mgbe ha maara (ma na amaghị otu o ga-eme) na ihe niile ga-arụkọta ọrụ ọnụ maka ọdịmma anyị.

Na Huddersfield, England, Nwanne nwoke Samuel Bridgstock ka-achọpụtara bu ọrịa kansa ogo anọ ya nwantịtị oge tupu a ga-akpọ onyeisi stek ọhụrụ. Nihi nchọpụta ọrịa nke a dị egwu, ọ gwara nwunye ya, Anna, kedụ ihe kpatara ọ ga-eji gaa ka agba ya ajụjụ ọnụ.

“Nihi,” Nwanne nwanyị Bridgstock kwuru, “a ga-akpọ gị ị bụ onyeisi stek.”

Ezi na ụlọ Bridgstock

Na mbụ enyere ya otu afọ ma ọ bụ abụọ ibi ndụ, Onyeisi Bridgstock (onye nọ n’ebe a taa) nọ ugbua na afọ anọ nke ije ozi ya. Ọ nwere ụbọchị ọma na nke ndị siri ike. Stek ya na-ejupụta na mbawanye nke okwukwe, ije ozi na obi ebere. Ọ dịghị mfe, mana nwunye ya na ezi na ụlọ ya ji okwukwe, obi ekele, na mwute nke nwere nghọta biri nke ha nwere ntụkwasị obi ga-emesị bụrụ ọńụ ebighị ebi site na aja mgbaghara mmehie mnweghachite nke Jizọs Kraịst.

Mgbe anyị nọ jụụ, ghere oghe, ma dịrị nsọpụrụ, anyị nwere ike nwete mmetụta nke ịma mma, ebumnuche na ịdị jụụ nke ọgbụgba ndụ nsonye nke Onyenwe anyị na-enye. N’oge ndị dị nsọ, Ọ nwere ike kwe ka anyị hụtụ nsiridị ebighị ebi dị nnukwu nke ndụ anyị kwa ụbọchị bụ akụkụ ya, ebe ihe ndị dị ntakịrị ma dị mfe na-arụkọ ọrụ ọnụ maka ọdịmma ndị ahụ na-enye enye na ndị na-anata anata.

Ribeka, nwa nwanyị nke onyeisi mbụ mishọn m, kesara otu Onyenwe anyị jiri zaa ekpere ya maka nkasị obi jiri ohere a na-atụghị anya iji zaa ekpere onye ọzọ.

Ribeka nyere nwanyị ahụ igwe oxygen nke nne ya.

Na otu mgbede, Ribeka dị ka ọ na-eru uju ọnwu nne ya mgbe na-adịghị anya, nwetere mmetụta ka ọ jee zụọ gas maka ụgbọala ya. Mgbe o ruru na filiing steshọn, ọ hụrụ otu agadi nwanyị na-adọga na-iku ume jiri tank oxygen buru ibu. Emesịa, Ribeka nyere nwanyị ahụ obere igwe oxygen nke nne ya. Nwanne nwanyị a jiri obi ekele kwuo, “Inyeghachiwo m mnwere onwe m.” Ihe niile na-arụkọ ọrụ ọnụ maka ọdịmma dị ka anyị na-eje ozi nlekọta dị ka Jizọs Kraịst gaara eme.

Otu nna ekenyere ọrụ ije ozi nlekọta ya na nwa ya nwoke dị afọ ndị nkuzi kọwara, “Ije ozi nlekọta bụ mgbe anyị bidoro site na-ịbụ ndị agbataobi na-eweta biskit bụrụzie ndị enyi atụkwasịrị obi, ndị mbụ na-aza oku ime mmụọ.” Ọgbụgba ndụ nsonye nime Jizọs Kraịst na-akasị obi, na-ejikọta, na-edo nsọ.

Ọbụna na mberede, nkwado nke ime mmụọ nwere ike chetara anyị na Nna anyị nke Eluigwe maara oge ahụ anyị adịghị ike ma nọrọ naanị anyị. N’ịmatụ, otu ezi na ụlọ ndị nwa ha ka ebuuru jee ụlọọgwụ mesịrị nweta nkasị obi nihi na ọ chetara na Mmụọ Nsọ atakaworịị nọdịniihu ihe a ga-atụ anya ya.

Mgbe ụfọdụ nnukwu nsiridị nke ebighị ebi ahụ nke Onyenwe anyị na-ekwe anyị nwe mmetụta ya gụnyere ezi na ụlọ ofe akwa mgbochi ahụ. Otu nwanne nwanyị chọtara ọńụ nihi atọghatara ya nye ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachiri. Nagbanyeghi ihe egwu abụọ emetuwo ndụ ya n’ụzọ dị omimi—ịhụ mberede ụgbọ mmiri na ọnwụ ike nke nne ya, onye jiri aka ya were ndụ ya.

Nwanne nwanyị meriri ụjọ ya ma mee baptizim.

Agbanyeghi, nwanne nwanyị nke a meriri ụjọ o nwere maka mmiri wee kwe ka emee ya baptizim site na imikpu. Ma ihe mesịrị bụrụ ụbọchị ezigbo obi ụtọ, ọ hụrụ mgbe emere otu onye nọ ka onye nnọchi anya nne ya nwụrụ anwụ, baptizim na tempụl. “Baptizim nke tempụl gwọrọ nne m, ma ọ tọghapụrụ m,” ka nwanne nwanyị ahụ kwuru. “Ọ bụ oge mbụ m nweteworo udo kemgbe nne m nwụrụ.”

Egwu nsọ anyị na-ekwu maka mmesi obi Ya na ihe niile ga arụkọ ọrụ ọnụ maka ọdịmma anyị.

Dịrị jụụ, mkpụrụ obi m: Chineke gị ekwewo nkwa

Idu ọdịnihu dị ka o jiri duo oge gara aga.

Olileanya gị, obisike gị ekwela ihe ọbụla kwagharịa;

Ihe niile dị omimi ugbua ga-achakee n’ikpeazu.

Bianụ, bianụ, unu Ndị nsọ, ọdịghị ọrụ ike ma ọ bụ ịrụ ọrụ ga-atụ egwu;

Ma werenụ ọńụ na-aga njem unu.

O nwere ike ịdị unu ka njem a osiri ike,

Amara ya, ga-adị ka ụbọchi unu. …

Ma anyị ọ ga-anwụ tupu ọgwụgwụ njem anyị,

Ubọchị obi ụtọ! Ihe niile dị mma!

Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ihe aka ebe anyị ji n’aka na Jizọs bụ Kraịst ahụ na Chineke na-emezu ama Ya niile. Akwụkwọ nke Mọmọn e dere site n’aka ndị amụma ndị hụrụ ụbọchị anyị malitere n’ejije dị mnwute—otu ezi na ụlọ nwere ndịiche dị omimi ndị n’esogbu ha. Ma, dị ka anyị na-amụ ma na-atule 1 Nifaị 1 ruo na Moronaị 10, a na-adọta anyị nso n’ebe Jizọs Kraịst nọ jiri ịgba ama siri ike na ihe mere ebe ahụ ma emesịa nwere ike gọzie anyị ebe a na ugbua.

Dị ka Onyenwe anyị site n’aka onye amụma Ya dị ndụ na-ewete ọtụtụ ụlọ nke Onyenwe anyị nso ruo n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ, ngọzi niile nke tempụl na-arụkọ ọrụ ọnụ maka ọdịmma anyị. Anyị na-abịaru n’ebe Chineke Nna anyị na Jizọs Kraịst nọ site na ọgbụgba ndụ na emume nsọ ma rite nhụnuche ebighị ebi banyere ndụ anụ ahụ. Otu otu, aha n’aha, anyị na-enye ndị ezi na ụlọ anyị hụrụ naanya—ndị nna nna ha ha—emume nsọ niile dị nsọ na ngọzi niile nke ọgbụgba ndụ n’usoro nke Onyenwe anyị nke ndị nzọpụta n’elu Ugwu Zayọn.

Dịka tempụl na-abịaru anyị nso n’ọtụtụ ebe, aja tempụl nke anyị nwere ike ịchụ bụ ịchọ ịdị nsọ nime ụlọ nke Onyenwe anyị mgbe na mgbe. Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị echekwawo ego, tụọ atụmatụ, ma chụọ aja iji bịa na tempụl. Ugbua, dị ka ọnọdụ niile na-ekwe, biko bịakwutenu Onyenwe anyị ọbụna ọtụtụ mgbe nime ụlọ nsọ Ya. Kwe ka ofufe na ije ozi tempụl mgbe niile gọzie, chekwaa, ma kpakee gị na ezi na ụlọ gị—ezi na ụlọ nke ị nwere na ezi na ụlọ nke ị ga-enwe ma bụrụ otu ụbọchị.

Nne ukwu n’ezi tempụl ahụ.

Ọzọkwa, mgbe ọnọdụ gị kwere, biko lebaa anya na ngọzi nke inwe uwe niile nke tempụl nke onwe gị. Otu nne ukwu sitere n’otu ezi na ụlọ dị umeala kwuru na abịa n’ihe ọbụla nime ụwa nke a, ihe ọ kacha chọọ inwe bụ uwe niile nke temple nke onwe ya. Nwa nwa ya nke nwoke kwuru, “Nne ukwu takara, ‘Aga m eje ozi n’uwe tempụl nke onwe m, ma mgbe m nwụrụ, Aga eli m nime ha.” Ma mgbe oge ahụ bịara, emere ya otu ahụ.

Dị ka Onyeisi Russell M. Nelson kuziri, “Ihe niile anyị kwenyere na nkwa ọbụla nke Chineke kweworo nye ndị Ya gbara ndụ na-abịakọta ọnụ nime tempụl.”

N’oge ndụ na ebighị ebi, ebumnuche nke Okike na ọdịdị nke Chineke n’onwe Ya bụ iwete ihe niile ọnụ maka ọdịmma anyị.

Nke a bụ ebumnuche ebighị ebi nke Onyenwe anyị. Nke a bụ nhụnuche ebighị ebi Ya. Nke a bụ nkwa ebighị ebi Ya.

Mgbe ndụ gbagọrọ agbagọ ma ebumnuche edochaghị anya, mgbe ị chọrọ ibi ndụ dị mma karịa mana ị maghị otu esi eme ya, biko bịakwute Chineke Nna anyị na Jizọs Kraịst. Tụkwasị obi na Ha dị ndụ, hụ gị naanya, ma chọọ ihe niile maka ọdịmma gị. A na m agba ama na Ha na-eme, n’ụzọ na-enweghi ọgwụgwụ na nke dị ebighị ebi, n’aha nsọ na nke dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Lee Jọn 16:33.

  2. Ndị Rom 8:28.

  3. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 90:24. Nkebiokwu nke a ama ama “ọ dịcha nnọ mma” mgbe ụfọdụ na-akọwa na ihe niile dị mma na nọrọ nusoro, ma ghara ikọwa na n’ezie ha bụ nnọọ maka ọdịmma anyị.

  4. Lee Mozis 1:3.

  5. Lee Alma 7:11.

  6. Lee 2 Nefi 9:10–12. Chineke na-asọpụrụ ohere nhọrọ ziri ezi, mgbe ụfọdụ na-ahapụ ka omume ajọọ omume niile nke ndị ọzọ ka ha metụ anyị. Mana dị ka anyị ji obi na-achọ ime ihe niile anyị nwere ike ime, amara nke Jizọs Kraịst na ike nkwado na mgbaghara Ya nwere ike sachaa, gwọ, kedoo, ma mee udo netiti anyị nonwe anyị ma onye nibe ya, nofe abụọ nke akwa mgbochi.

  7. Lee Moronaị 7:6, 10–12. Okammụta Terry Warner dere ọfụma maka isiokwu nke a.

  8. Lee Ndị Rom 3:10; Moronaị 10:25.

  9. Lee Moronaị 10:32.

  10. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 122:4, 7.

  11. Anyị na-amụta ihe site na nhụmihe niile nke anyị ahọrọghị ma ọlị. Mgbe ụfọdụ iburịta ibu arọ jiri enyemaka Onyenwe anyị nwere ike ịmụba ịdịike anyị iji bup ibu arọ ndị ahụ; Mosaia 24:10–15 na-akọwa nkwa nke Onyenwe anyị ị ga “eleta ndị m na mkpagbu ha niile” ma ị “mee ka ha gbasie ike ka ha wee bulie ibu-arọ ha niile.” Alma 33:23 na-akuzi na “ibu-arọ unu niile wee dị mfe, site n’ọn̄ụ nke Ọkpara ya.” Mosiah 18:8na-echetara anyị na mgbe anyị dị “na njikere iburita ibu-arọ onye ọbụla nye ibe ya,” ha ga a “dị mfe.”

  12. Onye amụma Aịzaya kwuru maka Mezaya: “Mmụọ nke Onyenwe anyi, nọkwasịrị m; n’ihi na Onyenwe anyị etewom mmanụ ikwusara ndi ewedara n’ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi ha tiwara etiwa, … ịkasi ndi niile na-eru újú obi; ịkenyere nye ha bụ ndị na-eri uju na Zaion, inye ha ihe ọma n’ọnọdu ntu, mmanu ọńụ n’ọnọdu iri újú, ákwà otuto n’ọnọdu mmụọ nke idi arọ” (Aịzaya 61:1-3). N’otu aka ahụ, onye abụọma nyere nhụnuche Onyenwe anyị ekwere na nkwa: “Ịkwa akwa nwere ike ịdịgide otu abalị, mana ọńụ na-abịa n’ụtụtụ.” (Abụ ọma 30:5. Nke a gụnyere nkwa niile ahụ dị ebube maka ndị ezi omume nụtụtụ nke Mbilite n’ọnwụ nke Mbụ.

  13. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 122:4. Ikwere na ọnwụnwa nwere ike ịbụ nanị “nanị ntakịrị oge” nime ebighị ebi apụtaghị ileda ma ọ bụ belata isi ike ma ọ bụ ịma aka dị nime mgbu ntaram ahụhụ ma ọ bụ nhụjuanya anyị nwere ike na-enweta kwa ụbọchị na ndụ a, ụra abalị na-enweghị ike idi, ma ọ bụ oké egwu ejighị n’aka nke ụbọchị ọhụrụ ọ bụla. Ikekwe nkwa ekwere na mmadụ ga enwe ike leghachi anya azụ na jiri ìhè nke ọmịiko Chineke na echiche ebighị ebi hụzie ahụhụ anyị noge ndụ anụ ahụ, na-agbakwụnye ụfọdụ echiche nye nghọta anyị banyere ịnwụ anwụ na olileanya anyị iji nagide jiri okwukwe na ntụkwasị obi na Ya ruo ọgwụgwụ. Ọzọkwa, mgbe anyị nwere anya ịhụ, a na-enwekarị ihe ọma nime ugbu a; anyị ekwesịghị ichere maka oge n’ọdịnihu iji hụ ihe ọma.

  14. Lee 2 Nifaị 2:2.

  15. Lee Matiu 7:9–10. Ikwe ka Chineke merie na ndụ anyị abụghị ị nọọrọ nnọọ anabata ihe ọbụla bịaruru gị. Ọ bụ iji obi dị nkọ kwere na Nna anyị nke Eluigwe na onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, chọrọ nnọọ ma mgbe niile ihe kacha dịrị anyị mma. Mgbe ihe egwu mere, anyị nwere jiri okwukwe jụọ, nabụghị “Gịnị mere o jiri bụrụ m?” kama “Kedụ ihe m ga-amụta?” Ma anyị nwere tie uju jiri obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị wee mata na noge na ụzọ Ya, ngọzi niile nke mkwụghachi na ohere niile ga-abịa.

  16. Anyị agbawo ndụ isoro ndị na-eru uju ruo uju ma kasie ndị chọrọ nkasi obi obi (lee Mosiah 18:9).

  17. Job 1:21.

  18. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115:6.

  19. Okwukwe n’ihu ihe isi ike bụ ihe megidere nhụjuanya dị adị na obi nkoropụ Akwụkwọ nke Mọmọn kọwara ndị ahụ “kọchara Chineke, ma chọọ ịnwụ” mana ndị “otu o sila dị … ga-eji mma-agha gbaa lịka lịka maka ndụ ha niile” (Mọmọn 2:14).

  20. “Dịrị Jụụ, Mkpụrụ obi M,” Abụ niile, nke 124.

  21. “Bịa, Bịa, Unu Ndị nsọ,” Abụniile, nke 30. Tulee kwa;

    Lee ka amamihe na ihunanya si dị ukwuu. …

    Atụmatụ dị ukwuu nke mgbapụta,

    Ebe ikpe ziri ezi, ịhụnanya, na ebere na-ezute

    Na nkweko dị nsọ!

    (“Lee ka amamihe na ihunanya si dị ukwuu,” Abụ niile, nke 195.)

    N’etiti ejighi aka niile nke ndụ, anyị ma na atụmatụ dị ukwuu nke mgbapụta ga-ewekọta ikpe ziri ezi, ịhụnanya, na ebere ọnụ maka ọdịmma anyị.

  22. Lee Obadaya 1:21. Onye amụma Josef Smith kọwara na: “Kedụ otu ha [Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a] si abụ ndị nzọpụta nelu Ugwu Zayọn? Site na-iwu tempụl ha, irụ ebe baptizim ha niile, ma na-aga niihu na anata emume nsọ niile … N’aha ndị nna nna ha nwụrụ anwụ” (Nkuzi niile nke Ndịisi nke Nzukọ nsọ: Joseph Smith [2007], 473).

  23. Ndị otù na-aga tempụl nke mbụ ha nwere ike zuta uwe niile nke tempụl nonu ahia ewepụrụ ihe.

  24. Russell M. Nelson, “Tempụl na Ntọala nke Ime Mmụọ Gị,” Liahona, Nov. 2021, 94.