Elobara niime Ọńụ nke Kraịst
Ana m agba ama na Nna nke Eluigwe na-anụ arịrịọ anya mmiri gị niile ma ga-aza mgbe niile na-amamiihe zuru oke.
Anyị hụrụ unu n’anya, Okenye Kearọn M nwere ike ịgbaziri ụda olu ahụ naanị nkeji 10?
Nwere oke agụụ maka Ọrụ ebube niile
Na Agba Ọhụrụ anyị na-amụta banyere Batimọs onye isi, onye tikuru Jizọs na-achọ ọrụ ebube. “Jisọs gwara ya, Gawa ebe ị na-aga, okwukwe gị azọpụtawo gị. Ma ozugbo ozugbo ọ hụwara ụzọ.”
N’oge nke ọzọ, otu nwoke nọ na Betsaịda nwere oke agụụ maka ọgwụgwo. N’aka nke ọzọ, ọrụ ebube nke a abịaghị ozugbo ozugbo. Kama, Jizọs gọziri ya ugboro abụọ tupu “a gwọọ ya.”
Niihe ọmụmaatụ nke atọ, Pọl Onye ozi “rịọrọ Onyenwe anyị ugboro atọ” niime mkpagbu ya, ma otu ọ dị, na mmata ihe anyị, azaghị oke arịrịọ ya.
Ụzọ mmadụ atọ dị iche iche. Ụzọ nhụmiihe atọ pụrụ iche.
Ya mere, otu ajụjụ: Gịnị kpatara ụfọdụ na-eji anata ọrụ ebube ndị na-agụsi ha agụụ ike ọsịsọ ọsịsọ, ebe ndị ọzọ na-eji ndidi na-anagide, na-echere Onyenwe anyị? Anyị nwere ike amaghị ihe kpatara ya, otu ọ dị n’obi ekele, anyị maara Ya onye hụrụ [anyị] naanya” ma “[na-eme] ihe niile maka ọdịmma na ańụrị [anyị].”
Ebumnuuche niile Si na chi
Chineke, onye na-ahụ ọgwụgwụ site na mmalite, na-amasi obi ike, “Nsogbu gị na mkpagbu gị niile ga-abụ mana nwa mgbe nta.” ma ga-abụ ihe a ga-edo nsọ “maka uru gị.”
Nyere anyị aka chọtakwuo ihe ndị ọzọ mnwale anyị pụtara, Okenye Orson F. Whitney kuziri: “Ọ dịghị ihe mgbu nke anyị na-agabiga, ọ dịghị mnwale nke anyị na-ahụta bụ ihe furu ọhịa. Ọ na-ezi ozi maka mmụta anyị. … Ihe niile … nke anyị na-edi [na ndidi] … , na-ewulite agwa anyị, asacha mkpụrụ obi anyị, eme ka obi anyị saa mbara, ma mee anyị akarịa nwee obi dị nro ma na-emefu aka. … Ọ bụ site n’iru uju na ịta ahụhụ, ịgbasi mbọ ike na nsogbu, ka anyị si enweta mmuta nke anyị bịara ebe a inweta na nke ga-eme anyị adịkarịa ka [ndị nne na nna anyị nke eluigwe].”
Ịghọta na “ike nke Kraịst [ga] adị niime ya [ya]” na mkpagbu ya niile, Pọl Onye ozi kwuru n’obi umeala, “Niihi na mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m siri ike.”
Mnwale niile nke ndụ na-egosị ihe anyị bụ. Ọbụla Onye Nzọpụta “mụtara … nrube isi site na” ma e mere ka o zuo oke site na ntaram ahụhụ niile.”
Ma otu ụbọchị Ọ ga-eji ọmịiko maa ọkwa, “Lee, a ńchawo m gị, a họpụtawo m gị niime okporo ọkụ nke mkpagbu.”
Ịbịa tụkwasị obi n’ebumnuuche niile dị nsọ nke Chineke na-ekunye olileanya niime mkpụrụ obi ndị ike gwụrụ ma kpakee mkpebi n’oge niile nke nnukwu ntaram ahụhụ na obi mgbu.
Echiche niile Si na chi
Ọtụtụ afọ gara aga, Onyeisi Russell M. Nelson kọwara nghọta nke a bara nnukwu uru: “Dị ka anyị na-ele ihe niile jiri echiche nke ebighị ebi, ọ ga-eme ka ibu anyị dị nfe n’ụzọ dị oke mma.”
Nwunye m , Jill, na mụ onwe m na nso nso a hụtara eziokwu nke a niime ndụ nke Holly and Rick Porter ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị nwa ha nwoke, Trey, gbara afọ 12 nwụrụ n’ọkụ ọgbụgba dị egwu. Ebe aka na ụkwụ rere ọkụ nke ukwuu site na mgbalị dị egwu nke nwanyị a iji zọpụta nwa ya nwoke ọ hụrụ naanya, Holly guzooro n’ọgbakọ oriri nsọ ma gbaa ama dị ike banyere nnukwu udo na ọńụ Onyenwe anyị na-awụkwasịwo ezi na ụlọ ha n’oge nnukwu ntaramahụhụ ha, na-eji mkpụrụokwu ụdị dị ka dị ebube, nke rara ahụ nkwenye, ma dị nnukwu ịtụnaanya.
Arịrị nke onye nne nke a dị oke ọnụ ahịa nke na-enweghị odidi ozugbo ka ejiri udo karịrị akarị dochie dị ka echiche nke a batara n’uche ya: “Aka m abụghị aka na-azọpụta; aka ndị ahụ bụ nke Onye Nzọpụta nwe. Aka ndị ahụ bụ nke Ony Nzọpụta! Kama ị nọ na-ele anya na apa m niile dị ka ihe ncheta nke ihe m na-enweghị ike ime, ana m echeta apa m niile ahụ Onye Nzọpụta m bu.”
Aka ebe nke Holly ya mejuputara nkwa nke onye amụma anyị: “Dị ka ị na-eche maka selestịal, ị ga-ahụta mnwale niile na mmegide n’ụzọ dị ọhụrụ.”
Okenye D. Todd Christofferson kwuru: “E kwere m na ihe aka mgba nke imeri na ị na-eto eto sitere na nsogbu tọrọ anyị ụtọ mgbe Chineke wepụtara atụmatụ nke mgbapụta Ya niime ụwa a dịịrị tupu abịa n’ụwa. Anyị kwesịrị izute ihe aka mgba ahụ ugbu a ebe anyị ma na Nna anyị nke Eluigwe ga-akwado anyị. Mana ọ dị oke mkpa na anyị ga-abịakwute Ya. Ewezuga Chineke, nhụmiihe ọchịchịrị niile nke ịta ahụhụ na nsogbu na-eweta nkụda mmụọ, na obi nkoropụ, ma ọbụna inwe obi ilu.”
Ụkpụrụ niile Si na chi
Iji zere ọchịchịrị nke enweghị afọ ojuju ma kama chọta udo, olileanya, na ọbụna ọńụ nke kacha ukwuu n’oge ihe aka mgba ndị siri ike nke ndụ, ana m akọpụta ụzọ ụkpụrụ atọ si na chi dị ka ọkpụkpọ oku.
Otu—okwukwe kacha sie ike na-abịa site na ijiri Jizọs Kraịst kporo ihu. “Lekwasịnụ m anya n’echiche ọbụla,” ka Ọ mara ọkwa; enwela obi abụọ, atụla ụjọ.” Onyeisi Nelson kuziri:
“Ndụ ebighị ebi [anyị] dabeere na okwukwe [anyị] niime [Kraịst] na niime Aja mgbaghara mmehie Ya.”
Dị ka m gbaworo mgba n’oke mgbu nke mmerụ ahụ m nwere na nso nso a kpatara, enwetawo m ekele miri emi maka Jizọs Kraịst na onyinye a na-apụghị ịghota nke aja mgbaghara mmehie Ya. Chee maka ya! Onye Nzọpụta tara ahụhụ ‘mgbu na mkpagbu na ọnwụnwa niile n’ụdị ọbụla’ ka O nwee ike ịkasi anyị obi, gwọọ anyị, [ma] napụta anyị na oge niile nke mkpa.”
Ọ garaniihu: Ihe mmerụ ahụ m emewo ka m na-atụgharị uche mgbe na mgbe banyere ‘ịdị ukwuu nke Onye Nsọ nke Izrel.’ N’oge ọgwụgwọ m, Onyenwe anyị egosipụtawo ike Ya dị nsọ n’ụzọ niile nke udo na enweghị mgbagha.”
Na ụwa unu ga-enwe mkpagbu: mana nwee nụ ańụrị,” Onye Nzọpụta anyị na-enye mgbam ume; E meriela m ụwa.”
Abụọ—olileanya kacha amụke amụke na-abịa site na iche echiche akaraka anyị dị ebighị ebi. N’ikwu okwu banyere ike ebumpụta ụwa n’idobe “ọhụ nke ngọzi ndị dị ịtụnaanya nke Nna anyị kwere na nkwa … niihu anya anyị ụbọchị niile,” Nwanne nwanyị Linda Reeves gbara ama: “Amaghị m ihe mere anyị jiri nwee ọtụtụ mnwale nke anyị nwere, mana ọ bụ mmetụta nke m nwere n’onwe m na ụgwọ ya dị oke ukwuu, … na-enye oke ọńụ ma karịa ka anyị pụrụ ịghọta nke mere na n’ụbọchị nke ịkwụ ụgwọ ahụ, anyị nwere ike nwee mmetụta ịgwa Nna anyị dị ịhụnaanya, nwere obi ebere, ‘Nke ahụ ọgwụla ihe niile a chọrọ?’ … Gịnị ka ọ ga-abụ … ihe anyị tara ahụhụ ya ebe a ọ bụrụ ma, n’ikpeazụ, mnwale ndị ahụ … enye anyị ntozu oke maka ndụ ebighị ebi … niime alaeze nke Chineke?”
Tulee ihe Onyenwe anyị zara Josef Smit mgbe ọ rịọrọ maka enyem aka n’ụlọ mkpọrọ Libati. Onyenwe anyị kuziiri Onye amụma ahụ na omume na-ekwesịrịị mmadụ o nwetara ga-enye ya nhụmiihe ma bụrụ maka ọdịmma ya. ‘Ọ bụrụ na ị nagide ya nke ọma,’ Onyenwe anyị kwere nkwa, ‘Chineke ga-ebuli gị n’elu.’ Onyenwe anyị naara akuziri Josef iche echiche maka selestịal ma hụ n’uche ụgwọ dị ebighị ebi karịa ịlekwasị anya na ihe isi ike niile na-egbu oke mgbu nke ụbọchị taa.”
Mgbanwe echiche nke Josef wetere ido nsọ dị omimi, dị ka arụtụrụ aka niime akwụkwọ ozi nke a nye otu enyi: Mgbe a kpọchichara m niime mgbidi nke ụlọ mkpọrọ ruo ọnwa ise o yiri m ka mkpụrụ obi m ga-aka adị nro mgbe nke a mesịrị karịa ọ dịwororịị na mbụ. … Ana m eche na m enweghị ike nwee mmetụta dị ka m na-enwe ugbu a ma ọ bụrụ na m ataghị ahụhụ mmejọ niile nke m taworo.”
Atọ—ike kacha ukwuu na-abịa site na ịtụkwasị uche n’ọńụ. N’oge awa nke ebighị ebị kachasị sie ike, awa ndị na-egbu oke mgbu, Onye Nzọpụta anyị alaghị azụ mana ńụrụ iko ilu ahụ. Olee otu O siri mee ya? Anyị na-amụta, “Maka ọńụ nke e chere ya niihu ya [Kraịst] nagidere obe ahụ,” uche Ya “bụrụ ihe elobara niime uche nke Nna.”
Nkebi okwu nke a “elobara” na-emekụta m n’ụzọ dị omimi. Ihe na-amasị m niime ya gbagoro elu mgbe matara na na Spanish, “swallowed up” ka atụgharịrị asụsụ ya dị ka “eriri.”; na German, dị ka “erichapụrụ,” ma na Chinese dị ka “rikpuru.” Ya mere, mgbe aka mgba niile nke ndụ bịara dị mgbu karịsịa, ana m echeta nkwa nke Onyenwe anyị—na anyị “agaghị ata ahụhụ ụdị mkpagbu ọbụla, ewezuga ma [e] lobara ya [eriri, erichapụrụ, ma rikpuru ya] niime ọńụ nke Kraịst.”
Ana ahụta ọńụ nke n’ọtụtụ niime unu, bụ nke “[na-emegide] … nghọta nke ndụ a pụrụ ịnwụ anwụ,” ọbụladị na-aka anapụbeghị unu iko ilu ahụ. Unu emeela maka idobe ọgbụgba ndụ unu ma na-eguzoro dị ka ndị aka ebe nke Chineke. Unu emeela maka ịpụta ịgọzi anyị niile, ebe “niime obi [unu] dị jụụ ka e zoro iru uju nke anya na-apụghị ịhụ.” Niihi na mgbe unu na-ewetara ndị ọzọ enyem aka nke Onye Nzọpụta, unu ga-achọta ya maka onwe unu, ka Onyeisi Camille N. Johnson kuziri.
Nkwa niile Si na chi
Ugbu a, soro m lọghachite na nzukọ oriri nsọ ahụ ebe anyị hụtara ọrụ ebube nke ezi na ụlọ Holly Porter ebe Onyenwe anyị kwadoro ha. Dị ka m nọdụrụ ebe nguzo na-atụgharị uche niihe m nwere ike ikwu iji nye ezi na ụlọ nke a dị ịrịba ama na ndị enyi ha nkasi obi, echiche nke a bịara: “Jiri okwu nke Onye Nzọpụta.” Ya mere, aga m emechi taa dị ka m mere n’Ụbọchị izu ike ahụ, jiri okwu Ya, “nke na-agwọ mkpụrụ obi etipịara etipịa.”
“Bịakwutenụ m, unu ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndi e bowokwara ibu dị arọ, ma Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.”
“Agakwa m eme ka ibu arọ e bukwasịrị n’ubu unu dị mfe, na ọbụna unu enweghị ike enweta mmetụ ya na-azụ unu, ọbụna mgbe unu nọ na-agba ohu; … ka unu wee mara n’ezie na Mụ onwe m, Jehova Chineke, na-eleta ndị m niime mkpagbu ha.”
“Agaghị m apụ na-enyeghị unu nkasi obi: aga M abịakwute unu.”
Aka ebe M
Site n’iji ọńụ akwanye ugwu, ana m agba aka ebe na Onye Nzọpụta anyị dị ndụ na “nkwa Ya niile dị ire. Kachasị maka unu ndị nọ na nsọgbu ma ọ bụ “nọ na mkpagbu n’ụdị ọbụla,” ana m agba ama na Nna anyị nke Eluigwe na-anụ arịrịọ anya mmiri unu ma ga-azaghachi mgbe niile na-amamiihe zuru oke. “Ka Chineke nye unu,” dị ka O mewooro ezi na ụlọ anyị n’oge nnukwu mkpa niile, “ka ibu arụ unu wee dị mfe,” ọbụla, “elomiwo ya n’ime ọn̄ụ nke Kraịst.” N’aha dị nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen.