Ọgbakọ Zuru ọha
Na nkwado nke Ndudugandu Na-etolite etolite
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


11:21

Na nkwado nke Ndudugandu Na-etolite etolite

Ọ bụ mmekọrịta niile niime ndụ niile nke ndị ntoroọbịa nke nwere ike mmetụta kachasị ukwuu na nhọrọ ha niile.

Na-ịkwado ikwuru unu okwu, adọrọwo m ruo na akụkọ nke Helaman na ụmụokoroọbịa nke ndị nke Amọn. Enwetewo m mmetụta ike ndị amụma nke Akwụkwọ nke Mọmọn na-akuziri ndị nne na nna, ndị bishọp, na ndị otù ngalaba ukwu site na-ịmụ nkọwapụta nke a.

Helaman bụ onye ikom nke Ndị Amọn nta ahụ nwere ike ntụkwasị obi na ya. O nyeere ha aka zulite ma kaa akaa n’ezi omume. Ha maara ma hụ ya naanya ma “ga-achọ na [ọ] ga-abụ onye ndu ha.”

Helaman hụrụ ndịikom nta ndị a naanya dị ka ụmụ ya ndị nwoke ma hụ ike mmepụta ha. Okenye Dale G. Renlund kuziri na “inwe ike jeere ndị ọzọ ozi nke ọma anyị ahaghị ịhụ ha … site naanya nke Nna nke Eluigwe. Naanị mgbe ahụ ka anyị ga-amalite ịghọta ezi uru nke mkpụrụ obi. Naanị mgbe ahụ ka anyị pụrụ ịhụta ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe nwere maka … ụmụ Ya niile.” Ndị Bishọp taa ka agọziri jiri nghọta ịhụ njirimara si na chi nke ndị ntoroọbịa dị na nlekọta ha.

Helaman “gụrụ ọnụ” ndịikom nta nọ na nlekọta ya. O butere ụzọ na-iwulite mmekọrịta siri ike ya na ha.

N’oge dị oke mkpa mgbe ndụ na ọnwụ bịakọtara nso, Helaman na ndị agha nta ya gbanahụrụ otù ndị agha na-achụ ha ọsọ. Helaman dụkọrịtara ọdụ ya na ndị ntoroọbịa

“Lee, anyị amaghị kama ha akwụsiwo na ebumnuche na anyị ga-abịakwasị ha. …

“Ya mere gịnị ka unu na-ekwu, ụmụ m ndị nwoke … ?”

Ndịikom nta ndịa kwesịrị ntụkwasị obi zaghachiri, “Nna, lee Chineke anyị nọnyeere anyị, ma ọ gaghị ekwe na anyị ga-ada; mgbe ahụ kwe ka anyị gaaniihu.” Emerịrị n’ụbọchị ahụ, dị ka Helaman kwadoro ndịikom nta ndị a na mkpebi ha ime ihe.

Ndị Amọn nta ahụ nweburu ọrụ dị ukwuu ma dịịrị ike na “nkwado nke ndị ahụ.” “Obere otù ndị agha nke a,” nke Helaman duru, gbasasịrị “nnukwu olileanya na nnukwu ọńụ” niime obi niile nke otù ndị agha Ndị Nifaị nwere nhụmiihe. Ndị Bishọp taa pụrụ idu ndị ntoroọbịa ha nwere onyinye pụrụ iche na-ịgọzi ngalaba ukwu na ikpokọta Israel. Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo na nke a bụ “ozi maka nke ejiri zite [ha] n’ụwa.”

Dị ka ndị Amọnait nta ndị a ndị dịịrị “eziokwu n’oge niile n’ihe ọbụla ọ bụ enyefere ha n’aka,” Helaman soro ndị ndu ya n’ikwesị ntụkwasị obi. Agbanyeghị aka mgba ma ọ bụ ihe ndọla azụ, Helaman nọgidere “chịm na mkpebi” iji melie nzube ha. Mgbe a tuziiri ya aka “ịzọ njem ya na ụmụ [ya] ndị nwoke dị obere,” o rubere isi.

Ndị ntoroọbịa taa ka agọziri dị ka ndị bishọp na-esoro odudu nke ndị ndu anyị “ịdụkọrịta ndụmọdụ ha na ndịisi Ndịinyom Nta ngalaba ukwu.” Ndịisi stek na-ahụ na ndị bishọp na ndịisi Ndịinyom Nta ka akuziiri na-imejuputa oke na ọrụ ha maka ndị ntoroọbịa.

Helaman kwanyeere ọgbụgba ndụ niile ugwu. Mgbe Amọn kuziri ozi ọma nye ndị nne na nna nke ndịikom nta na-eto eto, ndị nne na nna ndị a nabatara ya jiri obi ghe oghe. Ha ranyere nke ukwuu ndụ ọhụrụ ha nke ịbụ ndị na-eso ụzọ ezi omume nke ha mere ọgbụgba ndụ “ịtọgbo ngwa ọgụ ha na nnupụ isi.” Naanị ihe kpataara ha itule imebi ọgbụgba ndụ nke a, ịlaghachi azụ n’ihe ha maara oge gara aga nke ịlụ ọgụ, bụ ịhụta Ndị Nifaị n’ihe egwu.

Ndị Amonaịtị chọbuuru inyere ndị mmadụ ndị a aka ndị nyebuuru ha ebe nchekwa. Helaman, ya na ndị ọzọ, kwagidere ha idebe ọgbụgba ndụ ha ghara ịlụ ọgụ ma ọlị. Ha tụkwasịrị obi karịa n’ume nke Chineke ga-ewete karịa n’ume ndị Amọnait ndị a nwere ike iwete jiri mma agha ha na akụ ha.

Mgbe Helaman na ndị agha ya nta zutere ịma aka ndị na-akụda mmụọ, Helaman kpebisiri ike. “Lee, ọ baghị uru—anyị nwere ntụkwasị obi na Chineke ga-anapụta anyị.” N’otu mgbe, mgbe ha nọọrọ n’ọnụ nke ịnwụ na-agụrụ, nzaghachi ha bụ “ịwụpụta mkpụrụ obi [ha] n’ekpere nye Chineke, na ọ ga-agba [ha] ume ma napụta [ha]; … ma Onyenwe anyị … wee leta [ha] jiri mmesị obi ike na ọ ga-anapụta [ha]” niihi okwukwe ha dị ukwuu nihe ahụ nke akuziwooro ha ikwere na ya.”

Anyị na-amụta site n’aka Helaman na ndịikom nta ndị a ka ndị nne na nna ha kwadoro. Ndị nne na nna ndị a kwesịrị ntụkwasị obi maara na ha nwere ọrụ isimbụ maka ikuziri ụmụ ha ihe. Ha kuziiri ụmụ ha idebe iwu nsọ niile na “ije ije n’ụzọ ziri ezi” niihu Chineke. Ndị nne ha kuziiri ha “na ọ bụrụ na ha enweghị obi abụọ, Chineke ga-anapụta ha.” Ndị nna ha hiwere ọmụmaatụ siri ike nke ime ọgbụgba ndụ. Ndị agha isimbụ ndị a maara ihe egwu ọjọọ niile nke agha. Ha nyefere ụmụ ha ndị nwoke na-enweghị nhụmiihe n’aka nlekọta nke Helaman ma kwadoo ha site na-izigara ha “ọtụtụ nri na ngwa.”

Helaman anọghị naanị ya dị ka o jeere otu ndị agha nta ya ozi. O nwere ndị mmadụ gbara ya gburugburu ndị ọ na-atụgharịrị maka nkwado na odudu. Ọ kpọtụụrụ Ọchị agha Moronaị maka enyem aka, ma ọ bịara.

Ọ dịghị onye na-eje ozi niime alaeze nke Onyenwe anyị na-eje ozi naanị ya. Onyenwe anyị ejiriwo ngalaba ukwu niile na stek niile wee gọzie anyị. Site na otù Ya eweghachitere, anyị nwere akụrụngwa niile, amamiihe, na mkpate mmụọ izute ịma aka ọbụla.

Bishọp na-ewete odudu maka ngalaba ukwu site na kansụl niile. Ọ na-akwalite ajụjụ ọnụ ije ozi nlekọta kwa nkeji anọ n’afọ ma emesịa gbaa ndị okenye na Otù Enyem aka ume imejuputa ọrụ ha nke ije ozi nlekọta nye ezi na ụlọ niile. Otù ndịisi ndị a na-ebute ụzọ n’inyocha mkpa niile na ịchọta azịza ndị na-akpate mmụọ. Ndịisi stek na-enye nkwado site na-inye ndị okenye na ndịisi Otù Enyemaka nkuzi n’ọrụ ndị a niile.

Odudu nke achọrọ maka ndị ndu na ndị nne na nna ka ana ahụ niime Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma na app Ibi ndụ Ozi ọma. Niime akụrụngwa ndị a na-akpate mmụọ, anyị nwere ike chọta akwụkwọ nsọ, nkuzi niile nke ndị amụma oge ugbua, na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe. Tab Ntoroọbịa niime Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma nwere ọtụtụ akụrụngwa maka otù ndịisi kworum na klas ma nwere Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile. Dị ka ndị otù niile nke ngalaba ukwu na-amụ nsipụta ndị a na-akpate mmụọ ma chọọ odudu sitere n’aka Mmụọ, aga edu onye ọbụla site n’aka Onyenwe anyị na-ịgba ndị ntoroọbịa ume.

Ngalaba ukwu niile ka aga-agọzi ma agbaa ume dị ka ndị otù na-elekwasị anya na ndudugandu na-eto eto. Agbanyeghị ezughị oke anyị na adịghị ike niile, Nna nke Eluigwe na-akpọku onye ọbụla niime anyị, site na nsiso nke Mmụọ Ya, ịkpọtụrụ ndị ọzọ. Ọ maara na anyị na-eto eto ma na-edo nsọ dị ka anyị na-esoro mkpate niile nke Mmụọ Nsọ. Ọ baghị uru na mgbalị anyị ezughị oke. Mgbe anyị na-emekọ ihe anyị na Onyenwe anyị, anyị nwere ike tụkwasị obi na mgbalị anyị ga-adaba ya na ihe Ọ ga-emere ndị ntoroọbịa.

Site na-isoro ntuziaka nke Mmụọ Nsọ n’ikpọtụrụ ndị ntoroọbịa, anyị na-abụrụzi ndị aka ebe nke ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe niime ndụ ha. Ime ihe na mkpate mmụọ site n’aka Onyenwe anyị na-ewuli mmekọrịta niile nke ịhụnaanya na ntụkwasị obi. Ọ bụ mmekọrịta niile niime ndụ niile nke ndị ntoroọbịa nke nwere ike mmetụta kachasị ukwuu na nhọrọ ha niile.

Ndị ntoroọbịa ga-amụta ụkpụrụ nke mkpughe dị ka ha na-esonyere anyị niime usoro nke ịchọ na ime ihe n’elu mkpate niile iji jeere ndị ọzọ ozi. Dị ka ndị ntoroọbịa na-atụgharị nye Onyenwe anyị maka odudu mkpake nke a, mmekọrịta ha na ntụkwasị obi ha niime Ya ga-emikpu emikpu.

Anyị na-egosipụta obisike obi anyị niime ndị ntoroọbịa site na-inye nkwado na ntuziaka na-anapụghị ya ha. Dị ka anyị na-alaghachitụ azọ ma kwe ndị ntoroọbịa ịmụta site na-ịdụkọrịta ndụmọdụ ọnụ, na-ahọrọ ihe na-akpate mmụọ, na itinye atụmatụ ha n’omume, ha ga-enwete nhụmiihe ezi ọńụ na uto.

Onyeisi Henry B. Eyring kuziri na “ihe ga-akachasị adị mkpa bụ ihe ha na-amụ site n’aka [gị] banyere onye ha bụ n’ezie na ihe ha nwere ike ịbụ n’ezie. Echiche m bụ na ha agaghị amụta ya nke ukwuu site n’aka ndị nkuzi mahadum. Ha ga-enwete ya site na mmetụta niile nke onye unu bụ, onye unu chere na ha bụ, na ihe unu chere ha nwere ike ịbụrụzi.”

Ndị ntoroọbịa anyị na-atụ m naanya jiri ume ha, okwukwe ha, na ike ha niile. Dị ka ha na-ahọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst nọ n’ọrụ n’uju, ozi ọma ya ka a ga-akanye n’elu obi ha. Isoro Ya ga-abụ otu akụkụ nke ndị ha bụ, abụghị naanị ihe ha na-eme.

Helaman nyeere Ndị Amọnait nta ahụ aka ịhụ otu onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst dị ike n’ọrụ na-adị ndụ. Anyị nwere ike bụrụ ọmụmaatụ dị ike nye ndị ntoroọbịa maka otu ndị na-eso ụzọ nke Kraịst si ebi ndụ taa. Ndị nne na nna kwesịrị ntụkwasị obi nọ na-ekpe ekpere maka ọmụmaatụ ndị a niime ndụ nke ụmụ ha. Ọdịghị emume pụrụ ịnọchi ike mmetụta nke ndị okenye dị ịhụnaanya, na-edebe ọgbụgba ndụ.

Dị ka onyeisi nke kworum ndị nchụaja, bishọp nwere ike ihiwe ọmụmaatụ maka ndị ntoroọbịa maka otu esi abụ di na-eguzosi ike n’ihe na nna dị ịhụnaanya site na-ichekwa, iwete, na iduzi n’ụzọ ezi omume niile. Ndị bishọp, na-elebacha nnọọ anya n’ebe ndị ntoroọbịa [nọ], ga-enwe ike mmetụta ga-anọrụ ọtụtụ ndudugandu.

Ndị ntoroọbịa taa sonyere n’etiti ndị mmụọ niile ahụ nke Nna nke Eluigwe mara mma. Ha sonyere n’etiti ndị nchekwa nke eziokwu na ohere nhọrọ siri ike niime ụwa tupu ndụ anụ ahụ. A mụrụ ha n’ụbọchị ndị a ikpokọta Israel site n’aka ebe ha siri ike nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Ọ maara onye ọbụla niime ha ma mara ike mmepụta ha dị ukwuu. Ọ na-enwe ndidi dị ka ha na-eto eto. Ọ ga-agbapụta ma chekwaa ha. Ọ ga-agwọ ma duo ha. Ọ ga-akpake ha. Anyị, ndị nne na nna na ndị ndu ha, ka akwadoworo ịkwado ha. Anyị nwere Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta inyere anyị aka dị ka anyị na-azulite ndudugandu nke na-abịa.

Ana ma agba aka ebe na Nzukọ nsọ nke Kraịst, eweghachitere site n’aka Onye amụma Josef Smith ma eduo taa site n’aka Onyeisi Russell M. Nelson, ka ahaziri iji nyere ndị ntoroọbịa aka mejuputa nzube ha dị ukwuu niime ụbọchi ikpeazụ ndị a. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Alma 53:19

  2. “Ọ bụrụ na ị họrọ ime, ọ bụrụ na ị chọrọ ime, … i nwere ike bụrụ nnukwu akụkụ nke ihe buru ibu, ihe dị ukwuu, ihe dị ebube! … Unu nọ n’etiti ndị kachasị mma Onyenwe anyị ziteworo kemgbe niile n’ụwa nke a. Unu nwere ike inwe akọ n’uche karịa ma mara ihe karịa ma metụta ihe n’ụwa karịa ndudugandu nke ọbụla gara aga!” (Russell M. Nelson, “Olile anya nke Israel” [worldwide youth devotional, June 3, 2018], Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma).

  3. Dale G. Renlund, “Site Naanya nke Chineke,” Liahona, Nov. 2015, 94.

  4. Alma 56:55

  5. Alma 56:43–44

  6. Alma 56:46

  7. “Ebumnoobi nke Nna anyị nke Eluigwe nịzụ ụmụ abụghị ime ka ụmụaka mee ihe ziri ezi; ọ bụ ime ụmụ Ya họrọ ime ihe ziri ezi” (Dale G. Renlund, “Họrọ Gị n’Ụbọchị nke Taa,” Liahona, Nov. 2018, 104).

  8. “Dị ka anyị na-enye ndị ntoroọbịa ike site n’ikpọku na ikwe ha ime ihe, Nzukọ nsọ ga-aganiihu n’ụzọ dị ọrụ ebube” (David A. Bednar; lee kwa 2020 Ntuziaka Odudu nke Tempụl na Agụgụala Ezi na ụlọ, Feb. 27, 2020, Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma).

  9. Alma 53:22

  10. Alma 56:17

  11. Russell M. Nelson, “Olileanya nke Israel,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  12. Alma 53:20

  13. Alma 58:12

  14. Alma 56:30

  15. Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazu a, 7.1.2, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  16. Lee General Handbook, 6.1.2.

  17. Alma 23:7

  18. Alma 58:37

  19. Alma 58:10–11.

  20. Alma 57:26.

  21. Alma 53:21

  22. Alma 56:47

  23. Lee Alma 23:7; 24:17–19.

  24. Alma 56:27.

  25. Lee Akwụkwọ Ntuzi aka Izugbe, 7.1.1.

  26. “Dị ka anyị na-achọ eziokwu ebighị ebi, ajụjụ abụọ ndị a sotere nwere ike inyere anyị aka mata ma echiche a na-abịa site n’aka Chineke ma ọ bụ site nz nsipụta ọzọ: Ana akuzi echiche mgbe niile niime akwụkwọ nsọ na site n’aka ndị amụma? Ekwetewo na echiche ahụ bụ eziokwu site n’aka ebe nke Mmụọ Nsọ? Chineke na-ekpughe eziokwu ozizi niile site n’aka ndị amụma, ma Mmụọ Nsọ na-eme ka anyị mara maka eziokwu ndị ahụ ma nyere anyị aka tinye ha n’ọrụ.” (John C. Pingree Jr., “Eziokwu Ebighị ebi,” Liahona, Nov. 2023, 100).

  27. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 4:2–4

  28. “Ọ bụrụ ma ndị ntoroọbịa [anyị] ka ọrụ [nke Chineke] juru anya nke ukwuu, ọ ga-adịkwa mfe na ụwa ga-ejukwa ha naanya. … Ndị dikin ole na ndịisi kworum ndị nkuzi ole mejuru naanị ịkpọ mmadụ oku ikpe ekpere ma ọ bụ kesaa oriri nsọ? Ụmụnne ndị nwoke, ndị a n’ezie bụ mmụọ ndị pụrụ iche, ma ha nwere ike ime ihe ndị dị iriba ama ọ bụrụ ma enye ha ohere!” (Neal A. Maxwell, “Ndudugandu Na-eto eto,” Ensign, Apr. 1985, 11).

  29. Henry B. Eyring, “Nkuzi ihe Bụ Ezigbo Omume” (okwu e kwuru Ọgbakọ omenaafọ Mahadum Brigham Young University, Aug. 27, 1991), 3, speeches.byu.edu.

  30. Lee “Isiokwu Kworum Ọkwa nchụaja nke Erọn,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  31. Lee “Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba Akwụkwọ maka Ozi ọma.

  32. “Anyị nwere olileanya na ndị otu bishọp anyị ga-elebazi anya niime oke na ọrụ ọkwa nchụaja niile nke ndịikom nta ma nyere ha aka n’ọrụ kworum ha niile. Ndị ndụmọdụ Agadi Ndịikom maara nke ana eme ka a ga-akpọ ị nyere ndị ndịisi kworum nke Ọkwa nchụaja nke Erọn na ndị otu bishop aka nime ọrụ ha niile. Anyị nwere obisike na ọtụtụ ndịikom nta na ndịinyom nta ga-ebili wee merie ịma aka ahụ ma nọrọ n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ n’ihi nlebanya nkea a ga-elebara ndị ntorobịa anyị” (Quentin L. Cook, “Nhazigharị iji Gbaa Ndị Ntoroọbịa ume,” LiahonaNov. 2019, 41).

  33. “Nna anyị nke Eluigwe echekwawo ọtụtụ niime mmụọ Ya ndị kachasị mma—eleghị anya, e nwere m ike kwuo, otu Ya kachasị maa mma—maka nkeji ikpeazụ nke a. Mmụọ ndị ahụ kachasị mma—ndị otu egwuregwu ahụ kachasị mma, ndị dike ahụ—bụ gị!” (Russell M. Nelson, “Olileanya nke Israel,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma).

  34. “Ntoroọbịa gbara afọ iri na ụma ị hụrụ naaya nwekwara ike bụrụ otu niime ndị otu agha dị ike n’aka nke ohere nhọrọ na eziokwu. … Anyị nwere ike nyee aka n’ụzọ anyị si emeghachi omume nye mkpebi ịhọrọ n’onwe ha Ha ga-amata ma anyị na-ahụ ha dị ka na ha nwekwara ike bụrụwo otu niime ndị agha kwesịrị ntụkwasị obi site n’ụwa tupu ndụ anụ ahụ, ka nwere mkpebi nye nchekwa nke ezi ohere nhọrọ ma mara maka nnukwu uru ya iwetere ha obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị nwere ike ịhụ ha dị ka ndị agha kwesịrị ntụkwasị obi sitere n’ụwa ndụ tupu ndụ anụ ahụ, anyị nwekwara ike ịhụ nkwuputa nke ịnọrọ onwe ha dị ka ihe iriba ama nke ike mmepụta ha, ihe iriba ama na ha na-anwale ike ohere nhọrọ nke ga-ewetere ha obi ụtọ” (Henry B. Eyring, “Ndụ Ehiwere niime Ihe na Eziokwu” [Brigham Young University devotional, Aug. 15, 2000], 3, 4, speeches.byu.edu).