Ọgbakọ Zuru ọha
Tempụl niile, Ụlọ niile nke Onyenwe anyị Na-ejuputa N’ụwa
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


13:56

Tempụl niile, Ụlọ niile nke Onyenwe anyị Na-ejuputa N’ụwa

Dị ka unu na-abịa na ntozu oke ma nekpere nụlọ Ya dị nsọ, a ga-enwe unu ngwa agha jiri ike Ya.

Ọ bụ na ọmarịcha okwu ndị anyị kwere ugbu a adịghị amasị gị? “Aga m agba gị ume, nyere gị aka, na mee gị eguzoro, … jigide gị n’aka ezi omume m pụrụ ime ihe niile.” Onyenwe anyị na-agba Ndị Nsọ Ya nke ọgbọ niile ume dị ka ha na-abịa n’ụlọ nsọ Ya. Site na Kinshasa ruo Zollikofen ruo Fukuoka ruo Oakland, ndị ntoroọbịa, n’echiche nke onwe ha, na-ejuputa ebe baptizim tempụl anyị. N’oge gara aga, ndị ọrụ emume nsọ a kachasị hụ naanya nwere isi na-agba awọ—mana ọdịghịkwa otu ahụ. Ndị mgbasa ozi ọma akpọrọ ọrụ, ndị mgbasa ozi nke ije ozi, na ndị mgbasa ozi ọma lọghachitere nọ gburugburu akụkụ niile. Gburugburu ụwa, enwere mmetụta na-etolite na-adọrọ anyị ruo ụlọ nke Onyenwe anyị.

Otu afọ naanị gara aga, otu ezigbo enyi ezi na ụlọ, gbara afọ 95, bi nso oké osimiri ọwụwa anyanwụ nke United States, onye ndị mgbasa ozi ọma kuziwooro ruo afọ 70, gwara nwa ya nwanyị, “A chọrọ m iso gị gaa tempụl.”

Nwa ya nwanyị zaghachiri, “N’ezie, Nne, i kwesịrị ibute ụzọ mee baptizim.”

Baptizim nke nwanne nwanyị agadi.

“Ọ dị mma,” ka ọ zaghachiri, “mgbe ahụ nụ a chọrọ m ime baptizim.” E mere ya baptizim. Ụbọchị ole ma ole gasịrị, ọ bara n’ebe baptizim tempụl na nsọpụrụ. Ma ihe fọrọ ntakịrị ka ọ gafee otu ọnwa gara aga, ọ natara onyinye dị nsọ na nrachi nke onwe ya. “Mmata ihe na ike nke Chineke na-agbasa agbasa; akwa mgbochi kpuchiri ụwa amalitewo ịdọwa.”

Nwanne nwanyị agadi nọ n’ezi tempụl.

I tulewo ihe mere Onyenwe anyị ga-esi atuzi ndị amụma Ya aka imeju ụwa ugbu a jiri tempụl nsọ Ya niile? Gịnị mere Ọ, ga n’oge nke a kpọmkwem enye ọganiihu nke a chọrọ nye ndị ọgbụgba ndụ Ya na site na otu ụzọ n’ụzọ iri ha niile, narị kwuru narị ụlọ nke Onyenwe anyị ka enwere ike iwuli?

N’ụtụtụ nke a, Onyeisi Dallin H. Oaks gosiri ọmarịcha nlere nke tempụl niile ndị a na-arụ n’ofe mba ụwa. Mụ na Kathy gara Filipii na nso nso a. Chee maka ọrụ ebube nke a: Tempụl Manila ka edoro nsọ na 1984. Ọ ga-abụ afọ 26 tupu arụsịa tempụl nke abụọ, niime Obodo ukwu Cebu na 2010. Ugbu a, afọ 14 gasịrị, tempụl 11 ka a na-arụ arụ, a na-emewe, ma ọ bụ akwadoworo maka nraranye. Site nugwu ruo ndịda: Laoag, Tuguegarao, Santiago, Urdaneta, Alabang, Naga, Tacloban City, Iloilo, Bacolod, Cagayan de Oro, na Davao. Ọ na-akpali akpali ịhụ ọrụ ịtụnaanya niile nke Chineke!

Tempụl ndị dị na Filipi

N’ofe mba ụwa, ụlọ niile nke Onyenwe anyị na-abịa anyị nso karịa. Gịnị mere o jiri bụrụ n’ụbọchị anyị?

Ụbọchị Ikpeazụ niile

Onyenwe anyị dọrọ aka na ntị na nụbọchị ikpe azụ niile, aga enwe mkpagbu n’etiti mba niile, ndị mmadụ “ga-abụ ndị hụrụ onwe ha naanya,” ihe niile [ga] anọ na ọgba aghara,” mgbagwoju anya ga-ejuputa, ma “obi nke ụmụ mmadụ [ga] ada ha.” Anyị ahụwo n’ezie obi nke ndịikom na ndịinyom dara ha: ihe ịtọ akpịrị niile nke ụwa, mmegharị anya nke olu ndị na-adọ akpịrị, nleghara anya nke ọzụzụ ime mmụọ, ike ọgwụgwụ sitere na ọchịchọ niile nke ịbụ onye na-eso ụzọ. Elemaanya i nwetewo obi ọjọọ dị ka ị hụworo onye ị hụrụ naanya, onye otu mgbe kwuru n’ezie maka okwukwe ya niime Jizọs Kraịst, gbaa aka ebe nke Akwụkwọ nke Mọmọn, ma jiri ịnụ ọkụ n’obi nyee aka wulie alaeze nke Chineke, na mberede pụọ, opekempe ugbu a, site na nkwenye ya niile ma gawa n’akụkụ Nzukọ nsọ. Ndụmọdụ m nye gị bụ adakwala mba! Ihe nile dicha mma. Niihi niime Chineke, ọdịghị ihe na-adịghị ekwe omume.

Jiri ọgba aghara nke a e buru n’amụma na ekweghị ekwe niime ụwa, Onyenwe anyị kwere nkwa na a ga-enwe ndị gbara ndụ, ndị ọ na-anụ ọkụ n’obi na-echere nlọghachi Ya, ndị guzooro n’ebe dị nsọ niile ma anaghị akwagharị ha pụọ site n’ebe ha. O kwuru maka ndị ezi omume guzogidere aghụghọ niile nke onye iro, na-azụlite okwukwe ha, na-eche selestịal, ma na-atụkwasị obi kpamkpam niime Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst.

Gịnị mere Onyenwe anyị ugbu a si ewete narị kwuru narị nke tempụl Ya nso nso nye anyị? Otu ebumnoobi bụ na n’etiti ọgba aghara na ọnwụnwa niile nke ụwa, O kwewo nkwa ịgba ume ma gọzie Ndị nsọ ọgbụgba ndụ Ya, ma nkwa Ya niile ka a na-emejuputa!

Nkwa niile sitere na Tempụl Kirtland

Kedụ otu ụlọ nsọ ndị a si agba ume, akasị obi, ma echekwa anyị? Anyị na-achọta azịza niime arịrịọ niile nke Onye amụma Josef Smith na nraranye Tempụl nke Kirtland. Ọ bụ niime tempụl nke a ebe Ndị nsọ gụrụ, “Anyị ga-agụ ma anyị ga-esoro otu ndị agha nke eluigwe eti mkpu.” Onye Nzọpụta n’onwe Ya pụtara, ma ndị amụma mgbe ochie lọghachiri, na-enyefe mgbakwunye ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja nye ozi ọma eweghachitere.

N’oge ahụ dị nsọ niime Tempụl Kirtland, Onye amụma kpere ekpere na n’ụlọ nsọ nke Onyenwe anyị, Ndị nsọ ka a ga-enye ngwa agha jiri ike nke Chineke, na aha nke Jizọs Kraịst ga-adakwasị ha, na ndị mmụọ ozi Ya ga-enwe ike n’isi ha, ma na ha ga-etolite niime Onyenwe anyị ma “nata uju nke Mmụọ Nsọ.” Arịrịọ ndị a siri ike ka emejuputara niime ndụ anyị dị ka anyị na-efe ofufe ikwesị ntụkwasị obi niime ụlọ nke Onyenwe anyị.

Enyere Ike

Niime ụlọ Ya, enyere anyị n’ezie onyinye jiri ike nke eluigwe. Okwukwe anyị niime Jizọs Kraịst na ịhụnaanya anyị maka Ya ka a nabatara ma mee ka o sie ike. A na-ekwe anyị nkwa ime mmụọ maka ezi njirimara anyị na ebumnoobi nke ndụ. Dị ka anyị kwesịrị ntụkwasị obi, a na-agọzi anyị jiri nchekwa sitere na ọnwụnwa na mmegharị anya niile. Anyị na-enwete mmetụta ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta dị ka Ọ na-ebuli anyị elu site na ihe isi ike na iru uju anyị niile. Enyere anyị ngwa agha jiri ike nke Chineke.

Aha Ya n’isi Anyị

Niime ụlọ nsọ Ya, anyị na-ewekwasị aha Ya n’onwe anyị kpamkpam karịa. Mgbe e mere anyị baptizim, anyị na-ekwuputa nkwenye anyị niime Ya na njikere anyị idebe iwu nsọ Ya niile. Niime tempụl, anyị n’ịdị nsọ na-ekwe nkwa, site na ọgbụgba ndụ anyị isoro Ya ruo ebighị ebi.

Ngosi nke Heber Valley Utah Temple.

Ndị ntoroọbịa nke Nzukọ nsọ a dị ịtụnanya. Niime ụwa siri ike, ha na-ewekwasị nonwe ha aha nke Kraịst. Niime Obodo ukwu Heber, Utah, nzukọ ọha ka emere ikpa nkata nkọwa niile nke tempụl atụrụ atụmatụ maka owuwu. Ndị ntoroọbịa narị atọ juputara ogige dị n’akụkụ igosi nkwado ha maka tempụl atụrụ aro. Otu onyeikom nta, na-agwa ndị ndu gọọmentị okwu nọgbakọ ihu ọha, na-atụghị egwu kọwara, “Ana m atụ anya ịlụ nwunye niime tempụl nke a. [Tempụl ga-enyere] m aka debe onwe m ọcha ma dị ọcha.” Onye ọzọ kọwara tempụl dị ka ihe atụ nke ìhè na olileanya. Ndịikom nta na ndịinyom nta nke Nzukọ nsọ gburugburu ụwa na-anabata aha nke Jizọs Kraịst.

Ndị ntoroọbịa n’ejuputa park dị niime Obodo ukwu Heber.

Anyị na Ndị Mmụọ ozi

Niime Tempụl Kirtland, Onye amụma Josef kpere ekpere na “ndị mmụọ ozi [ga] abụ ndị nche n’ebe [Ndị nsọ] nọ.” Na-eme emume nsọ niile maka ndị nna nna anyị ha niime tempụl na-ewete ezi nnabata mara mma na ndụ na-aganiihu gafee akwa mgbochi.

Agbanyeghị ọtụtụ niime nhụmiihe anyị niime ụlọ nke Onyenwe anyị na-adị oke nsọ ikesa n’ihu ọha, ụfọdụ ka anyị nwere ike ikesa. Afọ iri anọ gara aga, mgbe anyị bi Florida, mụ na Kathy gara njem ruo tempụl dị niime Atlanta, Georgia. N’abalị Wenesde, Me 9, 1984, dị ka anyị mezuru otu nzukọ niime tempụl, onye ọrụ emume nsọ bịakwutere m ma rịọ ma m nwere oge ime naanị otu nkwadobe emume nsọ nkwado. Aha nke onye m nọchitere gbara iche. Aha ya bụ Eleazer Cercy.

Ụbọchị sotere, tempụl juputara na Ndị nsọ. Dị ka m kwadoro ime onyinye dị nsọ m nke abụọ nke ụbọchị ahụ, e nyere m aha nke onye m ga-anọchite. N’ịtụnaanya, aha ahụ bụ otu onye ahụkwa site n’abalị gara aga, Eleazer Cercy. Enwetere m mmetụta Mmụọ nke Onyenwe anyị dị ka emezuru onyinye dị nsọ ahụ. Emesịa n’ehihie ahụ, ka nọkwa niime tempụl, Kathy hụrụ otu enyi ezi na ụlọ anyị mere agadị, Nwanne nwanyị Dolly Fernandez, onye bi na Atlanta ugbu a. Na-enweghị onye otù ezi na ụlọ nke nwoke ya na ya nọ, ọ rịọrọ mam nwere ike nyee aka na nrachi nke nna ya nye nne na nna nke nna ya. N’ezie enwetere m nkwanye ugwu.

Dị ka m gburu ikpere na ngwụcha ebe nchụaja maka emume nsọ nke a dị nsọ, a nụrụ m ọzọ kwa otu aha ahụ nke akanyere niime obi m, nna ya, Eleazer Cercy. E kwere m nke ọma na isoro ndụ nke a, aga m ezute ma makuo nwoke nke a maara na ndụ ya pụrụ ịnwụ anwụ dị ka Eleazer Cercy.

Ọtụtụ niime nhụmiihe anyị niime ụlọ nke Onyenwe anyị na-ewete udo juputara nọńụ na mkpughe dị nro karịa ntinye aka dị egwu. Mana mara n’ezie: ndị mmụọ ozi nwere ikike n’ebe anyị nọ!

Uju nke Mmụọ Nsọ

Onyinye nke Mmụọ Nsọ. Ka enyere anyị dị ka anabatara anyị ndị otù nke Nzukọ nsọ. Izu ụka ọbụla dị ka anyị na-eri na ntozu oke achịcha na mmiri na ncheta nke Onye Nzọpụta anyị, ekwere anyị nkwa Mmụọ Ya ga-anọnyere anyị mgbe niile. Dị ka anyị na-eji obi dị njikere abịa ụlọ nke Onyenwe anyị, ebe kachasị dị nsọ n’elu ụwa, anyị na-etolite niime ụlọ nke Onyenwe anyị ma nwere ike “ịnata uju nke Mmụọ Nsọ.” Site n’ike nke Mmụọ Nsọ, anyị juputara n’udo na ọńụ na olileanya ọnụ na-apụghị ikwu. Anyị na-anata ume ịnọgide bụrụ ndị na-eso ụzọ Ya ọbụna mgbe anyị na-ahụta onwe anyị n’ezi ebe ndị dị nsọ.

Onyeisi Russell M. Nelson a mawo ọkwa: “Onye Nzọpụta na Onye mgbapụta anyị, Jizọs Kraist, ga-eme ụfọdụ ọrụ Ya ndị kachasị sie ike site ugbua na mgbe Ọ ga-abia ọzọ. Anyị ga-ahụ ngosipụta n’ụzọ ọrụ ebube niile na Chineke Nna na Ọkpara Ya … Jizọs Kraịst … nọ n’isi Nzukọ nsọ n’ugwu ma n’ebube.” Ijuputa n’ụwa jiri ụlọ niile nke Onyenwe anyị bụ ọrụ dị ike na ngosiputa n’ụzọ ọrụ ebube.

Ndị enyi m hụrụ naanya, ọ bụrụ na anyị nwere ike ma emelitebeghị ịga tempụl anyị, ka anyị chọtakwuo oge ọzọ iji fee ofufe niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Ka anyị kpee ekpere maka tempụl ndị a mara ọkwa ya, ka e nwee ike zụta ala, ka gọọmentị kwadoo atụmatụ niile, ka ndị ọrụ maara ihe hụta aka ọrụ ha ịbawanye, na ka nraranye niile dị nsọ ga-ewete nkwado nke eluigwe na nleta nke ndị mmụọ ozi.

Nkwa niile

Tempụl bụ n’ezie ụlọ nke Onyenwe anyị. Ana m ekwe nkwa dị ka unu na-abịa n’ụlọ nsọ Ya na ntozu oke na n’ekpere, a ga-enye unu ngwa agha jiri ike Ya, aha Ya ga-adakwasị unu, ndị mmụọ ozi Ya ga-abụ ndị nche n’isi unu, ma unu ga-etolite niime ngọzi nke Mmụọ Nsọ.

Onyenwe anyị kwere nkwa, “Mkpụrụ obi ọbụla nke hapụrụ mmehie ya nile ma bịakwute m, ma na-akpọku aha m, ma na-erube kwa isi n’olu m, ma na-edebe kwa iwu nsọ m nile, ga-ahụ ihu m ma mata na a bụ m.” Enwere ọtụtụ ụzọ dị iche iche ịhụta ihu Kraịst, ma enweghị ebe ka mma karịa ụlọ nsọ Ya.

N’ụbọchị nke mgbagwoju anya na ọgba aghara nke a, ana m agba ama na tempụl bụ ụlọ Ya dị nsọ ma ga-enye aka chekwaa anyị maka ụbọchị ahụ dị ebube mgbe, ya na ndị mmụọ ozi Ya niile, Onye Nzọpụta anyị alọghachite n’ebube, ike, na oke ebube. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. “How Firm a Foundation,” Hymns, no. 85.

  2. “Mmụọ nke Chineke,” Abụ niile, no. 2.

  3. E nwere ugbu a tempụl 182 ndị na-arụ ọrụ. Isii ka a na-arụgharị. Asaa na-eche ido nsọ, na otu ọzọ na-eche idogharị nsọ. E nwere 45 a na-arụ ọrụ na 94 ọzọ nke a mara ọkwa ma ọ bụ ana-atụ atụmatụ na mmewe ya.

  4. Lee Luk 21:10.

  5. 2 Timoti 3:2.

  6. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:91.

  7. Okenye David A. Bednar kwuru: “ Ụkpụrụ niile nke ozi ọma bụ maka mụ na gị ihe helm bụ nye ụgbọ mmiri. Ụkpụrụ ziri ezi na-enye anyị ike ịchọta ụzọ anyị na iguzosi ike, nkwudesi ike, na akwaa akwụrụ ka anyị wee ghara ịtụfu ntule anyị ma daa niime ebili mmiri ụbọchị ikpe azụ nke ọchịchịrị na mgbagwoju anya” (“Ụkpụrụ niile nke Ozi ọma M,” Liahona, Me 2021, 126).

  8. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:26.

  9. “Ọ bụrụ ma onye ọbụla ga-achọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya bu ụzọ jụ onwe ya, ma bụrụ obe ya, ma soro m” (Matiu 16:24).

  10. Lee Luk 1:37.

  11. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 87:8.

  12. Abụ niile, no. 2

  13. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 110. Tupu oge nke a, Onye amụma Josef Smith anataworịị Ọkwa nchụaja nke Erọn na ọtụghe ya niile site n’aka Jọn Omee Baptizim, ma ọ nataworịị Ọkwa nchụaja Melkizedek na ọtụghe ya niile site n’aka Ndị Ozi Pita, Jemis, na Jọn (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13:1; 27:12–13).

  14. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:15; lee kwa amaokwu 22.

  15. Onyeisi Russell M. Nelson kwuru: “Tempụl pụrụ inyere anyị aka na njem anyị. Ebe ahụ ka ana enye anyị onyinye dị nsọ juru n’ike nke Chineke, na-enye anyị ike imeri Setan, onye njanye nke esemokwu niile” (“Ndị Omee Udo ka Achọrọ,” Liahona, Me 2023, 101).

  16. Lee Russell M. Nelson, “Nhọrọ niile maka Ebighị ebi” (worldwide devotional maka ndị okenye nta, Me 15, 2022), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  17. Okenye Colin Stauffer, akwụkwọ ozi nke onwe, Jan. 30, 2024.

  18. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:22.

  19. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 20:77, 79.

  20. Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 109:15.

  21. Lee Ndị Rom 15:13.

  22. Russell M. Nelson, “Mkpughe maka Nzukọ-nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” Liahona, Me 2018, 96.

  23. Brigham Young kwuru, “Anyị ga-enwe narị kwuru narị tempụl na puku kwuru puku ndịikom na ndị inyom na-arụ ọrụ niime ya maka ndị ahụ labaworo nụra, na-enweteghị ohere ịnụrụ na irube isi nye Ozi ọma ahụ” (Nkuzi nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Brigham Young [1997], 312). Ma Onyeisi Ezra Taft Benson kwuru: “Ndị bu anyị ụzọ ebuwo amụma na ọtụtụ tempụl ga-ejuputa ala obodo nke North na South Emerịka, agwa etiti niile nke Pacifik, Europe, na ebe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ọrụ mgbapụta nke a ka a ga-eme otu o kwesịrị, narị kwuru narị nke tempụl ka a ga-achọ” (Nkuzi niile nke Ezra Taft Benson [1988], 247).

  24. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:1.

  25. Okenye David B. Haight kwuru:

    “Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ahụworịị n’ezie Onye Nzọpụta, mana mgbe mmadụ jụrụ ọkọwa okwu, ọ na-amụta na enwere ọtụtụ mpụtara ndị ọzọ nke mkpụrụ okwu ahụ hụ, dị ka ịbịa mata Ya, ghọta Ya, kọta Ya na ọrụ Ya, na-aghọta ịdị mkpa Ya, ma ọ bụ ịbịa ịghọta Ya.

    “Ụdị nghọta na ngọzi ndị a si n’igwe dị adị nye onye ọbụla niime anyị” (“Temples and Work Therein,” Ensign, Nov. 1990, 61).