Ọgbakọ Zuru ọha
Mkpụrụ osisi Nke Fọdụrụ
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


11:39

Mkpụrụ osisi Nke Fọdụrụ

Inwe Mmụọ Nsọ ịrachi emume nsọ anyị niile dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ngozi niile ahụ e kwere na nkwa ruo mgbe ebighị ebi.

Dịka nwa okorobịa, a hụrụ m piich niile chara acha n’anya. Ruo taa, echiche nke ịtabiri piich chara acha dị mmiri mmiri nke nwere ụtọ yiri ka oroma nkịrịsị ka na-eme ka ọnụ m gbaa mmiri. Mgbe a tụtụrụ piich tozuru oke, ha na-anọ n’etiti ụbọchị abụọ na anọ tupu ha emebie. E nwere m obi ụtọ nke isonyere nne m na ụmụnne m na usekwu anyị dịka anyị na-echekwa piich niile a kpara akpa n’oge winter na-abịa site na-irachi ha n’ime karama niile. Ọ bụrụ na anyị echekwa piich niile n’ụzọ ziri ezi, mkpụrụ osisi a na-atọ ụtọ ga-anọru ọtụtụ afọ ọ bụghị naanị ụbọchị abụọ ruo anọ. Ọ bụrụ na a kwadebere ya nke ọma ma sie ya n’ọkụ, a na-echkwa mkpụrụ osisi ahụ ruo mgbe agbajiri nrachi ahụ.

Kraịst gwara anyị ka “gaa mịpụta mkpụrụ, … ka mkpụrụ anyị wee nọgide.” Kama Ọ naghị ekwu maka piich niile. Ọ na-ekwu banyere ngọzi niile nke Chineke nye ụmụ Ya. Ọ bụrụ na anyị mee ma dobe ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, ngọzi niile ahụ jikọtara ọgbụgba ndụ anyị niile nwere ike ịgbatị karịa ndụ nke a ma ga-arachikwa anyị, ma ọ bụ chekwaa, ruo mgbe ebighị ebi, na-aghọ mkpụrụ osisi nke fọdụrụ mgbe ebighị ebi.

Mmụọ Nsọ ahụ, n’ọrụ Ya dị nsọ dị ka Mmụọ Nsọ nke Nkwa, ga-arachi emume nsọ ọbụla n’isi ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ha ka ha wee dị ire mgbe anyị nwụsịrị. Inwe Mmụọ Nsọ ịrachi emume nsọ anyị niile dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ngozi niile ahụ e kwere na nkwa ruo mgbe ebighị ebi, na-aghọ mkpụrụ nke na-anọgide.

Nke a dị mkpa karịsịa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ebulịe anyị elu. Dịka Onyeisi Nelson kụziworo, anyị kwesịrị “ibido site na-iburu ngwụcha n’obi. … N’ezie, maka onye ọ bụla nime anyị, ‘ọgwụgwụ’ ahụ nke anyị ga-achọ inweta bụ ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi na ezinaụlọ anyị na ọnọdụ dị elu ebe anyị ga-anọ n’ihu nke Chineke, Nna anyị nke Eluigwe, na Ọkpara Ya Jizọs Kraịst.” Onyeisi Nelson ekwukwala: “Ọlụlụ di na nwunye selestịal bụ akụkụ dị mkpa nke nkwadebe maka ndụ ebighị ebi. Ọ chọrọ ka mmadụ lụọ onye ezi mmadụ, n’ebe kwesịrị ekwesị, site n’ikike ziri ezi, na irube isi nye n’ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ n’ikwesị ntụkwasị obi. Mgbe ahụ mmadụ nwere ike ijide n’aka na a ga-ebuli ya elu n’alaeze selestial nke Chineke.”

Gịnị bụ ngọzi niile nke mbuli elu? Ha na-agụnye ibi n’iru Chineke ruo mgbe ebighị ebi bikọta ọnụ ka di na nwunye, iketa “oche eze niile, alaeze niile, ala ọkparaeze niile, na ike niile, … na ịga n’ihu nke mkpụrụ niile ahụ ruo mgbe ebighị ebi,” na ịnata ihe niile nke Chineke Nna nwere.

Onyenwe anyị kpughere site n’aka Josef Smịth:

“Na ebube nke alaeze nke selestịal e nwere eluigwe atọ ma ọ bụ ogo atọ;

“Ma na usoro nke inweta nke kachasị-elu, onye ahụ ahaghị ibanye n’ime ụsoro nke ọkwa nchụaja [nke pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide nke ọlụlụ di na nwunye];

“Na ọbụrụ na o meghị otu a, o nweghị ike inweta ya.

“O nwere ike ịbanye nke ọzọ, mana nke ahụ bụ ngwụcha nke ala-eze ya; ọ gaghị enwe mmụba.”

Anyị na-amụta n’ebe a na mmadụ nwere ike ịnọ nalaeze selestịal, ma ọ bụ biri n’iru Chineke, ma bụrụ onye na-emebeghị ọlụlụ. Mana ka e wee bulie ya elu n’ọkwa kachasị elu nke alaeze seletịal, mmadụ ga-abanyerịrị n’ọlụlụ di na nwunye site n’ikike kwesịrị ekwesị ma were eziokwu nye ọgbụgba ndụ niile e mere n’alụm di na nwunye ahụ. Ka anyị na-ekwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ niile ndị a, Mmụọ Nsọ nke Nkwa ahụ nwere ike ịrachi ọgbụgba ndụ ọlụlụ di na nwunye anyị. Ngọzi niile ndị a arachiri na-aghọ mkpụrụ osisi nke fọdụrụ.

Gịnị ka achọrọ iji nikwesị ntụkwasị obi debe ọgbụgba ndụ ọhụrụ dị ebighị ebi nke alụm di na nwunye?

Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo na-enwere ụdị nkekọ abụọ mgbe anyị banyere n’ọgbụgba ndụ ọlụlụ di na nwunye ebighị ebi: njikọ dị n’akụkụ di na nwunye, na njikọ kwụ ọtọ n’ebe Chineke nọ. Inwe ngọzi nile nke mbuli elu arachiri n’isi anyị ma n’ọgide n’iru ndụ a, anyị aghaghị ikwesi ntụkwasị obi nye njikọ nke akụkụ na nke kwụ ọtọ nke ọgbụgba ndụ ahụ.

Idobe njikọ gị na onye gị na ya lụrụ, Chineke nyere anyị ndụmọdụ ka ị “hụ nwunye [gị] n’anya [ma ọbụ di] jiri obi [gị] niile, m … ga-rapara n’arụ ya ma enweghị onye ọzọ.” Maka ndị lụrụ di na nwunye, ịrapara n’ahụ ya ma ọ bụ ya na ọ dịghị onye ọzọ pụtara na unu na-adụkọrịta ọdụ ọnụ n’ịhụnanya, unu hụrụ ibe unu n’anya ma na-elekọta ibe unu, ị na-ebute oge gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ụzọ karịa ọdịmma ndị ọzọ, ma unu na-akpọ Chineke ka onyere unu aka merie adịghị ike unu niile. Ọ pụtakwara na e nweghị ụdị mmekọ nke ahụ na nke uche ọ bụla gaadị n’ezi alụm di na nwunye gị, gụnyere ịchụ achụ ma ọ bụ ịkpa enyi, ma ọ dịghịkwa ikiri ndị gba ọtọ, nke na-akpali agụụ mmekọahụ.

Iji nọgide na-enwe njikọ dị n’akụkụ n’ọgbụgba ndu ahụ, onye ọ bụla ga-achọsi ike ịnọ n’alụm di na nwunye. Onyeisi Dallin H. Oaks kuziri na nso nso a: “Anyị makwara na Ọ [Chineke] gaghị amanyere onye ọbụla ịbanye nime mmekọrịta nrachi nke megidere uche ya. Ngọzi niile nke mmekọrịta arachiri arachi ka ekwere na nkwa nye ndị niile ga-edebe ọgbụgba ndụ ha niile mana na-abụghị site na mmanye njikọ arachiri n’elu onye ọzọ na-etozubeghị oke ma ọ bụ na adịghị njikere

Gịnị bụ njikọ kwụ ọtọ nke Onyeisi Nelson kwuru maka ya? Njikọ ahụ kwu ọtọ bụ nke anyị na Chineke na-eme.

Iji dobe njikọ kwu ọtọ n’ebe Chineke nọ, anyị ga-akwụsi ike nye ọgbụgba ndụ niile nke tempụl ahụ anyị meworo gbasara iwu niile nke nrube isi, ịchụ aja, ozi ọma, ịdị ọcha mmekọrịta na ido nsọ. Anyị na Chineke na-agbakwa ndụ ịnata onye nsiso anyị nke ebighị ebi na ịbụ ezi di ma ọ bụ nwunye na nne na nna. Ka anyị na-edobe njikọ kwụ ọtọ, anyị na-etozu oke maka ngọzi nke ịbụ akụkụ nke ezinaụlọ nke Chineke site n’ọgbụgba ndụ Abraham, gụnyere ngọzi niile nke ụmụ ụmụ, ozi ọma ahụ, na ọkwa nchụaja. Ngọzi niile ndị a bụkwa mkpụrụ osisi nke fọdụrụ.

Ka anyị na-enwe olile anya na ndị niile na-abanye n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ na nke ebighị ebi ga-anọ n’eziokwu ma nweta ngọzi niile ahụ arachiri n’isi ha ruo mgbe niile ebighị ebi, mgbe ụfọdụ echiche ahụ na-adị ka aka anyị agaghị eru ya. Na-ije ozi m niile ahụtawo m ndị otù na-eme ma na-edebe ọgbụgba ndụ niile mana ndị ha lụrụ anaghị eme ya. E nwekwara ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, na-enwekwaghị ohere ịlụ di na nwunye na ndụ ha. Ma e nwere ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’ọgbụgba ndụ alụm di na nwunye ha. Gịnị ga-eme ndị mmadụ dabara n’ọnọdụ ndị a?

  1. Ọ bụrụ na ị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ niile nke i mere mgbe e nyere gị onyinye dị nsọ, ị ga-anata ngọzi niile nkeonwe e kwere gị na nkwa na onyinye dị nsọ ahụ ọbụrụgodị na onye ịlụrụ emebiwo ọgbụgba ndụ ya niile ma ọ bụ hapụ alụm di na nwunye ahụ.. Ọ bụrụ na a rachiri gị ma emechaa gbaa alụkwaghịm, ma ọ bụrụ na a kagbughị nrachi ahụ, ngọzi niile nke onwe gị nke nrachi ahụ ga-adịgide maka gị ma ọ bụrụ na ị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi.

    Mgbe ụfọdụ, n’ihi mmetụta nke nraranye na ezigbo mmekụta, di ma ọ bụ nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi nwere ike chọọ ịkagbu nrachi ha na onye ha lụrụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi ka ha nwee ike ịpụ n’ebe ha nọ dịka o kwere mee, ma n’ụwa ma ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụrụ na ị na-enwe nchegbu na n’ụzọ ụfọdụ a ga-ejikọta gị na onye ịlụrụ mbụ na-enweghị nchegharị, cheta, a gaghị eme ya! Chineke agaghị achọ ka onye ọ bụla nọrọ na mmekọrịta nrachi ruo mgbe ebighị ebi megide ọchịchọ ya. Nna nke Eluigwe ga-ahụ na anyị ga-anata ngọzi ọ bụla nke ọchịchọ na nhọrọ anyị niile kwere.

    Agbanyeghị, ọ bụrụ na a chọrọ nkagbu nke nrachi, a na-asọpụrụ nhọrọ. E nwere ike ịgbaso ụfọdụ usoro. Mana nke a ekwesịghị ime ya na nkịtị! Ndị isi Mbụ ka e nyere ọtụghe ijikọ na rachịe n’ụwa na n’elu-igwe. Ozugbo Ndị isi Mbụ nyere ikike nke nkagbu nrachi, ngọzi niile metụtara nrachi ahụ adịkwaghị n’ọrụ; a kagbuola ha ma n’akụkụ ma na ịkwụ ọtọ. Ọ dị mkpa ịghọta na iji nweta ngọzi niile nke mbuli elu, anyị ga-egosipụta na anyị dị njikere ịbanye na n’ikwesị ntụkwasị obi na-edobe ọgbụgba ndụ ọhụrụ dị ebigbị ebi, ma n’ime ndụ nke a ma ọbụ nke na-eso.

  2. Maka ndị otù Nzukọ nsọ ahụ na-embeghị ọlụlụ, biko cheta na “n’ụzọ ma n’oge nke Onyenwe anyị, agaghị enwe mọlị ngọzị nke agaghị erutere Ndị Nsọ Ya kwụsịrị ike n’okwukwe. Onyenwe anyị g’ekpe ikpe ma kwụọ onye ọbụla ụgwọ dịka otu [ọchịchọ obi] onye ahụ sịrị dị ma ịhe ọ metara.”

  3. Ọ bụrụ na ị nọgideghị na-ekwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ nịịle nke tempụl, e nwere olile anya? Ee! Oziọma nke Jisọs Kraịst bụ oziọma nke olile anya. Olile anya ahụ na-abịa site n’aka Jizọs Kraịst n’ezi nchegharị na nrube isi na-eso nkuzi niile nke Jizọs Kraịst. A hụla m ndị mmadụ mere mmehie niile dị ukwuu, na-emebi ọgbụgba ndụ niile dị nsọ. Na oge niile, A na m ahụ ndị ji ezi obi chegharịa, agbaghara ha, ma laghachi n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ ahụ. Ọ bụrụ na ị mebiwo ọgbụgba ndụ niile nke tempụl gị, A na m arịọ gị ka ị chigharịkwuru Jizọs Kraịst, gị na bishọp gị kparịa, chegharịa, ma meghee mkpụrụ obi gị nye ike ọgwụgwọ dị ike dị n’ihi aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnaanya enyewo anyị ọgbụgba ndụ niile ka anyị wee nwee ike nweta ihe niile O debere maka anyị. Ngọzi ndị a dị nsọ sitere n’aka Chineke na-atọ ụtọ karịa mkpụrụ osisi ọ bụla nke ụwa. E nwere ike idobere anyị ha mgbe ebighị ebi, na-aghọ mkpụrụ osisi nke fọdụrụ, dịka anyị na-ekwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ anyị niile.

A na m agba ama na Chineke eweghachila ikike iji jikọọ n’ụwa ka ewe jikọọ n’elu-igwe. A na-ahụ ikikere ahụ n’ime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazu a. Ọ bụ ndị Otù Ndịisi Mbụ na Kworum Ndị Ozi Iri na abụọ ji ya ma a na-eji ya arụ ọrụ na ntụziaka nke Onyeisi Russell M. Nelson. Ndị na-abanye n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ na ebighi ebi nke ọlụlụ di na nwunye ma na-edebe ọgbụgba ndụ ahụ nwere ike zuo oke ma mechaa nweta n’uju nke ebube nke Nna, n’aghanyeghị ọnọdụ niile ndị na-enweghị ike ịchịkwa ha.

Ngọzi niile e kwere na nkwa nke metụtara ọgbụgba ndụ anyị niile ka e nwere ike ịrachi anyị site na Mmụọ Nsọ nke Nkwa ma bụrụ mkpụrụ osisi nke fọdụrụ mgbe ebighị ebi. Otu a ka m si gbaa ama n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Jọn15:16.

  2. Lee Dale G. Renlund, “Inweta Ike nke Chineke site na Ọgbụgba ndụ niile,” Liahona, Mee 2023, 35–38; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:7.

  3. A na-arachi otu emume nsọ mgbe e mere ya ka ọ dị ire ma n’eluigwe ma n’ụwa n’ihi na ọ bụ onye nwere ikikere na-eme ya ma Mmụọ Nsọ kwadoro ya.

    “Anyị na-achọkarị iche maka ikike nrachi dị ka imetụta naanị ụfọdụ emume nsọ tempụl, mana ikike ahụ dị mkpa iji mee emume nsọ ọbụla dị ire ma na-ejikọ gafee ọnwụ. Ike nrachi na-enyefe ihe nrachi nke izi ezi nisi baptizim gị, n’ịma atụ, ka enwee ike mata ya ebe a na n’eluigwe. N’ikpeazu, emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja ka a na-eme n’okpuru ọtụghe niile nke Onyeisi Nzukọ nsọ, ma dị ka Onyeisi Josef Fielding Smith kọwara, ‘Ya [Onyeisi Nzukọ nsọ] enyewo anyị ikike, o tinyewo ike nrachi niime ọkwa nchụaja anyị, niihi na o ji ọtụghe ndị ahụ’ [eńọmiri site na Harold B. Lee, in Conference Report, Oct. 1944, 75]” (D. Todd Christofferson, “Ike nke Nrachi,” Liahona, Nov. 2023, 20).

    “Omume nke e jiri Mmụọ Nsọ nke Nkwa rachie bụ nke akwadoro site n’aka Mmụọ Nsọ; ọ bụ nke akwadoro site n’aka Onyenwe anyị. … O nweghị onye nwere ike ịgha ụgha nye Mmụọ Nsọ ma lagbụrụ ya. … Ụkpụrụ ndị a na-emetụtakwa emume nsọ ọ bụla na ọrụ ọ bụla n’ime Nzukọ nsọ. Ya mere ọ bụrụ na ndị abụọ nime [ọlụlụ di na nwunye] bụ ndị ’eziomume’ [Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 76:53.], ọ bụrụ na ha tozuru oke, a ga-etinye nrachi n’elu ọlụlụ di na nwunye tempụl ha; ọ bụrụ na ha erughị eru, Mmụọ agaghị agụnye ha ka ndị ezi omume ma a ga-ejide nkwado nke Mmụọ Nsọ. Ntozu oke n’abịa ga-etinye nrachi n’ike ma ajọọ omume ga-agbaji nrachi ọ bụla” (Bruce R. McConkie, ”Mmụọ Nsọ nke Nkwa,” nime Nkwado maka Ọlụlụ di na nwunye Mgbe ebighị ebi Akwụkwọ Ntụziaka Ụmụakwụkwọ [2003], 136).

    Mmụọ Nsọ nke Nkwa bụ Mmụọ Nsọ ahụ nke na-edobe akara nke nkwado n’elu emume nsọ ọ bụla: baptizim, ime onye otu, echichi, ọlụlụ di na nwunye. Nkwa ahụ bụ na a ga-enweta ngọzi niile ahụ site n’ịkwesị ntụkwasị obi. Ọ bụrụ na mmadụ emebie ọgbụgba ndụ, ma ọ bụ nke baptizim, echichi, ọlụlụ di na nwunye ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ, mmụọ na-ewepụ stampụ nke nkwado, ma agaghị enweta ngọzi niile. Emume nsọ ọ bụla ka arachiri jiri nkwa nke ụgwọ ọrụ dabere nikwesị ntụkwasị obi. Mmụọ Nsọ na-ewepụ stampụ nkwado ebe e mebiri ọgbụgba ndụ niile” (Josef Fielding Smith, Ozizi niile nke Nzọpụta, comp. Bruce R. McConkie [1954], 1:45).

  4. Russell M. Nelson, Heart of the Matter: Ihe ibi Afọ 100 Kuziworo M (2023), 15. Ọgbụgba ndụ niile ga-enwerịrị nrachi site n’aka Mmụọ Nsọ nke Nkwa ma ọbụrụ na ha ga-enwe ike mgbe mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:7).

  5. Russell M. Nelson, “Ọlụlụ Di na Nwunye Selestial,” Liahona, Nov. 2008, 94.

  6. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 132:19.

  7. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 84:38.

  8. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 131:1–4.

  9. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 132:19-20. “Njedebe ahụ kachasị dị elu—mbuli elu n’ime alaeze selestịal— bụ ebe nlekwasị anya nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a” (Dallin H. Oaks, “Alaeze niile nke Ebube,” Liahona, Nov. 2023, 26).

  10. “Dị ka alumdi na nwunye niile na ezi na ụlọ niile na-enwekọrịta njikọ pụrụ iche [nke] na-emepụta ịhụnaanya pụrụ iche, otu ahụkwa ka mmekọrịta ọhụrụ enwere na-adị mgbe anyị kekọtara onwe anyị site n’ọgbụgba ndụ ị kwụ ọtọ nye … Chineke” mgbe anyị na-abanye n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ na ebighị ebi nke alụmdi na nwunye (Russell M. Nelson, Obi nke Okwu ahụ41–42).

  11. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:22; lee kwa Akwụkwọ Ntụziaka Izugbe: Ije ozi n’ime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a, 38.6.16. N’ịtụle ọlụlụ di na nwunye n’ebe a, A na m ekwu maka ọlụlụ di na nwunye dịka iwu Chineke siri dị, nke kọwara ọlụlụ di na nwunye dịka njikọ iwu na nke iwu kwadoro n’etiti nwoke na nwanyị (lee “Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa amara nye Ụwa,” Ọba Akwụkwọ nke Ozi ọma).

  12. Lee “Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa amara nye Ụwa,” Ọba Akwụkwọ nke Ozi ọma.

  13. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:22-24.

  14. Dallin H. Oaks, “Alaeze niile nke Ebube,” 29; emphasis added.

  15. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 86:8–11; 113:8; Abraham 2:9–11.

  16. Lee Akwụkwọ Ntuzi aka Izugbe, 38.4.1.

    Mgbe m na-eje ozi mgbasa ozi ọma n’ime Switzerland, mụ na onye otu m kuziri otu di na nwunye dị egwu gbara afọ 60 ozi-ọma ahụ. Ka anyị na-akuzi di na nwunye a banyere Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst e weghachiri, nwanyị ahụ gosipụtara mmasị dị ukwuu n’ihe anyị na-akuzi. N’ime izuụka ole na ole, ọ nwetara ọgbụgba ama maka eziokwu na eweghachitere Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst jiri ikikere ziri ezi sitere n’aka Chineke ma na Jizọs Kraịst na-eduzi Nzukọ nsọ Ya site n’aka ndị amụma na ndị ozi niile dị ndụ. Anyị tụrụ anya ikuzirzi di na nwunye a gbasara otu n’ime nkuzi kacha mma nke mweghachi, ohere ahụ maka ọlụlụ di na nwunye ebighị ebi. N’ịju anya, otu o dị, ka anyị na akuzi di na nwunye a banyere ozizi nke ọlụlụ di na nwunye ebighị ebi, nwanyị Switzerland kwuru na ya enweghị mmasị ịnọnyere di ya ruo mgbe ebighị ebi. Nye ya, eluigwe agụnyeghị iso di ya, bụ onye ọ lụrụla kemgbe afọ 36. Nwanne nwanyị ahụ mere baptizim, mana di ya emeghị. Ọ dịghị mgbe arachiri ha n’ime tempụl.

    Nye ọtụtụ ndị, agbanyeghị, eluigwe agaghị abụ eluigwe ma ọ bụrụ na ha na onye ahụ ha na ya lụrụ di na nwunye anọkọghị. Na gị na nwunye ahụ ị hụrụ n’anya mgbe ebighị ebi n’ezie dị ka eluigwe. Dịka Okenye Jeffrey Holland kerịtara gbasara nwunye ya ọ hụrụ n’anya, Pat, eluigwe agaghị abụ eluigwe ma ọ bụrụ na ọ nọghị (lee “Scott Taylor: Maka Okenye Holland, Eluigwe na-enweghị Nwunye na Ụmụ Ya ‘Agaghị Abụ Eluigwe maka M,’” Church News, July 22, 2023,thechurchnews.com).

  17. Lee Dallin H. Oaks, “Alaeze nke Ebube,” 26.

  18. Russell M. Nelson, “Ọlụlụ Di na Nwunye Selestia,” 94.

  19. Lee Jọn 15:16.