Ọgbakọ Zuru ọha
Ọńụ Kacha Dị Elu
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


15:37

Ọńụ Kacha Dị Elu

Ka anyị niile chọọ ma chọta ọńụ ahụ dị elu nke na-abịa site na-itinye ndụ anyị niile nime Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya ọ Hụrụ naanya.

Enwetewo m nnukwu ngọzi ikwu okwu nime ọgbakọ zuru ọha ruo afọ iri atọ ugbua. N’oge nke ahụ, ọtụtụ mmadụ gburugburu ụwa ajụwọ m ọtụtụ ajụjụ metụtara ozi niile ndị a. Na nso nso, otu ajụjụ nime ha na-abịakarị. Ọ na-adịkarị otu a: “Okenye Uchtdorf, Akpachara m anya gee ntị na okwuchukwu ikpeazụ gị, mana …a nụghịm ihe ọbụla banyere ụgbọelu”

Mgwanụ, mgbe taa gafesịrị, enwere ike a gaghị m anụ ụdị ajụjụ ahụ ọzọ rụọ nwantịtị oge.

N’elu “Ntụgharị Obi ụtọ ahụ nke Urukpuru niile Anyanwu Kewara”

Ọ rara ahụ ị kwere na ọ bụ nanị afọ 120 gara aga mgbe Wilbur na Orville Wright buru ụzọ felie elu gafee aja niile nke Kitty Hawk, North Carolina. Ife efe mkpirisi anọ nime ụbọchị Dizemba anọ gbanwere ụwa ma mehee ụzọ nke otu niime nchọpụta kachasị ibe ya niime agụgụala nke ụwa.

Ife efe bụ ihe ize ndụ n’ụbọchị niile nke mbụ ahụ. Ụmụnne ndị nwoke maara nke a. Ma otu a ka nna ha Milton makwara. N’ezie, ezigbo egwu tụrụ ya maka ụmụ ya ndị nwoke abụọ ịnwụ nihe mberede nke ife ife nke mere ha ji kwe ya nkwa na ha agaghị efekọta ọnụ ma ọlị.

Ma ha emeghị nke a ma ọlị—nanị na otu ngụpụ. Afọ asaa mgbe ụbọchị nke a pụrụ iche gafere na Kitty Hawk, Milton Wright na-ikpeazu nyere ụmụ ya nkwado ya ma kirie ka Wilbur and Orvill fekọtara ọnụ n’otu mbụ ya. Mgbe ha fedatara, Orville mere ka nna ya kwete ị fee ụgbọelu ya nke mbụ na nke ikpeazụ ma jiri anya nke onwe ya hụ ịhe ọ dị ka ya.

Dị ka ụgbọelu ahụ fegoro site n’ala, Milton dị afọ 82 nwetere ezigbo obi ụto nke ifeli elu nke mere ụjọ niile jiri site nime ya pụọ. Orville ńụrụ ọńụ mgbe nna tiri mkpu ọńụ, “Elu elu, Orville, elu elu!”

Onye a bụụrụ nwoke na-amasị obi nke m!

Ikekwe otu ihe mere m ji na-ekwu banyere ife efe mgbe ụfọdụ bụ na A maara m otu ihe nke metụtara obi ndị Wright. Mụ onwe m “ahapụwokwa ajọọ nkedo niile nke Uwa ma gbaa egwu n’igwe n’elu nku olaọcha nke ọchị juru.”

Ife efe nke mbụ ahụ nke ụmụnne ndị nwoke Wright, nke mere nanị afọ 37 tupu ọmụmụ m, mehere ụzọ niile nke njem, ịtụnanya, na ọńụ na-enweghi ntụpọ niime ndụ m.

Ma nagbanyeghị otu itụnanya ọńụ ahụ dị, enwere ọbụna ụdị ọńụ karịrị ya idi elu. Taa, na mmụọ nke mkpu ahụ Milton Wright tiri, “Elu elu, Orville, elu elu,” Ọ ga-amasị m ikwu banyere ọńụ dị elu nke a—ebe o si abịa, otu o si abata niime obi anyị, na otu anyị si nwete nhụmihe ya n’ogo dị nnukwu.

Ebumnobi niile nke Idị adị Mmadụ

Ikekwe a ghaghị aga ma ghara ikwu na onye ọbụla chọrọ ịnwe ańụrị. Nagbanyeghi, a ghaghịkwa aga ma ghara ikwu na ọbụghị onye ọbụla nwere ańụrị. Na mnwute, ọ dị nọọ ka, maka ọtụtụ ndị mmadụ, ịchọta ańụrị rara ahụ.

Gịnị kpatara nke a? Ọ bụrụ na ańụrị bụ otu ihe ahụ mmadụ kacha nwe mmasị, gịnị kpatara anyị anaghị enwete ọganihu na-ịchọta ya? Ikwugharị otu egwu nke ime obodo, enwere ike anyị na-achọ ọńụ ahụ n’ebe ndị n’ezighi ezi.

Kedụ ebe Anyị Ga-achọta Ańụrị?

Tupu anyị akparịta otu esi achọta ọńụ, kwee ka m nakwere na obi ịda mba na ima aka niile siri ike nke echiche na mmetụta uche dị irè, ma na azịza ya abụghị nnọọ “Gbaa mbọ ịnwe ańụrị karịa.” Ebumnuche m taa abụghị ibelata ma ọ bụ akpọghị ihe niile nke ahụike nke uche ihe. Ọ bụrụ na ị na-ezute ụdị ima aka ndị a, E so m gị eri uju ma eguzoro m gị n’akụkụ. Maka ụfọdụ ndị mmadụ, ịchọta ọńụ nwere ike gụnye ịchọta enyemaka site n’aka ndị ọkachamara ahụike nke uche ndị tinyere ndụ ha na-ịrụ ọrụ nka ha dị mkpa. Anyị kwesịrị ịnye ha ekele maka ụdị enyemaka nke a.

Ndụ abụghị nnọọ usoro agwụghị agwụ maka obi ụtọ. “N’ihi na ọ dịrịrị mkpa, na a ga-enwe mmegide n’ihe nile.” Ma ọ bụrụ na Chineke n’onwe Ya na-ebe akwa, dị ka otu akwụkwọ nsọ kwuru Ọ na-eme, mgbe ahụ mụ na gị gakwa ebekwe akwa. Ịnwe mnwute abụghị akara ọdịda. N’oge ndụ a, opekampe, ọńụ na iri uju bụ ndị nsiso n’enweghi nkewa. Dị ka onye ọbụla niime unu, Mụ onwe m enwetawo oke nke m nke ndakpọ olileanya m, iri uju, mnwute, na mmetụta nchegharị

Kosiladị, E nwetawokwa m nhụmihe nye onwe m maka anyanwụ ụtụtụ ahụ dị ebube nke na-ejupụta mkpụrụ obi na ọńụ nke dị ukwuu a na-enweghi ike ijikwali ha nime. A chọpụtawo m maka onwe m na obisike nke a nwere udo na-abịa site na-isoro Onye Nzọpụta na ije ije n’Ụzọ Ya.

Udo ahụ Ọ na-enye adịghị ka nke ụwa na-enye. O ka mma. Ọ dị elu ma dịrị nsọ karịa. Jizọs sịrị, “A bịawom ka ha wee nwe ike nwe ndụ, ma ka ha wee nwe ike nwee ya n’uju karịa.”

Ozi ọma nke Jizọs Kraịst bụ n’ezie “ozi ọma nke ọńụ dị nnukwu”! Ọ bụ ozi nke olileanya na-enweghị atụ! Ọ bụ ozi nke nkedo-yok ma mbupụ ibu arọ. Nke nchịkọta ìhè. Nke obi ọma eluigwe, nghọta dị elu karịa, ọgbugba ndụ ndị kacha dị nsọ, nchekwa ebighị ebi, na ebube ebighị ebi!

Ọńụ bụ nnọọ ebumnuche atụmatụ Chineke nwere maka ụmụ Ya. Ọ bụ ihe kpatara ejiri kee gị—“na [unu] wee nwe ike nwee ọńụ”! Ekere unu maka ihe nke a!

Nna anyị nke Eluigwe ezochaghị ụzọ ahụ eji enweta ańụrị. Ọ bụghị ihe ezoro ezo. Ọ dịịrị onye niile!

Ekweere ya na nkwa nye ndị niile ga-eje ije ndị na-eso ụzọ, ndị sooro nkuzi niile na ọmụmatụ niile nke Onye Nzọpụta, debe iwu nsọ Ya niile, ma kwanyere ọgbụgba ndụ niile ha na Chineke mere ugwu. Nkwa nke a dị mma ikwu okwu ya!

Chineke Nwere Ihe Karịrị akarị Ọ ga-enye

Anyị niile mara ndị na-ekwu na Chineke adịrịghị ha mkpa maka ịnwe obi ụtọ, na obi ụtọ ha zuuru ha na-enweghi okpukperechi.

A na m anakwere ma na-akwanyere mmetụta ndị a ugwu. Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnaanya chọrọ ka ụmụ Ya niile nwete ańụrị ruo ogo ọbụla ọ kwere omume, nihi nke a Ọ mejupụtara ụwa n’ịdị mma, ụtọ na mmasị niile dị mma maka “iji mee ka anya hụ ihe ọma … iji mee ka obi dị ụtọ.” Maka mụ, ife efe nwetere m nnukwu ańụrị. Ndị ọzọ na-achọta ya niime egwu, nime nka, nime ihe omume ntụrụndụ, ma ọ bụ nime eke.

Site na-ikpoku onye niile na ikesa ozi dị mma nke nnukwu ọńụ nke Onye Nzọpụta, anyị anaghị agụpụ nsipụta ọbụla nke ọńụ ndị a. Anyị na-ekwu nnọọ na Chineke nwere ihe karịrị ya ịnye. Ọńụ dị elu ma dị nnukwu—ọńụ nke gafere ihe ọbụla nke ụwa nke a na-enye. Ọ bụ ọńụ nke na anagide obi mgbawa, rikpuo iri uju ma belata owu ọmụma.

Ańụrị nke ụwa, na-ịdị iche ya, anaghị anọgide. O nweghi ike ya. Ọ bụ ejirimara ihe nke ụwa ịka nka, ree ere, gwụ ike, ma ọ bụ gbaa ụka. Mana ihe nke chi na-adị ebighị ebi, nihi na Chineke dị ebighị ebi. Jizọs Kraịst bịara ibuli anyị pụọ nime ihe nwantịtị oge ma dochi ire ure jiri ereghị ure. Naanị Ya nwere ike ahụ, ma nanị ọńụ Ya na-adịgide.

Ọ bụrụ na ị na-achọ ụdị ọńụ dị otu a nime ndụ gị, a na m akpọku gị isonye nime njem nke isoro Jizọs Kraịst ma n’Ụzọ Ya. Ọ bụ njem nke ogologo ndụ a—ma gafee ya. Biko ka m tụpụta ntakịrị nzọụkwụ mmalite nime njem a tozuru oke nke eji achọpụta ọńụ na-enweghi ntupọ.

Bịaruo Chineke Nso

Ị na-echeta nwanyị ahụ niime Agba Ọhụrụ onye nagidere ọrịa oruru ọbara ruo afọ 12? O tufuwo ihe niile ọ nwere n’isi ndị dọkịnta, mana ihe gara nihu na-adị njọọ. Ọ nụwo maka Jizọs; ike ọgwụgwọ Ya bụ ihe amara nke ọma. Mana Ọ nwere ike ịgwọ Ya? Ma kedụ otu o ga esi erute Ya nso? Ọrịa ya mere ya “adịghị ọcha” dị ka iwu nke Mosis kwuru, ma nihi ya achọrọ ya ị nọpụ iche site na ndị ọzọ.

Ịbịakwute Ya nihu ọha ma rịọ ya maka ọgwụgwọ dị nnọ ka ihe na-ekweghi omume.

Kama, ọ chere, “Ọ bụrụ na m ga emetụ uwe ya aka, a ga eme ka m dị ọcha.”

Nikpeazu, okwukwe ya meriri ụjọ ya. O jiri obi merie nkọrọmọnụ ndị ọzọ ma gaa niihu ruo ebe Onye Nzọpụta nọ.

Na ikpeazụ, ọ rutere nso. Ọ gbatịpụrụ aka ya.

Ma ọ natara ọgwụgwọ.

Ọ bụna enweghi otu anyị si dịrị nnọọ ka nwanyị a?

Enwere ike inwe ọtụtụ ihe na-eme anyị ji enwe obi abụọ ị bịaru nso n’ebe Onye nzọpụta nọ. Anyị nwere ike zute nkatọ ma ọ bụ ikpe ọmụma site n’aka ndị ọzọ. N’ime mpako anyị, anyị nwere ike ileghara ikwe omume nke ihe ahụ dị nnọọ mfe ịnwe ezigbote uru. Anyị nwere ike iche na ọnọdụ anyị nwere otu o jiri nwe ike gụpụ anyị na ntozu oke nke ọgwụgwọ Ya—na anyị nọ ebe dị ezigbo anya ma ọ bụ mmehie anyị dị ọtụtụ.

Dị ka nwanyị a, A mụtawom na ọ bụrụ na anyị bịaruo Chineke nso ma setịpụ aka anyị metụ Ya, n’ezie anyị nwere ike chọta ọgwụgwọ, udo na ọńụ.

Chọọ maka ya

Jizọs kuziri, “Chọọnụ, ma unu ga-achọta.”

Ekwenyere m na nkebiokwu a dị mfe abụghị nanị nkwa ime mmụọ, ọ bụ okwuonu nke eziokwu.

Ọ bụrụ ma anyị chọọ ihe ga-akpali iwe iwe, inwe obi abụọ, ịnwe obi ilu, anyị ga-achọtakwa ha.

Kosiladị, Ọ bụrụ ma anyị chọọ ọńụ—ọ bụrụ ma anyị chọọ ịńụrị ọńụ ma jiri obi ụtọ soro Onye Nzọpụta, anyị ga-achọta ha.

Ọ rara ahụ ịchọta ihe ahụ anyị anaghị achọ.

Ị na-achọ ọńụ?

Chọọnụ, ma unu ga-achọta.

Burita Ibu-arọ Onye Ọbụla nye Ibe ya.

Jizọs kuziri, “Ọ bụ ihe kacha dị ngọzi ịnye enye karịa ịnata anata.”

O nwere ike ị bụ na n’oge njem ịchọta ọńụ, ụzọ kacha eji achọta ya bụ ịwetere ndị ọzọ ọńụ?

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, unu maara ma A ma mara m na nke a bụ eziokwu! Ọńụ dị ka gbọmgbọm ntụ ọka ma ọ bụ ite mmanụ nke na-agaghị agwụ agwụ ma ọlị. Ezi ọńụ na-amụbawanye mgbe a kesara ya.

Ọ chọghị ihe di nnukwu ma ọ bụ dị mgbagwoju anya.

Anyị nwere ike ị mee ihe ndị dị mfe.

Dị ka ịkpeere onye ọzọ ekpere jiri obi anyị niile.

Inye ekele si n’obi

Nyere mmadụ aka nwete mmetụta nnabata, nkwanye ugwu, ịba uru ma ịhụnaanya.

Kesaa akwụkwọ nsọ kacha masị anyị ya na ịhe ọ pụtara nye anyị.

Ma ọ bụgodi ịgee nnọọ ntị.

“Mgbe unu nọ na-ijere mmadụ ibe unu ozi unu nọ nanị na-ije ozi nke Chineke gị,” ma Chineke ga-akwụghachi obi ebere gị mmaji kuru mmaji. Ọńụ ahụ ị na-enye ndị ọzọ ga-alaghachikwuru gị “n’ezigbo ntụtụ, e wedatara ala, ma jikọta ọnụ, ma na-ejubiga-oke.”

“Gịnịzi Ka Anyị Ga-eme?”

N’oge ụbọchị niile, izu niile, na ọnwa ndị na-abịa abịa, ka m kpokuo unu ịme:

  • Wepụta oge jiri ezigbo mgbalị ejiri obi niile mee iji bịarute Chineke nso.

  • Chọsike maka ohere olile anya, udo na ọńụ maka ụbọchị ọbụla.

  • Wetere ndị ọzọ nọ gburugburu gị ọńụ.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ezi ndị enyi, dịka unu na-achọ okwu Chineke maka nghọta dị omimi banyere atụmatụ ebighị ebi nke Chineke, nabatanụ oku ndị a, ma gbalịa ije ije n’Ụzọ Ya, unu ga-enwete nhụmihe nke “udo nke Chineke, nke karịrị nghọta niile,” ọbụna n’etiti iri uju niile. Ị ga-enweta mmetụta ntụtụ karịrị akarị nke ịhụnaanya na-enweghi atụ nke Chineke dị ka ọ na-ejupụta obi gị. Ọwụwa anyanwụ nke ihè selestịal ga-arukpunye niime ọchịchịrị nke mnwale unu niile, ma ị ga-amalite ịnụ ụtọ nke ebube niile ọnụ apụghị ikwu na ntụnanya niile nke ebe eluigwe nke anya ahụbeghi, na nke zuru oke. Ị ga-ahụta ka esi na-ebuli mmụọ gị pụọ na ike ndọda nke ụwa nke a.

Ma dị ka ezi Milton Wright, ikekwe unu ga-ewelite olu unu na ịńụrị ọńụ ma tie, “Elu elu, Nna, elu elu!”

Ka anyị niile chọọ ma chọta ọńụ ahụ dị elu nke na-abịa site na-itinye ndụ anyị niile nime Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya ọ Hụrụ naanya. Nke a bụ ekpere obi m na ngọzi m na aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. John Gillespie Magee Jr., “Ụgbọ elu Dị elu,” poetryfoundation.org.

  2. Lee Christopher Klein, “Ihe 10 ị nwere ike ịmaghị gbasara Ụmụnne Nwoke Wright,” History, Mar. 28, 2023, history.com.

  3. Magee, “Ụgbọ elu Dị elu.”

  4. Afọ puku abụọ na narị anọ gara aga, Aristotle kwuru na obi ụtọ bụ otu ihe na-agụsi mmadụ niile agụụ ike. N’akwụkwọ akụkọ ya Nicomachean Ethics, ọ kụziri na ihe kacha mma na ndụ bụ ihe anyị na-achụso dị ka njedebe n’onwe ya (na-emegide ihe ndị anyị na-achụso bụ ụzọ isi nweta njedebe ọzọ). Obi ụtọ, karịa ihe niile, bụ ihe dị otú ahụ. “Anyị na-achọkarị obi ụtọ n’ihi nke ya,” ka o kwuru “ma nabụghịkwa ma ọlị ụzọ iji nweta ihe ọzọ” (The Nicomachean Ethics of Aristotle, trans. J. E. C. Weldon [1902], 13–14).

  5. Lee Harry Enten, “Obi Ụtọ ndị Amerịka Kụbara Ọnụ ọgụgụ Dị ala,” CNN, Feb. 2, 2022, cnn.com; Tamara Lush, “Ntuli aka: Ndị Amerika Kacha Enweghi Obi ụtọ Ugbua Kemgbe Afọ 50,” Associated Press, June 16, 2020, apnews.com; “Ọchịchịrị Dị Ukwuu: Na 2023, Ndị ọrụ Ugbua Kacha Enweghị Obi ụtọ Karịa Mgbe ọ bụla. Gịnị mere? BambooHR, bamboohr.com.

  6. Lee Wanda Mallette, Patti Ryan, na Bob Morrison, “Na-achọ Ịhụnaanya (n’Ebe Ndị Nezighi ezi)” (1980).

  7. 2 Nefi 2:11.

  8. Lee Jọn 11:35; Mozis 7:28–37.

  9. Lee 2 Nifaị 2:11.

  10. Lee Jọn 14:27.

  11. Jọn 10:10.

  12. Luk 2:10, New Revised Standard Version.

  13. Lee Matiu 11:28-30.

  14. 2 Nifaị 2:25.

  15. Ọ bụrụ na ị nwere nchegbu ọ bụla ma Nna gị Nke Eluigwe ga-anabata gị ma ọ bụ na ọ gaghị anabata gị ma kwe ka ị nweta ọńụ Ya, a na m akpọ gị òkù ka ị jiri ekpere gụọ ilu Kraịst banyere nwa mmefu.(Lee Luk 15:11–32). N’ilu ahụ, anyị na-amụta otu Nna anyị nke Eluigwe si enwe mmetụta banyere ụmụ Ya na otu Ọ na-eche ma na-eme emume nloghachi anyị mgbe anyị si n’ebe Ọ nọ kpafuo! Site n’oge ahụ anyị “matara onwe anyị” (lee verse 17) wee malite njem ahụ ịlaghachi ebe obibi, Ọ ga-ahụ anyị, n’ihi na Ọ na-eguzo na-eche nche na eche. Ma gịnị ka Ọ na-echere maka ya? Maka Anyị! Dị ka anyị na-abịakwute Ya, Ọ ga-eme emume ncheta nlọghachi anyị ma kpọọ anyị nwa Ya.

  16. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:18. Mkpughe nke a kọwakwara, “Ọ masịrị Chineke na o nyeworo mmadụ ihe ndị a nile; n’ihi na otu a ka e jiri kee ha” (verse 20).

  17. Maka ndị ahụ na-abịaru Chineke nso, Ọ na-enye nkwa nke a dị nnukwu: “A ga m abịaru unu nso” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:63; lee kwa Jemis 4:8).

  18. Lee Mak 5:24–34.

  19. Lee Nkọwa okwu Baịbụlụ, “Dị Ọcha na adịghị ọcha

  20. Mak 5:28.

  21. Matiu 7:7.

  22. Site na-ịburịta ibu arọ onye na ibe ya, anyị “na-emezu iwu nke Kraịst” (Ndị Galeshia 6: 2; lee kwa Mosaia 18: 8).

  23. Ọlụ 20:35.

  24. Lee 1Ndị Eze 17:8–16.

  25. Mozaya 2:17.

  26. N’akwụkwọ ozi ya o degaara ndị Rom, Pọl na-ekwu na Chineke “ga-enyeghachi onye ọ bụla ụgwọ dị ka omume ya si dị: ndị ji ntachi obi nọgide n’ime ihe ọma na-achọ otuto na nsọpụrụ na anwụghị anwụ, ndụ ebighị ebi: … ebube, nkwanye ugwu, na udo, nye mmadụ ọbụla na-arụ ọrụ ọma” (Ndị Rom 2:6–7, 10).

  27. Luk 6:38. Nzọpụta anyị na obi ụtọ ebighị ebi nwere ike dabere na ọmịiko anyị na ebere anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ (lee Matiu 25:31–46).

  28. Luk 3:10.

  29. Ndị Filipi 4:7.