Akwụkwọ nke Inọs
Isi 1
Inọs wee kpesie ekpere ike ma rite uru nsachapụ nke mmehie ya nile—olu nke Onye-nwe wee bata n’ime obi ya, na-ekwe nkwa nzọpụta maka ndị Leman—Ndị Nifaị chọrọ inwetaghachị ndị Leman—Inọs wee nwee ọn̄ụ n’ime Onye-mgbapụta ya. Ihe dịka n’afọ 420 tutu amụọ Kraịst.
1 Lee, o wee ruo na mụ, Inọs, ebe m matara nna m na ọ bụ nwoke ziri-ezi—n’ihi na ọ kụziri m n’asụsụ ya, na kwa na nzulite na ịdọ-aka na-ntị nke Onye-nwe—Ma ngọzi na-adịrị aha nke Chineke m maka ya—
2 Ma a ga m agwa gị maka ịgba-mgba nke m nwere n’iru Chineke, tutu mụ enweta nsachapụ nke mmehie m nile.
3 Lee, a gara m ịchụ-nta anụ n’ime oke-ọhịa; ma okwu ndị ahụ nke m nụworo ugboro-ugboro ka nna m na ekwu ya gbasara ndụ-ebighi-ebi, na ọn̄ụ nke ndị nsọ nile, mibara ala-ala n’ime obi m.
4 Ma mkpụrụ-obi m wee nwee agụụ; ma e gburu m ikpere n’ala n’iru Onye-meworo m ma m wee tikuo ya na nnukwu ekpere na arịrịọ n’ihi mkpụrụ-obi nke m, na ogologo ụbọchị nile ka m tikuru ya; e, ma mgbe abalị bịara e welịkwara m olu m elu nke mere na o ruru elu-igwe nile.
5 Ma o nwere olu bịaruru m, na-asị: Inọs, mmehie gị nile ka a gbagharaworo gị, ma ị ga-adị ngọzi.
6 Ma mụ, Inọs matara na Chineke enweghị ike ikwu okwu ụgha; ya mere, ikpe-ọmụma m nke mụọ ka a zafuworo.
7 Ma a sịrị m: Onye-nwe, olee otu a na-esi eme ya?
8 Ma o wee sị m: N’ihi okwukwe gị n’ime Kraịst, onye nke ị na-aka-anụtụghị olu ya ma-ọbụ hụtụ ya mbụ. Ma ọtụtụ afọ ga-agafe tutu ọ ga egosịpụta onwe ya n’anụ arụ; ya mere, gawa, okwukwe gị azọpụtawo gị.
9 Ugbua, o wee ruo na mgbe m nụworo okwu ndị a m wee malite inwe ọchịchọ maka ọdịmma nke ụmụnne m, ndị Nifaị; ya mere, a wụpụtachara m obi m nile nye Chineke maka ha.
10 Ma mgbe m ka nọrịị na-agba lịka lịka n’ime mụọ, lee, olu nke Onye-nwe batara n’ime uche m ọzọ, na-asị: A ga m eleta ụmụnne gị nwoke dịka mgbalị ike ha siri dị n’idebe iwu-nsọ m nile. E nyewo m ha ala nke a, ma ọ bụ ala dị nsọ; ma a gaghị m abụ ya ọnụ ma ọbụghị n’ihi ime arụ; ya mere, a ga m eleta ụmụnne gị nwoke dịka otu m kwuworo; ma njehie ha nile ka m ga-ewedata na mwute n’isi nke onwe ha.
11 Ma mgbe mụ, Inọs, nụworo okwu ndị a nile, okwukwe m malitere ịbụ akwa akwụrụ n’ime Onye-nwe; ma e kpere m ekpere nye Ya site n’ọtụtụ ogologo ịgba lịka-lịka nile maka ụmụnne m, ndị Leman.
12 Ma o wee ruo na mgbe m kpeworo ekpere ma rụọ ọrụ site na mgbalị, Onye-nwe sịrị m: A ga m emere gị dịka ọchịchọ gị siri dị, n’ihi okwukwe gị.
13 Ma ugbua lee, nke a bụ ọchịchọ nke m chọrọ n’aka ya—na ọbụrụ na ọ ga-adị otu ahụ, na ndị m, ndị Nifaị, ga-adaba n’ime njehie, ma site n’ụzọ ọbụla bụrụ ndị ebibiri, ma ndị Leman agaghị abụ ndị e bibiri, na Onye-nwe Chineke ga edokwa akụkọ-ndekọta nke ndị m, ndị Nifaị; ọbụna ọbụrụ na ọ ga-adị otua site n’ike nke aka nsọ ya, na a ga-ewepụta ya n’ụbọchị dị n’iru nye ndị Leman, na, eleghị-anya, e nwere ike weruta ha na nzọpụta—
14 N’ihi na n’oge ugbua, ịgba lịka-lịka anyị nile bụrịị ihe efu n’idughachi ha n’ụzọ ezi okwukwe ahụ. Ma ha n̄ụrụ iyi n’oke iwe na, ọbụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-ebibi akụkọ-ndekọta anyị nile na anyị, na kwa omenala nile nke ndị nna anyị ha.
15 Ya mere, mụ ebe m matara na Onye-nwe Chineke nwere ike idokwa akụkọ-ndekọta anyị, e bekuru m ya akwa n’esepụghị-aka, n’ihi na ọ sịwo m: Ihe ọbụla unu ga-arịọ n’okwukwe, kwere na unu ga-anata n’aha nke Kraịst, unu ga-anata ya.
16 Ma e nwere m okwukwe, ma e bekuru m Chineke akwa ka o wee chekwaa akụkọ-ndekọta nile ahụ; ma mụ na ya gbara ndụ na ọ ga-ewepụta ha nye ndị Leman mgbe oge nke ya ruru.
17 Ma mụ, Inọs, matara na ọ ga-adị dịka ọgbụgba-ndụ nke o meworo; ya mere obi m zururịị ike.
18 Ma Onye-nwe sịrị m: Nna gị ha achọwo kwa n’aka m ihe nke a; ma a ga-emere ha ya dịka okwukwe ha siri dị; n’ihi na okwukwe ha dịrịi ka nke gị.
19 Ma ugbua o wee ruo na mụ Inọs, gagharịrị n’etiti ndị nke Nifaị, na-ebu-amụma maka ihe nile ga-abịa, ma na-agba-ama maka ihe nile nke m nụworo ma hụkwa.
20 Ma a na m agba ama na ndị nke Nifaị chọsịrị-ike ịkpọghachi ndị Leman n’ezi-okwukwe n’ime Chineke. Ma na ọrụ anyị nile bụ ihe efu; ịkpọ-asị ha bụ ihe e kedosịrị ike, ma ihe na-edu ha bụ ajọọ ndụ nke mere na ha enwetaghị ọzụzụ, ma dị egwu, na ndị agụụ-ọbara na-agụ, jupụta n’ife arụsị na iru-inyi; anụ n’eri ibe ha ka ha ji eme ihe oriri; na-ebi n’ime ụlọ ikwuu, ma na-akpagharị n’ime ọzara site n’iyi mkpirisi-uwe akpụkpọ-anụ n’ukwu ma isi ha bụrịị ihe a kpuchara akpucha ma ime-nka ha dị n’ime ụta ha, na n’ime mma-agha ha na onyike ha. Ma ọtụtụ n’ime ha anaghị-eri ihe ọbụla ma ọbụghị anụ ndụ; ma ha na-achọ esepụghị-aka ibibi anyị.
21 Ma o wee ruo na ndị nke Nifaị na-akọ ala, ma zụlite ụdị mkpụrụ-nke-ubi nile, na nke mkpụrụ-osisi, na igwe-nke anụmanụ nile, na igwe nke ụdị ehi di ịche ịche, na ewu nile na ewu ọhịa nile, na kwa ọtụtụ ịnyịnya-nile.
22 Ma e nwere ọtụtụ ndị-amụma karịrị akarị n’etiti anyị. Ma ndị mmadụ a bụ ndị na-akpọ-ekwe-nkụ, ọ na-ara ahụ ịghọta ha.
23 Ma onweghị ihe ọbụla dị ma ọbụghị oke ịbasi mba ike, ikwusa ozi-ọma na ibu-amụma maka agha nile, na ndọrọ-ndọrọ nile na mbibi nile, na esepụghị-aka ichetara ha maka ọnwụ, na agwụ-agwụ nke mgbe ebighi-ebi, na ikpe nile na ike nke Chineke, na ihe ndị a nile—na-akpalite ha esepụghị aka ka e debe ha n’ịtụ egwu nke Onye-nwe. A sị m ọdịghị ihe ọbụla dị ma ọbụghị ihe ndị a, na nnukwu ịdị-mfe nghọta karịrị akarị nke ikwu okwu, ga-edebe ha site n’igbada ọsọ-ọsọ ruo mbibi. Ma n’ụdị a ka m na-ede gbasara ha.
24 Ma a hụrụ m ọtụtụ agha n’etiti ndị Nifaị na ndị Leman n’oge njem nke ụbọchị m nile.
25 Ma o wee ruo na a malitere m ịka-nka, ma otu narị afọ na iri asaa na iteghete agafewọrịị site n’oge nna anyị Lihaị hapụrụ Jerusalem.
26 Ma m wee hụ na a ga m agbada ruo ili m na nso nso, ebe emejupụtaworo m n’ike nke Chineke na m ga-ekwusarịrị okwu ahụ ma buo-amụma nye ndị mmadụ a, ma kwupụta okwu ahụ dịka ezi-okwu ahụ nke dị n’ime Kraịst. Ma e kwupụtawo m ya n’ụbọchị m nile, ma e nwewo m ọn̄ụ n’ime ya karịa ndị nke ụwa.
27 Ma a na m aga na nso nso n’ebe izu-ike m, nke bụ mụ na Onye-mgbapụta m; n’ihi na a ma m na n’ime ya a ga m ezu-ike. Ma a na m an̄ụrị-ọn̄ụ n’ụbọchị ahụ mgbe arụ m ga-eyịkwasị anwụghị-anwụ, ma ga-eguzoro n’iru ya; mgbe ahụ ka m ga-ahụ iru ya n’inwe mmasị, ma ọ ga-asị m: Bịakwute m, gị onye agọziri agọzi, o nwere ebe e doziri nye gị n’ime ọtụtụ ebe obibi nke Nna m. Amen.