Nkeji 30
Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith onye-amụma nye David Whitmer, Peter Whitmer, Nta, na John Whitmer, na Fayette, New York, Septemba 1830, mgbe e mesịrị ọgbakọ ụbọchị atọ na Fayette, mana tutu ndị okenye nke Nzukọ-nsọ a nọrọ rịị iche-iche (History of the Church, 1:115–116). Na mbụ, e bipụtara ozị a dịka mkpughe atọ, emekọtara ya n’otu nkeji site n’aka Onye-amụma n’ihi ụdị mbipụta nke 1835 nke Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile.
1–4, David Whitmer wee taa ahụhụ maka ịda mba ya n’ife ofufe ya n’irusi ọrụ ike; 5–8, Peter Whitmer, nta, ga-esoro Oliver Cowdery jee ozi nye na ndị Leman; 9–11, John Whitmer ka akpọrọ maka ịkwụsa ozi-ọma.
1 Lee, a sị m gị David na ị tụrụ mmadụ ụjọ ma ị dabereghị na m maka ike dịka i kwesịrị.
2 Kama uche gị nọkwarịị n’ihe nile nke ụwa karịa n’ihe nile nke m, Onye meworo gị, na ịgbasa ozi nke a kpọworo gị, ma ị geghị ntị n’olu nke mụọ m, ma nye ndị edoro ịlekọta gị kama ị kwenyeere ndị m na-enyeghị ịwu.
3 Ya mere, a hapụrụ gị ka ị jụọ maka onwe gị n’aka m, ma tụgharịa uche n’ihe ndị ị natara.
4 Ma ebe obibi gị ga-abụ n’ụlọ nna gị ruo mgbe m ga-enye gị iwu-nsọ ndị ọzọ. Ma ị ga-aga ije ozi n’ime nzukọ-nsọ ma n’iru ụwa ma na mpaghara nile gbara ebe ahụ gburu-gburu. Amen.
5 Lee, a sị m gị Peter, na ị ga-eje ije gị na nwanne gị nwoke Oliver, n’ihi na oge ahụ eruwo mgbe m chere dị mkpa na ị ga-emeghepụ ọnụ gị kwusaa ozi-ọma nke m, ya mere atụla ụjọ, kama nụrụ okwu m nile na ndụmọdụ nke nwanne gị nwoke, nke ọ ga-enye gị.
6 Ma ka a kpagbuo gị na mkpagbu ya nile, na-ewelite obi gị mgbe nile nye m n’ekpere na okwukwe, n’ihi nnapụta gị na ya; n’ihi na e nyewo m ya ike iwulite nzukọ-nsọ m elu n’etiti ndị Leman;
7 Ma onweghị onye m nyere ọkwa ka ọbụrụ ya onye ndụmọdụ n’isi ya na nzukọ-nsọ, gbasara okwu nzukọ-nsọ nile, m’ọbụghị nwanne ya nwoke, Joseph Smith, Nta.
8 Ya mere, nụrụ ihe ndị a nile, ma rụsị ọrụ ike n’idebe iwu-nsọ m nile, ma a ga-agọzi gị ruo na ndụ ebighi-ebi. Amen.
9 Lee, a si m gị, nwa odibo m John, na ịga-amalite site na ugbu a gaa-n’iru ịma-ọkwa ozi-ọma nke m, dịka iji olu nke opi.
10 Ma ọrụ gị ga-abụ n’ụlọ nwanne gị Philip Burroughs, ma na mpaghara nile gbara ebe ahụ gburu gburu, e, ebe nile ha ga-ege nti ruo mgbe mụ nyere gị iwu ka isite ebe ahụ laa,
11 Ma ọrụ gị nile ga-abụ na Zaịọn, jiri mkpụrụ obi nile, site ugbu a ga-n’iru, e, ị ga emepe ọnụ gị mgbe nile n’ọrụ m, na-atụghị egwu ihe mmadụ nwere ike ime, n’ihi na mụ onwe m nọnyeere gị. Amen.