Kraịst Ebilitewo; Okwukwe na Ya Ga-eme Ugwu Anọgharịa
Okwukwe n’ime Jizọs Kraịst bụ ike kachasị dịịrị anyị nime ndụ anyị nkea. Ịhe nile g’ekwe omume maka ndị ahụ kwere ekwe.
Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị nọ m n’obi, enwerem obi ekele maka ohere nke ikwuru unu n’ụbọchị Sọnde Ista nkea.1 Aja nke mgbaghara mmehie na Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraist gbanworo ndụ ọnye ọbụla nime anyị ruo ebighi ebi. Anyị hụrụ Ya nanya ma neji obi ekele nefe Ya na Nna anyị nke Eluigwe ofufe.
N’ọnwa isii gara aga, anyị agawo nihu n’achọ otu esi emeri ọrịa zuru ụwa ahụ. Ọ n’atụ m nanya ụdị nnagide na ike nke mụọ nke unu ji ezute nrịanrịa, nfunarị, na ọnọdụ ịnọ nanị. A na m ekpe ekpere mgbe nile na site na ịhe nile nkea, unu ga-anụta ịhụnanya nke Onyenwe anyị nke n’adịghị ada ada. Ọ bụrụ na n’oge mwale gị ị kpara agwa dịka ezigbo onye n’eso ụzọ, afọ nke a gara aga agaghị abụ ihe efu.
N’ụtụtụ a, anyị anụwo site n’ọnụ ndị ndu Nzukọ-nsọ nile ndị si nsọtụ ụwa nile ebe mmadụ jupụtara. N’ezie, ngọzị nile nke oziọma bụ maka agbụrụ, asụsụ ma mmadụ ọbụla. Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst bụ nzukọ nsọ ruru gburugburu ụwa. Jizọs Kraịst bụ onye ndu anyị.
Ekele dịrị chi, na ọrịa ozuruụwa enwebeghi ike ijigide eziokwu ahụ ka ọ ghara ị ga nihu. Oziọma nke Jizọs Kraist bụ nnọọ ịhe achọrọ n’oge a mgbawojuanya, ise okwu na ike gwụrụ ụwa.
Nwa nke Chineke ọbụla tozuru ịnwete ohere ị nụ ma ịnabata ọgwụgwọ, mgbapụta nke dị n’ozi nke Jizọs Kraist. Enweghi ozi ọzọ ọbụla ka dịrị añụrị anyị mkpa—ugbua na ebighi ebi.2 Enweghi ozi ọzọ ọbụla karịrị jupụta na olileanya. Enweghi ozi ọzọ ọbụla nke g’ewezuga ise-okwu nime obodo anyị.
Okwukwe n’ime Jizọs Kraịst bụ isi nkume nke nkwenye nile ma bụrụ ụzọ eji enwete ike dị nsọ. Dịka Pọl kwuru, “Mọbụghi site n’okwukwe ọ rara ahụ ịme [Chineke] obi ụtọ: nihi ọnye n’abịakwute Chineke kwesịrịrị ikwere na ọ dị, ma ọ bụ onye n’akwụ ụgwọ nye ndị ahụ jiri obi ha nile n’achọ ya.”3
Ịhe ọma nile nọ na ndụ a—ngọzị ọbụla nke bara uru ruo ebigho ebi—n’ebido n’okwukwe. Ị hapụ ka Chineke nwe mmeri na ndụ anyị n’ebido site n’ịnwe okwukwe na Ọ dị njikere ị duru anyị. Ezigbo nchegharị n’ebido n’ịnwe okwukwe na Jizọs Kraist nwere ike iji sachapụ, gwọ ma gba anyị ume.4
“Ghara ịgọnarị ike nke Chineke,” the prophet Moroni declared, “n’ihi na ọ na arụ-ọrụ site nʼike, dịka okwukwenke ụmụ nke mmadụ siri dị.”5 Ọ bụ okwukwe anyị na-agbahe ike nke Chineke nime ndụ anyị.
Nagbanyeghi nkea, itinye okwukwe n’ọrụ nwere ike ịdịka ihe siri ike. Mgbe ụfọdụ anyị nwere ike ịjụ onwe anyị m’anyị ọ nwere ike ịwepụtafu okwukwe nke eji anata ngọzị nke anyị chọsịrị ike. Kosiladị, Ọnyenwe anyị azawo ajụjụ ahụ site n’okwu nile nke onye amụma nke Akwụkwọ nke Mọmọn Alma.
Alma gwara anyị nanị k’anyị mee ihe nchọpụtan’okwu nile ma “ma jiri otu mpekeleokwukwe, e, ọbụna ọbụrụ na [anyị] enweghị ike ime ihe na-akarịghị ịchọ ikwere.”6 Okwu a “mpekele nke okwukwe” n’echetara anyị maka nkwa nke Onyenwe anyị nke nọ na baịbụlụ mọbụrụ n’anyị “nwe okwukwe dịka otu mpekele mkpụrụ nke mustardanyị g’enwe ike “kwuoro ugwu ahụ, si ebe a pụọ; ma ọ ga-apụ; ma enweghi ịhe nagaghị ekwe omume nye [anyị].”7
Ọnye-nweanyị ghọtara adịghị ike anyị nile. Anyị n’ejehie mgbe ụfọdụ. Mana Ọ mazuru maka nnukwu akaraka anyị. Mkpụrụ nke mustard ahụ g’ebido ntakịrị ma ọ g’eto ị bụ nnukwu osisi nke ọtụtụ nnụnnụ ga-ewu akwụ ha na akala-osisi ya nile. Mkpụrụ mustard ahụ nọchitere okwukwe nke dị ntakịrị ma n’eto eto.8
Onye Nwe-anyị ekwughị na ọchọrọ okwụkwe zuru-okétupu anyị enwete ohere ịnata ike Ya zuru oké. Mana Ọ chọrọ ka anyị kwere.
Ezi Ụmụnne m ndi Nwoke na ndi Nwanyị, ọkpụkpọ okú m nye unu n’ụtụtụ Ista nkea bụbido taa wuliwe okwukwe unu. Site n’okwukwe gị Jizọs Kraist ga-abawanye ume ị nwere iji mee ka ugwu nile nọ na ndụ gị gagharịa,9nagbanyeghi na mwala nke gị nwere ike dịka ọ buru oke ibu dịka Ugwu nke Everest.
Ugwu gị nile nwere ike bụrụ nke ịnọ nanị, obi abụọ, nrịanrịa, mọbụ nsogbu onwe gị ndị ọzọ. Ugwu gị nile nwere ike ịdị iche, ma nagbanyeghi nkea, aziza nye mwale ọbụla bụ ịmụba okwukwe gị. Nke ahụ g’ewe ọrụ. Ndị nadịghi ike na mmụta ma ndị n’eso ụzọ dara mba mgbe nile gana adọlị oke ndọlị, iji wepụta otu mpekele okwukwe.
Ọ g’ewe mbọ mọbụrụ n’achọrọ ịmee ka ịhe dị mma. Na ị bụ ezigbo onye n’eso ụzọ nke Jizọs Kraist agụpụghị gị. Ọ g’ewe mbọ mọbụrụ n’achọrọ ịmụba okwukwe gị na ntụkwasị obi ịnwere na Ya. Ka m tụpụta ntụpụta ise nke g’enyere gị aka iwulite okwukwe na ntụkwasị obi gị.
Nke mbụ, nwe ọmụmụ. Bụrụ onye n’achọsike ị mụta ịhe. Rukpuo onwe gị nime akwụkwọ nsọ ka ịghọta nke ọma ije ozi na njem nlekọta nke Kraịst. Mazuo ozizi nke Kraịst ka ịnwe ike ịghọta ike ya nime ndụ gị. Tinye eziokwu nkea nime gị na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst gbasakwara gị. Ọ bokwasịrị onwe Ya enweghi anụrị gị nile, njehie gị nile, adịghị ike gị nile, ma mmehie gị nile. Ọ kwụrụ ụgwọ ahụ ma rọpụta ike ahụ iji eme ka ugwu nile nke ị ga-ezuta gagharịa. Ị n’eweta ike ahụ site n’okwukwe gị, ntụkwasị obi, ma obi ikpebiri i soro Ya.
Ị me ka ugwu gị nile gagharịa n’ewe ọrụ ebube. Mụta maka ọrụ ebube nile. Ọrụ ebube n’abịa dịka otu okwukwe ị nwere na Onyenwe anyị sịrị dị. Ịhe dị n’etiti okwukwe ahụ bụ ịtụkwasị obi n’uche ma n’oge Ya—otu ma mgbe Ọ g’eji agọzi gị site n’ịnye gị enyemaka ọrụ ebube ahụ ị chọrọ. Nanị ekweghiekwegị ga-egbochi Chineke igọzi gị site n’ịrọpụtara ọrụ ebube nke ị mee ka ugwu nile nke ndụ gịgagharịa.10
Dịka ị n’amụ maka Onye nzọpụta karịa, mgbe ahụ ka ọ gadịrị gị mfe ịtụkwasị obi n’ebere Ya, n’ịhụnanya Ya nadịghị agwụ agwụ, ma ịnwete mgbam ume nke Ya, ọgwụgwọ, ma ike mgbapụta. Ọnye nzọpụta anaghị aka anọrọ gị nso karịa mgbe ahụ ijiri okwukwe zute mọbụ na-arịgo otu ugwu.
Nke abụọ, họrọ ịkwere na Jizọs Kraist. Ọ bụrụ na ịnwere obi abụọ banyere Chineke nke Nna na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ Nanya, mọbụ banyere eziokwu nke Mweghachi mọbụ eziokwu nke ọkpụkpọ okú Josef Smit dịka onye amụma, họrọị kwere11ma kwụdesie ike n’ọkwukwe. Were ajụjụ gị nile gakwuru Onyenwe anyị ma ndị ọzọ kwere ekwe genye gị aziza. Mụọ ịhe nihi ị nwere ọchịchị-obi ị kwere karịa na ebumnobi gị bụ ka ịchọta otu ntụkpọ nime ndụ nke otu onye amụma mọbụ adabaghị-adaba nime akwụkwọ nsọ. Kwụsị ịmụba obi abụọ gị site na gị na ndị obi abụọ i kwugharị ịhe ndịa. Hapụ ka Onyenwe anyị duru gị na njem gị nke nchọpụta nke ime mụọ.
Nke atọ, meeịhe n’okwukwe. Gịnị ka ị g’eme mọbụrụ na ịnwebụrụ okwukwe karịa? Cheegodi maka ya. Depụta banyere ya. Emesịa nata okwukwe karịrị akarị site nịme ihe nke ga-achọkwa okwukwe karịrị akarị.
Nke anọ, tozuo oké ị nata emume nile nke ndịdị nsọ Emume nsọ ndịa na-agbahe ike nke Chineke nime ndụ gị.12
Ma nke ise, rịọNna gị nke Eluigwe maka enyemaka n’aha Jizọs Kraist.
Okwukwe n’esite n’ọrụ. Ị nata mkpughe n’esite n’ọrụ. Mana “n’ihi na onye ọbụla nke na-arịọ, na-anata; ma onye na-achọ, na-achọta; ma onye nke na-akụ aka, a ga-emeghere ya.”13 Chineke mazuru ịhe g’enyere okwukwe gị aka too. Rịọ, ma rịọ ọzọ.
Ọnye n’ekweghi ekwe nwere ike kwuo na okwukwe bụ maka ndị nadịghị ike. Mana ụdị okwua n’eleghara ike dị n’okwukwe anya. Ọ dịgị ka Ndị Ozi Onye nzọpụta naara ị ga nihu n’akụzi maka ozizi Ya mgbe ọ nwụrụ, n’oge achọrọ iwezuga ndụ ha, mọbụrụ na ha nwere obi abụọ na Ya?14 Ọ dịgị ka Josef na Hyrum smit naara ịta ahụhụ ọnwụ onye nsọ dịka ha na-echekwa Mweghachi nke Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị mọbụrụ na ha enweghi ezi akaebe na ịhe ahụ bụ eziokwu? Ọ dịgị ka ndị nsọ ruru 2,000 g’anwụchu ọnwụ n’ụzọ ndị buru-ụzọ15mọbụrụ na ha enweghi okwukwe na eweghachiwo oziọma nke Jizọs Kraist? N’ezie, okwukwe bụ ike ahụ n’eme ka emezuo ịhe ndị ahụ echere na ọ gaghị ekwe omume.
Ebeletakwala okwukwe ahụ nke i nwere. Ọ n’ewe okwukwe iji bata Nzukọ nsọ ma kwụdesie ike n’okwukwe. Ọ n’ewe okwukwe iji soro ndị amụma karịa isoro echiche ndị ụwa. Ọ n’ewe okwukwe iji jee ozi mgbasa oziọma n’oge ọrịa zuru ụwa nkea. Ọ n’ewe okwukwe iji bie ndụ mmekọrịta dị ọcha n’oge nkea ụwa n’eti mkpu na iwu nke mmekọrịta dị ọcha bụzi nke mgbeochie. Ọ n’ewe okwukwe iji kuziere ụmụaka oziọma nime ụwa nke a n’enweghi okpukperechi. Ọ n’ewe okwukwe iji rịọ arịrịọ maka ndụ nke onye ahụrụ nanya, ma okwukwe karịrị akari iji nabata aziza nke ị na-achọghị.
Afọ abụọ gara aga, Nwanne nwwanyị Nelson na Mụ jere obodo Samoa, Tonga, Fiji, na Tahiti. Nnukwu mmiri ezowo ọtụtụ ụbọchi na obodo mmiri ndịa. Ndị otú ebuwo ọnụ ma kpee ekpere ka ozuzo mmiri ghara imebi nzukọ ndị a g’eme n’ezi.
Dịka a n’ebido nzụkọ ahụ na Samoa, Fiji, na Tahiti, mmiri akwụsị izo. Mana mmiri akwụsịghị izo na Tonga. Nagbanyeghi nkea, Ndị nsọ ruru 13,000 bịara ọsịsọ ka ha nwete oche, jiri ndidi noro nime mmiri ozuzo ahụ, ma nọdụ ọdụ na ọgbakọ ahụ emere ruo awa abụọ.
Anyị hụrụ ka okwukwe n’arụsị ọrụ ike nime ndị mba mmiri ahụ—okwukwe nke zuru ezu ịkwụsị mmiri ozuzo ahụ ma okwukwe nke nagidere mgbe mmiri ozuzo ahụ akwụsịghị.
Ugwu nile nke ndụ anyị anaghị agagharị otu ma mgbe anyị chọrọ ya Mana okwukwe anyị mgbe nile ga-akpali anyị ị ga nihu. Mgbe nile ka okwukwe na-amụba ohere anyị ji anata ike si na chi.
Biko mara nkea: ọ bụrụ na ịhe nile na onye nile nime ụwa ahụ ịtukwasịrị obi gharịpụ gị, Jizọs Kraist na Nzukọnsọ Ya agaghịagharịpụ gị mọlị. Ọnyenwe anyị anaghị ada-mba ma-ọbụ rahụ-ụra.16 Ọtu “Ọ dị taa, kọdị ụnyahụ, ka ọ gadịkwa [echi].”17 Ọ gaghị echefu ọgbụgba ndụ Ya,18nkwa Ya nile, mọbụ ịhụnanya Ọ nwere maka ndị Ya. Ọ n’arụ ọrụ ebube taa ma Ọ ga-arụ ọrụ ebube echi.19
Okwukwe n’ime Jizọs Kraịst bụ ike kachasị dịịrị anyị nime ndụ anyị nkea. Ịhe nile g’ekwe omume maka ndị ahụ kwere ekwe.20
Okwukwe gị nke n’eto etoịnwere na Ya g’eme ka ugwu nile gagharịa—ọ bụghị ugwu ndị ahụ chọọrọ ụwa mma kama ọ bụ ugwu nile ndị nke mwute nọ na ndụ anyị. Okwukwe gị nke n’amụba amụbag’enyere gị aka gbanwe mwale gị ị bụrụ otito nke n’enweghi atụ ma ohere.
Na Sọnde nke Ista nke-a, ma jiri mmetụta nkem dị imee nke ịhụnanya na obi ekele, ọzọ A nam ekwupụta aka ebe nkem na n’ezie Kraịst ebilittewo.” Ọ biliwo n’ọnwụ idu Nzukọ nsọ Ya. Ọ biliwo ị gozi ndụ nile nke ụmụ nile nke Chineke, nagbanyeghi ebe ha bi. Site n’okwukwe anyị nwere na Ya, anyị nwere ike ị mee ka ugwu nile nke ndụ anyị gagharịa. A na m agba-ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.