Ọgbakọ Zuru ọha
N’ụzọ nke Ọrụ Ha
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


14:29

N’ụzọ nke Ọrụ Ha

Unu ndị taa na-aganiihu nụzọ nke ọrụ unu bụ ike nke Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta eweghapụtara.

Ana m ekpesị ekpere ike maka enyemaka nke Mmụọ Nsọ dị ka ugbu a ana m egosipụta ịhụnaanya m, mmasị, na obi ekele maka ndị otu nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a gburugburu ụwa niile.

Ha bụ ndị Wagọn Ikpeazụ

N’afọ 1947 mere emume ncheta nke ugboro 100 nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a mbụ bịaruru na Ndagwurugwu Salt Lake. Ọtụtụ emume ncheta ka e mere n’oge afọ ahụ, ma imerime ngosipụta nke obi ekele ka enyere maka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst raara onwe nye ndị gbawara ụzọ niile, wulite ọtụtụ ebe obibi, kụọ akụkụ ubi niile niime ọzara aga, ma hiwe ọtụtụ obodo.

Onyeisi J. Reuben Clark, Onye ndụmọdụ Mbụ niime Otu Ndịisi Mbụ, nyere otu niime okwu nkwado a kachasị echeta n’emetụta emetụta nye ndị mbuụzọ ndị a kwesịrị ntụkwasị obi n’ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 1947.

Nozi ya, Onyeisi Clark nakweere na nkenke ndị ndu a maara nke ọma ndị duru mbugharị mpaghara ọdịda anyanwụ, dị ka Brigham Young, Heber C. Kimball, Wilford Woodruff, Parley P. Pratt, na ọtụtụ ndị ọzọ. Kosiladị, isi ebumnuuche ya abụghị ị kwugharị mmeta niile nke ndị mmadụ a kwesịrị ịrịba ama n’otu n’otu. Kama, ọ tụkwasịrị okwu ya n’isi mkpụrụ obi ndị siri ike ndị aha ha a maghị ma ọ bụ edekọ aha niime agụgụala Nzukọ nsọ. Isiokwu nke ozi ya dị nkuzi bụ “Ha bụ nke Wagọn Ikpeazụ.”1

Onyeisi Clark kọwara na nnukwu nkọwa njirimara niile na aka mgba niile nke ndị mbugharị na-eme njem niime wagọn ikpeazụ ekpuchiri ekpuchi zutere niime nsoro wagọn ogologo nke gafere ala larịị ndị ahụ. O toro ndị dike amaonye na ndị a na-akpọghị aha ndị a ndị, kwa ụbọchị, kwa izu ụka, na kwa ọnwa, ebe uzuzu nke wagọn ndị nọ n’ihu ha kpalitere kpagburu—na ndị meriri ihe mgbochi ndị adịghị agwụ agwụ ha gakwuru n’ụzọ ahụ.

Onyeisi Clark mara ọkwa, “Ha bụ ndị nke wagọn ikpeazụ gbagoro n’ihu, ume agwụ ma ike agwụ, ọnya ikere ụkwụ, mgbe ụfọdụ gaara abụ nke obi gbawara, nke a mụrụ site n’okwukwe ha na Chineke hụrụ ha naanya, na ozi ọma eweghachitere bụ eziokwu, ma na Onyenwe anyị duru ma tuziere Ụmụnne ndị nwoke aka n’ịpụta n’ihu.”2

O mechiri ozi ya jiri ịja mma na-akpali mmụọ: “Nye mkpụrụ obi umeala ndịa, dị nnukwu n’okwukwe, dị nnukwu n’ọrụ, dị nnukwu n’ibi ndụ ezi omume, dị nnukwu n’ịhazi ihe nketa na-enweghị ọnụ ahịa, n’obi umeala ana m enye ịhụnaanya m, nkwanye ùgwù m, nsọpụrụ m.”3

Anaghị Eje Ozi Dị Ntakịrị Karịa

N’afọ 1990, Onyeisi Howard W. Hunter, Onyeisi Kworum nke Ndị Iri na Abụọ mgbe ahụ, nyere ozi banyere onyinye niile dị mkpa nke imerime ndị otu Nzukọ nsọ ndị na-eje ozi na nrụsi ọrụ ike na ikwesị ntụkwasị obi na ndị na-anata nnakwere ma ọ bụ otuto ihu ọha dị ntakịrị ma ọ bụ na-enweghị.

Onyeisi Hunter kọwara:

“E kwuru [banyere Ọchịagha Moronaị dị nta ma dịrị ike]:

“‘Ọ bụrụ na mmadụ niile a nọrọwo, ma nọọrọ, ma ga-anọgide, dị ka Moronaị nọọrọ, lee, ike niile nke ala mmụọ n’onwe ha ka a gaara eme ka ha maa jijiji ruo mgbe ebighị ebi; ee, ekwensu agaghị enwe kwa ike ọzọ n’ebe mkpụrụ obi nke ụmụ mmadụ nọ’ (Alma 48:17)

“Lee ụdị otuto enyere otu nwoke ama ama dị ike. … Amaokwu abụọ ndị ọzọ bụ ahịrị banyere Helaman na ụmụnne ya ndị nwoke, onye rụrụ ọrụ ana ahụchaghị anya nke ọma karịa Moronaị, nke ahụ gụrụ:

“‘Ugbu a lee, Helaman na ụmụnne ya ndị nwoke anaghị ejere ndị ahụ ozi dị ntakịrị karịa ka Moronaị siri na-eje’ (Alma 48:19).”

Onyeisi Hunter garaniihu, “Na nkwugharị, na-agbanyeghị Helaman abụghị onye a na-ahụta nke ọma ma ọ bụ onye pụtara ìhè dị ka Moronaị, ọ naara eje ozi; nke bụ, ọ naara enye aka ma baa uru dị ka Moronaị.”4

Onyeisi Hunter mesịrị nye anyị niile ndụmọdụ ịbụ ndị na-anaghị eje ozi dị ntakịrị karịa. O kwuru: “Ọ bụrụ ma gị chee na ọtụtụ ihe ị na-eme niime afọ nke a ma ọ bụ niime afọ ndị na-abịa anaghị eme ka a mara gị nke ọma, jide obi gị aka. Ọtụtụ niime ndị mmadụ kacha mma ndị biiri ndụ ka ana amaghị nke ọma kwa. Jee ozi ma tolite, na nkwesị ntụkwasị obi na nwayọ nwayọ.”5

N’ụzọ nke Ọrụ Ha

Obi jupụtara m n’ekele nye nde kwuru nde nke ndị otu Nzukọ nsọ ndị na-abịakwute Onye Nzọpụta taa6 ma na-aga niihu n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ niime wagọn ikpeazụ nke nsoro wagọn anyị ndị na-agakọ ọnụ—na ndị ezie anaghị eje ozi dị ntakịrị. Okwukwe unu siri ike niime Nna nke Eluigwe na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na ndụ unu na-enweghị aghụghọ, enyefechasịrị na-akpate mmụọ m ịbụ nwoke na onye na-eso ụzọ dị mma karịa.

A hụrụ m unu naanya. E nwere m mmasị ebe unu nọ. Unu emeela. Ma ana m ewepụrụ unu aka.

Otu ahịrị dị niime Akwụkwọ nke Mọmọn sitere n’aka Samuel onye Laman kachasị chịkọta mmetụta m niile maka unu.

“Lee na ndị karịrị niime ha nọ nʼụzọ nke ọrụ ha, ma ha na-aga nʼihi aka nʼanya nʼihu Chineke, ma ha na-eleru anya nʼidebe iwu nsọ ya niile na usoro iwu ya. …

“Ee, asị m unu, na akụkụ nke karịrị niime ha na-eme nke a, ma ha na-agbalị jiri ịrụsi ọrụ ike nʼenweghị ike ọgwụgwụ ka ha wee kpọta ụmụnne ha ndị nwoke ndị fọdụrụ nʼọmụma ihe nke eziokwu ahụ.”7

E kwere m na nkebiokwu ahụ “n’ụzọ nke ọrụ ha” na-akọwa ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị nwere nghọta ndị na-achọta ma nọdụ ọdụ na-akụkụ ndị naanị ha nọ niime Nzukọ niile nke nzukọ nsọ na niime ntọala ndị ọzọ dị iche iche. Ha na-agba mbọ mgbe niile “ịkasị ndị ahụ nọ na mkpa obi,”8 na-enweghị atụmaanya nke nnakwere ma ọ bụ otuto.

Nkebiokwu ahụ “n’ụzọ nke ọrụ ha” na-akọwa ndị di na nwunye na ụmụ ndị na-akwado onye nsiso, nne na nna, ma ọ bụ nwa onye na-eje ozi n’ọndụ ịbụ onye ndu niime Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị eweghachitere. Ike mmetụta nkwado ha kwụrụ chịm, dị nwayọ, na nke adịkarịghị amata na-eme ngọzi adịịrị maka ọtụtụ ndị mmadụ n’otu n’otu na ezi na ụlọ niile n’ụzọ ndị a ga-amata n’uju naanị na mgbe ebighị ebi.

Nkebiokwu ahụ, “n’ụzọ nke ọrụ ha” na-akọwa ndị mmadụ n’otu n’otu ndị, mgbe ha tụgharịworo pụọ site na Chineke, n’obi umeala na na-atụgharịghachi na Ya otu mgbe ọzọ,9 na-echegharị site na mmehie ha, ma na-achọ ike nsacha na ọgwụgwọ nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta. Ị na-abịakwute Kraịst10 site nịlaghachi nụzọ nke ọgbụgba ndụ site na njem mmehie baa niime ụzọ ndị amachibidoro”11 dị oké mkpa n’ụzọ ime mmụọ ma sie ike n’ezi omume. Dị ka ha na-aganiihu n’okwukwe ma ghara ịda mba na-ime ihe dị mma, ha na-atụ ntọala nke oke ọrụ na ndụ ndị mmadụ n’otu n’otu,12 “nye ndudugandu niile na maka ebighị ebi.”13

Nkebiokwu ahụ “n’ụzọ nke ọrụ ha” na-akọwa ndị mmadụ ezi omume na-achọsi ike ka ejikọta ha na Onye Nzọpụta site na ọgbụgba ndụ na emume nsọ ndị nwere ikike nke ozi ọma Ya—mana enwere ike ịmachibido ha site ime otu a site n’aka ihe ndị gafere ike gị. Ana m ekwe nkwa na nhụjuanya nke onwe unu ka a ga-edochi ma nrube isi na nkwesị ntụkwasị obi unu inyefe uche gị na ndidi nye Chineke ka a ga-akwụ ụgwọ “n’oge kacha mma nke Onyenwe anyị.”14 “Ịkwa akwa nwere ike idigide otu abalị, mana ọńụ na-abịa n’ụtụtụ.”15

Nkebiokwu ahụ “n’ụzọ nke ọrụ ha” na-akọwa ndị ntụgharị asụsụ na ndị ntapịa na-akpate mmụọ gburugburu ụwa ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi site n’inyere ndị enyi na ndị otu aka “ịnụrụ uju nke ozi ọma n’ire nke onwe [ha], na n’asụsụ nke onwe [ha].”16 Olu ha, asụsụ akara, na dọkumentị ndị atụgharịrị asụsụ na-ewete eziokwu ebighị ebi niile, ma ole ma ole niime anyị maara aha ha ma ọ bụ na-egosi ekele. Site n’onyinye nke ire ha bụ nke ejiworo gọzie ha, ndị ntụgharị asụsụ na ndị ntapịa na-eje ozi nke ọma, na-achọghị naanị ọdịmma onwe, ma, ọtụtụ mgbe, n’amaonye iji nyere ndị mmadụ aka nata onyinye ime mmụọ nke okwukwe site ị na-agụ ihe na ị na-anụ okwu Chineke.17

Nkebiokwu ahụ “n’ụzọ nke ọrụ ha” na-akọwa ndịikom na ndịinyom kwesịrị ntụkwasị obi lụrụ ọlụlụ ndị na-asọpụrụ oke na ọrụ nke ọgbụgba ndụ ha ịmụba ma mejupụta ụwa na ndị agọziri jiri ike na ume iji gbaa mgba ha na ụmụ ha niime nzukọ niile nke oriri nsọ. Niime ụwa dị mgbagwoju anya na-abawanye eji ọdachi na ihe ndị kacha mkpa edozighị nke ọma na-etigbu, ndị mmadụ ndị a anaghị ańa ntị n’olu ndị ụwa n’eto onwe onye; ha na-asọpụrụ ido nsọ na ịdị mkpa nke ndụ niime atụmatụ obi ụtọ nke Nna nke Eluigwe maka ụmụ Ya.

Ọtụtụ di na nwunye na-atụkwasị kwa obi na Chineke mgbe ọchịchọ ezi omume nke obi ha ka ana enweteghị otu ma ọ bụ mgbe ha tụrụ anya ma chọọ. Ha “na-echere oge Onyenwe anyị”18 ma anaghị ana ka O zute oge mmecha nke ndụ anụ ahụ ha. “Niihi kemgbe mmalite nke ụwa ọ bụ na mmadụ anụbeghị ọ bụghị ma ha anụtaghị kwa na ntị, ọ bụghị ma anya ọbụla ahụghi kwa, O Chineke, ewezuga gị, lee ka ihe niile sị dị ukwuu nke i kwadoworo nye [ndị] nke na-echere gị.”19

Nkebiokwu ahụ “n’ụzọ nke ọrụ ha” na-akọwa puku kwuru puku nke ndị ndu ụmụ ọta akara na ndị nkuzi praịmarị ndị nwere ịhụnaanya ma na-akuziri ụmụaka nke Nzukọ nsọ ụbọchị Ezumiike ọbụla.

Tulee mmetụta ebighị ebi nke ije ozi ejere site n’aka ndị a na-eso ụzọ raara onwe ha nye—na ngọzi ndị dị ịtụnaanya ekwere nkwa ha nye ndị ahụ na-ejere ụmụaka ozi nlekọta.

“Ma [Jizọs] kuuru otu nwantakịrị, me mee ka o guzoro n’etiti ha: ma mgbe o kuuru ya n’aka ya, ọ sịrị ha,

“Onye ọbụla ọ bụ ga-anataotu niime ụmụntakịrị ndị a naha m, na-anabata m: ma onye ọbụla ọ bụ nabatara m, ọbụghị m ka ọ nabatara, kama ya onye zitere m.”20

Nkebiokwu ahụ, “n’ụzọ nke ọrụ ha” na-akọwa maka ụmụ ndị raara onwe ha nye n’iji obi ọma elekọta ndị nne na nna mere agadi, onye nne ụra churu na-akasị nwata egwu na-atụ obi mgbe o guzooro nche dị ka “agụ nwanyị n’ọnụ ụzọ ama” nke ebe obibi ya,21 ndị otu Nzukọ nsọ bịaruru n’oge ma nọrọ ruo abali ịhazi ma buda oche niile, na ndị mmadụ mmụọ kpatere na-akpọku ezi na ụlọ, ndị enyi, na ndị otu ọrụ ịbịa ma hụ, bịa ma nyee aka, ma bịa ma nọrọ.22

Akọwawo m naanị ọmụmaatụ ole ma ole ahọọrọ nke ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst n’edebe ọgbụgba ndụ raara onwe ha nye dị ka gị onye na-aganiihu “n’ụzọ nke ọrụ [gị]” Nde kwuru nde ọmụmaatụ agbakwunyere nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ ndị na-enye “mkpụrụ obi ha dum”23 n’aka Chineke ka a na-ahụta n’ebe obibi dabeere na Kraịst na niime ngalaba Nzukọ nsọ gburugburu ụwa.

Ị na-enwe ịhụnaanya ma jee ozi, gee ntị ma mụta ihe, lekọta ma kasie obi, ma kuzie ihe ma gbaa ama site n’ike nke Mmụọ Nsọ. Unu gae-ebu ọnụ ma kpee ekpere ugboro ugboro, ma gbasie ike nke ukwuu nʼobi umeala, na tolitesie ike nʼokwukwe nke Kraịst, “ruo nʼimejupụta mkpụrụ obi [unu] nʼọn̄ụ na nkasiobi, ee, ọbụna ruo nʼịsachasị na ido nsọ nke [unu], bụ ido nsọ nke bịaworo niihi … inyefe obi [unu] n’aka Chineke.”24

Nkwa na Ama

Ha bụ ndị wagọn ikpeazụ, ndị niile na-adịghị eje ozi dị ntakịrị, na unu ndị taa na-aganiihu n’ụzọ nke ọrụ unu bụ ike Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta eweghachitere. Dị ka Onyenwe anyị kweworo nkwa, “oche eze niile na ọtụtụ ebe ọchịchị, ala ọkpara eze niile na ike niile, ka a ga-ekpughe ma yikwasị ya ndị niile nọgidere n’ịdị ike maka ozi ọma nke Jizọs Kraịst.”25

E ji m ọṅụ na-agba aka ebe na Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya dị ndụ ma nkwa Ha bụ eziokwu, n’aha dị nsọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.