Ọmụmụ ihe Ụzọ ndị nne na nna si azụ ụmụ si na Chi
Ndị nne na nna na-abanye nrụkọọrụ ha na Nna nke Eluigwe idu ọmarịcha ụmụ ha laghachi eluigwe.
Enwetụla mgbe i ku nwa a mụrụ ọhụrụ n’aka gị? Enwere ìhè nke na-apụta site na nwa ọhụrụ ọbụla a mụrụ, na-ewete njikọ nke pụrụ iche nke nwere ike iji ọṅụ emejupụta obi nke ndị nne na nna.1 Odee bụ onye Mexico dere, “A matawo m na mgbe ọbụla nwa a mụrụ ọhụrụ pigidere mkpịsịrị aka nna ya na mbụ niime obere aka ya, o nwetewo ya ruo ebighị ebi.”2
Ịzụ ụmụ bụ otu niime nhụmiihe nke ndụ kachasị pụọ iche. Ndị nne na nna na-abanye nrụkọọrụ ha na Nna nke Eluigwe idu ọmarịcha ụmụ ha laghachi eluigwe.3 Taa ọ ga-amasị m ikekọrịta ụfọdụ ọmụmụ ihe ndị nne na nna ji azụ ụmụ dị niime akwụkwọ nsọ ma a kụzie ya site n’aka ndị amụma dị ndụ iji nyere anyị aka dobe ihe nketa nke nne na nna anyị.
Rigoro N’ebe Dị elu Karịa nke Omenaala nke Ozi ọma
Anyị garịrị arịgoro n’ebe dị elu karịa nke omenaala nke ozi ọma anyị na ndị ezi na ụlọ anyị. Onyeisi Russell M. Nelson mara ọkwa: “Ezi na ụlọ niile ka odudu sitere n’eluigwe kwesịrị. Ndị nne na nna enweghị ike inye ụmụntakịrị ndụmọdụ zuru oke site na nhụmiihe nke onwe, ụjọ, ma ọ bụ mmetụta ibe.”4
Na-agbanyeghị mgbakwasa omenaala anyị, aka nne na nna ji azụ ụmụ, na nhụmiihe nke onwe nwere ike ịbara nne na nna uru iji zụọ ụmụ, ike ndị a ezughị ezu iji nyere ụmụ anyị aka laghachi eluigwe. Anyị chọrọ ohere ruo “ukwu ụkpụrụ niile na … omume niile” dị elu karịa,5 omenaala nke ma ịhụnaanya ma ihe ndị a tụrụ anya, ebe anyị na ụmụ anyị na-emekọrịta ihe n’ụzọ kacha elu, kacha dị nsọ.”6 Onyeisi Dallin H. Oaks kọwara omenaala ozi ọma dị ka “ụzọ nke ndụ, pụrụ iche ukwu ụkpụrụ niile na ihe ndị a tụrụ anya na omume niile. … Omenaala ozi ọma nke a na-abịa site n’atụmatụ nke nzọpụta, iwu nsọ niile nke Chineke, na nkuzi niile nke … ndị amụma dị ndụ. Ọ na-edu anyị n’ụzọ anyị si azụlite ezi na ụlọ anyị na ụzọ ibi ndụ nke onwe anyị.”7
Jizọs Kraịst bụ isi nke omenaala ozi ọma nke a. Ịnabata omenaala ozi ọma niime ezi na ụlọ anyị dị oke mkpa imepụta agbata nwere ọnọdụ dị mma ebe mkpụrụ nke okwukwe nwere ike ito n’ụzọ dị mma. Irigoro n’ebe dị elu karịa, Onyeisi Oaks kpọkuru anyị “ịkwụsị omenaala ndị nke onwe na nke ezi na ụlọ ma ọ bụ omume ndị megidere nkuzi niile nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst.”8 Ndị nne na nna, ime ihere n’akụkụ anyị ihiwe omenaala ozi ọma nwere ike kwe onye iro ahụ ihiwe ukwu kwụ chịm niime ebe obibi anyị ma ọ bụ, ọbụna kacha njọ, niime obi ụmụ anyị.
Dị ka anyị na-ahọrọ ime omenaala ozi ọma omenaala nke kacha ibe ya niime ezi na ụlọ anyị, emesịa site n’ezigbo ike mmetụta nke Mmụọ Nsọ,9 aka iji zụọ ụmụ anyị nke ugbua, omenaala niile, na omume niile ka aga afụcha, dozie, mee mma, ma emelite ya.
Mee Ebe Obibi Isi ebe Ọmụmụ ihe nke Ozi ọma
Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo na ebe obibi kwesịrị ịbụ “isi ebe ọmụmụ ihe nke ozi ọma.”10 Nzube ọmụmụ ihe nke ozi ọma bụ “imikpu ntọghata anyị nye Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ma nyere anyị aka ịdịrị ka Ha karịa.”11 Ka anyị tulee oke na ọrụ ndị dị oké mkpa ndị nne na nna si azụ ụmụ a kọwara site n’aka ndị amụma na ndị ozi ndị nwere ike inyere anyị aka hiwe omenaala nke ozi ọma dị elu karịa niime ebe obibi anyị.
Nke Mbụ: Kuzie ihe N’obi ọma
Nna nke Eluigwe nyere Adam iwu banyere Jizọs Kraịst na ozizi Ya. Ọ kuziiri ya “ikuzi ihe niile n’obi ọma nye ụmụ [ya].”12 Ya bụ, Nna nke Eluigwe kuziiri Adam ikuzi ihe ndị a n’afọ ọma, n’ụzọ kachasị mma, ma na-enweghị mgbochi.13 Akwụkwọ nsọ na-agwa anyị na “Adam na Iv wee too aha nke Chineke, ma ha wee mee ka ụmụ ha ndị nwoke ma ụmụada ha mara ihe niile.”14
Anyị na-akuziri ụmụ anyị ihe n’ụzọ kachasị mma mgbe anyị na-ewepụta oge bara uru ịnọnyere ha. Anyị na-akuzi ihe na-enweghị mgbochi mgbe anyị na-akparịta isiokwu ndị na-emetụta uche ụdị dị ka oge skriin, jiri akụrụngwa ndị Nzukọ nsọ wepụtaworo.15 Anyị na-akuzi ihe n’ụzọ kachasị mma mgbe anyị na ụmụ anyị na-amụ akwụkwọ nsọ jiri Bịanụ, Soro M ma kwe ka Mmụọ ahụ bụrụ onye nkuzi.
Nke Abụọ: Ịbụ Onye na-eso ụzọ Dị Mma Nńomi
N’akwụkwọ Jọn, anyị na-agụ na mgbe ọtụtụ ndị Juu jụrụ Onye Nzọpụta ajụjụ banyere agwa Ya, Jizọs tụgharịrị uche ha ruo n’onye dị mma nńomi Ya, Nna Ya. Ọ kuziri, “Ọkpara ahụ enweghị ike eme ihe ọbụla n’onwe ya mana ihe ọ na-ahụ Nna ahụ na-eme: niihi na ihe ọbụla ọ bụ ọ na-eme, ndị a kwa ka Ọkpara ahụ na-emekwa.”16 Ndị nne na nna, kedụ ihe anyị dị mma a na-eṅomi maka ụmụ anyị? Ị bụ onye na-eso ụzọ.
Dị ka ndị nne na nna, anyị nwere ike ikuzi mkpa ọ dị ibu ụzọ tinye Chineke mgbe anyị na-akpa maka iwu nsọ nke mbụ, mana anyị na-eṅomi ya mgbe anyị na-eleghara ihe ndọpụ uche nke ụwa anya ma debe ụbọchi Izu ike nsọ izu ụka ọbụla. Anyị nwere ike ikuzi mkpa ọgbụgba ndụ niile nke tempụl dị mgbe anyị na-ekwu okwu banyere ozizi nke alụm di na nwunye selestịal, mana anyị na-eṅomi ya mgbe anyị na-akwanyere ọgbụgba ndụ anyị ugwu, na-emeso di ma ọ bụ nwunye anyị omume n’ụzọ nwere ùgwù.
Nke Atọ: Kpọkuo maka Ime ihe
Okwukwe niime Jizọs Kraịst kwesịrị ịbụ isi ama niile nke ụmụ anyị, ma ama ndị a aghaghị ịbịara nwa ọbụla site na mkpughe nke onwe.17 Inyere ụmụ anyị aka n’iwulite ama ha, anyị na-agba ha ume iji ohere nhọrọ ha ji mee ihe ziri ezi18 ma kwadoo ha maka oge ndu n’ụzọ ọgbụgba ndụ nke Chineke.19
Ọ ga-abụ amamiihe ịgba onye ọbụla niime ụmụ anyị ume ịnabata ikpọ oku nke Onyeisi Nelson ilekọta ama nke onwe nke Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya—ịrụ ọrụ maka ya, izulite ya ka o wee too, inye ya eziokwu dị ka nri, ma ghara imerụ ya jiri fịlọsọfị ụgha niile nke ndịikom na ndịinyom na-adịghị ekwe ekwe.20
Ụzọ Ezi omume, Akpachapụrụ anya Ndị nne na nna si Azụ ụmụ
Ebumnuche si nigwe nke Nna anyị nke Eluigwe dị ka nna ka e mere ka amata niime mkpughe enyere Moses: “Niihi na lee, nke a bụ ọrụ m na ebube m—iwete na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke mmadụ.”21 Onyeisi Nelson agbakwunyewo, “Chineke ga-eme ihe niile O nwere ike ime, ewezuga imebi ohere nhọrọ gị, iji nyere gị aka ịghara inwete ngọzi niile kachasị elu niime ebighị ebi niile.”22
Dị ka ndị nne na nna, anyị bụ ndị na-eje ozi nke Chineke na nlekọta nke ụmụ anyị.23 Anyị aghaghị ime ihe niile anyị nwere ike ime ikewapụta agbata ebe ụmụ anyị nwere ike inwete mmetụta Ya si na Chi.
Nna nke Eluigwe ma ọlị ebughị n’obi maka anyị dị ka ndị nne na nna ịnọdụ n’akụkụ ụzọ dị ka ndị nkiri, na-ele mgbe ndụ ime mmụọ nke ụmụ anyị ga-amalite. Ka m gosipụta echiche nke a nke ụzọ mkpachapụanya nne na nna si azụ ụmụ jiri nhumiihe nke onwe m. Mgbe m naara aga Praịmarị niime obere ngalaba nta dị niime Guatemala, ndị nne na nna m malitere ikuziri m ihe banyere uru ngọzi nke petrak. Nne m weere oge ahụ ịkọ nhụmiihe ya nke ịnata ngọzi nke petrak ya dị oké ọnụ ahịa. Ọ kụziiri m ozizi metụtara ngọzi nke petrak niile, ma ọ gbaara ama nke ngọzi ndị ekwere na nkwa. Ụzọ ndị nne na nna si azụ ụmụ ya akpachapụrụ anya kpatere mmụọ m inwe ọchịchọ iji nata ngọzi nke petrak.
Mgbe m gbara afọ 12, ndị nne na nna m nyeere m aka nyagharịa nchọgharị nke onye petrak. Nke a dịịrị mkpa niihi na enweghị petrak ọbụla niime distrit ebe anyị biiri. E mere m njem ruo onye petrak nke dị na stek gafere kilomita 156 (maịlụ 97). Echetere m nke ọma mgbe petrak tụkwasịrị aka ya abụọ n’elu isi m ịgọzi m. A maara m na site na nkwenye ime mmụọ siri ezigbo ike, na-enweghị obi abụọ, na Nna m nke Eluigwe maara m.
Maka obere nwa nwoke gbara afọ 12 sitere na obodo ukwu nta, nke ahụ pụtara ihe niile nye m. Obi m tụgharịrị nye Nna m nke Eluigwe n’ụbọchi ahụ niihi ụzọ mkpachapụanya nne na nna si azụ ụmụ nke nne m na nke nna m, ma aga m enwe obi ekele nye ha ruo ebighị ebi.
Nwanne nwanyị Joy D. Jones, onye bụbụụrụ Onyeisi Zuru ọha nke Praịmarị, kuziri: “Anyị enweghị ike ichere maka ntọgharị ka o ji aka ya mere ụmụ anyị. Mkparịta ụka mberede abụghị ụkpụrụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst.”24 Ịhụnaanya na ịkpọ òkù mkpatemmụọ anyị nwere ike mepụta ihe dị iche n’otu ụmụ anyị si eji ohere nhọrọ ha eme ihe. Onye Nelson kwusiri ike, “Ọ dịghị ọrụ ọzọ karịrị ụzọ nke ezi omume, akpachapụrụ anya ndị nne na nna si azụ ụmụ!”25
Na mmechi okwu
Ndị nne na nna, ụwa nke a jupụtara na ọtụtụ fịlọsọfị, omenaala, na echiche ndị na-ama aka maka ige ntị nke ụmụ anyị. Ụlọ nnukwu na nke obosara na-agbasa ozi nke ndị otu ya kwa ụbọchi n’eji chaneelụ midia kacha dị ọhụrụ. “Mana nʼonyinye nke Ọkpara ya,” ka onye amụma Moronaị kuziri, “ka Chineke kwadoworo ụzọ magburu onwe ya karịa.”26
Dị ka anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ site na ọgbụgba ndụ ma bụrụ ndị na-ejere Ya ozi na nlekọta nke ụmụ anyị, Ọ ga-edo ebumnuuche anyị nsọ, kpatee mmụọ nke nkuzi ihe anyị, ma kpasuo ịkpọ òkù anyị ka “ụmụ anyị nwee ike mara ụzọ ebe ha nwere ike ịtụanya maka mgbaghara nke mmehie ha.”27 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen