Ọgbakọ Zuru ọha
Ị chọrọ Inwe Ańụrị?
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


47:28

Ị chọrọ Inwe Ańụrị?

Nọrọ n’Ụzọ ahụ. Ndụ unu ga-enwere onwe ya karịa, nwee ańụrị karịa ma jupụta na ọńụ.

Ị chọrọ ịnwe ańụrị? Gịnị n’eme gị enwela ańụrị? Onyeisi Russell M. Nelson kwuru: “Ị chọrọ inwe obi ọjọọ, mebie iwu nsọ niile—ma echegharịkwala ma ọlị. Ị chọrọ inwe ọńụ, nọrọ n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ ahụ”1 Ọbụna ọdịghị mfe ịnwe ańụrị? Naanị mee ọgbụgba ndụ ma debe ha na ndụ unu. Ka anyị tulekọrịta ụfọdụ ihe nwere ike inyere anyị aka nọrọ n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ ma mee anyị nwete ańụrị.

1. Kedụ ihe bụ Ụzọ nke Ọgbụgba ndụ?

Dị ka otu Okenye Dale G. Renlund kwuru: “okwu ahụ ụzọ ọgbụgba ndụ na-ekwu maka usoro niile nke ọgbụgba ndụ site ebe anyị si abịakwute Kraịst ma jikọọ na Ya. Site na njiko ọgbụgba ndụ nke a, anyị nwere ohere nke ike ebighị ebi Ya. Ụzọ ahụ na-eji okwukwe n’ime Jizọs Kraịst na nchegharị amalite, nke baptizim na ịnata Mmụọ Nsọ na-esote.”2 Anyị na-emegharị ọgbụgba ndụ ndị a ọhụrụ n’oge nile anyị na-anata oriri nsọ.

Malite na ọgbụgba ndụ nke baptizim, anyị n’eme ọgbụgba ndụ ndị ọzọ ruo ogologo ndụ anyị niile. Ọzọkwa, Okenye Renlund kwuru: “Ụzọ nke ọgbụgba ndụ na-eduba na emume nsọ niile nke tempụl, ụdị dị ka onyinye dị nsọ tempụl. Onyinye dị nsọ bụ onyinye Chineke nke ọgbụgba ndụ dị nsọ na ejikọ anyị nye Ya n’ụzọ zuru ezu karịa.”3

2. Ị nọ n’Ụzọ nke Ọgbụgba ndụ ahụ?

Mgbe ụfọdụ anyị mere ọgbụgba ndụ niile, anyị na-ada ada n’ịdebe ha. Mgbe nke a mere, kedụ otu ị ga-esi alaghachị n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ? Ka m kesaa ụfọdụ ọmụmatụ maka ịlaghachị n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ ahụ.

Ihe jiri ntakịrị gafee otu ọnwa gara aga, A natara m ozi sitere na onye mgbasa ozi ọma laghachiworo onye anyị na ya jekọrịtara ozi. O kwuru: “Nke ikpeazụ esiwo ike. Ibuso agha nye nchegbu na ịda mbà n’obi kwa ụbọchị abụrụworo m ibu nnyịda, ma ọ siri nnukwu ike. Enwere m owu ọmụma ma nọọrọ n’obi ọjọọ. A nọ m na-ekpe ekpere maka odudu nke Nna nke Eluigwe maka udo na nkasị obi nime ihe m n’eme iji luso ihe isiike ahụ agha. … Dị ka m na-ekpe ekpere ma na-achọ odudu, A natara m mkpake mmụọ ka ọ na-agwa m na ihe m kwesịrị ime bụ ikwuzu otu ụzọ n’ụzọ iri m. … E nweterem mmetụta Mmụọ nụzọ dị ike, ma ozugbo ahụ enweterem nkwanye ịme otu ahụ. Jiri ọchịchọ obi ime nke a, enweterem mkpake na ‘Ọ bụrụ na ịkwụọ otu ụzọ n’ụzọ iri gị, ihe niile gaadị mma.’ A ka m na-adọlị ịchọta udo, mana enwerem ọgbụgba ama nime Onye Nzọpụta anyị ma na site na nrube isi nke m, enwere m ike nwete mmetụta ma chọta nime obi na uche m udo ahụ nke m na-achọ. Otebeghi aka m kpebiri ịlaghachi Nzukọ nsọ ma chọta Mmụọ ahụ nime ihe niile nke m neme.”

Ugbua ọ n’eme ezigbo ọfụma. Ị nwere kwara ike rịọ Nna nke Eluigwe maka udo, mana aziza ahụ nwere ike dị iche na ụdị ịchere na ọ gaabụ. Ọbụrụra na ị na-achọ ịmata Onye Nzọpụta ma kpeere Nna nke Eluigwe ekpere, Ọ ga-enye gị aziza arọpụtara naanị maka gị.

Onye Isi Nduzi Thomas S. Mọnson kuziri:

“Nkuzi nke kachasị dị mkpa anyị nwere ike imụta na ndụ anụ-arụ bụ na mgbe Chineke na-ekwu ma anyị erube-isi, anyị ga-abụ ndị ziri ezi mgbe niile.”4

“Mgbe anyị na-edebe iwu-nsọ niile, ndụ anyị ga-enwe ańụrị karịa, nwee njupụta karịa, ma nwee obere mgbagwoju anya. Ihe iche-aka mgba anyị niile na nsogbu anyị ga-adi mfe ibu, ma anyị ga-anata ngọzi niile [nke Chineke] kwere na nkwa.”5

Mgbe akpọrọ m ịbụ bishọp, ọ bụ oge kacha sie ike na ndụ m. A bụ m nna dị nta nọ afọ mbido 30 nke m, ma anọ m nime nsogbu ego nihi ịche akamgba niile nke ezi na ụlọ. Enweghi m ike ịchọta ogbugbo, ma e chere m na ịche akamgba ndịa enweghi ọgwụgwo ma ọlị. Ike gwụrụ m n’ụzọ ego na nke mmetụta uche. A malitere m nwenwekwe obi abụọ n’ume m nke ime mmụọ. Ọ bụ n’oge ihe isiike ahụ ka onyeisi stek m kpọrọ m oku ahụ. A nabatara m ya, nagbanyeghi na ọ rara ezigbo ahụ.

Nwunye m nwekwara ohere ajụjụ ọnụ ya na onyeisi stek, mana o nweghi ike ikwu eeh, ma okwughikwanụ mba kama ọ nọ na-ebepụta anya mmiri. O bere akwa ruo otu izu ụka, na-ajụ Nna nke Eluigwe, “Gịnị mere o jiri bụrụ ugbua?” ma “Ị makwara n’ezie onye ọbụla n’otu n’otu?” Ọ nataghị aziza, kama a kwadoro m dị ka akwadorom dị ka bishọp n’ụbọchi Sọnde n’esote. Ọ jụghị Nna nke Eluigwe ajụjụ ndị ahụ ọzọ kama ọ kwadoro ọkpụkpọ oku m ruo afọ isii.

N’ụbọchị Sọnde ahụ mgbe atọghapụrụ m n’ọrụ, nwunye m nụrụ olu mgbe ọ na-anata oriri nsọ. Olu ahụ takara na ntị ya, “Nihi ọ rara gị ezigbo ahụ ije ije, A kpọrọ m ya dị ka bishọp ka ojide gị aka ma soro gị jee ije.” Dị ka o leghechiri anya n’azụ afọ isii ahụ, ọ matawo na ọtụtụ ịche akamgba ahụ ndị dịịrị ka ha enweghi ọgwụgwụ ka edoziworo ugbua dị ka ije n’aga.

Anyị matara na mgbe anyị chere na ọ bụghị ezi oge maka anyị ị nata ọkpụkpọ oku, o nwere ike bụrụ oge nke ọkpụkpọ oku ahụ kacha dịịrị anyị mma. Mgbe ọbụla Onyenwe anyị kpọrọ anyị ije ozi nime ọkpụkpọ oku ọbụla, ma ọ bụ ọ dị mfe ma ọ bụ dị arọ, Ọ na-ahụ mkpa anyị niile. Ọ na-arọpụtara anyị ume anyị chọrọ ma o debewo ngọzị a ga-awụkwasa niisi anyị dị ka anyị n’eje ozi kwesịrị ntụkwasị obi.

Enwere ọtụtụ ihe ndị na-adọpụ uche anyị site na ịnọgide n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ ahụ. Nagbanyeghi ihe ọ bụ, ọge agafebeghi ma ọlị ichighari obi anyị debe n’ebe Nna nke Eluigwe nọ maka enyemaka. Okenye Pọl V. Johnson kuziiri anyị na: “Mgbe anyị na-esoro Setan, anyị na-enye ya ike. Mgbe anyị na-esoro Chineke, Ọ na-enye anyị ike.”6

Eze Benjamin nime Akwụkwọ nke Mọmọn gbara aka ebe: “Ma nke ka nke, a ga m achọ ka unu tụgharịa uche na ngọzi na ọnọdụ an̄ụrị nke ndị ahụ na-edebe iwu-nsọ nile nke Chineke. N’ihi na lee, agọziri ha n’ihe nile ma n’ihe nke arụ ma nke mụọ; ma ọbụrụ na ha a nọgide n’okwukwe ruo n’ọgwụgwụ a ga-anabata ha n’ime elu-igwe, nke mere na ha na Chineke ga-ebi n’ọnọdụ an̄ụrị na-enweghị ọgwụgwụ.”7

3. Kedụ otu Idebe Ọgbụgba ndụ gị na Chineke si Enye Gị Ańụrị?

Nwunye m na-ekwu na ọlụlụ anyị jikọtara anyị ọnụ, ma nihi nke ahụ ọ n’eme ọtụtụ ihe nke ọ n’enweghi ike ịmenwu na mbụ. N’ịmatụ, kamgbe ọ dị na nwata, ọ na-ara ya ahụ ị pụ n’ọchịchịrị, mana ọ naghịzi arara ya ahụ nihi a na m eso ya apụ. Ọ dị mkpụmkpụ ma aka ya anaghị eru n’elu kọbọọdụ ma ọ bụrụ na o jighi oche ma ọ bụ ubube, mana aka m nwere m ike iru ihe ndị ahụ maka ya nihi a ka m ya too ogologo. Iwekwasị onwe anyị yok nke Onye Nzọpụta dị ka otu ahụ. Dị ka anyị na-ejikọta onwe anyị na ya, anyị nwere ike mee ihe ndị ahụ anyị enweghi ike ịmenwu n’onwe anyị nihi Ọ nwere ike imee ihe ndị anyị na-enweghi ike ị mere onwe anyị.

Okenye David A. Bednar kwuru: “Ime ma idebe ọgbụgba ndụ ndị dị nsọ na-ejikọta anyị na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ọnụ. N’ezie, Onye Nzọpụta na-akpọku anyị idabere na ya ma jikọta aka ọnụ dọọ ihe, ọbụnadị na mgbalị anyị nke kacha ahataghị na nke Ya ma ejighi ha atụrụ nke Ya Dị ka anyị na-atụkwasị obi na ya ma soro ya na-adọ ibu anyị n’oge njem nke ndụ anụ arụ, n’ezie yok nke Ya dị mfe, ma ibu Ya adighị arọ”8

Onyeisi Nelson akụziwokwa:

“Ikekọta onwe unu na Onye Nzọpụta pụtara na inwere ohere ruo n’ume Ya na ike nke mgbapụta Ya,”9

“Ụgwọ ọrụ nke idobe ọgbụgba ndụ niile nke gị na Chineke bụ ike nke eluigwe—ike nke na-agba anyị ume iji nagide mnwale niile, ọnwụnwa niile, na obi mgbu niile n’ụzọ dị mma karịa. Ike nke a na-eme ka ụzọ anyị nwere onwe ya. Ndị ahụ na-edobe iwu ndị dị elu nke Jizọs Kraịst nwere ụzọ iji nweta ike Ya dị elu karịa.”10

“Ịdebe ọgbụgba ndụ n’ezie n’eme ka ndụ nwere onwe ya! Onye ọbụla nke mere ọgbụgba ndụ niile na fọnt ndị nke baptizim na niime tempụl niile—ma na-edobe ha—nwere ụzọ bara ụba esi enweta ike nke Jizọs Kraịst.”11

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị m hụrụ naanya, unu chọrọ inwe ańụrị? Nọrọ n’Ụzọ ahụ. Ndụ unu ga-enwere onwe ya karịa, nwee ańụrị karịa ma jupụta na ọńụ. Onye Nzọpụta na-akpọku anyị, “Bịakwutenụ m, unu ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndi e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.”12 Ọ bụ Kraịst ahụ dị ndụ. Ọ na-ebu ibu arụ anyị ma n’eme ka ndụ anyị nwere onwe ya karịa. Na aha nke Jizọs Kraịst, amen.