Ọgbakọ Zuru ọha
Jizọs Kraịst Bụ Akụ ahụ
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


12:24

Jizọs Kraịst Bụ Akụ ahụ

Lekwasị anya na Jizọs Kraịst. Ọ bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị, “oke” ahụ bụ onye anyị kwesịrị ilekwasị anya, na akụ anyị kachasị elu.

N’afọ 1907 otu Nwoke bekee bara ọgaranya akpọrọ George Herbert, Earl Carnarvon nke Ise,1 kwagara Ijipt ma nwee mmasị na nkà mmụta ihe ochie. Ọ gakwuuru otu Ọkachamara Ijipt a maara ama nke ọma, Howard Carter, ma kwupụta uche nrụkọ ọrụ. Carter ga-elekọta ihe ochie ndị egwupụtara, ma Carnarvon ga-ewete ego niile.

N’otu ha nyochara ebe dị iche iche nke ọma. Emesịa ha natara ikike igwupụta site na Ndagwurugwu nke Ndị Eze, dị na-akụkụ Luxor nke oge a, ebe achọtara ili ọtụtụ Fero. Ha kpebiri ịchọgharị ili nke Eze Tutankhamun. Tutankhamun rigooro n’oche eze nke Ijipt ihe karịrị afọ 3,000 tupu ugbua ma chịa afọ 10 tupu ọnwụ ya a na-atụghị anya ya.2 A maara ya ka onye eliri niime Ndagwurugwu nke ndị Eze,3 mana ebe ili ya dị ka a na-amaghị.

Carter na Carnarvon gburu afọ ise achọtaghị ili nke Tutankhamun. N’ikpeazụ Carnarvon gwara Carter na o mesiwo na ọchịchọ ahụ na-enweghị isi. Carter rịọrọ naanị maka otu oge nke igwugharị ihe ọzọ, ma Carnarvon chegharịrị ma kwere n’iwete ego.

Carter ghọtara na ala niile nke Ndagwurugwu nke ndị Eze ahụ ka egwupụtaworo n’usoro n’usoro—ewezuga mpaghara ebe kampụ ọrụ ha onwe ha. Niime ụbọchi ole ma ole nke igwu ala ebe ahụ, ha hụtara nzọụkwụ mbụ ndị na-edu gbadaa n’ili ahụ.4

Mgbe Carter n’ikpeazụ nyobara anya n’ebe ụlọ nche nke ili Tutankhamun, ha hụrụ ọlaedo ebe niile. Mgbe ọnwa atọ nke idepụta ọdịnaya niile nke ụlọ nche ahụ gasịrị, ha meghere ụlọ olili ahụ arachiri arachi na Febrụwarị 1923—100 afọ gara aga. Nke a bụ nchọta nkà mmụta ihe ochie akacha mara na senchuri nke 20.

N’oge afọ ndị ahụ nke nchọgharị na-enweghị isi, Carter na Carnarvon elegharawo ihe dị nnọọ ha n’okpuru ụkwụ anya. Ihe dị ka senchuri ise tupu ọmụmụ nke Onye Nzọpụta, onye amụma Akwụkwọ nke Mọmọn Jekọb kpọrọ ileghara anya ma ọ bụ iwelata uru ihe nọ nso dị ka “ilefe anya n’oke ahụ.” Jekọb hụrụ n’ọhụ na ndị Jerusalem agaghị amata Mezaya ahụ ekwere na nkwa mgbe Ọ ga-abịa. Jekọb buru amụma na ha ga-abụ “ndị mmadụ [ndị] lelịrị okwu niile doro anya … ma [ga-achọ] maka ihe niile nke ha na-enweghị ike ịghọta. Ya mere, niihi isi ha kpuru, bụ isi [ga-abịa] site n’ilefe anya n’oke ahụ, ha aghaghị ịda.”5 N’okwu ọzọ, ha ga-asụ ngọngọ.

Amụma nke Jekọb bịara bụrụ eziokwu. N’oge ije ozi anụ ahụ nke Jizọs, ọtụtụ lefere anya n’oke ahụ, gafee Ya. Ha lefere Onye Nzọpụta nke ụwa anya. Kama ịmata ọrụ Ya n’imejupụta atụmatụ nke Nna nke Eluigwe, ha mara Ya ikpe ma kpọgide Ya n’obe. Ha tụrụ anya ma chere maka onye ọzọ iwetere ha nzọpụta.

Dị ka ndị ahụ nọ na Jerusalem, na dị ka Carter na Carnarvon, o nwekwara ike ịdịrị anyị mfe ilefe anya n’oke ahụ. Ọ dị mkpa na anyị ga-eche nche megide omume a n’ụjọ anyị a ghara inwete Jizọs Kraịst niime ndụ anyị ma ghara ịmata ọtụtụ ngọzi ndị Ọ na-enye anyị. Anyị chọrọ Ya. Enyere anyị ndụmọdụ ịdabere “kpam kpam n’elu uru niile nke ya onye dị ike ịzọpụta.”6

Ọ bụ oke anyị. Ọ bụrụ ma anyị elezighị anya na-eche na enwere mkpa banyere ihe gafere ihe Ọ na-enye, anyị na-agọnarị ma ọ bụ belata oke na ike ahụ O nwere ike inwe niime ndụ anyị. Ọ narawo ikike niile nke ebere ma na-agbasa ebere ahụ ruo na anyị.7 Ọ bụ ya bụ isi “ụzọ [bụ onye anyị kwesịrị] ile anya maka mgbaghara mmehie [anyị].”8 Ọ bụ Onye Nkwuchite Ọnụ anyị nebe Nna nọ ma n’edu ihe ahụ Nna chọwororịị mgbe niile, maka anyị ịlọghachikwute Ya dị ka ndị nketa oke nalaeze Ya. Anyị kwesịrị, nokwu niile nke onye amụma Alma, “legharịa anya [anyị] ma malite ikwere n’Ọkpara nke Chineke, na ọ ga-abịa ịgbapụta ndị ya, ma na ọ ga ata ahụhụ ma nwụọ iji chụọ aja mgbaghara mmehie maka mmehie [anyị]; ma na ọ ga-ebili ọzọ site na ndị nwụrụ anwụ, nke ga-ewete na mmezu mbilite n’ọnwụ ahụ.”9 Jizọs Kraịst bụ akụ anyị.

Onye Nzọpụta eziwo anyị ọtụtụ ụzọ a ga-esi na mkpachapụ anya elekwasị anya na Ya, tinyekọta ohere nchegharị kwa ụbọchi. Oge ụfọdụ anyị na-eleda uru ịdị ukwuu ngọzi nke a enyere dị. Mgbe m gbara afọ asatọ, nna m mere m baptizim. Emesịa e jidere m aka ya dị ka anyị na-agafe okporo ama ọtụtụ ihe na-eme. A naghị m aṅa ntị ma zọpụ ụkwụ site n’akụkụ ụzọ nnọọ mgbe nnukwu gwongworo na-abịa n’ike n’ike. Nna m dọghachiri m azụ, pụọ n’okporo ama ahụ ruo n’akụkụ ụzọ. A sị na o meghị otu ahụ, gwongworo ahụ gaara akụda m. Ịmara ọdịdị aghụghọ m, e chere m, “Enwere ike ọ gaara a kara m mma na gwongworo ahụ gburu m niihi na agaghị m ma ọlị adị ọcha dị ka m dị ugbua mgbe m mesịrị baptizim.”

Dị ka nwa gbara afọ asatọ, e chewom na nghọtaghie na mmiri nke baptizim sachapụrụ njọ niile. Ọbụghị eziokwu. Niime ọtụtụ afọ kemgbe baptizim mụ, a mụtawo m na a na-asachapụ njọ site n’ike nke Jizọs Kraịst site na aja mgbaghara mmehie Ya dị ka anyị na-eme ma na-edebe ọgbụgba ndụ baptizim.10 Mgbe ahụ, site n’onyinye nke nchegharị, anyị pụrụ ịdịgide ọcha. A mụtawokwa m na oriri nsọ na-ewete ihe ọma dị ike na-emekarị eme niime ndụ anyị, na-enyere anyị aka edobe mgbaghara nke mmehie anyị.11

Dị ka nnọọ akụ ahụ dị n’okpuru ụkwụ Carter na Carnarvon, ngọzi nke oriri nsọ niile dị oké ọnụ ahịa dị adị nye anyị oge ọbụla anyị jere nzukọ oriri nsọ. E kwere anyị nkwa na Mmụọ Nsọ ga-abụ onye nsiso anyị mgbe niile ọ bụrụ ma anyị rie oriri nsọ otu onye atọghatara ọhụrụ si ahụ baptizim na emume nnabata, jiri obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị na mkpebi idebe ọgbụgba ndụ ahụ nke baptizim. Mmụọ Nsọ na-eji ike ido nsọ Ya agọzi anyị ka anyị wee nwee ike mgbe niile jigide mgbaghara mmehie anyị, kwa izu ụka.12

Ntọala ime mmụọ anyị na-enwete mgbam ume site na nchegharị na site na-ime nkwado jiri akọ na uche maka ma iri oriri nsọ na ntozu oke. Naanị site na ntọala ime mmụọ siri ike ka anyị ga-enwe ike ijikwali ihe yiri mmiri ozuzo, ifufe, na iju mmiri niile na-eche anyị ihu niime ndụ anyị.13 Naka nke ọzọ, ntọala nke ime mmụọ anyị a naghị adịcha ike mgbe anyị n’eji aka anyị ghara ịga nzukọ oriri nsọ ma ọ bụ mgbe anyị anaghị elekwasị Onye Nzọpụta anya n’oge oriri nsọ. Anyị nwere ike na-akpachapụghị anya “wepụ onwe anyị site na Mmụọ nke Onyenwe anyị, nke mere na Ọ gaghị enwe ohere niime [anyị] idu [anyị] n’ụzọ amamiihe ka e wee gọzie [anyị], anyị e mee nke ọma, ma echekwaa anyị.”14

Mgbe anyị nwere Mmụọ Nsọ niime anyị, anyị ga-enwe mkpatmmụọ ma e duo anyị ime ma debe ọgbụgba ndụ ndị ọzọ, dị ka ndị ahụ anyị na-eme niime tempụl. Ime otu a na-emikpu mmekọrịta anyị na Chineke.15 E nwere ike ị matawo na amawo ọkwa ọtụtụ tempụl ọhụrụ n’afọ ndị adịbeghị anya, na-ewetere ndị otu tempụl nso nso mgbe niile.16 Na-isoro igbuduokwu, dị ka tempụl na aka adị nso karịa, o nwere ike ịdịrị anyị mfe iwere ịga tempụl ka ihe nkịtị karịa. Mgbe tempụl dị ebe dị anya, anyị na-akwado oge na akụrụngwa anyị iji mee njem ruo tempụl ife ofufe ebe ahụ. Anyị na-eji njem ndị a akpọrọ ihe.

Ebe tempụl dị nso, o nwere ike ịdị mfe ikwe ka ụmụ obere ihe gbochigide ịga tempụl, na-agwa onwe anyị, “Ọ dị mma, aga m aga nnọọ oge ọzọ.” Ibi nso na tempụl na-ewete ịdị mfe mgbanwe karịrị akarị na-ịhazi oge na tempụl, mana ịdị mfe mgbanwe nke a nwere ike ime ya adịkwa mfe ejighị tempụl kpọrọ ihe. Mgbe anyị na-eme otu a, anyị “na-aghara inwete oke ahụ,” na-ebelata ohere ịbịaru Onye Nzọpụta nso niime ụlọ nsọ Ya. Nkwa anyị ịga kwesịrị ịdị nnọọ ike dị ka mgbe tempụl dị nso dịkwa ka mgbe ọ dị anya.

Mgbe Carter na Carnarvon gwuru ebe ndị ọzọ niime Ndagwurugwu nke ndị Eze ahụ na-achọgharị ebe ili nke Tutankhamun nọ, ha matara nleghara anya ha. Ọ baghị uru na anyị ga-arụ ọrụ n’enweghị isi, dị ka ha mere otu mgbe, ịchọta akụ anyị. Ọ bụghị ma anyị nwere mkpa ịchọ ndụmọdụ site nụzọ ndị dị elu, na-aja isi o siri bịa mma ma na-eche na udiri ndụmọdụ ahu kacha enye nghọta karia nke ahụ anyi nwere ike inata site n’aka onye amụma Chineke dị umeala.

Dị ka e dere niime Testament Ochie, mgbe Naaman chọgharịrị ọgwụgwọ ọrịa ekpenta ya, o were iwe mgbe a sịrị ya rukpuo onwe ya ugboro asaa niime osimiri nkịtị dị nso. Mana akwagidere ya isoro ndụmọdụ nke onye amụma Elisha kama ịdabere n’echiche mbu ụzọ nke onwe ya nke otu ọrụ ebube ahụ kwesịrị isi mee. Niihi ya, a gwọrọ Naaman.17 Mgbe anyị na-atụkwasị obi na onye amụma nke Chineke n’elu ụwa taa, ma jiri ndụmọdụ ya mee ihe, anyị ga-achọta obi ụtọ, ma anyị nwakwa ka enwere ike ịgwọ. Anyị ekwesịghị ile anya ebe ọzọ.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ana m agba unu ume icheta na na-elekwasị Jizọs Kraịst anya. Ọ bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị, “oke” ahụ bụ onye anyị kwesịrị ilekwasị anya, na akụ anyị kachasị elu. Dị ka unu na-abịakwute Ya, a ga-eji ume akwụ unu ụgwọ iji zute akamgba niile nke ndụ, mgbam ume iji mee ihe ziri ezi, na ike iji mejupụta ozi unu niime ndụ a pụrụ ịnwụ anwụ. Jiri ohere iji cheegharịa kpọrọ ihe, ohere ọma nke iri oriri nsọ, ngọzi nke ime ma debe ọgbụgba ndụ niile nke tempụl, mmasị nke ife ofufe niime tempụl, na ọńụ nke inwe onye amụma dị ndụ.

Ana m agba aka ebe m dị nsọ na nke bụ eziokwu na Chineke, Nna nke Ebighị ebi, bụ Nna anyị nke Eluigwe na na Ọ dị ndụ; Jizọs bụ Kraịst ahụ; Ọ bụ Enyi Eluigwe anyị dị ọbi ọma maara ihe,18 ma nke a bụ Nzukọ nsọ Ya eweghachitere. Unu emeela maka okwukwe na ikwesị ntụkwasị obi unu. Ana m ekpe ekpere na-aga agọzi unu, unu e mee nke ọma, ma echekwaa unu, n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Aha uju nke Earl nke ise nke Carnarvon bụ George Edward Stanhope Molyneux Herbert.

  2. A computed tomography (CT) scan e mere n’afọ 2005 gosiri na Eze Tutankhamun nwere ike dị ka na ọ gbajiri otu ọkpụkpụ nke ụkwụ ya, eleghị anya kpatara ya ọrịa nje na ọnwụ.

  3. Ọtụtụ niime fero New Kingdom ndị Ijipt ka e liri niime Ndagwurugwu nke ndị Eze. Ọtụtụ niime ili ndị ahụ ka achọtara ma zuo ohi na ya maka ihe ochie.

  4. Nkọwapụta nke a banyere nchọpụta nke ili Tutankhamen dabeere kpọm kwem na Eric H. Cline, “King Tut’s Tomb,” in Archaeology: An Introduction to the World’s Greatest Sites (2016), 60–66.

    Ọtụtụ ihe gbakwunyere na nhọrọ nke Carter na nke Carnarvon banyere ebe ha ga-egwu—na ebe ha agaghị egwu—niime Ndagwurugwu nke ndị Eze. Mpaghara dị na gburugburu kamp ọrụ ha adịchaghị ụtọ igwu ihe. The triangular area provided visitor access to the tomb of Ramses VI, so excavations there would be particularly disruptive. Mpaghara ebe ahụ ka eji edejuru n’okwu niile nke Carter, “ọnụọgụgụ ụlọ nke nke ọrụ ewughị nke ọma, eleghị anya ndị na-arụ ọrụ nọ niime ili nke Ramesis[,] biiri na ya … [na] fiiti aja atọ dị n’okpuru ha.” Ọ dịghị nnọọ ka a ga-arụ obere ụlọ n’elu ọnụ ụzọ ili (lee Howard Carter na A. C. Mace, Ili nke Tut-ankh-Amen: Achọtara site n’aka Earl nke Carnarvon nwụrụ anwụ na Howard Cartervol. 1 [1923], 124–128, 132).

    Maka nkọwapụta ndị ọzọ nke ili nke Tutankhamun, lee Zahi Hawass, Tutankhamun na Afọ Ọlaedo nke ndị Fero (2005); Nicholas Reeves, Tutankhamun Zuru ezu: Eze Ahụ, Ili ahụ, Akụ nke Ịbụ eze (1990), 80–83; na Nicholas Reeves na Richard H. Wilkinson, Ndagwurugwu Zuru ezu nke ndị Eze: Ili niile na Akụ niile nke Fero niile Dị Ukwuu nke Ijipt (1996), 81–82.

  5. Jekọb 4:14

  6. 2 Nifaị 31:19

  7. Lee Moronai 7:27-28

  8. 2 Nefi 25:26

  9. Alma 33:22

  10. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:52

  11. Lee David A. Bednar, “Kuzie ihe iji Wulite Okwukwe niime Jizọs Kraịst” (okwu enyere na semina maka ndị ndu mishọn ọhụrụ, June 23, 2023); Rachel Sterzer Gibson, “Kuzie ihe iji Wulite Okwukwe niime Jizọs Kraịst, Okenye Bednar Na-enye Ndụmọdụ,” Church News, Jun 23, 2023, thechurchnews.com.

  12. Oriri nsọ, kosiladị, ka a na emebeghi dị ka ụzọ a kara ọnụ nke inwete mgbaghara nke mmehie anyị (lee James E. Talmage, Ndepụta nke Okwukwe, 12th ed. [1924], 175). Mmadụ agaghị ama ama mee njọ na mgbede Satọde ma tụọ anya na naanị ihe ọ kwesịrị ime bụ iri otu ibe achịcha ma ńụọ otu iko mmiri na Sọnde ma otu ntabi anya nwete nsacha. Mana nsonazụ nsacha nke Mmụọ Nsọ pụrụ ịsacha ndị niile chegharịworo jiri obi ọcha na nzube ziri ezi.

  13. Lee 3 Nefi 18:12–13

  14. Mosiah 2:36

  15. Onyeisi Russell M. Nelson kwuru sị: “Chineke nwere ịhụnaanya pụrụiche nye onye ọbụla na-eme ọgbụgba ndụ na Ya niime mmiri niile nke baptizim. Ma ịhụnaanya chi ahụ na-emikpukwu dị ka a na-eme ma na-edebe ọgbụgba ndụ ndị agbakwunyere na nkwesị ntụkwasị obi” (“Nhọrọ niile maka Ebighị ebi” [worldwide devotional for young adults, May 15, 2022], Gospel Library). Ọtụtụ ọgbụgba ndụ nụzọ ọgbụgba ndụ abụghị nnọọ nke ahara aha mana nke mgbakwunye na ọbụna nke dabara adaba. Ha na-akwalite njikọ dị nso na nke siri ike karịa na Chineke. Ụdị njikọ a na-ekwe anyị ịgbanwe ruo mgbe oyiyi Ya dị niime mbara ihu anyị na obi anyị ka agbanwere nke ukwuu na-anọgide (lee Alma 5:14).

  16. Onyeisi Nelson kọwara na Onyenwe anyị “na-eme ka Tempụl Ya niile dịrị nso karịa. Ọ na-eme ngwa n’otu anyị si arụ tempụl niile. Ọ na-abawanye ike anyị iji nye aka kpọkọta Izrel. Ọ nakwa eme ka ọ dị mfe karịa nye onye ọbụla niime anyị ịnụchaa n’ụzọ ime mmụọ” (“Nlekwasị anya n’ebe Tempụl dị,” Liahona, Nov. 2022, 121).

  17. Lee 2 Ndị Eze 5:9–14

  18. Lee “A Maara Na Onye Mgbapụta M Dị Ndụ,” Abụ niile, no. 136.