N’Emepe Ọnụ Mpio niile nke Eluigwe
Ọnụ mpio niile nke eluigwe na-emeghe n’ụzọ dị ọtụtụ. Tụkwasị obi n’ọgụgụ oge nke Onynwe anyị; ngọzi niile ahụ na-abịa mgbe niile.
Mgbe m nọ na South Afrịịka na nso nso a, Nwanne nwoke Roger Parra sitere na Venezuela kọọrọ m nhụmiihe ndị a sotere:
“Na 2019 Venezuela nwere nsogbu ndị juru ya ahụ nke ihe kpatara ya bụ ọkụ e weere ruo mkpụrụ ụbọchị ise.
“Ọgba aghara na mmebi iwu rịrị ibe ya elu n’okporo ụzọ niile, ma ọtụtụ ndị ọkacha raa ahụ enweghị ihe oriri zuru oke.
“Ụfọdụ malitere ịbụ ụbụ n’ebe a na-ere ihe oriri, na-emebisị ihe niile nọchiiri ha ụzọ.
“Dị ka onye nwere obere ebe a na-eme achịcha, e nwere m nchekasị gbasara ebe azụmahịa anyị. Dị ka otu ezi na ụlọ, anyị kpebiri inyepụcha ndị nọ na mkpa ihe oriri niile nọ n’ebe anyị na-eme achịcha.
“N’otu ụbọchị kpọm kwem ọchịchịrị gbazuru ọgbaghara zuru ebe niile. Naanị ihe na-ewute m bụ maka nchekwa nke ezi nwunye m na ụmụ m ndị m hụrụ naanya.
N’isi isi ụtụtụ a gawara m n’ebe anyị na-eme achịcha. Nke ka njọ, ebe azụmahịa ihe oriri ọbụla nọ nso abụrụwo ihe emebiri emebi site n’aka ndị na-abụ ụbụ, mana noke mgbagwoju anya m,ebe anyị na-eme achịcha kwụ chịm. E nweghị ihe ọbụla emebiri. N’obi umeala e kelere m Nna m nke Eluigwe.
Na-ịlọrute n’ebe obibi, a gwara m ezi na ụlọ m ihe banyere ngọzi na nchekwa nke Chineke.
“Obi ha niile juputara n’ekele.
“Ọkpara m, Rogelio, gbara naanị afọ iri na abụọ, sịrị, ‘Papa!!! Ama m ihe mere ụlọ ahịa anyị jiri nwee nchekwa. Gị na Mama na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri unu mgbe niile.’”
Nwanne nwoke Perra kwuchara: “Okwu niile nke Malakaị batara m n’uche. Aga m abara onye nrichapụ ahụ mba niihi unu, ma ọ gaghị ebibi mkpụrụ nile nke ala unu.’ [Malakaị 3:11]. Anyị gbisara ikpere n’ala ma n’obi ekele nye Nna anyị nke Eluigwe ekele maka ọrụ ebube Ya.”1
Nwaa M Ugbua Site na nke a
Ihe niile anyị nwere na ihe niile anyị bụ si n’aka Chineke. Dị ka ndị na-eso ụzọ nke Kraịst, anyị na-eji obi anyị niile na-ekekọrịta ihe anyị nwere anyị na ndị ọzọ nọ anyị gburugburu.
Site niihe niile Onyenwe anyị na-enye anyị, Ọ gwawo anyị ka anyị nyeghachi Ya ma alaeze Ya n’elu ụwa pesentị 10 site na mmụba anyị. O kwewo anyị nkwa na dị ka anyị na-akwụwa aka ọtọ n’ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri anyị, Ọ ga “emeghe … mpio niile nke Eluigwe, ma wụpụta … ngọzi, nke a na-agaghị enwe ebe ga-ezu ịnabata ya.”2 O kwewo anyị nkwa na Ọ ga-echekwa anyị site niihe ọjọọ.3 Nkwa ndị a doro nnọọ ezigbo anya,4Onyenwe anyị na-ama ọkwa, “Nwalee m ugbua site na nke a,”5 otu nkebiokwu a na-ahụghị ebe ọzọ niime akwụkwọ nsọ mana mgbe a na-eńomi Malakaị.
Mpio ụlọ niile nke eluigwe na-emeghe n’ụzọ dị ọtụtụ. Ụfọdụ bụ nke anụ ahụ, mana ọtụtụ bụ nke ime mmụọ. Ụfọdụ siri ike nghọta ma dị mfe ileghara anya. Tụkwasị obi n’ọgụgụ oge nke Onynwe anyị; ngọzi niile ahụ na-abịa mgbe niile.
Anyị na-eso ndị ahụ ọ na-ara ahụ inweta ihe ndị dị mkpa na ndụ eru uju. Na nso nso a Nzukọ nsọ ahụ nyere onyinye nde U.S. dollar $54 iji nyere ụmụaka na ndị nne na-enweghị nchekwa aka n’ofe ụwa.6 Ma site n’onyinye ndị sitere na ibu ọnụ kwa ọnwa unu, ezigbo ndị bishọp anyị na-enyere puku kwuru puku aka izu ụka ọbụla ndị nwa oge nta nwere mkpa ihe oriri n’elu tebụlụ ha, uwe n’ahụ ha, na ebe nchekwa n’elu isi ha. Naanị azịza na-adịgide mgbe niile nye ịda ogbenye nke ụwa nke a bụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst.7
Ọ bụ Ihe Chọrọ Okwukwe
Pọl Onyeozi dọrọ aka na ntị na amamiihe nke ụmụ mmadụ na-aghọta ihe nke ụmụ mmadụ mana na-enwe ihe ịra ahụ ịghọta ihe ndị nke Chineke.8 Ndị ụwa na-ekwu okwu banyere ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri niihe gbasara ego anyị, mana iwu nke ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri ahụ dị nsọ bụ n’ụzọ kachasị mkpa ihe gbasara okwukwe. Ị na-akwụwa aka ọtọ n’ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri anyị bụ otu ụzọ anyị na-esi egosị ịdị njikere anyị iji Onyenwe anyị bute ụzọ niime ndụ anyị, karịa ihe ndị na-esogbu anyị na ihe ndị na-amasị anyị. Ana m ekwe unu nkwa na dị ka unu na-atụkwasị obi niime Onyenwe anyị, na ngọzi niile nke eluigwe na-esote.
Jizọs sịrị ka enye “Ceza ihe ndị bụ nke Ceza; ma nye Chineke ihe ndị bụ nke Chineke.”9Onye Nzọpụta bilitere n’ọnwụ gwara ndị Nefi ka ha deba niime ndekọihe ha nkwa Ya niile a hụrụ na Malakaị.10 N’ụbọchị anyị, Onyenwe anyị mekwara ka amata ọzọ iwu nke ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri dị nsọ, na-ama ọkwa: “Nke a ga-abụ mmalite nke ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ndị m. Na [ha] ga-akwụ otu ụzọ n’uzọ iri nke uru ha niile kwa afọ; na nke a ga-abụ iwu ga-anọgide nye ha ruo mgbe ebighị ebi.”11
Onyenwe anyị nyere ntuziaka doro anya banyere otu esi emefu ego otu ụzọ n’ụzọ iri, na-asị, “Wetanụ otu ụzọ n’ụzọ iri niile n’ụlọ nkwakọba akụ,”12 nke pụtara wetabatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri niile niime alaeze Ya eweghachitere, Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a.13 O nyere ntuziaka na iji otu ụzọ n’ụzọ iri ndị a dị nsọ mee ihe ga-abụ ihe eji ekpere tulee site n’aka kansụl nke Otu Ndịisi Mbụ, Kworum nke Ndị Ozi Iri na Abụọ, Otu ndị bishọp Na-elekọta, “na site n’olu nke mụ onwe m nye ha, ka Onyenwe anyị kwuru.”14
Ego niile Dị nsọ nke Onyenwe anyị
Ego ndị a dị nsọ abụghị ihe ndị ndu nke Nzukọ nsọ nwe. Ha bụ nke Onyenwe anyị. Ndị odibo Ya maara nke ọma banyere ọdịdị dị nsọ nke ọrụ nlekọta ha.
Onyeisi Gordon B.Hincley kọgharịrị nhụmiihe nke oge ọ dị na nwata nke a: “Mgbe m bụ nwata nwoke a jụrụ m nna m otu ajụjụ … gbasara mmefu ego niile nke Nzukọ nsọ. O chetaara m na nke m bụ ọrụ ahụ Chineke nyere ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye m niile Mgbe m mere otu a, [nna m sịrị,] na nke ahụ m nyere abụzikwaghị nke m ọzọ. Ọ bụ nke Onyenwe anyị onye m doworo ya nsọ nye.” Nna ya gbakwunyere: “Ihe ndị ji ikike nke Nzukọ nsọ na-eji ya eme ekwesịghị ịgbasa [gị, Gordon]. Ha nwe inye Onyenwe anyị azịza, onye ga-achọ inye nkọwapụta site n’aka ha.”15
Anyị na-enweta mmetụta arụ dị omimi nke “ịdị na-enye Onyenwe anyị ọsịsa.”
Ịkwụ Otu ụzọ n’ụzọ iri na Onyinye Mmepụ aka Unu niile
Site na ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye ndị mmepụ aka unu doworo nsọ nye Onyenwe anyị, afọ gara aga ihe karịrị otu ijeri U.S. Dollar ka e jiri rụọ ọrụ ịgọzi ndị ahụ nọ na mkpa.16
N’oke na ọrụ dị mkpa anyị nwere iwega ozi ọma ahụ eweghachitere n’ofe ụwa, anyị nwere ndị mgbasa ozi ọma karịrị 71,000 n’eje ozi na mishọn dị 414.17 Niihi otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye unu niile, ndị mgbasa ozi ọma, na-agbanyeghị ọnọdụ ihe banyere njikwa ego nke ezi na ụlọ ha, na-enwe ike ije ozi.
A na-ewu ọtụtụ tempụl n’ofe ụwa n’ọnụọgụgụ ndị a na-ahụtụbeghị mbụ. N’oge ugbua, tempụl dị 177 na-arụ ọrụ, 59 ka a nọ na-ewu ewu ma ọ bụ na-arụzigharị n’oge ugbua, ma 79 ndị ọzọ ka a na-atụ atụmatụ ha ma na-ese ese.18 Otu ụzọ n’ụzọ iri unu na-ekwe ka ngọzi niile nke tempụl na-adị n’ebe ndị naanị Onyenwe anyị nwere ike ibu ụzọ hụta.
E nwekwara ndị ọgbakọ karịrị 30,000 ebiwara na puku kwuru puku chapụl na akụrụngwa ndị ọzọ dị na mba na ala ndị ọzọ dị 195.19 Niihi otu ụzọ n’ụzọ iri unu e jiri okwukwe kwụọ, Nzukọ nsọ ahụ ka a na-ehiwe n’ebe ndị dị anya unu nwere ike gaghị enwe ike gaa leta n’etiti Ndị nsọ nwere ezi omume nke unu na-agaghị enwe ike mata.
Nzukọ nsọ ahụ n’oge dị ugbua na-akwụ ụgwọ ụlọ mmụta dị elu ise.20 Ndị a na-enyere ihe karịrị ụmụ akwụkwọ dị 145,000 aka. Otu puku narị na iri klaas ka a na-akuziri ihe kwa izu ụka na seminarị na instutu anyị niile.21
Ngọzi niile ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ karịrị akarị na-abịa n’ụzọ dị ukwuu site na ndị ukwu na ndị nta site n’ọnọdụ mkpata ego ọbụla nke ndị na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri n’eziokwu.
Ike nke ime mmụọ nke iwu dị nsọ nke ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri abụghị ihe a na-atụ site n’ego ole a tụtara, niihi na ma ndị bara ụba ma ndị ogbenye ka e nyere iwu site n’aka Onyenwe anyị ịtụ ụtụ pesentị 10 nke ego ha kpatara.22 Ike ahụ na-abịa site na anyị ịtụkwasị obi anyị niime Onyenwe anyị.23
Ojuju nke Onyenwe anyị agbakwunyere a na-eburu site na mmepụ aka otu ụzọ n’ụzọ iri unu akwadowo ndokwa niile nke Nzukọ nsọ, na-eweta ohere niile iji mee ka ọrụ Onyenwe anyị gaaniihu gafee ihe ọbụla nke anyị ka nwetaworo nhụmiihe ya. Onyenwe anyị mazuru ihe niile, ma n’oge na-adịghị anya, anyị ga-ahụ ebumnobi Ya niile dị nsọ emejupụtara.24
Ọtụtụ Ngọzi Na-abịa n’Ụzọ dị Ọtụtụ
Ngọzi niile nke ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri na-abịa n’ụzọ dị ọtụtụ. Na 1998, e sooro m n’oge ahụ Okenye Henry B. Eyring gaa otu nnukwu ọgbakọ Nzukọ nsọ na mpaghara Utah a maara ugbua dị ka Silicon Slopes, otu obodo nwere nnukwu mmepụta na teknụzụ. Ọ bụụrụ oge nke akụ na ụba na-eto eto, ma Okenye Eyring dọrọ Ndị nsọ aka na ntị gbasara ịtụnyere ihe ha nwere na nke ndị ọzọ ma na-achọkwu ọzọ. Aga m na-echeta nkwa ya mgbe niile na dị ka ha na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri n’eziokwu, ọchịchọ ha maka inwekarị ihe nke ụwa ga-ebelata. Niime afọ abụọ, bọbụl teknụzụ tiwara. Ọtụtụ ka ọrụ ha kwụsịrị, ma kọmpịnị niile nwere nsogbu n’oge nke mkpachilata ihe banyere ego. Ndị nke sooro ndụmọdụ nke Okenye Eyring bụ ndị a gọziri agọzi.
Nkwa ya chetaara m maka nhụmiihe ọzọ. E zutere m Charlotte Hlimi gbara afọ 12 n’ebe dị nso na Carcassonne, France, na 1990 mgbe m na-eje ozi dị ka onyeisi mishọn. Ndị Hlimis ahụ bụụrụ ezi na ụlọ nwere okwukwe bi na obere ụlọ ha na ụmụ asatọ. Ha nwere foto nke Onye Nzọpụta na nke onye amụma ko na mgbidi. Na ajụjụ ọnụ maka ngọzi nke onye petrak ya, a jụrụ m Charlotte ma ọ kwụrụ otu ụzọ n’ụzọ iri n’eziokwu. Ọ zaghachiri, “Ee, Onyeisi Andersen. Nne m akuziworo m na e nwere ngọzi ndị nke anụ ahụ na ngọzi ndị nke ime mmụọ na-abịa site n’ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri anyị. Nne m akụziworo m na ọ bụrụ na anyị na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri anyị mgbe niile, o nweghị ihe ga-akọ anyị. Ma Onyeisi Andersen, o nweghị ihe kọrọ anyị.”
N’inye m ohere ịkọ akụkọ ya, Charlotte, ugbua gbara afọ 45 ma rachie na tempụl, kwuru nke a: Ama m banyere ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri bụụrụ ezigbo eziokwu n’oge ahụ, ma ọbụna ọ kacha sie ike ugbua. Obi juru m n’ekele nke ukwuu maka iwu nsọ nke a. Dị ka m na-ebi ndụ ya aga m na-aganiihu anata ngọzi n’uju.”25
Otu ụbọchị onye ọbụla niime anyị ga-ejecha njem anyị n’elu ụwa. Afọ iri na ise gara aga, naanị mkpụrụ ụbọchị ole tupu ọgọ m nwanyị, Martha Williams, a nwụọ site na kansa, ọ natara obere chek na mel ya. Ozugbo ọ jụrụ nwunye m, Kathy maka akwụkwọ o ji adọrọ ego iji kwụọ otu ụzọ n’ụzọ iri ya. Ebe nne ya na-esighị ike nke ukwuu nke mere na o nweghị ike ide ihe odide, Kathy rịọrọ ma ọ ga-enwe ike deere ya chek ahụ. Nne ya zaghachiri, “Mba, Kathy. A chọrọ m ime ya n’aka m.” “Ma o mesịrị jiri nwayọ gbakwunye sị, “A chọrọ m ikwesị ekwesị n’ihu Onyenwe anyị. Otu niime ihe ikpeazụ Kathy mere maka nne ya bụụrụ inye bishọp ya nvolop nke otu ụzọ n’ụzọ iri ya.
Ọrụ Dị Mkpa nke Chineke
Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazu a “apụtawo na nzizo,”26 na-eweta ngọzi ndị dị iriba ama n’ofe ụwa. A ga-enwe ndị na-aja anyị ịganiihu na ndị na-agaghị aja anyị. Echewo m echiche banyere okwu ndị nke Gamaliel maara ihe, onye nke, mgbe ọ nụrụ banyere ọrụ ebube niile nke Ndịozi Pita na Jọn, dọrọ ndị kansụl aka na ntị na Jerusalem:
Hapụnụ [ndịikom ndị a] aka: niihi na ọ bụrụ na … nke a sị n’aka ụmụ mmadụ, ọ ga-abụ ihe efu:
“Mana ọ bụrụ na o si n’aka Chineke, unu apụghị ịkwatu ya; n’ụjọ ma … aga ahụta unu ọbụna n’ịlụ ọgụ megide Chineke.”27
Mụ na gị bụ akụkụ ọrụ Chineke dị mkpa n’elu ụwa. Ọ gaghị abụ ihe efu mana ga-anọgide na-aganiihu n’ofe ụwa, na-akwado ụzọ maka nlọghachi nke Onye Nzọpụta. Ana m agba ama nokwu niile nke Onyeisi Russell M. Nelson: “N’ụbọchị ndị na-abịa abịa, anyị ga-ahụ ngosịpụta ndị kachasị ukwuu banyere ike nke Onye Nzọpụta nke ndị ụwa na-enwebeghị mgbe ha hụtụrụ ya mbụ. Site ugbua ruo oge Ọ ga-alọghachi… , Ọ ga-enyefe ndị nwere okwukwe ohere niile , ngọzi niile, na ọrụ ebube niile nke ọnụ ana apụghị ịgụta.”29
Nke a bụ aka ebe m. Jizọs bụ Kraịst ahụ. Nke a bụ ọrụ nsọ Ya. Ọ ga-abịa ọzọ. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.