Ọgbakọ Zuru ọha
Anyị bụ Ụmụ Ya.
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


9:42

Anyị bụ Ụmụ Ya.

Anyị nwere otu ụdị mbido sinachi ma otu ụdị akara aka n’enweghi ọgwụgwụ sitere na amara nke Jizọs Kraịst.

Ị na-echeta nhụmihe nke onye amụma Samuel nweburu mgbe Onyenwe anyị zigara ya n’ụlọ Jesse ka ọ tee eze ọhụrụ nke Izrel mmanụ? Samuel hụrụ Eliab, nwambụ nke Jesse. Eliab, ọ dịka, toro ogologo ma nwee ọdịdị nke onye ndu. Samuel hụrụ nke ahụ ma kpebie ozugbo. Nke ahụ mesịrị bụrụ mkpebi n’ezighi ezi, ma Onyenwe anyị kuziri Samuel ihe: “Elegidela iru ya anya, ma ọ bụ ogologo nke idi elu ya; … n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya n’ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele n’obi.”1

Ị na-echeta nhụmihe nke Ananayas onye n’eso ụzọ nweburu mgbe Onyenwe anyị zigara ya ka ọ gọzie Sọl? Akụkọ Sọl eruwo ya ntị ma Ananayas anụwo banyere Sọl na obi ọjọọ na mkpagbu akwụsịghị akwụsị ya n’ebe Ndị nsọ nọ. Ananayas nụrụ ma kpebie ozugbo na ikekwe ọ kwesịghị ije leta Sọl Nke ahụ mesịrị bụrụ mkpebi n’ezighi ezi, ma Onyenwe anyị kuziri Ananayas ihe, “Onye ahụ bụ ngwaọrụ arọpụtara nye m, ka ọ buru aha m che n’iru Mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel”2

Kedụ ihe bụ nsogbu nye Samuel na Ananayas nime ịma atụ abụọ ndị a? Ha jiri anya ha hụ ma jiri ntị ha nụ, ma dị ka ihe ndapụta, ha jiri ọdịdị na asịrị maa ndị ọzọ ikpe.

Mgbe ndị odee na onye Farisii hụrụ nwanyị ahụ ejidere n’ịkwa iko, kedụ ihe ha hụrụ?. Nwanyị agwa rere ure, onye mmehie tozuru oke ikpe ọnwụ. Mgbe Jizọs hụrụ ya, kedụ ihe Ọ hụrụ? Nwanyị onye dabara nwantịtị oge n’olulu adịghị ike nke anụ ahụ, mana onye enwere ike ịgbarakwa ọzọ site na nchegharị na aja mgbaghara mmehie Ya. Mgbe ndị mmadụ hụrụ onye senchrịọn ahụ, onye odibo ya nọ n’ọrịa mkpọnwụ ahụ, kedụ ihe ha hụrụ?. Ikekwe ha hụrụ onye a na-akpọghi oku, onye obodo ọzọ, onye ekwesịrị ịkpọ asị. Mgbe Jizọs hụrụ ya, kedụ ihe Ọ hụrụ? Otu nwoke nwere nchegbu maka ọdịmma nke ndị ụlọ ya, onye chọrọ ihu nke Onyenwe anyị jiri eziokwu na okwukwe. Mgbe ndị mmadụ hụrụ nwanyị oruru ọbara ahụ, kedụ ihe ha hụrụ?. Ikekwe nwanyị na-adịghị ọcha, onye achụpụrụ achụpụ ekwesịrị ize eze. Mgbe Jizọs hụrụ ya, kedụ ihe Ọ hụrụ? Otu nwanyị na-ejighi ahụ, onye nọ naanị ya ma onye achụpụrụ nihi ọnọdụ niile nke ọ n’enweghi ike ijikwa, onye nwere nchekwube na-aga agwọ ya ma o sonye kwa ọzọ.

Nime akụkọ nke ọbụla, Onyenwe anyị hụrụ ndị mmadụ dị ka onye ha bubụrụ ma mee ozi nleta nye onye ọbụla nime ha. Dị ka Nefi na nwanne ya nwoke Jekọb kwupụtara:

“Ọ na-akpọku ndị niile ịbịakwute Ya…, ndị ojii na ndị ọcha, ndị oru na ndị nwe onwe ha, nwoke na nwanyị; ma ọ na-echeta ndị na-ekweghị ekwe; ma ha nile dị otu ụdị n’anya Chineke.”3

“Na otu mmadụ dị mkpa n’anya ya ka nke ọzọ dị.”4

Otu aka ahụ, ka anyị ghara ịkwe ka anya anyị, ntị anyị, ma ọ bụ ụjọ anyị duhie anyị mana mepee anya na uche anyị ma jiri obiọcha jeere ndị nọ gburugburu anyị ozi dị ka O mere.

Afọ ole gara aga, nwunye m Isabelle, natara otu oke n’orụ ije ozi nlekọta dị iche. A gwara ya ka ọ jee zute otu agadị nwanyị isimkpe nime ngalaba ukwu anyị, nwanne nwanyị nwere ima aka niile nke ahụike ma onye ịnọ naanị ya ebuteworole ya obi ọjọọ na ndụ ya. Kọtịn ya ka o mechichara; ikuku adịghị nime ụlọ ya; ọchọghị nleta ma ọ mere ka o doo anya na “enweghi ihe m nwere ike imere onye ọbụla.” Na-egeghi ya ntị, Isabelle zaghachiri, “Eeh, e nwere! I nwere ike ịmere anyị otu ihe site n’ịhapụ anyị bịa leta gị.” Kosiladị, Isabelle gara, na nkwụdesi ike.

Ka oge gasịrị, nwanne nwanyị ọma nke a mere ọpereshọn n’ụkwụ ya, nke pụtara na aga na-agbanwe bandeji ya ụbọchị niile, ihe nke ọ na enweghi ike imere maka onwe ya. Rụọ ọtụtụ ụbọchị, Isabelle jere n’ụlọ ya, saa ụkwụ ya, ma gbanwee bandeeji ya. Ọ hụghị njọ ihu ya ma ọlị; ọ nụghị isi rere ere ma ọlị. Naanị ihe ọ hụrụ bụ nwa nwanyị mara mma nke Chineke ọnye chọrọ ịhụnaanya na nlekọta dị nro.

N’ime ọtụtụ afọ ndị ahụ, Mụ na ọtụtụ ndị ọzọ enwetawo ngọzị site n’onyinye nke Isabelle ị hụ dị ka Onyenwe anyị sị ahụ. Ma ị bụ onyeisi stek ma ọ bụ ọnye ekele nke ngalaba ukwu, ma ị bụ Eze nke England ma ị bi na ụlọ gbamgbam, ma ị na-asụ asụsụ ya ma ọ bụ nke ọzọ, ma ị na-edobe iwu niile ma ọ bụ ufọdụ ha na ama gị aka, ọ ga-enye gị nri ya nke kacha ibe ya n’elu efere ya nke kacha ibe ya. Ọnọdụ akụ na ụba, agba nke anụ arụ, omenala, obodo, ma ọ bụ ogo eziomume, ogo nke obodo, ma ọ bụ aha ejirimara ndị ọzọ enweghi isi n’ebe ọ nọ. Ọ na-ahụ jiri obi ya, na-ahụ nwa nke Chineke ahụ nime onye ọbụla.

Onyeisi Russell M. Nelson akụziwo na:

“Onye iro na-aṅụrị ọṅụ nihi aha ejirimara niile nihi na ha na-ekewa anyị ma na-egbochi ụzọ anyị si eche echiche banyere onwe anyị ma onye na ibe ya. Ọ dị mnwute mgbe anyị na-akwanyere aha ejirimara ugwu karịa otu anyị si akwanyere onwe anyị ugwu.

“Aha ejirimara nwere ike ibute ọmụma ikpe na ekworo. Mmetọ ọbụla ma ọ bụ ịkpa oke ọbụla na-ebe onye ọzọ nọ niihi mba o siri bịa, agbụrụ, ọzụzụ banyere mmasị ahụ nwoke na nke nwanyị, okike ọmụmụ, digrii ole agụtara n’akwụkwọ, omenaala, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ pụtara ihe eji ama mmadụ bụ arụ n’ebe Onye mere anyị nọ!”5

French abụghị onye m bụ; ọ bụ ebe amụrụ m. Onye ọcha abụghị onye m bụ; ọ bụ agba nke anụ arụ m, ma ọ bụ adịghị adị ya. Ọka mmụta abụghị onye m bụ; ọ bụ ọrụ m rụrụ iji kwado ezi na ụlọ m. Onye Ji Ikike Zuru ọha Iri Asaa abụghị onye m bụ; ọ bụ ebe m na-eje ozi n’alaeze n’oge nke a.

“Nke mbụ na nke kachasị” dị ka Onyeisi Nelson chetaara anyị, a abụ m “nwa nke Chineke.”6 Otu ahụ ka ị dịkwa, ma ọtụ ahụ ka ndị ọzọ niile nọ gburugburu anyị dịkwa. A na m ekpe ekpere na anyị ga-abịa nwete nnukwu obi ekele maka eziokwu nke a dị ịtụnaanya. Ọ na-agbanwo ihe niile!

Enwere ike azụlitewo anyị nime omenala dị iche iche; enwere ike anyị si nime ọnọdụ akụ na ụba na ogo dị iche iche; ihe nketa nke ndụ anụ arụ; gụnyekọta obodo anyị, agba nke anụ arụ, mmasị nri, ndọrọ ndọrọ anyị so nime ya, nwere ike dị nnukwu iche. Mana anyị bụ ụmụ Ya, anyị niile, na-agụpụghị onye ọbụla. Anyị nwere otu ụdị mbido sinachi ma otu ụdị akara aka n’enweghi ọgwụgwụ sitere na amara nke Jizọs Kraịst.

C. S. Lewis kwuru ya otu a: “Ọ bụ ihe eji akpọ ihe ibi niime etiti ndi nwere ohere ịbụ chi nke nwoke na chi nke nwanyị, ịcheta na onye ahụ kacha bụrụ onye iberibe onye n’enweghi ihe dị mmasị banyere ya nke ịnwere ike ịgwa okwu nwere ike otu ụbọchị bụrụ onye nke, ọ bụrụ na ịhụ ya ugbua, ọ ga-adọ gị akpịrị ife ya ofufe. … Enweghị ndị mmadụ bụ ndị nkịtị . Enwebeghi ma ọlị mgbe ị kwuuru mmadụ anụ arụ dị nkịtị okwu. Obodo niile, omenala niile, nka niile, ma mmepeanya—ndịa bụ anụ arụ, ma ndụ ha ịtụnyere nke anyị dịka nke anwụta. Mana ọ bụ mmadụ anwụghị anwụ ka anyị na ha na-akpakọrịta ọchị, rụkọọ ọrụ, lụkọọ, gbachi nkịtị ma rigbuo.”7

Ezi na ụlọ anyị enwetawo ohere ibi nime obodo na omenala dị iche iche; ụmụ anyị enwetawo ngọzị ịlụ ọlụlụ nime agbụrụ dị iche iche. A biawo m mata na ozi ọma nke Jizọs Kraịst bụ otu nnukwu ihe nhata. Dị ka anyị na-abakọ ya n’eziokwu, “Mmụọ Nsọ n’onwe ya soro mmụọ anyị na-agb͕a àmà, na anyị bụ ụmụ Chineke.”8 Eziokwu nke a dị ịtụnaanya na-atoghapụ anyị, ma aha ejirimara niile na nkewa nille nke nwere ike ịkpagbu anyị ma njikọ dị n’etiti anyị ka n’ụzọ dị mfe “elomiworo n’ime … Kraịst.”9 Ọ teghi aka ọ doo anya na anyị, dị ka ndị ọzọ, “abụghịzi ndị ọbịa na ndị mba ọzọ, kama soro ndị nsọ bụrụ ndị amụrụ n’ala, ma bụrụ kwa ndị ezinaụlọ Chineke”10

Na nso nso a nụrụ m onyeisi ngalaba nta nke otu nime ngalaba anyị nke ọtụtụ asụsụ ka ọ rụtụrụ aka na nke a, dị ka Okenye Gerrit W. Gong meworo, dị ka ọgbụgba ndụ nke isonye.11 Nke a bụ echiche mara mma! Anyị sonyere nime otu ndị mmadụ ndị na-agba mbọ idebe Onye Nzọpụta na ọgbụgba ndụ ha n’etiti ndụ ha niile ma ibi ndụ ozi ọma n’obi ụtọ. Nihi nke a, kama anyị ihụ onwe anyị site anya kpụrụ isi nke ndụ anụ ahụ, ozi ọma ahụ na-ebuli anya anyị ma kwee kanyị hụ onwe anyị site na anya n’enweghi ntupọ nke n’adịghị agbanwe agbanwe nke ọgbụgba ndụ dị nsọ. Site nịme otu ahụ, anyị amalite iwepụ ịkpa oke niile na ikpọ asị niile anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ, nke ga-enyere anyị aka belata ịkpa oke niile na ikpọ asị ha nwere n’ebe anyị nọ,12n’ụzọ okirikiri dị ịtụnaanya na nke were eziagwa. N’ezie, anyị na-esoro ịkpọ oku onye amụma ọma anyị; “Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, otu anyị si emeso ndị ọzọ omume dịkwa mkpa n’ezie! Otu anyị si agwa ndị ọzọ okwu na otu anyị sị ekwu ihe gbasara ndị ọzọ n’ebe obibi, na nzukọ nsọ, n’ebe ọrụ, na n’ikuku dịcha mkpa. Taa, ana m arịọ anyị ka anyị na ndị ọzọ na-akpakọta n’ụzọ kacha elu, kacha dị nsọ.”13

N’ehihie nke a, nihi mmụọ nke ịkpọ oku ahụ, ọ masịrị m ịgbakwụnye nkwa m nye nke ndị ụmụaka Praịmarị ọma anyị:

Ọ bụrụ na ị naghị eje ije dị ka otu ọtụtụ mmadụ si eje,

Ụfọdụ ndị mmadụ ga esi n’ebe ị nọ pụọ,

Mana A gaghịm! A gaghịm!

Ọ bụrụ na ị naghị ekwu okwu dị ka otu ọtụtụ mmadụ si ekwu,

Ụfọdụ ndị mmadụ ga akatọ ma chịa gị ọchị,

Mana A gaghịm! A gaghịm!

A ga m esoro gị jee ije. A ga m esoro gị kwuo okwu.

Otu ahụ ka m ga-esi egosi ịhụnaanya m nwere maka gị.

Jizọs esighi n’ebe mmadụ nọ pụọ.

Ọ tọgbọrọ ịhụnaanya ya maka onye ọbụla.

Ya mere A ga m eme! A ga m eme!14

A na m agba ama na Onye ahụ anyị na-akpọ dị ka Nna nke Eluigwe n’ezie bụ Nna anyị, na Ọ hụrụ anyị naanya, na Ọ mazuru ụmụ Ya n’otu n’otu, na Ọ nwere nlekọta dị omimi banyere onye ọbụla, ma na anyị n’ezie dị ka otu nye Ya. A na m agba ama na ụzọ anyị sị akpasị onwe anyị agwa bụ ihe ngosipụta nke nghọta anyị na obi ekele maka aja kacha ibe ya na Aja mgbaghara mmehie nke Ọkpara Ya, Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. A na m ekpe na, dị ka Ya, anyị nwere ike ịhụ ndị ọzọ naanya nihi ọ bụ ihe ziri ezi ịme, nabụghị nihi ha na-eme ihe ziri ezi ma ọ bụ na ha dị anyị mma nanya. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. 1 Samuel 16:7.

  2. Ọlụ 9:15.

  3. 2 Nifaị 26:33.

  4. Jekọb 2:21.

  5. Russell M. Nelson, “Nhọrọ niile maka Ebighị ebiworldwide devotional for young adults, May 15, 2022), Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  6. Russell M. Nelson, “Nhọrọ niile maka Ebighị.”

  7. C. S. Lewis, Ibụ nke Ebube na Okwu Ndị ọzọ (1949), 14–15.

  8. Ndị Roms 8:16.

  9. Alma 31:38.

  10. Ndi Efesọs 2:19.

  11. Lee Gary E. Stevenson, “Ọgbụgba ndụ Isonye,” Liahona,, Nov. 2019.

  12. Lee Dale G. Renlund na Ruth L. Renlund, Ọkwa Nchụaja Melkizedek Ahụ: Ịhọta Ozizi ahụ, Ibi ndụ Ụkpụrụ ahụ (2018), 11.

  13. Russell M. Nelson, “Ndị Ome udo Ka A Chọrọ,” Liahona, Me 2023, 99.

  14. A ga m esoro gị Jee ije,” Children’s Songbook, 140–41.