Ụmụnne nwoke na Ụmụnne nwanyị nime Kraịst
Ka anyị na-enwekwu mmekọrịta nke ime mmụọ dị n’etiti anyị ma jiri agwa dị iche iche na onyinye dị iche iche nke anyị niile nwere kpọrọ ihe.
Ezigbo ndị enyi m, anyị enweela nnọkọ niile ọgbakọ dị ịtụnanya taa. Anyị niile enwela mmetụta Mmụọ nke Onyenwe anyị na ịhụnaanya Ya site n’ozi dị ebube nke ndị ndu anyị kesara. Enwere m ihe ugwu ịgwa unu okwu n’uhuruchi a dị ka ọka okwu mmechi nke nnọkọ a. A na m ekpe ekpere ka Mmụọ nke Onyenwe anyị na-anọnyere anyị ka anyị na-ańụrị ọńụ dịka ezi ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị nime Kraịst.
Ezigbo onye amụma anyị, Russell M. Nelson, kwuru : “A na m akpọku ndị otu anyị ebe niile ibute ụzọ n’ịhapụ akparam agwa na omume niile ndị nke obi ọjọọ. A na m arịọ unu ka unu buli elu nsọpụrụ maka ụmụ Chineke niile.”1 Dịka Nzukọ nsọ zuru ụwa ọnụ ma na-eto eto, ịgbaso ọkpụkpọ oku a sitere n’aka onye amụma anyị bụ ihe dị oke mkpa maka iwulite ala-eze nke Onye Nzọpụta nime mba niile nke ụwa.
Ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-akụzi na anyị niile bụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom ndị mmụọ nne na nna nke eluigwe bụ ndị hụrụ anyị n’anya n’ezie2 ma na anyị biri dịka ezinaụlọ n’iru Chineke tutu a mụọ anyị n’elu ụwa a. Ozi ọma nakwa akuzi na anyi niile ka e kere n’oyiyi na ụdidi nke Chineke.3 Ya mere, anyị há otu n’ihu Ya,4n’ihi na O “sitere n’otu ọbara mee mba niile nke nwoke [na nwanyị].”5Ya mere, anyị niile nwere ọdịdị si na chi dị nsọ, ihe nketa, na ikike, n’ihi na e nwere “otu Chineke na Nna nke ihe niile, onye dị elu karịa ihe niile, na site n’ihe niile, na nime [anyị] niile.”6
Dịka ndị na-eso Kraịst, a na-akpọ anyị oku ị mụbaa okwukwe, na ịhụnaanya anyị maka, ụmụnne anyị nwoke na nwanyị nke ime mmụọ site n’ijikọta obi anyị ọnụ n’ịdị n’otu na ịhụnaanya, n’agbanyeghị ọdịiche anyị niile, si otu ahụ na-amụba ikike anyị ịkwalite nkwanye ugwu maka nsọpụrụ nke ụmụ ndịikom na ụmụ ndịinyom niile nke Chineke.7
Ọ bụ na nke ahụ abụghị kpọmkwem ọnọdụ ahụ ndị Nifaị nwetara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ abụọ ka Kraịst jesịrị ha ozi?
“Ma nʼezie enweghị ike inweta ndị nwere an̄ụrị karịa ndị ahụ nʼetiti ndị niile e keworo site nʼaka nke Chineke. …
“E nweghị ndị Leman, ma-ọbụ ụdị ndị-ọbụla; kama ha dị nʼotu, ụmụ nke Kraịst, na ndị-nketa nke ala-eze nke Chineke.
“Ma lee ka ịdị-ngọzi ha dị!”8
Onyeisi Nelson gara n’ihu kwusie ike mkpa ọ dị ịgbasa ugwu na nkwanye ugwu maka mmadụ ibe anyị mgbe o kwuru: “Onye okike anyị niile na-akpọku onye ọ bụla nime anyị ka ọ hapụ agwa nke ajọ mbunobi megide otu ọbụla nke ụmụ Chineke. Onye ọbụla nime anyị nwere ajọ mbunobi megide agbụrụ ọbụla kwesịrị ịchegharị! … O kwesịrị ka onye ọ bụla nime anyị mee ihe ọ bụla anyị nwere ike ime n’ọnọdụ mmetụtara anyị iji chekwaa ugwu na nkwanye ugwu nwa nwoke na ada nke Chineke ọ bụla kwesịrị.”9 N’ezie, ugwu mmadụ na-ebute nkwanye ugwu maka ịdị iche iche anyị niile.10
Na ịtụle njikọ dị nsọ nke na-eme ka anyị na Chineke dị n’otu dị ka ụmụ Ya, ntụziaka amụma a nke Onyeisi Nelson nyere bụ ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ nzọụkwụ dị mkpa na-iwulite akwa mmiri niile nke nghọta kama imepụta mgbidi niile nke ajọ mbunobi na nkewa n’etiti anyị11 Otu osila dị, dị ka Pọl dọrọ ndị Efesọs aka na ntị, anyị aghaghị ịghọta na iji mezuo nzube a, ọ ga-achọ ka anyị mee mgbalị n’otu n’otu na n’igwe iji ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi mee ihe n’ebe ibe anyị nọ.12
Enwere akụkọ banyere otu onye rabaị Juu onye ya na ndị enyị abụọ nọ na-ekpori ndụ nọwụwa anyanwụ. Ọ jụrụ ha, “Olee otu unu si ama mgbe abali gachara ma ụbọchị ọhụrụ ebidola?”
Otu nime ha zara, “Mgbe ị nwere ike ileba anya n’ebe ọwụwa anyanwụ ma nwee ike ịmata atụrụ site na ewu.”
Nke ọzọ zara, “Mgbe ị nwere ike ilepụ anya ebe igwe na ala metụrụ ma mata ọdịiche dị na osisi olive na osisi fig.”
Mgbe ahụ ha tụgharịrị nye onye rabbị maara ihe ma jụọ ya otu ajụjụ ahụ. Ka ọ tụgharịchara uche, ọ zara, “Mgbe ị nwere ike ileba anya na ọwụwa anyanwụ ma hụ ihu nwanyị ma ọbụ ihu nwoke ma nwere ike kwuo, Ọ bụ nwanne m nwanyị; ọ bụ nwanne m nwoke.’”13
Ezigbo ndị enyi m, A na m emesi unu obi ike na ihé nke ụbọchị ọhụrụ na enwuwanye na ndụ anyị mgbe anyị na-ahụ ma na-emeso ndị mmadụ ibe anyị omume nkwanye ugwu na dị ka ezi ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị nime Kraịst.
N’oge ije ozi Ya n’ụwa, Jizọs na gosipụtara nnọ ọfụma ụkpụrụ a dịka Ọ “gara n’ihu na-eme ihe ọma”14 nye mmadụ niile, na-akpọ ha oku ịbịakwute Ya ma kere oke nke ịdị mma Ya, na-agbenyeghị ebe ha si malite, ọkwa mmadụ, ma ọbụ àgwà omenala ha. O jere ozi, gwọọ ọrịa, ma na-akpachara anya mgbe niile maka mkpa niile onye ọbụla, karịsịa ndị a na-ewere na oge ahụ na ha dị iche, ndị a na-eleda anya, ma ọbụ ndị a na-agụpụ. Ọ dịghị onye ọ gọnahụrụ kama meso ha ihe n’ezi omume na ịhụnaanya, n’ihi na Ọ hụrụ ha ka ụmụnne Ya ndị nwoke na ụmụnne ndị nwanyị, ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị nke otu Nna.15
Otu nime emume niile kacha pụta ihé mgbe nke a mere bụ mgbe Onye Nzọpụta gara Galili, kpachara anya soro ụzọ ahụ gafere na Sameria.16 Jizọs mgbe ahụ wee kpebie ịnọdụ ala n’akụkụ olulu mmiri Jekọb ka o zuru ike. Ka Ọ nọ n’ebe ahụ, otu nwanyị Sameria bịarutere ka o were mmiri gbajuo ite ya. Na ịma ihe niile Ya, Jizọs gwara ya okwu, sị, “Nye m ka m ńụa.”17
Ụjọ tụrụ nwanyị a na onye Juu rịọrọ nwanyị Sameria maka enyemaka ma gosi iju-anya ya, na-asị, “Gịnị mere gị onwe gị, ebe ị bụ onye Juu, na-arịọ mmiri na aka m, bụ nwanyị Sameria? maka na ndị Juu na ndị Sameria adịghị emekọ ihe.”18
Kama Jizọs, na ileghara ọdịnala niile nke ịkpọasị dị n’etiti ndị Sameria na ndị Juu anya kemgbe, jiri ịhụnanya jeere nwanyị a ozi, ma nyere ya aka ịghọta onye Ọ bụ nezie—nke a bụ Mezaya ahụ, onye ga-ekwu ihe niile na onye ọbịbịa ya ọ nọ na-eche.19 Mmetụta nke ozi ahụ dị nrọ mere ka nwanyị ahụ gbaba nime obodo ahụ gwa ndị mmadụ ihe merenu, na-asị, “Onye a ọ bụghị Kraịst ahụ?”20
E nwere m ọmịko miri emi maka ndị a emejọrọ, eledara anya, ma ọbụ a kpagburu site n’aka ndị anaghị eche echiche, n’ihi na, n’oge ndụ m, A hụla m n’onwe m ihe mgbu ndị ezi omume na-enwe site n’ikpe a na-ekpe ha ma ọbụ ịchụpụ ha n’ihi na ha kwuru okwu, yie, ma ọbụ biri ndụ dị iche. A na m enwe ezigbo mwute nime obi m maka ndị uche ha gbara ọchịchịrị, ndị ịhụ ụzọ ha nwere oke, na ndị obi ha na-esi ike site n’okwukwe na ịdị ala nke ndị ọzọ pụrụ iche. Otu ha si ele ndị ọzọ anya na-egbochi ha ịhụ ndị ha bụ dị ka ụmụ nke Chineke.
Dịka ndị amụma buru n’amụma, anyị na-ebi n’ụbọchị ndị dị ize ndụ na-eduga na Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta.21 Nkewa siri ike dị na ụwa, nke na-abanye nihi ịdịiche sitere na agbụrụ, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na mmekọrịta akụ na ụba. Nkewa niile dị otu ahụ mgbe ụfọdụ na-emetụta ụzọ nke echiche na omume ndị mmadụ na ihe gbasara ndị mmadụ ibe ha. Maka nke a, ọ gaghị abụ ihe ọhụrụ ịhụ ka ndị mmadụ na-akọwa ụzọ nke echiche, omume, na ikwu okwu banyere omenala ndị ọzọ, agbụrụ niile, na asụsụ ndị ọzọ dị ka ndị dị ala, iji echiche ndị e bu ụzọ chepụta, nabụchaghị eziokwu na mgbe ọbụla njakịrị, na-ebute agwa nleli, enweghị mmasị, enweghị nkwanye ugwu, na ọbụna ajọ mbunobi megide ha. Agwa niile dị otu a sitere na nganga, mpako, anyaụfụ, na ekworo, agwa niile ejiri mara anụ ahụ,22 nke na-emegidekwa agwa niile ndị yiri Kraịst. Omume nke a ezighị ezi maka ndị na-agbalịsi ike ịbụ ezi ndị na-eso Ya.23 N’eziokwu, ezi ụmụnne m nwoke na nwanyị, enweghị ọnọdụ maka echiche ma ọbụ omume niile nke ajọ ebumnobi nime obodo nke Ndị-nsọ.
Dịka ụmụ nwoke na ụmụ ada nke ọgbụgba ndụ ahụ, anyị nwere ike inye aka wepụ ụdị agwa nke a site na ile anya na ọdịiche niile pụtara ihé ihe dị n’etiti anyị jiri anya niile nke Onye Nzọpụta24 ma dabere na ihe anyị nwekọtara—amamihe dị nsọ na ọbụbụeze anyị. Ọzọkwa, anyị pụrụ ịgbalịsi ike ịhụ na anyị na-egosipụta onwe anyị na nrọ, olile anya, iru uju, na ihe mgbu niile nke onye agbata obi anyị. Anyị niile bụ ndị njem ibe anyị dịka ụmụ Chineke, hara otu na ọnọdụ ezughị oke anyị na n’ikike anyị ito eto. A na-akpọ anyị ka anyị na-ejekọ ọnụ, n’udo, jiri obi anyị jupụtara n’ịhụnanya n’ebe Chineke na mmadụ niile nọ.—ma ọbụ, dịka Abraham Lincoln kwuru, “enweghị obi ajọ omume nye onye ọbụla ma afọ ọma dịrị mmadụ niile.”25
Ọ dịtụla mgbe ị tụgharịrị uche ka esi egosipụta ụkpụrụ nke ịkwanye ugwu na ịha nhata maka mmadụ site n’ụzọ dị mfe anyị si eji ejiji nime ụlọ nke Onyenwe anyị? Anyị niile na-abịa na tempụl n’ịdị n’otu na otu ebumnuche ma jupụta n’ọchịchọ ịdị ọcha na ịdị nsọ n’ihu Ya dị nsọ. Yiri uwe ọcha, anyị niile bụ ndị Onyenwe anyị n’onwe Ya nabatara dịka ụmụ Ya ọ hụrụ n’anya, ndị ikom na ndị inyom nke Chineke, ụmụ nke Kraịst.26 Anyị nwere ohere ime otu emume nsọ niile ahụ, mee otu ọgbụgba ndụ niile ahụ, kwenye ibi ndụ dị elu na ndụ dị nsọ, ma nata otu nkwa niile ebighị ebi. Ịdị notu na nzube, anyị na-eji anya ọhụrụ ahụ ibe anyị, ma n’ịdị n’otu anyị, anyị na-eme mmemme ịdị iche iche anyị dịka ụmụ nke Chineke.
E nyere m aka n’oge adibeghị anya iduzi ndị isi na ndị ọrụ gọọmentị site n’imeghe ụlọ maka Tempụl Brasilia Brazil. Mụ na osote onyeisi ala Brazil kwụsịrị n’ebe a na-agbanwe uwe, ma anyị kwurịtakwara banyere uwe ọcha nke onye ọbụla na-eyi nime tempụl ahụ. A kọwara m ya na iyi uwe ọcha a na-eme n’ụwa niile na-egosi na anyị niile bụ otu ihe n’ihu Chineke ma na, nime tempụl, njirimara anyị abụghị osote onyeisi ala nke obodo ma ọbụ onye ndu ụka kama amatara anyị ebighị ebi dịka ụmụ nwoke nke Nna nke Eluigwe.
Osimiri Iguaçú na-esi n’ebe ndịda Brazil na-asọba na ala dị larịị nke na-eme ka usoro mmiri nke a maara n’ụwa niile dịka Iguaçú Falls—otu nime ihe ndị kachaa maa mma ma dị egwu nke ihe Chineke kere n’ụwa, e weere dịka otu nime ihe ebube asaa nke ụwa. Otu nnukwu mmiri na-asọba nime otu osimiri ma kewaa, bụrụzie narị kwuru narị mmịrị si n’elu awụdata n’ala nke na-enweghi atụ. Nikwu okwu nụzọ ihe atụ, usoro mmiri mmiri a dị egwu bụ ngosipụta nke ezinaụlọ Chineke n’elu ụwa, n’ihi na anyị na-eketa otu mmalite na ihe ime mmụọ, nke sitere n’ihe nketa na ọbụbụeze anyị dị nsọ. Ka o sila dị, onye ọbụla nime anyị na-asọba n’omenala, agbụrụ, na mba dị iche iche, nwee echiche, nhụmihe, na mmetụta niile dị iche iche. Nagbanyeghị nke a, anyị na-aga n’ihu, dịka ụmụ Chineke na ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị nime Kraịst, n’atufughị njikọ anyị dị nsọ, nke na-eme ka anyị bụrụ ndị pụrụ iche na obodo a hụrụ n’anya.27
Ezi ndị nwanne m nwoke na nwanyị, ka anyị mee ka obi na uche anyị niile kwekọọ n’ịmata na ịgba-ama na anyị niile ha nhata n’ihu Chineke, na e nyere anyị niile n’ụzọ zuru ezu otu ikike na ihe nketa ahụ nke ebighị ebi. Ka anyị na-enwekwu mmekọrịta nke ime mmụọ dị n’etiti anyị ma jiri agwa dị iche iche na onyinye dị iche iche nke anyị niile nwere kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na anyị emee otu ahụ, A na m ekwe unu nkwa na anyị ga-asọpụta n’ụzọ nke anyị, dị ka mmiri nke Iguaçú Falls, na-ewepụghị njikọ anyị dị nsọ nke na-egosi anyị dịka ndị pụrụ iche, “ụmụ nke Kraịst, na ndị nketa nke ala-eze nke Chineke.”28
A na m agba-ama na ka anyị na-aga n’ihu na-asọpụta n’ụzọ dị otu a nime ndụ anụ arụ anyị, ụbọchị ọhụrụ ga-amalite site n’ihé ọhụrụ nke ga-eme ka ndụ anyị nwuo enwu ma mee ka ohere niile magburu onwe ya iji baa uru karịa, ma bụrụ ndị a gọziri nke ọma site, n’ụdị dị iche iche nke Chineke kere n’etiti ụmụ Ya.29 Anyị ga-abụrịrị ngwa-ọrụ n’aka Ya iji kwalite nkwanye ugwu na ugwu n’etiti ụmụ Ya ndị nwoke na ndị nwanyị. Chineke dị ndụ. Jizọs bụ Onye Nzọpụta nke ụwa. Onyeisi Nelson bụ onye amụma nke Chineke n’ụbọchị anyị. Ana m agba aka ebe nye eziokwu ndị a n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.