Ọgbakọ Zuru ọha
Mkpali niile nke Mmụọ
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


14:10

Mkpali niile nke Mmụọ

Nnọnyere nke Mmụọ Nsọ nke n’adịgide bụ otu nime onyinye niile nke ime mmụọ kachasị nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a na-erite.

Ndubata

Na nso nso a, anya egwuruegwu niile nke ụwa lekwasịrị anya na asọmpi nke Iko Mba ụwa FIFA nke Ụmụnwanyị afọ 2023 emere na Australia na New Zealand. Ndị n’eme egwuruegwu ogo-ụwa ahọpụtara site n’ihe karịrị otu 200 nke obodo sitere gburugburu ụwa gosipụtara ike agwa ha, nrara onwe ha, talent ha, na ime egwuruegwu ha dị ka ha sọrọ mpi maka ugwu ndị nwanyị nke ụwa kachasị elu.

Ọ na-atụ anyị naanya ihe ndị n’eme egwuruegwu n’emepụta n’ebe ngalaba dị iche iche ndị na-erite ogo kachasị elu maka nkà nke ha. Anyị na-ekwu maka talent ma ọ bụ onyinye ha nke Chineke nyere ha. Nke a gụnyere ndị agọziri na ịgba egwu, ime jimnazum, egwu, nkà, ejije, mgbakọ na mwepụ, sayensị, ma ọtụtụ. Onye ọbụla na-egosipụta onyinye Chineke nyere nke a na-azulite ma mụta nke ọma site na nrụsị ọrụ ike, mmụta na mmegharị ruo ogologo ndụ nke mmadụ. Onyinye Chineke nyere na-emepụta ndị nwere nkà

Itinye Onyinye niile nke Ime mmụọ N’ọrụ

Ile anya site n’anya nke ozi ọma, Chineke na-agọzi ụmụ Ya jiri ọtụtụ onyinye niile nke ime mmụọ, wee mee ha bụrụ ndị nwere nkà nke ime mmụọ. Ndị otu Nzukọ nsọ na-edebe ọgbụgba ndụ ha ka a na-enye onyinye niile nke Mmụọ, nke gụnyere onyinye nke ọgbụgba ama Jizọs Kraịst dị ka Onye Nzọpụta anyị, onyinye nke Mmụọ Nsọ, na onyinye okwukwe iji gwọọ ọrịa ma nata ọgwụgwọ ọrịa, onyinye nke nghọta, onyinye nke ụnata ọrụ ebube, ma onyinye nke amamiihe na ọmụma ihe. Onyenwe anyị na-akpoku anyị ijiri obi anyị chọọ onyinye niile kachasị mma, ọbụnadị onyinye niile nke ime mmụọ. Ọ na-enye onyinye niile nke ime mmụọ iji gọzie anyị ma iji gozie ndị ọzọ.2

Kanyị laghachi na nkọwa nke ndị n’eme egwuruegwu nwere nkà, ọ dị mkpa ịcheta na otu onyinye n’onwe ya anaghị eme mmadụ abụrụ nnaukwu. Nagbanyeghi talent ọbụla pụrụ ezigbote iche, ọ bụ site nrụsi ọrụ ike na ịgba mbọ ka ndị n’eme egwurugwu ji emezi ma na-azulite akaọrụ ha iji rute n’ogo kachasị elu nke nkà ha. Ọbụnadị onyinye ndị ahụ a natara ma atọghee ya na-abịakarị mgbe ụfọdụ jiri ederede nke a “ụfọdụ akụkụ ka enwere ike itikọta ọnụ.”

N’otu aka ahụ, a mụtawom otu ihe nke metụtara onyinye niile nke ime mmụọ. Itinye onyinye niile nke ime mmụọ n’ọrụ ga-achọ mmega ahụ nke ime mmụọ. “Ịnwe odudu nke Mmụọ Nsọ nime ndụ gị ga-achọọ ọrụ ime mmụọ. Ọrụ nke a gụnyere ekpere eji obi kpee ma ọmụmụ akwụkwọ nsọ n’adịgide. Ọ gụnyekwara idebe ọgbụgba ndụ na iwu nsọ niile nke Chineke. … Ọ gụnyere itozu oke ịnata oriri nsọ kwa izu.”3

Gịnị bụ mkpụrụ osisi nke itinye onyinye niile nke ime mmụọ n’ọrụ? Ha gụnyere mkpali niile nke Mmụọ ahụ na-enyere anyị aka zute mkpa anyị ụbọchị niil ma gosi anyị ihe a ga-eme ma kwuo ma ngọzi niile nke udo na nke nkasịobi. Dị ka anyị na-ege ntị ma na-etinye mkpate ime mmụọ n’ọrụ, Mmụọ Nsọ ahụ ga-abawanye ike na ikike anyị iji mee ihe anyị na agaghị emenwu n’onwe anyị. Onyinye niile nke ime mmụọ ndịa dị oke ọnụ ga-enyere anyị aka nime akụkụ ọbụla nke ndụ anyị.4

Nnọnyere nke Mmụọ Nsọ nke n’adịgide bụ otu nime onyinye niile nke ime mmụọ kachasị nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a na-erite.

Kedụ ụdị mkpa onyinye nke a dị? Onyeisi Russell M. Nelson azawọ ajụjụ nke a kpọmkwem mgbe kwuru “n’ụbọchị ndị n’abịa abịa, ọ gaghị ekwe omume ịnya ndụ ime mmụọ na-enweghi nduzi, ntụziaka, nkasị obi na mmetụta nke Mmụọ Nsọ na-adịgide.”5

Kedụ otu is Akpọku ma Mata Mkpali niile nke Mmụọ Nsọ.

Nime njem ije ozi m, a hụtawo m otu ọchịchọ zuru ụwa dị nime onye ọbụla ị mata otu esi akpọku ma mata mkpali niile nke Mmụọ Nsọ. Mkpali niile nke Mmụọ dị ezigbo nkeonwe ma na-abịa ụzọ dị iche iche. Nagbanyeghi nke a, agọziri anyị ịnwete okwuọnụ niile nke ndị amụma, ma nke mgbe ochie ma nke ọhụrụ, ka ha na-enye anyị nghọta dị oke ọnụ banyere otu asi anata odudu sitere na Mmụọ.

Ka m nye ukpuru odudu anọ nke nwere ike ịbụrụ unu enyemaka maka ikpọku na ịmata mkpali niile nke Mmụọ.

Guzo N’ebe niile Dị nsọ

Nke mbụ bụ iguzoro n’ebe niile dị nsọ.6 Otebeghi aka m sonyere nime mmepe ụlọ nke Tempụl Tokyo Japan. Nzaghachị anyị natara n’aka ndị nta akụkọ ma ndị ọbịa dị oke elu gafere atụmanya anyị niile. Narị kwụrụ narị sonyere nime mkpagharị ime tempụl ahụ. Ndị ọbịa ka ịma mma nke tempụl metụrụ nime ime obi, gụnyere usoro na nka nille nke nwere njiko ya na omenala nke ndị Japan. Nke kacha mma ịrụtụ aka bụ nsọpụrụ na nkwanye ugwu si nime ndị ọbịa pụta mgbe akọwara emume nsọ nna nna nime imeụlọ a ga-eme ha. Mana nke kacha metụta n’obi bụ mkpali niile nke Mmụọ ahụ.

Otu ụdị oge ahụ metụrụ otu onye ọrụ gọmentị ama ama ka akanyere nime uche m. Mgbe emesịrị otu ịgbachi nkịtị na-atụgharị uche nime imeụlọ selestial, nihi mmetụta uche dị omimi, ọ takara m na ntị, “Ọbụnadị ikuku m na-eku nimeụlọ ebe dị iche.” A matara m na ọ na-anwa ịkọwaram ọnụnọ nke Mmụọ Nsọ, nke, n’ezie, bi n’ebe niile dị nsọ. Ọ bụrụ na ịnwere olileanya ịnwe mmetụta nke Mmụọ, nọrọ n’ebe ga-adịrị Mmụọ mfe ibi.

Tempụl na ebe obibi anyị niile bụ ebe ndị kachasị dị nsọ edoro nsọ ahụ. Nime ha ọ na aka adịrị anyị mfe ikpọku ma mata Mmụọ ahụ. Ebe ndị dị nsọ ọzọ gụnyere ụlọọgbakọ niile anyị, ụlọ nke semịnarị na institutu, ma ebe agụgụala Nzukọ nsọ niile na ogbe niile nke ọbịa. Guzo N’ebe niile Dị nsọ.

Guzo gị na Ndị Dị nsọ

Nke abụọ, Guzo gị na Ndị dị nsọ. A ga m ejiri ihe mbunisi iji kọwa ukpuru odudu nke abụọ.

A gaghịm ma ọlị echefu isonye nime ofufe nro emere n’ebe otu ogbe egwuruegwu ama ama. Ogbe nke a na-ejukarị na ndị nkwado n’eme oke mkpọtụ ndị na-etiri ndị egwuruegwu mba ha mkpụ ma ikekwe na na-akwa ndị iro ha emo. Mana n’abalị nke a, ebe a dị ezigbote iche. Ogbe nke a jupụtara na puku kwuru puku ndị ntorobịa gbakọrọ ị kwanye ugwu nye ma cheta ndụ nke Onye amụma Josef Smit. Nsọpụrụ ha, olu ha dị jụụ; obi ekele; ma obi jupụtara n’ekpere jupụtara n’ogbe ahụ ya na ọnụnọ nke Mmụọ Nsọ ahụ. E ji m anya m na-ahụ ya nihu ha. Ọ bụ onyinye nke Mmụọ Nsọ nọ n’ọrụ, nke na-agba akaebe ma ịgba ama niile nke agbara maka Josef Smit na Mweghachite ozi ọma ahụ.

A pụghị igbochi Mmụọ ahụ site na ị ga ọgbakọ nke ndị nsọ. Ọ bụrụ na ịnwere olileanya ịnwe mmetụta nke Mmụọ, nọrọ gị na ndị ọ ga-adịrị Mmụọ mfe inọnyere. Onye Nzọpụta kwuru ya otu a, “Mgbe abụọ m’ọbụ atọ gbakọrọ n’aha m lee, ebe ahụ ka Mụ ga-anọ n’etiti ha.”7 Maka ndị ntorobịa, tulee maka ọgbakọ niile nke ndị dị nsọ, kworum na klasị niile, FSY na semịnarị, emume egwuruegwu nke ngalaba ukwu na nke stek—ma ọbụna otu abụ nke ngalaba ukwu. Họrọ ị nọnyere gị na ndị mmadụ ma gaa ebe niile a ga-achọta eziomume. Chọta ume nime ọnụọgụgụ. Chọta ezigbo ndi enyi. Bụrụ ezigbo ndi enyi. Kwadokọrịta onwe unu nebe ọbụla unu nọ. Guzo gị na Ndị Dị nsọ.

Gbaa ama maka Eziokwu niile Dị nsọ

Nke atọ, gbaa ama maka eziokwu niile dị nsọ mgbe na mgbe inwere ike. Onye Nkasị obi mgbe niile na-ekesara anyị olu Ya mgbe anyị jiri olu anyị gbaa ama. Mmụọ ahụ na-agba akaebe nye onye okwu okwu ma onye na-ege ntị n’otu aka.

A na m echeta otu mgbe m nọ nime taxi ruo Obodo ukwu New York njrm ruru nkeji 45. Ebe m nweworo mkparịta ozi ọma dị juu mụ na ọkwọ ụgbọala n’oge niile ahụ m na-eje ọdụ ụgbọelu. A kwụrụ m nwanyị a ụgwọ ya ma kwadowe ịpụ site na taxi ahụ. Ozugbo ahụ, a matara na agbabeghi m ama maka ihe nke m kwuworo. Akwụsịtụrụ m, ma kesaa otu ọgbụgba ama dị nkenke, wee kpokuo Mmụọ ahụ ma mee ka anyị abụọ bepụta anya mmiri.

Dị ka ị na-achọ ma na-ewere ohere niile iji kesaa ndị ọzọ ịgba ama anyị, ị ga-arọpụta oge niile eji amata Mmụọ ahụ maka onwe gị.

Gee ntị nye Mmụọ Nsọ ahụ

Ukpuru nke ikpeazu bụ ị gee ntị nye Mmụọ Nsọ ahụ. O nwere ike bụrụ onye nnọnyere na-adịgide mana Ọ na-ekwu okwu n’olu dị jụụ. Onye amụma Elijah chọtara na olu nke Onyenwe anyị anọghị na ikuku ahụ, ala ọmajijiji, ma ọ bụ n’ọkụ ahụ kama ọ bụ “olu nke dị ezi nwayọ dị nta.”8 Ọ bụghị “olu nke egbe eluigwe,” kama “olu dị nwayọọ nke ịdị nwayọọ zuru okè nke dị nnọ ka ọ bụburu ntaka,” ma n’otu aka ọ nwere ike i “dụpuru ọbụna ruo nʼime mkpụrụ-obi”9

Onyeisi Boyd K. Packer kwuru: “Mmụọ ahụ anaghị adọta uche anyị site na-iti mkpu ma iji aka siri ike na-akwagharị anyị. Kama ọ n’eme ntaka. Ọ na-emetụ anyị aka n’ụzọ dị nwayọ nke ọ bụrụ na uche anyị anọghị ya, anyị nwere ike ghara ịnwe mmetụta ya.”10 A hụtawom na mgbe ụfọdụ olu Ya na-adị oke jụụ, ma ọ bụ na uche m anọghị ya, nke mere na otu onye m hụrụ nanya na-anụtara m ya maka m. Ọtụtụ bụ oge ahụ mgbe mkpali niile nke Mmụọ Nsọ abịakwutewo m site n’aka nwunye m, Lesa. Ndị nne na nna na ndị ndu ezi omume nwekwara ike nata odudu mmụọ kpatere maka gị.

Mkpọtụ, mkpu na esemokwu juru n’ụwa nwere ike merie mmetụta niile nke Mmụọ Nsọ nke dị nwayọọ na jụụ. Chọta ebe dị jụụ, otu ebe dị nsọ ebe ịnwere ike ịchọta odudu sitere na Mmụọ ahụ.

Okwu niile nke Ị dọ aka na ntị

Dị ka ị na-atule ukpuru ndịa iji kpọkuo ma mata Mmụọ ahụ, chee maka okwu odudu ndịa.11

Mata eziokwu nke Mmetụta nke ime mmụọ gị. Nịmatụ, mmetụta niile sitere na Mmụọ ga-adaba na n’akwụkwọ nsọ na nkuzi niile nke ndị amụma dị ndụ.

Mee ka o doo gị anya na mmetụta niile ị na anata dabara nọ ọrụ ekenyere gị. Ma akpọghị gị site n’ikike ziri ezi, enyeghi gị mmetụta niile sitere na Mmụọ iji dụọ ọdu ma ọ bụ gbazie ndị ọzọ olu.

Ihe niile nke ime mmụọ abụghị nke a na-amanye amanye. Ị nwere ike izulite otu agwa ma ọnọdụ nke na-akpọku Mmụọ, ma ị nwere ike ị kwado onwe gị, mana ị nweghi ike ịtụ otu ma ọ bụ mgbe mmetụta ga-abịa. Nwee ndịdị na ntụkwasiobi na ị ga-anata ihe ị chọrọ mgbe oge ya ziri ezi.

Were echiche gị kacha mma mee ihe. Mgbe ụfọdụ anyị chọrọ ka eduo anyị site na Mmụọ n’ihe niile. Kosiladị, mgbe ụfọdụ Onyenwe anyị chọrọ kanyị jiri amamihe Chineke nyere anyị ma mee ihe n’ụzọ nke dabara adaba na nghọta anyị nke kachasị. Onyeisi Dallin H. Oaks kuziri na:

“Ị nwe ọchịchọ odudu nke Onyenwe anyị bụ ume, mana ọ chọrọ ka ihe ga-esonye ya bụrụ nghọta ahụ na Nna anyị nke Eluigwe hapụrụ anyị ọtụtụ mkpebi obi maka nhọrọ nke onwe anyị. … Ndị na-achọ ịtọgbọrọ Onyenwe anyị mkpebi niile ma rịọ maka mkpughe maka nhọrọ ọbụla ga-amata n’oge n’adịghị anya ọnọdụ niile nke ha ga-ekpe ekpere maka odudu ma agaghị anata ya. …

“Anyị kwesịrị ị mụ ihe niile ndịa niime obi anyị. … Ma emesịa anyị kwesịrị ịkpe ekpere maka odudu ma mee ihe asị mee. … Ọ bụrụ nanyị anataghị odudu, anyị kwesịrị ime ihe were echiche anyị kacha mma mee ya.”

Nkwucha okwu jiri Ikpọ oku

Na nkwucha okwu, Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ kwesịrị ịbụ ndị na-edebe ọgbụgbandụ nwere nka. Agbanyeghi nke a, ọ nọrọ onye ọbụla nime anyị n’aka ịhụ nanyị na-etinye onyinye niile nke ime mmụọ anyị n’ọrụ, ma emesịa kpọkuo ma mụta otu esi amata mkpali nile nke Mmụọ. Ukpuru odudu anọ nke ga-enyere anyị aka nime mgbalị niile nke ime mmụọ a bụ:

  1. Guzo N’ebe niile Dị nsọ.

  2. Guzo gị na Ndị Dị nsọ.

  3. Gbaa ama maka Eziokwu niile Dị nsọ.

  4. Gee ntị nye Mmụọ Nsọ ahụ.

Ikike ịnwere iji kpọkuo ma mata mkpali niile nke Mmụọ ga-ewulite otu nzọụkwụ n’otu oge. “Ịchebe ntị ịnụrụ asụsụ nke Mmụọ ahụ dị nnọọ ka ịmụta asụsụ ọzọ. Ọ bụ usoro eji wayọọ eme nke na-achọ itinye uche, ịgba mbọ nwere ndidi.”13

Ilaghachi azụ ebe anyị bidoro, biko cheta na dị ka Onye nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, ị bụ onye nwere nka. Tulee n’uche gị, ọgbakọ Sọnde Obubu ọnụ nke akọwara nye m. Otu nwata nwanyị, guzoro n’elu oche, ma a naghị ahụ ya ọfụma n’elu ebe pulpit. Nna ya gụzọrọ n’akụkụ ya na-enye ya mgbam ume na na-enyere ya aka atakara ntị ya dị ka o jiri nganga kwuo, “A bụ m nwa nke Chineke.”

Igba ama nke sotere ya sitere n’aka otu okenye nta nwanyị onye bidoro n’ụjọọ kwuo: “Ọ masịrị m na enwere m onye ga-ataka na ntịm otu a” Mgbe ahụ ọ nwetere mmetụta na ntabianya ma gbaa ama, “E nwere m otu onye na-eme ntaka na ntịm otu ahụ—Mmụọ Nsọ ahụ!”

A nam emechi jiri otu ikpọ oku tụmadị maka ndị ntorobịa! Ọtụtụ nime unu bidoro ụbọchị unu site n’iguzo nihu enyo. Echi, n’izuụka nke a, n’afọ a, mgbe niile, kwụsịtụ dị ka ị na-ele onwe unu na enyo. Chee n’obi gị, ma ọbụ kwupụta ya n’olu dara ụda. “Ewo, leegodi m! A dị m itụnaanya! A bụ m nwa Chineke! Ọ maara mụ! Ọ hụrụ mụ n’anya! A bụ m onye nwere nka—enwere m onyinye nke Mmụọ Nsọ ahụ dịka onye nnọnyerem m n’adịgide!

A na m agbakwụnye ịgba ama m nye unu, ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a nwere nka, maka Chineke Nna, Jịzọs Kraịst, na Mmụọ Nsọ onye na-agba ama maka Ha. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen