Ọgbakọ Zuru ọha
Ịgba Aka ebe banyere Jizọs Kraịst site N’okwuọnụ na Omume niile
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


9:45

Ịgba Aka ebe banyere Jizọs Kraịst site N’okwuọnụ na Omume niile

Dị ka anyị na-agbalịsị ike ibi ndụ anyị ka ọdaba n’ọzi ọma nke Jizọs Kraịst, agwa anyị ga-abụ ịgba ama dị ndụ maka Onye Mgbapụta anyị.

Na baptizim otu niime nkwa ndị anyị na-eme bụ na anyị dị njikere iwekwasị n’onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst. Ebumnuche m taa bụ ịchetara anyị naanyị nwere ike igosi Chineke naanyị na-ewekwasị n’onwe anyị aha Ọkpara ya site n’ịgba ama jiri okwuọnụ na agwa, mgbe na mgbe anyị nwere ike, na Jizọs bụ Kraịst ahụ.

Mgbe ọ na-eje ozi nleta ma na-akụziri ndị nọ na Amerịkas ihe mgbe Mbilite n’ọnwụ Ya gasịrị, Onye Nzọpụta kwupụtara:

“Ha agụbeghị akwụkwọ nsọ nile, nke sị na unu ga-ewekwasị onwe unu aha nke Kraịst, nke bụ aha m? N’ihi na n’aha nke a ka a ga-akpọ unu n’ụbọchị ikpe-azụ;

“Ma onye ọbụla nke wekwasịrị onwe ya aha m, ma nọgide ruo ọgwụgwụ, onye ahụ a ga-azọpụta ya n’ụbọchị ikpe-azụ.”1

Onyeisi Russell M. Nelson akụziworo anyị na “ịwekwasị onwe anyị aha nke Onye nzọpụta tinyekọtara ikwupụta na ịgba aka ebe nye ndi ọzọ—site n’omume na okwuọnụ anyị niile—na Jizọs bụ Kraịst ahụ.”2

Dị ka ndị otú Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, anyị nwere ngọzị na ohere pụrụiche ịguzọrọ dị ka ndị aka ebe nke Onyenwe anyị ma nke aha Ya ebe ọbụla niile anyị nọ.3 Dị ka anyị na-agbalịsị ike ibi ndụ anyị ka ọdaba n’ọzi ọma nke Jizọs Kraịst, agwa anyị ga-abụ ịgba ama dị ndụ maka Onye Mgbapụta anyị na maka aha Ya. Ọzọkwa, anyị na-agba aka ebe banyere Kraịst jiri okwuọnụ site n’ịkesara ndị ọzọ ihe anyị kwere, ihe mmetụta, ma ọ bụ ihe anyị maara maka Jizọs Kraịst.

Mgbe anyị ji obi umeala kesaa ịgba ama anyị maka Onyenwe anyị site n’okwuọnụ na omume, Mmụọ Nsọ ga-ekwu eziokwu ya4 nye ndị ahụ nwere eziuche, mehere obi ha, ma nwee uche dị njikere ịnabata na Jizọs n’ezie bụ Kraịst ahụ.5

Ọ ga-amasị m ịkesa ọmụmatụ ndị otu abụọ mere na nso nso a na-akpake mmụọ ndị gosiri Chineke na ha wekwasịrị aha Jizọs Kraịst n’onwe ha site na ịkwupụta maka Ya ma ịgba aka ebe n’enweghi ntupọ n’ebe ọgbakọ niile nke Nzukọ nsọ.

Ọmụmatụ nke mbụ: Mgbe nwunye m, Elaine, na mụ gara Spain n’afọ 2002, anyị gara ọgbakọ niile nke Sọnde nime ngalaba dị ntakịrị nke Nzukọ nsọ n’ebe ahụ. Dị ka m nọdụrụ ọdụ n’ebe dị elu ma nwunye m anọdụ ọdụ n’etiti ndị igwe ndị ụka, a hụtara m na ọ nọdụrụ ọdụ n’akụkụ otu nwanyị ka ya mee okenye. Mgbe ọgbakọ oriri nsọ gwụrụ, ejekwuru m Elaine ma rịọ ya ka ọ mee ka m mata enyi ọhụrụ ya. O mere otu ahụ ma kwuo na nwanyị nke a, onye n’abụghị onye otu nke Nzukọ nsọ, na-abịa nnọọ Nzukọ nsọ ihe ruru afọ abụọ. Mgbe m nụrụ nke a, A jụrụ m nwanyị nke a na-atụ egwu Chineke ihe kpatara o ji alaghachi azụ ma na-abịa ọgbakọ anyị ruo ogologo oge dị otu a. Nwanyị ahụ jiri obi ịhụnaanya zaghachi, “Ọ na-amasị m ịbịa ebe a nihi unu na-ekwu maka Jizọs Kraịst n’ọgbakọ unu niile.”

Nke a doro anya na ndị otu Nzukọ nsọ nime ngalaba ahụ dị na Spain na-ekwu, na-akụzi ma na-agba ama maka Kraịst nime ọgbakọ ha niile.

Ọmụmatụ nke abụọ: Mgbe m jesiworo ozi na Mpaghara Brazil, A natara m ozi ọhụrụ ije ozi n’ebe ụlọ ukwu Nzukọ nsọ. Mgbe anyị kwagara Obodo Salt Lake na mgwụcha Julaị nke afọ nke a, anyị jere ọgbakọ niile nke Sọnde n’ebe ngalaba ukwu anyị nke ọhụrụ na nke dị itụnaanya. Ọtu niime ọgbakọ ahụ bubụrụ ọgbakọ nke ibu ọnụ na ịgba ama. Mgbe e jisiworo nkwanye ugwu richa oriri nsọ, ndị otu guzoro ọtọ otu n’otu ma gbaa ama metụrụ obi banyere Onye Nzọpụta. Ọgbakọ ahụ lekwasịrị anya na Jizọs Kraịst ma anyị nwetere ezi mmetụta nke Mmụọ. Ewulitere mmụọ anyị, ma okwukwe anyị nwetere mgbam ume. Ọ bụrụ ma ndị enyi Nzukọ nsọ, ndị jiri obiọcha chọọ eziokwu ahụ, nọburu n’ebe ọgbakọ ahụ, ha gaara amata na nke a bụ Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst.

Ọ bụ ngọzị ịhụ na ọgbakọ Nzukọ nsọ anyị bụ ohere pụrụiche maka anyị ịgba aka ebe maka Kraịst ma igosiri Chineke naanyị na-enwe obi ụtọ site n’ịwekwasịrị onwe anyị aha Ọkpara Ya.

Ugbua, ka m kwutụ banyere otu ọmụmatụ dị ike nke metụtara ịwekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst site na-ịgba ama banyere ya site n’omume.

N’Ọgọst gara aga, e sonyere m Okenye Jonathan S. Schmitt jee mmepe ụlọ nke Tempụl nke Feather River California Temple dị na Obodoukwu Yuba. N’ebe ahụ, e nwere m ngọzị iduuru ndị otù dị iche iche kpagharịa tempụl ahụ. Otu niime otu ahụ gụnyere onye otu nke Nzukọ nsọ, Virgil Atkinson na ndị enyị ya asaa ndị okpukpere chị ọzọ. Na ngwụcha nleta ahụ, n’ebe ụmụlọ nrachi, Nwanne nwoke Atkinson juputara na mmetụta uche dị ka o kwupụtara ịhụnaanya ọ nwere maka ndị enyi ya ndị bịara tempụl n’ụbọchị ahụ. Na ntabianya ọ mesiworo nke a, otu nwanyị so na otu ahụ guzoro ọtọ ma kwuo, “Anyị niile hụrụ Virgil naanya. Ọ dịghị mgbe ọ manyere anyị okwukwe ya ma ọlị. Mana ọ naghịkwanụ eme ya ihere. Ọ nọ nnọọ na-ebi ndụ dị ka ị ihe ọ kwere sịrị dị.

Kamgbe afọ niile ndị ahụ, ndụ Nwanne nwoke Atkinson nke yiriKraịst na-abụ ịgba ama dị ike nye ndị enyi ya. Ọmụmatụ ya bụ ihe akaebe dị ike na ọ wekwasịwo onwe ya aha nke Kraịst.

Na nkwucha okwu, a ga m achọ ịkesa otu nkuzi m mụtara banyere otu esi ewekwasị onwe anyị aha nke Kraịst ma gbaa ama banyere Ya site n’iji ezi aha nke Nzukọ nsọ.

Onyeisi Nelson, onye amụma di ndụ nke Chineke, nime ozi ya n’oge ọgbakọ zuru ọha nke 2018 nke akpọrọ “Aha Ziri ezi nke Nzukọ nsọ,” kwuru: “Ọ bụ mmezi ihe. Ọ bụ iwu nke Onyenwe anyị. Joseph Smith enyeghị Nzukọ nsọ eweghachitere aha site n’aka nke onwe ya; abụghị ma Mọmọn. Ọ bụ Onye Nzọpụta N’onwe ya kwuru, ‘N’ihi otua ka a ga-akpọ nzukọ-nsọ m n’ụbọchị ndị ikpeazụ, ọbụna Nzụkọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a.’ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile115:4].”6

Anyị niile hapụrụ ọgbakọ zuru ọha n’ụbọchị ahụ n’uchu ma na mkpebi obi isoro onye amụma ma bido mgbe ahụ gawa jiriwezie aha nke Nzukọ nsọ ekpughere. Akpachara m anya nnọọ ịhụ na ejiri m aha ziri ezi nke Nzukọ-nsọ. Na oge mbido ndị ahụ, ejidere m onwe m aka ka m ghara ịhapụ onwe m laghachi azụ n’ụzọ niile nke ochie. Mgbe mgbalị ndị mbụ ahụ gafere, ọ dịwaziri m mfe ijizi aha ziri ezi nke Nzukọ-nsọ. Ekwetere m na ọtụtụ mgbe, A na m ekwupụta aha Nzukọ nsọ ọsọ ọsọ. Enwere m nchegbu na ndị mmadụ agaghị etinye uche ha nye aha niile nke Nzukọ nsọ ma na ha ga-eche na otoro ezigbo ogologo.

Kosiladị, a bịara m mata na ịkpachapụ anya kwupụta aha niile nke Nzukọ nsọ na-enye m ohere dị ọke ọnụ iji kwupụta aha nke Jizọs Kraịst ma n’ezie gbaa ama maka Onye Nzọpụta site n’ikwupụta aha Ya nime aha nke Nzukọ nsọ Ya. A bịara m matakwa na mgbe m kwupụtara ndị ọzọ aha ziri ezi nke Nzukọ nsọ, a na m aka echeta Jizọs Kraịst karịa ma na-enwete mmetụta Ya nime ndụ m.

Site n’isoro onye amụma, anyị niile nwere ike ịgba ama karịa maka Jizọs Kraịst site n’ijiri ezi aha nke Nzukọ nsọ, site otu ahụ wekwasịkwuo onwe anyị aha nke Onyenwe anyị n’uju ya.

N’ụtụtụ Ụbọchị izu ike nke a, eji m obi ụtọ na-agba ama na Onyeisi Nelson bụ onye amụma dị ndụ nke Chineke ma na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a bụ Nzukọ nsọ nke Jizọs eweghachitere. Ejim obi umeala na-agba aka ebe maka Ọkpara Chineke na ịbụ chi nke Ya. Ọ bụ Nwambụ nke Chineke ma Ọkpara A Mụrụ Naanị Ya, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị, Ịmmanuel ahụ.7 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen